Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 2 p. 13-15
  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa n’Onwe Gị?
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Ọ̀ Dị Mma Mmadụ Ịna-eme Ọtụtụ Ihe Otu Mgbe?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Uru nke Ịnọrọ Onwe Onye
    Teta!—1998
  • Olee Ihe M Ga-eme Ka Uche M Na-adị n’Otu Ihe?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 2 p. 13-15
Ebe otu nwoke na-ele vidio e ji akụzi ihe ka ọ na-esi nri.

Olee Nsogbu Ekwentị Nwere Ike Ịkpatara Gịnwa N’onwe Gị?

Ndị mmadụ na-achọ ịmụta ihe ọhụrụ kwa ụbọchị. O nwere ike ịbụ ihe ga-abara ha uru n’ụlọ akwụkwọ, n’ọrụ ha, ma ọ bụ n’ihe ọ bụla ọzọ. Ekwentị na ihe ndị yiri ya nwere ike inyere ha aka. Kemgbe ụwa, o nwetụbeghị mgbe ọ dị mfe mmadụ ịnọ n’ụlọ ya ma ọ bụdị n’oche ya mụta ihe ọ bụla ọ chọrọ karịa ugbu a.

Ma, ọtụtụ ndị na-apịkarị ekwentị ha ma ọ bụ ihe ndị yiri ya achọpụtala na . . .

  • ọ na-esiri ha ike ime ka uche ha dịrị n’ihe ha na-agụ.

  • ọ na-esiri ha ike ịhapụ ịna-eme ọtụtụ ihe otu mgbe.

  • obi na-ajọkarị ha njọ ma ha nọrọ naanị ha.

IHE NDỊ I KWESỊRỊ ỊMA

Ebe otu nwa agbọghọbịa na-eme ọtụtụ ihe otu mgbe. O ji ekwentị ya na-ezipụ ozi, ya na otu enyi ya esi na vidio na-akparịta ụka, ya ejirikwa kọmputa na akwụkwọ na-amụ ihe.

ỊGỤ IHE

Ndị ịpị ekwentị riri ahụ́ na-agụkarị ihe elu elu kama iwetu obi ala gụọ ihe si n’isi ruo ná ngwụcha ka ha ghọta ihe a na-ekwu.

Mmadụ ịgụ ihe elu elu adịghị njọ ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịmata azịza ihe ozugbo ozugbo. Ma, isi otú a agụ ihe adịghị mma ma ọ bụrụ na onye ahụ chọrọ ịghọta ihe niile ọ na-agụ nke ọma.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ọ̀ na-adịrị gị mfe ịgụ ihe toro ogologo? Olee otú ịgụ ihe toro ogologo ga-esi nyere gị aka ịmụta ihe?​—ILU 18:15.

UCHE GỊ ỊDỊ N’IHE Ị NA-EME

Ụfọdụ ndị chere na ekwentị na ihe ndị yiri ya na-enyere ha aka ime ihe abụọ otu mgbe, dị ka ịna-ezigara ndị enyi ha ozi mgbe ha na-amụ ihe. Mana, ebe ọ bụ na ha na-eme ihe abụọ otu mgbe, o nwere ike ime ka uche ha ghara ịdị na nke ọ bụla, ya emezie o nweghị nke ha ga-eme nke ọma na ya.

Ọ bụ eziokwu na mmadụ itinye uche ya n’ihe ọ na-eme anaghị adịcha mfe, ma ọ ga-enyere onye ahụ aka ịmụta ihe. Otu nwatakịrị nwaanyị aha ya bụ Grace kwuru, sị: “Ọ na-eme ka mmadụ ghara ịna-emejọkarị ihe, meekwa ka onye ahụ ghara iji ọtụtụ ihe kpojuo onwe ya isi. Amụtala m na ọ ka mma itinye uche m n’otu ihe karịa ịna-eme ọtụtụ ihe otu mgbe.”

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ịpị ekwentị mgbe ị na-amụ ihe ọ̀ na-eme ka ị ghara ịghọtacha ihe ị na-amụ na icheta ihe ị mụrụ?​—ILU 17:24.

MGBE Ị NỌ NAANỊ GỊ

Ahụ́ anaghị eru ndị ụfọdụ ala ma ha nọrọ naanị ha n’ebe dị jụụ. Ha na-ewere ekwentị ha pịwa ka obi ghara ịna-ajọ ha njọ. Otu nwaanyị aha ya bụ Olivia kwuru, sị: “Obi na-ebido jọwa m njọ ma m nọọ nkeji iri na ise n’apịghị ekwentị m ma ọ bụ tablet m ma ọ bụkwanụ n’agbanyeghị tiivi.”

Ma, oge mmadụ nọ naanị ya bụ oge magburu onwe ya onye ahụ nwere ike iji chee echiche nke ọma. Ọ ga-enyere onye ahụ aka ịmụta ihe ọ na-amụ, ma onye ahụ ọ̀ bụ onye na-eto eto ma ọ̀ bụ dimkpa.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ị̀ na-eji oge ndị ị nọ naanị gị eche echiche nke ọma?​—1 TIMOTI 4:15.

IHE I NWERE IKE IME

LEBA ANYA N’OTÚ I SI APỊ EKWENTỊ NA IHE NDỊ YIRI YA

Olee otú ekwentị na ihe ndị yiri ya ga-esi nyere gị aka ịna-echebara ihe ị na-amụ echiche nke ọma? Ma, olee otú ha nwere ike isi mee ka uche gị ghara ịdị n’ihe ị na-amụ?

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma.”​—ILU 3:21.

JỤỌ ONWE GỊ, SỊ . . .

  • Ọ̀ na-esiri m ike itinye uche m n’ihe m na-agụ ma ọ bụrụ na m na-agụ ya n’ekwentị ma ọ bụ na kọmputa? Ọ bụrụ na ọ na-esiri m ike, gịnị na-akpata ya?

  • Olee ihe ndị m ga-eme iji belata ihe ndị ahụ na-eme ka uche m ghara ịdị n’ihe m na-amụ ma ọ bụkwanụ iji kwụsị ha kpamkpam?

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ná mmalite, na-agụ naanị otu paragraf ma ọ bụ abụọ. Ka oge na-aga, gị ejiri nwayọọ nwayọọ na-agụkwu ọtụtụ paragraf. Na-agụpụta ihe ị na-agụ agụpụta n’olu dị ala. Ọ ga-eme ka uche gị dịrị n’ihe ị na-agụ.

  • Olee otú m ga-esi wepụtakwuo oge m ga-eji na-echebara ihe m gụrụ echiche?

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Jiri nkeji iri ikpeazụ n’oge i wepụtara iji amụ ihe chebara ihe ndị ị mụrụ echiche.

  • Olee oge ndị m na-ebidokarị mewe ọtụtụ ihe otu mgbe?

  • Olee ihe ndị m nwere ike ime ka ọ dịrị m mfe ịna-etinye uche m n’otu ihe?

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Ị mụwa ihe, wepụ ihe ọ bụla nwere ike ime ka uche gị pụọ n’ihe ị na-amụ.

AMAOKWU BAỊBỤL GA-ENYERE GỊ AKA: “Nweta amamihe. Gbalịa ka ị na-aghọta ihe.”​—ILU 4:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya