Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 10/8 p. 18-19
  • Uru nke Ịnọrọ Onwe Onye

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru nke Ịnọrọ Onwe Onye
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịnọrọ Onwe Onye—Gịnị Mere O Ji Baa Uru?
  • Jiri Ịnọrọ Onwe Onye Mee Ihe Iji Bịaruo Chineke Nso Karị
  • Imeru Ihe n’Ókè Dị Mkpa
  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?
    Teta!—2021
  • Ntụgharị Uche nke Bara Uru
    Teta!—2000
  • Ịtụgharị Uche
    Teta!—2014
  • Ihe Ị Ga-eme ma I Chee na Ndị Enyi Gị Na-agbara Gị Ọsọ
    Teta!—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 10/8 p. 18-19

Echiche nke Bible

Uru nke Ịnọrọ Onwe Onye

N’OTU oge Jisọs “rịgoro n’elu ugwu ahụ iche ikpe ekpere: ma mgbe o ruru anyasị, nanị Ya nọ n’ebe ahụ.” (Matiu 14:23) N’oge ọzọ, “mgbe chi bọrọ, Ọ pụọ gaa n’ebe bụ ọhịa.” (Luk 4:42) Akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na-egosi na Jisọs Kraịst chọtara ma jiri oge ụfọdụ nke ịnọrọ onwe ya kpọrọ ihe.

Bible na-enye ihe atụ ndị ọzọ nke ndị ikom, dị ka Jisọs, bụ́ ndị ji ịnọrọ onwe onye kpọrọ ihe. Ọ bụ n’ime nche abalị nile nke ịnọrọ onwe onye ka ọbụ abụ ahụ tụgharịrị uche n’ịdị ukwuu nke Onye Okike Ukwu ya. N’ọnọdụ nke Jisọs Kraịst, ozugbo ọ nụsịrị akụkọ banyere ọnwụ Jọn Onye Na-eme Baptism, o jere “iche ruo ebe bụ ọhịa.”—Matiu 14:13; Abụ Ọma 63:6.

Taa, n’ihi oké mkpọtụ na ọgba aghara nke ndụ a na-ebi n’oge a, ịnọrọ onwe onye, ma ọ bụ n’ihi ọnọdụ ma ọ bụ ná nhọrọ, abụghị ihe na-ebute ụzọ. Ị̀ na-echeta mgbe ikpeazụ ị nọrọ nanị gị? Otu nwa agbọghọ nke lụworo dị kwuru, sị: “Ọ dịbeghị mgbe m nọrọ nanị m ná ndụ m.”

Ma ịnọrọ onwe onye ọ̀ dị mkpa n’ezie? Ọ bụrụ otú ahụ, olee otú a pụrụ isi jiri oge ndị dị jụụ mee ihe n’ụzọ bara uru ma na-eju afọ? Òkè dị aṅaa ka nguzozi na-ekere n’ịchọ ịnọrọ onwe onye?

Ịnọrọ Onwe Onye—Gịnị Mere O Ji Baa Uru?

Bible na-agwa anyị na otu onye nke Chineke biri n’oge ochie, bụ́ Aịsak, gara ịnọrọ onwe ya “n’ọhịa na mgbe anyasị.” N’ihi gịnị? “Ịtụgharị uche,” ka ọ na-ekwu. (Jenesis 24:63) Dị ka otu akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, ịtụgharị uche bụ “iche echiche n’ụzọ miri emi ma ọ bụ n’echeghị ya ọkụ ọkụ.” Ọ “na-enye echiche nke ntinye uche n’ihe ruo ogologo oge na n’ụzọ siri ike.” Nye Aịsak, bụ́ onye na-agaje iburu ibu ọrụ ndị dị arọ, ntụgharị uche dị otú ahụ na-enweghị ihe ndọpụ uche ga-emewo ka o nwee ike iche echiche nke ọma, ịhazi echiche ya, na ịtụle ihe ndị ga-ebute ụzọ.

Otu ọkachamara n’ọrụ ahụ ike nke uche na-ekwu na ọ bụrụhaala na ‘a kpaara owu ọmụma ókè, ịnọ n’ebe ndị ọzọ na-anọghị na-eme ka o kwe anyị omume ịhazi echiche anyị, itinye uche n’ihe n’ụzọ ka mma.’ Ọtụtụ ndị ga-agba akaebe na nke a pụrụ inye ume ọhụrụ, iwusi ike, na inye ahụ ike.

Ihe ndị so n’ezi ihe ịtụgharị uche na-arụpụta bụ ihe ọmụma dị ukwuu na njide onwe onye, àgwà ndị na-akwalite ịdị akọ n’okwu na n’omume, bụ́ nke na-eme ka e nwee, n’aka nke ọzọ, mmekọrịta ịdị n’otu n’etiti ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, onye na-amụ ịtụgharị uche pụkwara ịmụta mgbe e kwesịrị ịgbachi nkịtị. Kama ikwu okwu n’echeghị echiche, ọ na-ebu ụzọ tụlee mmetụta okwu ya ga-enwe. “Ị̀ hụwo onye ọ bụla na-anụkpọ onwe ya n’okwu ya nile?” ka onye ahụ so dee Bible e nyere ike mmụọ nsọ na-ajụ. Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Olileanya dịịrị onye nzuzu karịa onye ahụ.” (Ilu 29:20) Olee ihe a ga-eji gwọta iji iré eme ihe n’echeghị echiche dị otú ahụ? Bible na-ekwu, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu.”—Ilu 15:28; tụlee Abụ Ọma 49:3.

Nye onye Kraịst, ntụgharị uche dị jụụ nke e jikọtara ya na ịnọrọ onwe onye bụ ihe dị mkpa n’itoru ntozu okè ime mmụọ. Okwu Pọl onyeozi ndị a bara uru: “Na-ejisi ike n’ihe ndị a; na-anọsi ike n’ime ha; ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.”—1 Timoti 4:15.

Jiri Ịnọrọ Onwe Onye Mee Ihe Iji Bịaruo Chineke Nso Karị

Otu onye England na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ịnọrọ onwe onye bụ ebe Chineke na-anọ aṅa mmadụ ntị.” Mgbe ụfọdụ, Jisọs hụrụ mkpa ọ dị ịnọpụ iche site n’ebe ndị mmadụ ibe ya nọ ma kpegara Chineke ekpere mgbe ọ nọ nanị ya. A kọwara otu ihe atụ nke a na Bible: “O wee bilie n’isi ụtụtụ, n’ezi abalị, pụọ, jee n’ebe bụ ọhịa, nọrọ na-ekpe ekpere n’ebe ahụ.”—Mak 1:35.

N’Abụ Ọma, e zoro aka ugboro ugboro ná ntụgharị uche bụ́ n’ihe ndị metụtara Chineke. Ka ọ na-agwa Jehova okwu, Eze Devid kwuru, sị: “M na-atụgharị uche m na Gị.” Okwu Esaf nwere otu echiche ahụ: “M ga-atụgharịkwa uche n’ọrụ Gị nile, ọ bụkwa n’omume Gị nile ka m ga-atụgharị obi.” (Abụ Ọma 63:6; 77:12, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ya mere, ịtụgharị uche n’àgwà Chineke na ná mmeso ya na-eweta ụgwọ ọrụ bara ụba. Ọ na-eme ka e nwekwuo ekele maka Chineke, na-eme ka mmadụ nwee ike ịbịarukwu ya nso.—Jemes 4:8.

Imeru Ihe n’Ókè Dị Mkpa

Otú ọ dị, e kwesịrị iji imeru ihe n’ókè chọọ ịnọrọ onwe onye. A pụrụ ịkọwa ịnọrọ onwe onwe dị ka ebe bara uru ileta ma bụrụ ebe dị ize ndụ ịnọgide. Ikewapụ onwe onye iche nke ukwuu na-emegide mkpa bụ́ isi mmadụ nwere nke inwe mkpakọrịta, ikwurịta okwu, na igosipụta ịhụnanya. Ọzọkwa, ikewapụ onwe onye iche pụrụ ịbụ ájá ebe ahịhịa nke nzuzu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-eto. Ilu Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọchịchọ nke ya onwe ya na-achọsi ike ka onye na-ekewapụ onwe ya na-achọ, ọ bụ ezi nzube ihe nile ka ọ na-alụsosi ọgụ ike.” (Ilu 18:1) Iji nwee nguzozi n’ịchọ ịnọrọ onwe onye, anyị aghaghị ịmata ihe ize ndụ ndị dị n’ikewapụ onwe onye iche.

Dị ka Jisọs na ndị ikom ndị ọzọ ji ihe ime mmụọ kpọrọ ihe bụ́ ndị biri ndụ n’oge Bible, ndị Kraịst taa na-eji ntakịrị oge ha nọ nanị ha akpọrọ ihe. N’ezie, n’ihi ọtụtụ ibu ọrụ na nchegbu, iwepụta oge na ohere iji tụgharịa uche mgbe a nọọrọ onwe onye pụrụ ịbụ ihe ịma aka. Ma, dị ka ọ dị n’ihe nile bara ezi uru, anyị ga-azụchapụtarịrị “oge a.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Mgbe ahụ anyị pụrụ ikwu dị ka ọbụ abụ ahụ, sị: “Ka okwu nile nke ọnụ m na ntụgharị nke obi m bụrụ ihe na-atọ ụtọ n’ihu Gị, Jehova.”—Abụ Ọma 19:14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya