Enweghị Nchebe—Ọrịa Zuru Ụwa Ọnụ
Ị̀ NA-ECHE mgbe ụfọdụ na ndụ na ụzọ ndụ gị bụ nke na-enweghị ihe nchebe na nke a na-ejighị n’aka? Ọ bụghị nanị gị. Ọtụtụ nde mmadụ na-eche otú ahụ. N’ịbụ nke ihe mgbochi mba, okpukpe, ma ọ bụ nke ọha na eze na-ebelataghị, enweghị nchebe na-agbasa dị ka ọrịa, na-emetụta ndị mmadụ site na Moscow ruo Manhattan.
Mgbe ndụ anyị na-enweghị ihe nchebe, anyị na-abụ, dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo ya, ndị “egwu na nchegbu gbara gburugburu.” Nchegbu bụ nsogbu mmetụta uche nke na-arụpụta nrụgide, bụ́ nke pụrụ imebi ahụ ike anyị. Ma gịnị mere anyị ji enwe nchegbu na mmetụta nke enweghị nchebe?
Nchegbu Ndị A Na-enwe na Europe
N’ime Òtù Ndị Europe (EU), otu onye n’ime mmadụ 6 na-ebi ndụ n’ọnọdụ dị ala karịa nke e weere dị ka ịda ogbenye, nde 18 enweghị ọrụ, ndị ọzọ a na-apụghịkwa ịgụta ọnụ na-ebi n’egwu nke ịbụ ndị a chụrụ n’ọrụ. N’ọtụtụ ala EU, a na-emenye ndị mụrụ ụmụ ụjọ n’ihi egwu nke ndị na-edina ụmụaka na-eyi ụmụ ha. N’otu mba EU, mmadụ 2 n’ime mmadụ 3 na-enwe nchegbu banyere iyi egwu mpụ. Ndị ọzọ bi na EU na-atụwanye egwu n’ihi imebisi ihe, iyi ọha egwu, na mmetọ.
Ndụ na ihe ndị e ji ebi ndụ nọ n’ihe ize ndụ, ọ bụghị nanị n’ihi ihe agazighị agazi dị otú ahụ n’ọha mmadụ kamakwa n’ihi ọdachi ndị na-emere onwe ha. Dị ka ihe atụ, na 1997 na 1998, oké mmiri ozuzo, apịtị, na oké ifufe bibiri akụkụ ụfọdụ nke United States. Na 1997, idei mmiri kpara Ebe Etiti Europe aka mgbe osimiri Oder na Neisse rubigara ókè ha. Dị ka magazin Poland a na-ebipụta kwa izu bụ́ Polityka si kwuo, o kpuchiri ala ubi ndị buru ibu, tinyekwara obodo ukwu 86 na ihe dị ka obodo nta 900. Ihe ọkụkụ nke ihe dị ka ezinụlọ 50,000 mebisịrị, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ mmadụ 50 nwụrụ. Apịtị gbukwara ọtụtụ mmadụ n’ebe ndịda Itali ná mmalite 1998.
Okwu Metụtara Inwe Nchebe Onwe Onye
Ma ọ̀ bụ na e mesighị anyị obi ike na ndụ dị nchebe karịa ka ọ dị afọ iri gara aga? Ọ̀ bụ na njedebe nke Agha Nzuzo apụtaghị mbelata nke usuu ndị agha? Ee, ọ pụrụ ịbụ na inwe nchebe nke mba akawo mma. Otú ọ dị, ihe na-eme n’ebe obibi na n’okporo ámá na-emetụta inwe nchebe onwe onye. Ọ bụrụ na a chụọ anyị n’ọrụ ma ọ bụ ọ bụrụ na anyị na-eche na onye ohi ma ọ bụ onye na-edina ụmụaka na-ezogharị n’èzí, mgbe ahụ n’agbanyeghị ngwá agha ole e bibiri, anyị na-enwe nchegbu na mmetụta nke enweghị nchebe.
Olee otú ndị ụfọdụ si na-anagide ejighị ndụ n’aka? Ọbụna nke ka mkpa, è nwere ụzọ a ga-esi mee ka ndụ mmadụ nile—gụnyere nke gị—nwee nchebe n’ụzọ na-adịgide adịgide? A ga-atụle isi ihe ndị a n’isiokwu abụọ na-esonụ.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
UN PHOTO 186705/J. Isaac
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
FAO photo/B. Imevbore