Echiche nke Bible
Ibinye na Ibiri Ego n’Etiti Ndị Enyi
“ONYE NA-EMEBI IWU NA-EBIRI IHE, MA Ọ DỊGHỊ AKWỤGHACHI: MA ONYE EZI OMUME NA-EME AMARA, NA-ENYEKWA ENYE.”—ABỤ ỌMA 37:21.
“ABỤLA onye mbiri ma ọ bụ onye mbinye; n’ihi na mgbe mgbe ego e binyere ebinye na-efu, enyi na-akwụsịkwa.” Otú ahụ ka onye England na-ede egwuregwu, bụ́ William Shakespeare, dere, na-ekwughachi okwu amamihe nọteworo aka. N’eziokwu, e nwere ihe ole na ole ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya pụrụ ịkpata esemokwu dị ka ibiri na ibinye ego. Ọbụna mgbe e nwere atụmatụ ndị kasị mma na nzube kasị mma ihe adịghị agacha dị ka a tụrụ anya ha.—Eklisiastis 9:11, 12.
Ọnọdụ ndị ga-eme ka o siere onye biiri ego ike ma ọ bụ ka ọ ghara ikwe ya omume ịkwụ ụgwọ o ji pụrụ ibilite. Ma ọ bụ onye ahụ binyere ebinye pụrụ ịhụ onwe ya na mberede ka ego ahụ o binyere dị ya mkpa. Mgbe ihe ndị dị otú ahụ mere, dị ka Shakespeare kwuru, ọbụbụenyi na mmekọrịta pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ.
Otú ọ dị, mmadụ pụrụ inwe ezi ihe ndị mere o ji biri ego. N’ịbụ onye nsogbu ego chere ihu bụ́ nke ihe ọghọm dị oké njọ ma ọ bụ enwekwaghị ọrụ kpatara, ọ pụrụ ịhụ ya dị ka nanị ihe ọ pụrụ ime. Bible na-agba ndị pụrụ inyere ndị nọ ná mkpa aka ume mgbe ha nwere ike ka ha mee otú ahụ. (Ilu 3:27) Nke a pụrụ ịgụnye ibinye ego. Otú ọ dị, olee otú ndị Kraịst tinyere aka ná ndokwa dị otú ahụ kwesịrị isi lee ibu ọrụ ha anya?
Ụkpụrụ Ndị A Ga-atụle
Bible abụghị akwụkwọ na-enye nduzi n’ihe banyere ego. O kwughị ihe nile ibiri ma ọ bụ ibinye ego pụrụ ịgụnye. Okwu ndị dị ka ma à ga-anara ọmụrụ nwa ma ọ bụ na a gaghị anara na ego ole a ga-anara dịịrị ndị o metụtara.a Otú ọ dị, ihe ndị Bible kwuru bụ ụkpụrụ ndị doro anya, ndị na-egosi ịhụnanya bụ́ ndị kwesịrị ịchịkwa omume na akparamàgwà nke onye ọ bụla na-ebiri ma ọ bụ na-ebinye ego.
Tụlee ụkpụrụ ndị metụtara onye na-ebiri ego. Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume ka ha ghara ‘iji onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe ha n’anya.’ (Ndị Rom 13:8) Ọ bụ ezie na Pọl na-enye ụkpụrụ metụtara ọtụtụ ihe n’ebe a, a pụrụ iwere ndụmọdụ ya n’ezie dị ka ịdọ aka ná ntị megide iji ụgwọ. Mgbe ụfọdụ ọ na-aka mma ka mmadụ ghara inwe ihe ụfọdụ kama iji onye ọzọ ụgwọ. N’ihi gịnị? Ilu 22:7 na-akọwa na “ohu ka onye na-ebiri ego bụrụ onye mbinye.” Onye biiri ego aghaghị ịghọta na ya nwere ibu ọrụ ruo mgbe ọ kwụghachiri ego ahụ. N’ụzọ bụ́ isi, ihe ndị o nwere abụchaghị nke ya. Ịkwụ ụgwọ o ji dị ka ihe ndị e kwekọrịtara si dị aghaghị ịbụ ihe ga-ebute ụzọ ná ndụ ya, ma ọ bụghị ya nsogbu ga-ebilite.
Dị ka ihe atụ, ka oge na-aga ma a kwụghachighị ego ahụ mgbe kwesịrị ekwesị, onye binyere ego ahụ pụrụ iwe iwe. Onye binyere ego pụrụ inyowe ihe ndị onye biiri ego na-eme enyo dị ka ịzụ ákwà, iri ihe n’ụlọ nri, ma ọ bụ ịga ezumike. Iwe pụrụ ịmalite. Mmekọrịta dị n’etiti ha, ọbụnakwa nke dị n’etiti ezinụlọ ha pụrụ ịbụ nke e mebiri ma ọ bụ ka njọ. Ihe ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe mwute ndị na-esi na ya apụta ma ọ bụrụ na onye biiri ego emeghị ihe o kwuru.—Matiu 5:37.
Ma gịnị ma ọ bụrụ na na mberede ọnọdụ karịrị onye ahụ biiri ego egbochie ya imezu nkwa ya? Nke a ọ̀ ga-akagbu ụgwọ ahụ? Ọ bụchaghị otú ahụ. Ọbụ abụ ahụ kwuru na onye ezi omume ‘aṅụwo iyi nke ga-emejọ ya onwe ya, ma ọ dịghị agbanwe okwu ya.’ (Abụ Ọma 15:4) N’ọnọdụ dị otú ahụ, ihe a ga-eme nke na-egosi ịhụnanya, nke amamihe dịkwa na ya ga-abụ onye ahụ biiri ego ịkọwara onye ahụ binyere ya ego ọnọdụ ahụ ozugbo. Mgbe ahụ ha pụrụ ikwekọrịta ná ndokwa ọzọ. Nke a ga-eme ka udo dị, ọ ga-atọkwa Jehova Chineke ụtọ.—Abụ Ọma 133:1; 2 Ndị Kọrint 13:11.
N’eziokwu, mmadụ na-ekpughe ihe dị ukwuu banyere onwe ya site n’ụzọ o si eme omume n’ihe banyere ụgwọ o ji. Àgwà ọ gbasara m n’ihe banyere ịkwụghachi ụgwọ na-egosi echebaraghị ndị ọzọ echiche. Dị ka a pụrụ ikwu ya, onye nwere àgwà dị otú ahụ na-egosi ịchọ ọdịmma onwe onye nanị—ọ na-ebute ọchịchọ ya ụzọ. (Ndị Filipaị 2:4) Onye Kraịst nke kpachaara anya ma mara ụma jụ ịkwụ ụgwọ o ji na-etinye nguzo ya n’ebe Chineke nọ n’ihe ize ndụ, omume ya pụkwara igosi na o nwere anyaukwu na obi ọjọọ.—Abụ Ọma 37:21.
Onye Mbinye
Ọ bụ ezie na ibu ọrụ ka ukwuu dịịrị onye na-ebiri ego, e nwekwara ụkpụrụ ndị na-emetụta onye mbinye. Bible na-egosi na ọ bụrụ na anyị pụrụ inyere ndị nọ ná mkpa aka, anyị kwesịrị ime otú ahụ. (Jemes 2:14-16) Ma nke ahụ apụtaghị na iwu ji mmadụ ibinye mmadụ ego, ọ bụrụgodị na onye na-achọ ya bụ nwanna n’ime mmụọ. “Onye nwere ezi uche ahụwo ihe ọjọọ, wee zobe onwe ya,” ka Bible na-ekwu.—Ilu 22:3.
N’ịmata ma ghọta nsogbu ndị dị kpọmkwem n’ibinye na ibiri ego, onye nwere nghọta ga-eji nlezianya tụgharịa uche n’arịrịọ ọ bụla a pụrụ ịrịọ ya maka ibinye ego. Arịrịọ ahụ ò kwesịrị ekwesị? Onye ahụ na-arịọ arịrịọ ahụ ò chewo echiche nke ọma banyere ya? Onye ahụ chọrọ ibiri ego ọ̀ na-eme ihe n’ụzọ dị n’usoro ma bụrụ onye nwere aha ọma? Ọ̀ dị njikere ịbịanye aka n’akwụkwọ e depụtara ihe ndị unu kwekọrịtara? (Tụlee Jeremaịa 32:8-14.) Ọ̀ dị njikere n’ezie ịkwụghachi ego?
Nke a abụghị ikwu na onye Kraịst kwesịrị ịjụ ibinye onye nọ ná mkpa ego bụ́ onye yiri ka ọ gaghị akwụghachi ego ahụ. Ibu ọrụ onye Kraịst nwere n’ebe ndị ọzọ nọ abụghị nanị n’achụmnta ego ziri ezi. “Onye ọ bụla nke nwere ihe ụwa nke a o ji biri, nke hụkwara nwanna ya ka ọ nọ ná mkpa, o wee mechigide ya obi ebere ya, ịhụnanya Chineke si aṅaa dịgide n’ime ya?” ka Jọn onyeozi na-ajụ. Ee, ndị Kraịst aghaghị igosi ‘ịhụnanya, ọ bụghị n’okwu ọnụ ma ọ bụ n’ire: kama n’ọrụ na eziokwu.’—1 Jọn 3:17, 18.
N’ọnọdụ ụfọdụ mmadụ pụrụ ikpebi na ya agaghị ebinye nwanna ya nọ ná mkpa ego. Ọ pụrụ ịhọrọ inye ya onyinye ma ọ bụ inyere ya aka n’ụzọ ọzọ. Ná mmụọ yiri nke ahụ, mgbe nsogbu bilitere n’ihe banyere ibinye ego, onye mbinye pụrụ ịhọrọ ime ebere. Ọ pụrụ ịchọ ichebara ọnọdụ gbanwere agbanwe nke onye ahụ biiri ihe echiche ma nyekwuo ya oge iji kwụọ ya, sepụrụ ya ego, ma ọ bụ ọbụna kagbuo ụgwọ ahụ kpam kpam. Ndị a bụ mkpebi onwe onye nke onye ọ bụla na-aghaghị imere onwe ya.
Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche na Chineke na-ahụ ihe nile, ọ ga-ajụkwa anyị ajụjụ maka otú anyị si eme omume ma jiri ihe onwunwe anyị na-eme ihe. (Ndị Hibru 4:13) Ndụmọdụ Bible bụ́ ka anyị ‘mee ihe anyị nile n’ịhụnanya’ n’ezie metụtara ibinye na ibiri ego n’etiti ndị enyi.—1 Ndị Kọrint 16:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma n’okwu banyere ịnara ọmụrụ nwa n’ego e binyere ebinye, biko lee mbipụta Ụlọ Nche nke October 15, 1991, peji nke 25-28.
[Foto dị na peeji nke 22]
“Onye Na-agbanwe Ego na Nwunye Ya” (1514), nke Quentin Massys sere
[Ebe E Si Nweta Foto]
Scala/Art Resource, NY