Ákwà Ozu nke Turin—Ọ̀ Bụ Ákwà E Ji Lie Jisọs?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA N’ITALI
Malite n’April 18 ruo June 14, 1998, n’Itali na Katidral nke San Giovanni Battista, dị na Turin, e gosipụtara ákwà ozu a sị na e ji kechie ozu Jisọs onye Nazaret mgbe ọ nwụsịrị. E tinyere ya n’igbe e ji enyo mee nke ikuku na-apụghị ịbanye, nke mgbọ na-apụghị ịtụpu, nke a gbajuru ikuku na-adịchaghị ike n’ime ya. N’ebe ahụ e debere ya ebe e nwere ọnọdụ ihu igwe na-adịghị agbanwe agbanwe.
NDỊ nleta si n’ụzọ atọ a rụlitere elu ndị jitụ ntakịrị ihe karịa ibe ha elu gafere n’ihu ákwà ozu ahụ e chebere nke ọma. Nke a mere ka o kwe mmadụ nile mee ịhụ ya nke ọma. A dịghị enyekarị minit abụọ iji kirie ya, ọ bụkwa nanị nye ndị tinyere akwụkwọ. Mmetụta ndị e nwere bụ malite ná ntụgharị uche jupụtara n’oké mkpali, nke na-akpata ịgba anya mmiri ruo n’ọchịchọ nkịtị nke ịmata ihe. A kọrọ na e nwere ihe dị ka nde ndị nleta 2.5.
“Gịnị ka ákwà ozu ahụ pụtara nye gị?” bụ ajụjụ a na-ajụkarị. Nye onye ọ bụla nwere mmasị ikwu okwu banyere okpukpe, oge ahụ nyere ha ohere inyocha okwu ahụ n’ụzọ miri emi karị na ịgụghachi akụkụ Bible ndị na-ezo aka n’olili Jisọs.—Lee igbe dị na peji nke na-esonụ.
Ákwà ozu ahụ bụ ákwà dị sentimita 436 n’ogologo na sentimita 110 n’obosara nke nwere akara dị n’elu ya nke ahụ otu nwoke bụ́ onye, a na-azọrọ na ọ nwụrụ ọnwụ ike. Ma ajụjụ bụ, Ákwà Ozu nke Turin a ọ̀ bụ ya ka e jiri kechie ozu Jisọs ihe karịrị narị afọ 19 gara aga?
Otú Akụkọ Ya Sị Malite
“Ọ dịghị ihe àmà e nwere banyere ákwà ozu na narị afọ ndị mbụ nke oge ndị Kraịst,” ka New Catholic Encyclopedia na-ekwu. Na 544 O.A., a hụrụ otu onyinyo nke a kọrọ na ọ bụghị mmadụ mere n’Edessa, nke dị na Turkey nke oge a. E kwuru na onyinyo ahụ bụ ihu Jisọs. Na 944 O.A., e kwuru na onyinyo ahụ dị na Constantinople. Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme ekweghị na nke a bụ ihe ahụ a maara ugbu a dị ka Ákwà Ozu nke Turin.
Na France, na narị afọ nke 14, Geoffroi de Charny nwere otu ákwà ozu. Na 1453, ọ bịara bụrụ nke Louis, bụ́ Eze nke Savoy, bụ́ onye wefere ya na chọọchị dị na Chambéry, bụ́ isi obodo nke Savoyard. Na 1578, Emmanuel Philibert si n’ebe ahụ were ya gaa Turin.
Echiche Dịgasị Iche
Na 1988 onye bụ achịbishọp nke Turin mgbe ahụ, bụ́ Anastasio Ballestrero, mere ka e jiri usoro e ji achọpụta afọ ole ihe dị wee nyochaa Ákwà Ozu nke Turin ahụ iji mata afọ ole ọ dị. Nnwale ndị ahụ, nke ọ bụ ụlọ ime nnyocha atọ a na-akwanyere ùgwù na Switzerland, England, na United States mere, kpughere na ọ bụ nke dị laa azụ n’oge ụwa na-emepechabeghị anya, si otú a bụrụ nke malitere ịdị ogologo oge mgbe Kraịst nwụsịrị. Ballestrero nakweere nchọpụta ahụ, na-ekwupụta n’otu ihe odide, sị: “N’inyefe sayensị ntụle nke ihe ndị a a nwapụtara, chọọchị na-egosipụtaghachi nkwanye ùgwù na nsọpụrụ o nwere maka ihe oyiyi a kwesịrị nsọpụrụ nke Kraịst, bụ́ nke nọgidere na-abụ ihe ndị òtù chọọchị na-efe ofufe.”
Achịbishọp nke nọ ugbu a, bụ́ Giovanni Saldarini, kwupụtara, sị: “Anyị apụghị ikwu na onyinyo ahụ bụ onyinyo Kraịst nke e si n’elu obe budata.” Ma, n’otu oge ahụ, o kwusiri ike, sị: “Obi abụọ adịghị ya na onye kwere ekwe pụrụ ịhụ onyinyo nke nwoke ahụ nke Oziọma ndị ahụ kọwara n’akara ahụ.” Na May 24, 1998, ka a nọ na-egosipụta ákwà ozu ahụ, Popu John Paul nke Abụọ kpọrọ onyinyo ahụ “akara nke anụ ahụ Onye ahụ A Kpọgidere n’Obe.”
Dị ka a pụrụ ịhụ, n’ụzọ siri ike ihe àmà na-emegide Ákwà Ozu nke Turin ahụ ịbụ ákwà e ji lie Jisọs. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụ ya? Ọ̀ ga-ekwesị ekwesị ka onye chọrọ irubere nkụzi Bible isi sọpụrụ ákwà ahụ?
Tụlee nke abụọ n’ime Iwu Iri ahụ, bụ́ nke na-ekwu, dị ka nsụgharị Bible nke Roman Katọlik si kwuo ya: “Ị gaghị emere onwe gị ihe onyinyo a pịrị apị ma ọ bụ ihe yiri ihe ọ bụla dị n’eluigwe n’elu ma ọ bụ n’ụwa n’okpuru ya ma ọ bụ na mmiri n’okpuru ụwa. Ị gaghị akpọ isiala nye ha.” (Ọpụpụ 20:4, 5, New Jerusalem Bible) N’ezie, ezi ndị Kraịst na-aṅa ntị n’okwu Pọl onyeozi bụ́: “Anyị sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.”—2 Ndị Kọrint 5:7; 1 Jọn 5:21.
[Igbe dị na peeji nke 22]
Ákwà Ozu ahụ na Ihe Ndekọ Oziọma
Ndị so dee Oziọma ahụ na-ekwu na e ji ‘ezi ákwà ọcha na-enwu enwu’ kechie ozu Jisọs, mgbe Josef onye Arịmatịa si n’elu osisi ahụ budata ya. (Matiu 27:57-61; Mak 15:42-47; Luk 23:50-56) Jọn onyeozi na-ekwukwasị: “Nikọdimọs, . . . bịakwara, na-eweta myrrh na aloes a gwara agwa, ihe ha ka [otu narị pound] n’ọ̀tụ̀tụ̀. Ya mere ha weere ahụ Jisọs, kee ya n’ezi ákwà ozu, ya na ụda ụtọ ndị a, dị ka ndị Juu na-eme n’ili ozu.”—Jọn 19:39-42.
Dị ka omenala ha si dị, ndị Juu na-asa onye nwụrụ anwụ ahụ ma werezie mmanụ na ụda ụtọ tee ozu ahụ. (Matiu 26:12; Ọrụ 9:37) N’ụtụtụ sotere Ụbọchị Izu Ike, ndị enyi nwanyị Jisọs zubere idozicha ozu ya, bụ́ nke a tọgbọwororịị n’ili. Otú ọ dị, mgbe ha ji ‘ụda ụtọ ha ga-eji tee Ya mmanụ’ bịarute, ozu Jisọs adịghị n’ili ahụ!—Mak 16:1-6; Luk 24:1-3.
Gịnị ka Pita hụrụ mgbe ọ bịara ma banye n’ili ahụ n’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị? Jọn bụ́ onye ji anya ya hụ ihe merenụ kọrọ, sị: “O wee hụ ezi ákwà ozu ahụ ka ha tọgbọrọ, ịchafụ kwa, nke dịrị n’isi Ya, ya na ezi ákwà ozu ahụ atọgbọghị n’otu ebe, kama a tụrụworo ya debe n’otu ebe dị iche.” (Jọn 20:6, 7) Rịba ama na a kpọtụghị ezi ákwà ọcha ahụ na-enwu enwu nke akara ahụ Jisọs dị na ya aha n’ebe a—nanị ezi ákwà ozu na ịchafụ ahụ ka a kpọtụrụ aha. Ebe ọ bụ na Jọn kpọrọ ezi ákwà ozu na ịchafụ isi ahụ aha, ó yighị ka ọ gaara akpọtụ ezi ákwà ọcha ahụ na-enwu enwu nke akara ahụ Jisọs dị na ya aha ma ọ bụrụ na ọ dị n’ebe ahụ?
Ọzọkwa, tụlee nke a: Ọ bụrụ na onyinyo Jisọs dị n’ákwà e ji lie ya, ó yighị ka à gaara ahụ ya nakwa na ọ gaara aghọ ihe a ga na-ekwu okwu banyere ya? Ma, e wezụga ihe dị n’Oziọma ndị ahụ, Bible ekwutụghị okwu banyere ákwà ndị ahụ e ji lie ya.
Ọbụna ndị edemede nke narị afọ nke atọ na anọ sị na ha bụ ndị Kraịst, ndị ọtụtụ n’ime ha dere banyere ọtụtụ ihe ndị a sị na ha bụ ọrụ ebube ndị e jikọtara ha na ọtụtụ ihe ncheta mgbe ochie, ekwughị okwu banyere ịdị adị nke ákwà ozu nke onyinyo Jisọs dị na ya. Nke a siri ike nghọta, ebe ndị hụrụ ihe merenụ na narị afọ nke 15 na nke 16, dị ka ọkà mmụta bụ́ onye Jesuit bụ́ Herbert Thurston si kwuo, “na-akọwa akara ndị dị n’ákwà ozu ahụ dị ka ndị doro nnọọ anya n’akụkụ ya nile na n’ụcha ya nke na ọ pụrụ ịbụ na e mere ha nnọọ ọhụrụ.”
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 21]
David Lees/©Corbis