Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 5/8 p. 22-25
  • Ọgwụ Ahụhụ Adịghị Egbu Nanị Ahụhụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgwụ Ahụhụ Adịghị Egbu Nanị Ahụhụ
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ọgwụ Ahụhụ Na-akpata
  • Iji Ọgwụ Ahụhụ Eme Ihe—Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Ka Nta?
  • Usoro IPM—Nhọrọ Ọzọ
  • Imeri Ahụhụ—N’Uzọ Na-agụnyeghị Ọgwụ
  • Nchịkwa nke Wetara Mgbanwe
  • Inwe Ụdị Ihe Dị Iche Iche—Ihe Dị Oké Mkpa Maka Ndụ
    Teta!—2001
  • Gịnị Na-akpata Nsogbu ahụ A Na-enwe n’Ọrụ Ugbo Nakwa n’Ịkpa Anụ?
    Teta!—2003
  • À Na-emeri n’Ọgụ Ahụ?
    Teta!—1996
  • Nsogbu Ndị Ọrụ Ugbo na Ndị Na-akpa Anụ Na-enwe
    Teta!—2003
Teta!—1999
g99 5/8 p. 22-25

Ọgwụ Ahụhụ Adịghị Egbu Nanị Ahụhụ

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA BRAZIL

“Ọ DỊ nnọọ mma,” ka onye ọrụ ugbo bụ́ Domingos dos Santos na-ekwu ka ọ na-ekiri akpụ dị n’ugbo ya n’ebe ndịda Brazil. O nwere ihe mere ọ ga-eji nwee afọ ojuju. Akwụkwọ ihe ọkụkụ ya yiri ka e nwetụbeghị ahụhụ na-ebibi ihe tara ha. Ọ̀ bụ ihe ọzọ ọgwụ ahụhụ rụzuru? Ee e. “N’afọ gara aga na n’afọ a,” ka Domingos na-ekwu “ọ dịghị m mkpa ịzụ ọgwụ ahụhụ ọ bụla.”

Domingos so n’otu ìgwè na-aba ụba nke ndị ọrụ ugbo na-ala azụ iji ọgwụ ahụhụ echebe ihe ọkụkụ ha.a Kama nke ahụ, ha na-eji ụzọ ndị na-eme ka ha ghara ma ọ bụ, ọ dịkarịa ala, belata aka n’iji ọgwụ eme ihe. “Ụdị ụzọ ndị dị aṅaa ka ha bụ?” ka m jụrụ Sandro Müller, bụ́ onye ọkà n’ọrụ ugbo, onye nọworo na-eme nnwale n’otu ugbo oroma dị São Paulo nso. “N’ihi gịnịdị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ndị ọrụ ugbo ibelata aka n’ojiji a na-eji ọgwụ ahụhụ eme ihe?”

Ihe Ọgwụ Ahụhụ Na-akpata

Iji nyere m aka ịhụ otu ọghọmahịa dị n’iji ọgwụ ahụhụ eme ihe, Sandro na-ekwu, sị: “Cheedị n’echiche na otu ìgwè ndị ọrụ uwe ojii na-achụso otu ìgwè ndị ohi zuru ohi n’ụlọ akụ̀. Iji gbafuo, ndị ohi ahụ agbaba n’otu ọfịs mmadụ juru. Ebe ọ bụ na ndị ohi ahụ gbabara n’ime ìgwè mmadụ ahụ, ndị uwe ojii ahụ ebute helikọpta nke tụrụ bọmbụ e ji gas mee n’ọfịs ahụ. Nke a egbuo ọ bụghị nanị ndị ohi ahụ kamakwa ndị na-arụ ọrụ n’ofịs ahụ na ndị nche aka ha dị ọcha nke ụlọ ahụ. Ihe yiri nke a na-eme mgbe onye ọrụ ugbo gbara nnukwu ọgwụ ahụhụ siri ike n’ugbo ya ọtụtụ ugboro. Ha na-egbu ụmụ ahụhụ ndị na-ebibi ihe, bụ́ ndị ohi ahụ, ma ha na-egbukwa ndị bara uru, bụ́ ndị nche ahụ.”

“Ma ọ dịghị ihe ọzọ, e chebewo ihe ọkụkụ ndị ahụ,” ka m zaghachiri. Ma Sandro mere ka ọ pụta ìhè na ọgwụ ahụhụ e jiri mee ihe aghara aghara ga-amalite ịkpata ihe ndị dị njọ. N’ụzọ dị aṅaa? Ụfọdụ ụmụ ahụhụ na-alanarị ọgwụ ahụ a gbara ha n’ihi na ọgwụ ahụhụ ụfọdụ adịghị egbu ha. E mesịa ha na-anọ na-eri ihe ọkụkụ ahụ na-enweghị ‘ndị nche,’ ma ọ bụ ụmụ ahụhụ bara uru—n’ihi ọgwụ ahụ onye ọrụ ugbo gbara.

Ụba nri na enweghị ụmụ ahụhụ ndị na-eri ibe ha na-eme ka ọnụ ọgụgụ ụmụ ahụhụ ọgwụ na-adịghị egbu mụbaa ngwa ngwa, nke na-amanye onye ọrụ ugbo ahụ ịgba ọgwụ ahụhụ ọzọ, ikekwe o werezie ọbụna ụdị ọgwụ ahụhụ siri ike karị. N’ebe ụfọdụ a na-akọ àgwà n’Ebe Ndịda America, ndị ọrụ ugbo na-agba ọgwụ ahụhụ kwa izu. Gịnị na-esi n’usoro a apụta? “Ọ bụrụ na ị kụọ ọgwụ ahụhụ,” ka otu onye ọrụ ugbo kwuru, “ị ga-aghọta nsí.”

Iji Ọgwụ Ahụhụ Eme Ihe—Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ Ka Nta?

Nchọpụta e mere na-egosi na onye na-etinyere ahụhụ nsí na-etinyekwara onwe ya nsí. Na Brazil nanị, ka magazin bụ́ Guia Rural kọrọ, ọgwụ ahụhụ na-emebi ahụ ike nke ihe dị ka mmadụ 700,000 kwa afọ—nke ahụ bụ nkezi nke otu onye na sekọnd 45 ọ bụla! Òtù Ahụ Ike Ụwa na-akọwakwa na kwa afọ mmadụ 220,000 na-anwụ gburugburu ụwa n’ihi ikuru ọgwụ ahụhụ ndị na-egbu egbu. Ọzọkwa, ọgwụ ahụhụ na-emebi gburugburu ebe obibi anyị nke ukwuu.

Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị taa na-eche na ịgba ọgwụ ahụhụ dị nnọọ ka imepe akpa nsogbu, ndị ọzọ na-ahụkarị iji ọgwụ ahụhụ eme ihe dị ka nke ka nta n’ime ihe ọjọọ abụọ. Otú a ka ndị mmadụ si eche ya: Jiri ọgwụ ahụhụ mee ihe ma nrị dịrị ma ọ bụ ejila ọgwụ ahụhụ eme ihe ma agụụ dịrị. E kwuwerị, ọnụ ọgụgụ mmadụ n’ụwa na-arị elu ebe ala ndị dị mma ịkọ ihe na-ebelata ebelata. Ọ bụrụ na a ga-egbochi agụụ zuru ụwa ọnụ, a ghaghị ichebe ihe ọkụkụ pụọ n’aka ụmụ ahụhụ na-ebibi ihe nwere ike ibibi ha.

N’ụzọ doro anya, ụmụ ahụhụ bụ nsogbu bụ́ isi e nwere. Otú ọ dị, ọ dabara nke ọma na ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ọrụ ugbo gburugburu ụwa na-amụta na e nwere ụzọ ka mma karịa ịgbagbu ihe ọkụkụ n’ọgwụ ahụhụ. A na-akpọ ya usoro e jikọrọ ọnụ maka ịchịkwa ụmụ ahụhụ, ma ọ bụ usoro IPM.

Usoro IPM—Nhọrọ Ọzọ

“Gịnị bụ usoro IPM?” ka m jụrụ Prọfesọ Evôneo Berti Filho, bụ́ onyeisi nke Ngalaba Ihe Ọmụmụ nke Ụmụ Ahụhụ na Mahadum nke São Paulo dị na Piracicaba, bụrụkwa onye nchọpụta a ma ama n’ịchịkwa ụmụ ahụhụ n’ejighị ọgwụ. Prọfesọ Berti kọwara na nzube nke usoro IPM bụ ibelata ojiji a na-eji ọgwụ ahụhụ eme ihe ruo ọ̀tụ̀tụ̀ kasị dị ala kwesịrị ekwesị na ịgba nanị ọgwụ ahụhụ ndị na-egbu nanị ụmụ ahụhụ na-ebibi ihe. Mgbe ahụ e jirizie usoro ịchịkwa ụmụ ahụhụ n’ejighị ọgwụ kwadoo ịgba ọgwụ n’ụzọ a kpaara ókè.

Otu n’ime ụzọ ndị ahụ e si achịkwa ahụhụ bụ ịgbanwegharị ihe ọkụkụ. Dị ka ihe atụ, site n’afọ ruo n’afọ, onye ọrụ ugbo pụrụ ịgbanwerịta ọka na àgwà. Ụmụ ahụhụ na-eri ọka bụ́ ndị na-adịghị eri àgwà ga-anwụ n’agụụ ma ọ bụ pụọ ịchọ ebe a kụrụ ọka. Mgbe ahụ, mgbe ọzọ a kụrụ ọka, ihe ka ukwuu n’ụmụ ahụhụ ahụ nwere ike ha agaghị adịzi—ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo nwa mgbe. Ka ọ na-erukwala mgbe ụmụ ahụhụ ahụ ga-alọtaghachi n’uju, ịgbanwegharị ihe ọkụkụ ọzọ pụrụ n’oge na-adịghị anya ịmanye ha ịpụ ọzọ.

Iji ihe ndị dị ndụ achịkwa ụmụ ahụhụ bụ akụkụ ọzọ nke usoro IPM. Ọ gụnyere ndị ọrụ ugbo inweta enyemaka nke ụmụ ahụhụ, nje bacteria, nje virus, fungi, na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ na-eri ibe ha. Dị ka ihe atụ, ndị nchọpụta si Brazil chọpụtara na ọtụtụ egú nwụrụ mgbe ha butesịrị nje a na-akpọ baculovirus. Ha kwuru na ebe ọ bụ na nje ahụ adịghị egbu mmadụ, ha pụrụ ịgba ihe ọkụkụ mmiri a gbanyere nje a, a ga-ejikwa ya mee ihe dị ka ọgwụ ahụhụ e ji ihe ndị dị ndụ mee bụ́ nke na-egbu egú na-eri soybeans na akpụ. Ọ dị irè. Egú ndị ahụ nwụrụ ka ụbọchị ole na ole gasịrị ha riri ihe ọkụkụ ndị ahụ a gbara ọgwụ. Dị ka ihe ntụkwasị, egú ndị ahụ nwụrụ anwụ na-aghọrọ onye ọrụ ugbo ngwá ọgụ maka ọdịnihu. N’ụzọ dị aṅaa?

“Nanị ihe onye ọrụ ugbo ahụ ga-eme bụ itinye ndị nwụworonụ, bụ́ egú ndị butere nje virus ahụ n’ime ihe e ji akwọ ihe,” ka Prọfesọ Berti kọwara, “kwọrisie ha, zaa ya, ma tinye mmiri ahụ a zapụtara na friza.” Onye ọrụ ugbo ahụ ewepụtazie ya na friza ka ọ gbazee, gwakọta ya na mmiri, ma gbaa ngwakọta ahụ n’ihe ọkụkụ ya.

Ọgwụ ahụhụ a e ji ihe ndị dị ndụ mee nwere ike ọ gaghị arụ ọrụ ngwa ngwa dị ka ọgwụ ndị ọzọ, ma ọ dịkarịa ala, ka otu onye nchọpụta na-ekwu, o nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma dị pasent 90.

Imeri Ahụhụ—N’Uzọ Na-agụnyeghị Ọgwụ

Inweta enyemaka nke ụmụ ahụhụ ndị bara uru iji lụsoo ụmụ ahụhụ na-ebibi ihe ọgụ bụ akụkụ ọzọ dị mkpa nke iji ihe ndị dị ndụ achịkwa ụmụ ahụhụ. Ma, n’agbanyeghị mgbalị ndị e meworo iji mee ka ndị ọrụ ugbo kweta iji ụzọ a e si achịkwa ahụhụ na-eme ihe, ọtụtụ ndị ọrụ ugbo na Brazil na n’ebe ọzọ ekwebeghị iji ya. N’ihi Gịnị? O yiri ka echiche nke ịkpachara anya tinye ụmụ ahụhụ n’ugbo dị ndị ọrụ ugbo ka ihe ezi uche na-adịghị na ya dị ka itinye ọchịcha n’ụlọ dị ndị bi n’obodo ukwu. “Nye ọtụtụ ndị ọrụ ugbo,” ka Prọfesọ Berti gwara m, “ụmụ ahụhụ nile na-eri ihe ọkụkụ. Ihe onye ọrụ ugbo na-achọtụghị bụ inwekwu ha.”

Mgbe ahụ, n’ụzọ doro anya, iji ihe ndị dị ndụ achịkwa ụmụ ahụhụ ga-ezu ebe nile nanị mgbe ndị ọrụ ugbo ghọtara na ụfọdụ ụmụ ahụhụ bụ ndị inyeaka ha. Dị ka ihe atụ, ndị na-adụ mkpụrụ osisi na California, U.S.A., jiri enyemaka nke ébé mee ihe ná ngwụsị afọ ndị 1800. N’oge ahụ, ụmụ ahụhụ na-ebibi ihe, bụ́ ndị a na-akpacharaghị anya bubata site n’Australia, awakpowo osisi lemọn na oroma nile, ọ fọkwara nke nta ka ha bibisịa ha. O were ébé ndị ahụ ihe na-erughị afọ abụọ iji chịkwaa ụmụ ahụhụ ahụ na-ebibi ihe, na-azọpụta ugbo oroma ndị California!

Nchịkwa nke Wetara Mgbanwe

Taa ụfọdụ ndị ọrụ ugbo na Brazil na-achọpụtaghachi ọrụ joaninha (obere Joanna, bụ́ aha a na-akpọ ébé n’ebe a) dị ka ‘onye nche’ a pụrụ ịdabere na ya. “Joaninha na-alụso igwu ihe ọkụkụ ọgụ n’ugbo oroma a,” ka Sandro gwara m ka anyị na-aga n’akụkụ ọtụtụ ahịrị nke osisi oroma dị n’ugbo oroma ahụ ọ na-elekọta. Ọ kwụsịrị n’otu osisi oroma, dọtulata otu alaka osisi nwere akwụkwọ ndị ka na-epulite ọhụrụ. Igwu ihe ọkụkụ—ụmụ ahụhụ na-arị nke nta nke nta há ka isi agá—nọ n’ebe ahụ n’emegharịghị ahụ, were ọnụ ogologo ha dụgide n’akwụkwọ ndị ahụ, na-amị mmiri ha.

Otú ọ dị, igwu ndị a bụ nri ‘onye nche’ ahụ. N’eziokwu, n’etiti ụdị ébé ụfọdụ, otu ébé nwere ike iri igwu 800 n’oge ndụ ya. Nke ahụ ò zuru ime ka e nwee mgbanwe? “O zuru,” ka Sandro kwuru, “ma ọ bụrụ na ị hapụ ahịhịa zuru ezu n’etiti osisi oroma ndị ahụ iji mee ka ọtụtụ ébé na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ na-eri ibe ha nwee ebe obibi.” N’oge ndị gara aga, mgbe a na-adịghị eji ihe ndị dị ndụ achịkwa ụmụ ahụhụ n’ugbo mkpụrụ osisi a, ka Sandro kwuru, a gbara ọgwụ ahụhụ kwa izu abụọ. Taa, n’ihi ụmụ ahụhụ na-eri ibe ha dị ka ébé na ụmụ ahụhụ ndị ọzọ, mkpa nke ịgba ọgwụ ahụhụ ebelatawo ruo ịbụ n’ọnwa abụọ ma ọ bụ atọ ọ bụla.

Ébé bụ nanị otu n’ime ọtụtụ ndị inyeaka na-abụghị ọgwụ nke ndị ọrụ ugbo na-atụkwasị obi. Aṅụ, ebu, nnụnụ, ududo, mbara, awọ, ịkpọ ole na ole, bụcha ndị agha na-arụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị e ji achịkwa ahụhụ. Ọbụna azụ̀ na-enye aka ịnọchi anya ọgwụ ahụhụ. N’ụzọ dị aṅaa?

Na China, ka onye nchọpụta bụ́ Xiao Fan, nke Ngalaba Ọrụ Ugbo na Nlekọta Oké Ọhịa dị na Nanking, n’Ógbè Kiangsu na-akọ, e belatara mkpa nke iji ọgwụ ahụhụ eme ihe mgbe a malitere ịzụ azụ̀ n’ugbo osikapa nwere idei mmiri. Ndị ọrụ ugbo na-ekegide eriri n’ihe ọkụkụ ndị ahụ ma na-adọgharị ha iji mee ka ụmụ ahụhụ ahụ daba n’ime mmiri. “Ọ na-adịrị azụ̀ ndị ahụ mfe iri ụmụ ahụhụ ahụ na-eri ihe ọkụkụ,” ka Fan na-akọwa, “n’ihi na ha na-eme ka ha anwụọla mgbe ha si n’osikapa ndị ahụ dapụ,”

Iji ọgwụ ahụhụ dị nta karị na-eme ihe na-eme ka ụmụ ahụhụ bara uru nwee ike ịdịgide ndụ. Ụmụ ahụhụ a na-enyere azụ̀ ndị ahụ na-eri ahụhụ aka ịlụso ụmụ ahụhụ ọgụ. N’ihi iji ihe ndị dị ndụ achịkwa ụmụ ahụhụ, ka Fan na-ekwu, a dịghị ejizi nnukwu ọgwụ ahụhụ ndị na-egbu egbu eme ihe. Ọ na-ekwukwasị na abamuru ahụ ike na nke gburugburu ebe obibi dị na ya pụtara ìhè.

N’eziokwu, ndị ọrụ ugbo na-anakwere usoro IPM n’ihi ọnọdụ akụ̀ na ụba kama ịbụ n’ihi njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha. E kwuwerị, ibelata ọgwụ ahụhụ ndị dị oké ọnụ ahịa na-eme ka a ghara imefu nnukwu ego, nke ahụ pụtakwara inweta uru ka ukwuu—nzube na-adọrọ adọrọ nke oge ya na-adịghị agafe agafe, nke ọha nwekwara mmasị na ya. Otú o sina dị, ọ bụrụ na inwekwu uru n’ụzọ ego na-edujekwa n’inwe ihe ọkụkụ nwere nsí dị ala ma na-ebelata mmebi nke gburugburu ebe obibi, usoro IPM na-abazirinụ ndị ọrụ ugbo na ndị na-eri ihe ha kọtara tinyekwara njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha, uru. Dị ka otu onye na-ekiri ihe na-aganụ si kwuo ya, ọ bụrụ na e jiri usoro IPM na-eme ihe “mmadụ nile ga-erite uru.”

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọgwụ ndị a kasị eji eme ihe bụ (1) ọgwụ ahụhụ, (2) ọgwụ ahịhịa, (3) ọgwụ ọrịa ihe ọkụkụ, na (4) ọgwụ òké. A kpọkwasịrị ụdị nke ọ bụla aha ihe ọ na-egbu.

[Igbe dị na peeji nke 23]

ỌGWỤ AHỤHỤ E KETARA EKETA

Ọ bụrụgodị na ndị ọrụ ugbo nile n’ụwa nile amalite taa jiri usoro e jikọrọ ọnụ maka ịchịkwa ụmụ ahụhụ mewe ihe, nsogbu ọgwụ ahụhụ agaghị agwụsị ma ọlị. Òtù Nri na Ọrụ Ugbo nke Mba Ndị Dị n’Otu (FAO) na-eme atụmatụ na e nwere ihe karịrị 100,000 tọn nke ọgwụ ahụhụ ndị fọdụrụnụ a kwakọbara ná mba ndị na-emepe emepe. “Ihe dị ukwuu n’ọgwụ ahụhụ ndị ahụ,” ka magazin bụ́ Our Planet, bụ́ nke Ihe Omume Òtù Mba Ndị Dị n’Otu Maka Gburugburu Ebe Obibi bipụtara na-ekwu, “bụ ndị fọdụrụ n’ọgwụ ahụhụ ndị e nwetara site ná nkwekọrịta inye aka.” Ọgwụ ahụhụ ndị a gụnyere ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke DDT na ọgwụ ahụhụ ndị ọzọ bụ́ ndị a na-ele anya ugbu a dị ka ihe mkpofu dị ize ndụ. Ọ bụrụ na e bupụghị ọgwụ ahụhụ ndị a e ketara eketa, ka Our Planet na-ekwu, “a pụrụ ịtụ anya inwe ọdachi.”

Otú ọ dị, ibupụsị ha ga-efu nnukwu ego. Ibupụ ọgwụ ahụhụ ndị e ketara eketa n’Africa nanị pụrụ ifu ihe dị ka $100 nde. Ònye ga-akwụ ya? Òtù FAO na-akpọku mba ndị bunyere ọgwụ ahụhụ ndị ahụ inye aka kwụọ ya. Ma, dị ka òtù FAO na-eme ka ọ pụta ìhè, “e kwesịkwara ịnweta enyemaka nke ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ọgwụ e ji arụ ọrụ ugbo, bụ́ ndị keere òkè ọtụtụ mgbe n’ibunye ha ọgwụ ahụhụ gabiga ókè ma ọ bụ n’ụzọ na-adịghị mkpa.” Otú ọ dị, ka ọ dị ugbu a, mba ndị a “ekwebeghị ịtụ ego maka ibupụsị ọgwụ ahụhụ ndị ochie ahụ.”

[Igbe dị na peeji nke 24]

Ihe Ọkụkụ Ndị E Megharịrị Emegharị—N’ihi Gịnị Ka E Ji Na-arụrụ Ya Ụka?

Nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ bụ ngwá ọgụ ọzọ e ji alụso ahụhụ ọgụ. Ka ihe ọmụma mmadụ nwere banyere otú molecule DNA si arụ ọrụ n’ime ihe dị ndụ na-aba ụba, ndị nchọpụta enwewo ike ijikọta iberibe DNA nke ụdị ihe ọkụkụ dị iche iche ma mepụta ihe ọkụkụ ndị nwere ihe ha ga-eji chebe onwe ha pụọ n’aka ụmụ ahụhụ.

Ọka bụ otu ihe atụ. Ndị ọkà n’ịgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa tinyere mkpụrụ ndụ ihe nketa si n’ebe ọzọ na DNA nke ọka. Mkpụrụ ndụ ihe nketa ahụ e tinyere etinye, n’aka nke ya, mepụtara protein na-egbu ụmụ ahụhụ. Nke ahụ mere ka e nwee ọka a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ya nke na-eguzogide ndị iro ya bụ́ ụmụ ahụhụ.

Otú o sina dị, ihe ọkụkụ ndị a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha na-akpata arụmụka. Ndị na-emegide ya na-ekwu na ha pụrụ ime ka ndị mmadụ daa ọrịa ma ọ bụ na ihe ọkụkụ ndị e megharịrị emegharị pụrụ ịghọ ahịhịa na-adịghị anwụ anwụ. Ụfọdụ ndị ọkà mmụta sayensị na-adọ aka ná ntị na ihe ọkụkụ ndị nwere mkpụrụ ndụ ihe nketa na-egbu ụmụ ahụhụ ga-eme ngwa ngwa ka ọgwụ ghara igbu ụmụ ahụhụ. “Anyị kwesịrị ịchịkwa ịnụ ọkụ n’obi anyị n’ihe banyere nkà ịgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa,” ka onye ọkà mmụta ndụ ụmụ ahụhụ bụ́ Berti dọrọ aka ná ntị. “Ì chetara ụdị obi ụtọ ndị mmadụ nwere n’afọ ndị 1950 mgbe e toro ọgwụ ahụhụ dị ka ihe bụ ọrụ ebube? Taa anyị mazi nke bụ́ eziokwu. Ọgwụ ahụhụ ndị bụ nnọọ ọrụ ebube emewo ka e nwee ụmụ ahụhụ ọgwụ na-adịghị egbu. Ònye makwanụ nsogbu ndị ihe ọkụkụ ndị pụrụ iche nke taa a gbanwere mkpụrụ ndụ ihe nketa ha ga-akpata?”

Ọ bụrụgodị na a pụrụ idozi nsogbu nile metụtara ihe ndị dị ndụ, ụfọdụ ndị na-echegbu onwe ha banyere izi ezi nke ndị ọkà mmụta sayensị imegharị ụkpụrụ ihe nketa. Ụfọdụ na-eche na nkà na ụzụ banyere ihe ndị dị ndụ pụrụ idozi nsogbu ochie nke ọgwụ ahụhụ ma n’aka nke ọzọ wetara anyị nsogbu ọzọ metụtara ụkpụrụ.

[Foto dị na peeji nke 25]

Otu ébé nwere ike iri ọtụtụ narị ụmụ ahụhụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya