M̀ Kwesịrị Ịrịọ Nwanna M Ka O Binye M Ego?
NWA Simon nke kasị obere na-arịa ọrịa ma chọọ ka e nye ya ọgwụ ngwa ngwa. Ma Simon bụ ogbenye ọnụ ntụ, ọ pụghịkwa ịkwụli ụgwọ ya. Gịnị ka ọ pụrụ ime? Onye Kraịst ibe ya aha ya bụ́ Michael nwere ego karịa ya. Ikekwe Michael ga-agbazinye ya ego ahụ. Otú ọ dị, n’ime obi ya, Simon maara na o yikarịghị ka ya ga-enwe ike ịkwụghachi ego ahụ.a
Mgbe Simon bịakwutere ya, Michael chere ọnọdụ amaghị nke a ga-eme ihu. Ọ ghọtara na o nwere mkpa n’ezie ma o nwere obi abụọ ma Simon ọ̀ ga-akwụghachili ego ahụ n’ihi na nanị inye ezinụlọ ya nri na-abụrụ ya ọgụ na mgba. Gịnị ka Michael kwesịrị ime?
N’ọtụtụ mba, ihe ndị mmadụ ji ebi ndụ pụrụ ifunahụ ha na mberede, ha abụrụzie ndị na-enweghị ego ma ọ bụ inshọransị iji kwụọ ụgwọ ọgwụ. Ego ụlọ akụ̀ na-ebinye nwere ike ọ gaghị adị ma ọ bụ dị nnọọ oké ọnụ. Mgbe ọnọdụ mberede bilitere, ibite ego pụrụ iyi nanị ihe ngwọta dịnụ. Otú ọ dị, tupu a rịọ maka mbinye ego, e nwere okwu ụfọdụ ndị dị mkpa a ga-atụle.
Gụkọọ Ihe Ọ Ga-efu
Akwụkwọ Nsọ na-enye ma onye na-agbazinye agbazinye ma onye na-agbaziri agbaziri ụkpụrụ nduzi. Site ịgbaso ndụmọdụ a, anyị pụrụ izere ọtụtụ nghọtahie na mkpasu iwe.
Dị ka ihe atụ, Bible na-echetara anyị na anyị ekwesịghị ile okwu banyere mgbaziri ego anya n’ụzọ dị mfe. Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst nọ na Rom ume, sị: “Unu ejila onye ọ bụla ụgwọ ọ bụla, ma ọ bụghị ịhụrịta onwe unu n’anya: n’ihi na onye na-ahụ mmadụ ibe ya n’anya edebezuwo iwu.” (Ndị Rom 13:8) Dị ka o kwesịrị ịdị, nanị ụgwọ onye Kraịst kwesịrị iji ndị ọzọ bụ ịhụnanya. N’ihi ya, anyị pụrụ ibu ụzọ jụọ onwe anyị, sị, ‘Mbite ego a ọ̀ dị mkpa n’ezie?’
Ọ bụrụ na azịza ya bụ ee, mgbe ahụ ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịtụle ihe ndị na-esi n’ịba n’ụgwọ apụta. Jisọs Kraịst gosiri na mkpebi ndị dị mkpa chọrọ iche echiche na ime atụmatụ nke ọma. Ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya: “Ònye n’ime unu, nke na-achọ iwu ụlọ elu, na-ebughị ụzọ nọdụ ala gụọ ego ọ ga-ewe, ma o nwere ego ọ ga-eji rụzuo ya?” (Luk 14:28) Ụkpụrụ a metụtara mgbe anyị na-atụle ma anyị ga-arịọ nwanna ka o binye anyị ego. Ịgụkọ ihe mbite ego ga-ewe pụtara ịgụkọ otú na mgbe anyị ga-akwụghachi ya.
Ọ bụ ihe ruuru onye na-ebinye ego ịma otú na mgbe a ga-akwụghachi ego mbinye ahụ. Site n’ịtụle ihe nke ọma, anyị ga-enwe ike inye ya azịza ndị kwụ ọtọ. Ànyị agụkọwo ihe ọ ga-efu ịkwụghachi ego mbinye ahụ n’oge kwesịrị ekwesị? N’ezie, ọ ga-adị mfe karị ịgwa nwanna anyị, sị: “M ga-akwụghachi gị ngwa ngwa o kwere mee. Ị manụ na ị pụrụ ịtụkwasị m obi.” Ma ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime ihe banyere okwu ndị dị otú ahụ n’ụzọ iji ihe akpọrọ ihe karị? Anyị aghaghị ikpebisi ike site ná mmalite ịkwụghachi ego mbinye ahụ, ebe nke ahụ bụ ihe Jehova na-achọ n’aka anyị. “Onye na-emebi iwu na-ebiri ihe, ma ọ dịghị akwụghachi,” ka Abụ Ọma 37:21 na-ekwu.
Site n’ịgụkọ otú na mgbe anyị ga-akwụghachi ego mbinye ahụ, anyị na-echetara onwe anyị banyere nkwa siri ike anyị na-ekwe. Nke a na-ebelata ohere na anyị ga-eji ụgwọ n’ụzọ na-enweghị isi. Ọ bụrụ na anyị pụrụ izere ịba n’ụgwọ, e nwere abamuru ndị dị na ya. Ilu 22:7 na-adọ aka ná ntị, sị: “Ohu ka onye na-ebiri ego bụụrụ onye mbinye.” Ọbụna mgbe ma onye na-agbazinye agbazinye ma onye na-agbaziri agbaziri bụ ụmụnna ime mmụọ, ego mbinye pụrụ imetụta mmekọrịta ha, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo n’ókè ụfọdụ. Ọbụna nghọtahie banyere ego mbinye akpaghasịwo udo nke ọgbakọ ụfọdụ.
Kọwaa Ihe Mere I Ji Chọọ Ego Ahụ
Ọ bụ ihe ruuru onye na-agbazinye ego ịmara n’ụzọ bụ́ isi otú anyị gaje isi jiri ego ahụ anyị gbaziiri mee ihe. E wezụga ego mbinye a, ànyị na-agbazitekwa ego n’aka ndị ọzọ? Ọ bụrụ otú ahụ, anyị kwesịrị ime ka nke a doo anya, n’ihi na ọ ga-ekpebi ma anyị nwere ike ịkwụghachi ego mbinye ahụ.
Ọ dị mkpa karịsịa igosi ọdịiche dị n’etiti ego a na-ebiri maka achụmnta ego na nke mmadụ chọrọ iji mee ihe maka ọnọdụ mberede ụfọdụ. Nwanna enweghị ibu ọrụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ ịgbazinye ego maka achụmnta ego, kama o yikarịrị ka ọ ga-achọ inye aka ma ọ bụrụ na nwanna ọzọ, n’ihi ihe ọ na-abụghị ya kpatara, enweghị ike ịkwụ ụgwọ ihe ndị dị mkpa bụ́ isi dị ka nri, uwe, ma ọ bụ nlekọta ahụ ike dị mkpa. Ịkpọ ihe aha kpọmkwem na ikwu eziokwu n’okwu ndị a ga-enye aka igbochi nghọtahie.—Ndị Efesọs 4:25.
Deenụ Ya Ede
Ihe e dere ede nke nkwekọrịta ahụ bụ nzọụkwụ dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị ga-ezere nghọtahie n’ọdịnihu. Ọ dị mfe ichefu ihe ndị bụ́ isi nke nkwekọrịta ọ gwụlakwa ma e dere ha ede. Ọ dị anyị mkpa idetu ego ole a gbaziiri na mgbe a ga-akwụghachi ya. Ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ka ma onye na-agbazinye agbazinye ma onye na-agbaziri agbaziri bịanye aka ná nkwekọrịta ahụ nakwa ka onye ọ bụla n’ime ha debe otu. Bible na-egosi na mmekọrịta metụtara ego kwesịrị ịbụ nke e deturu n’akwụkwọ. N’oge na-adịghị anya tupu ndị Babilọn ebibie Jerusalem, Jehova gwara Jeremaịa ka ọ zụta otu ibé ala site n’aka otu n’ime ndị ikwu ya. Anyị pụrụ irite uru site ná ntụleghachi banyere otú o siri gaa.
“M wee zụrụ ubi ahụ n’aka Hanamel nwa nwanne nna m, bụ́ nke dị n’Anatọt,” ka Jeremaịa sịrị. “M wee tụọrọ ya ego ya, bụ́ shekel iri na asaa nke ọlaọcha. M wee dee aha m n’akwụkwọ ala ahụ, kaa ya akara, kpọọ ndị àmà, tụọrọ ya ego ahụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. M wee were akwụkwọ nzụta ala ahụ, ma nke a kara akara, nke ihe ya e nyere n’iwu na ụkpụrụ ya nile dị n’ime ya, ma nke ghere oghe: m wee were akwụkwọ nzụta ala ahụ nye Beruk nwa Neraịa, nwa Mahseịa, n’anya Hanamel nwa nwanne nna m, na n’anya ndị àmà ndị deworo aha ha n’akwụkwọ nzụta ala ahụ, n’anya ndị Juu nile ndị na-anọdụ ala n’ogige ụlọ nche ahụ.” (Jeremaịa 32:9-12) Ọ bụ ezie na ihe atụ a e kwuru n’ebe a metụtara ịzụrụ ihe kama ịbụ ibinye ego, ọ na-egosi mkpa ọ dị ime ihe ndị metụtara ego n’ụzọ doro anya, ma guzo kwem.—Lee Ụlọ Nche, (Bekee) May 1, 1973, peji nke 287-288.
Ọ bụrụ na ihe isi ike ebilite, ndị Kraịst kwesịrị ịgbalị idozi ha n’ụzọ kwekọrọ na ndụmọdụ Jisọs e dekọrọ na Matiu 18:15-17. Ma otu okenye gbalịworo inye aka n’okwu ndị dị otú ahụ na-ekwu, sị: “N’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile, e nweghị nkwekọrịta e dere ede. N’ihi ya, e nweghị nghọta doro anya n’etiti òtù abụọ ahụ banyere otú a ga-esi akwụghachi ego mbinye ahụ. Ekwenyesiri m ike na ide okwu ndị a ede bụ ihe àmà nke ịhụnanya, ọ bụghị nke atụkwasịghị obi.”
Ozugbo anyị nweworo nkwekọrịta, anyị kwesịrị n’ezie ịgbalisi ike imezu ihe anyị kwuru. Jisọs gbara ume, sị: “Ma ka okwu unu bụrụ, Ee, ee; Ee e, ee e: ma ihe ọ bụla karịrị ndị a na-esite n’ajọ onye ahụ.” (Matiu 5:37) Ọ bụrụ na nsogbu ndị a na-ebughị ụzọ hụ egbochie anyị ịkwụghachi ego mbinye ahụ dị ka e mere ndokwa ya, anyị kwesịrị ịkọwara onye gbazinyere anyị ego ahụ banyere ọnọdụ ahụ ozugbo. Ikekwe ọ ga-ekwe ka anyị kwụghachi ego mbinye ahụ ntakịrị ntakịrị ruo oge katụ ogologo.
Ma, ọnọdụ ndị na-adịghị mma adịghị enye anyị ihe ngọpụ n’ibu ọrụ anyị. Onye na-atụ egwu Jehova na-eme ike ya nile imezu okwu ya. (Abụ Ọma 15:4) Ọ bụ ezie na ihe nwere ike ghara ịdị otú anyị tụrụ anya ya, anyị kwesịrị ịdị njikere ịchụ àjà ụfọdụ iji kwụọ ụgwọ anyị ji, ebe ọ bụ na nke ahụ bụ ibu ọrụ ndị Kraịst anyị.
Kpachapụ Anya Banyere Ịgbazinye Ego
N’ezie, ọ bụghị nanị onye na-agbaziri ego ka ọ dị mkpa ịtụle ihe nke ọma. Nwanna a rịọrọ maka ego mbinye kwesịkwara ịgụkọ ihe ọ ga-efu. Tupu anyị agbazinye ego, anyị ga-abụ ndị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị ewepụta oge ịtụle okwu ahụ nke ọma na n’ụzọ ziri ezi. Bible na-agba ume ka a kpachapụ anya, na-asị: “Abụla otu n’ime ndị ga-anara mmadụ n’aka, abụkwala otu n’ime ndị nọ ná mbé banyere ụgwọ dị iche iche.”—Ilu 22:26.
Tupu i tinye onwe gị na ya, tụlee ihe pụrụ ime ma ọ bụrụ na nwanna ahụ enweghị ike ịkwụghachi gị ego ahụ. Ị̀ ga-enwezi nsogbu ego dị ukwuu n’onwe gị? Ọ bụ ezie na nwanna ahụ pụrụ inwe nnọọ ezi ebumnobi, ọnọdụ pụrụ ịgbanwe ma ọ bụ atụmatụ ndị o mere pụrụ ịkụ afọ n’ala. Jemes 4:14 na-echetara anyị nile, sị: “Unu bụ ndị na-amataghị ihe ga-eme echi. Ndụ unu bụ gịnị? N’ihi na unu bụ alụlụ, nke na-apụta ìhè nwa oge, e mesịa o wee pụọ n’anya.”—Tụlee Eklisiastis 9:11.
Karịsịa n’ihe banyere ego mbinye maka achụmnta ego, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịtụle àgwà e ji mara onye ahụ na-agbaziri ego. À maara ya dị ka onye a pụrụ ịtụkwasị obi na onye a pụrụ ịdabere na ya, ka ọ̀ bụ na o rughị eru n’ịchịkwa okwu metụtara ego? Ò nwere àgwà nke ịdị na-agagharị n’ọgbakọ na-arịọ ndị dị iche iche ego? Ọ bụ ihe amamihe dị na ya iburu okwu ndị a n’uche: “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.”—Ilu 14:15.
Mgbe ụfọdụ, ego mbinye nwekwara ike ghara ịbara onye ahụ gbaziiri ya uru. Ọ pụrụ ịghọ ibu arọ nye ya n’ụzọ dị mfe, na-anapụ ya ọṅụ ya. Ànyị chọrọ ka nwanna dị otú ahụ ghọọ “ohu” anyị? Ego mbinye ọ̀ pụrụ imetụta mmekọrịta anyị, na-eweta ahụ erughị ala ma ọ bụ ọbụna mmechuihu ma ọ bụrụ na o nweghị ike ịkwụghachi ya?
Ọ bụrụ na e nwere ezi mkpa, ànyị pụrụ ịtụle inye onyinye karịa ibinye ego, ọ bụ ezie na ego ahụ pụrụ ịkatụ nta? Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume inwe ọmịiko mgbe anyị hụrụ nwanna anyị ka ọ nọ ná mkpa. “Onye ezi omume na-eme amara, na-enyekwa enye,” ka ọbụ abụ ahụ bụrụ. (Abụ Ọma 37:21) Ịhụnanya kwesịrị ịkwali anyị ime ihe anyị pụrụ ime iji nyere ụmụnna nọ ná mkpa aka n’ụzọ dị irè.—Jemes 2:15, 16.
Tụlee Nzọụkwụ Ndị Ị Na-ewere nke Ọma
Ebe ọ bụ na ego mbinye pụrụ ịkpata esemokwu, anyị pụrụ ile ha anya dị ka ihe ikpeazụ anyị ga-eme karịa dị ka nhọrọ dị mfe. Dị ka e bu ụzọ kwuo, onye na-agbaziri ego kwesịrị ịkọwara onye na-agbazinye ya ego ihe n’ezoghị ọnụ, na-ede otú na mgbe ọ ga-akwụghachi ego mbinye ahụ ede. N’ọnọdụ ezi ihe isi ike, inye onyinye pụkwara ịbụ ihe ngwọta kasị mma.
Michael agbazinyeghị Simon ego ahụ ọ rịọrọ ya. Kama nke ahụ, Michael nyere ya ego katụ nta dị ka onyinye. Simon nwere ekele maka enyemaka dị otú ahụ maka ịkwụ ụgwọ ọgwụ nwa ya. Michael nwekwara obi ụtọ na ya nwere ike igosipụta ịhụnanya ụmụnna ya n’ụzọ dị irè. (Ilu 14:21; Ọrụ 20:35) Ma Michael ma Simon na-elepụ anya n’oge n’okpuru ọchịchị Alaeze ahụ, mgbe Kraịst “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya,” ọ dịghịkwa onye ga-asị, “Ana m arịa ọrịa.” (Abụ Ọma 72:12; Aịsaịa 33:24) Tupu mgbe ahụ, ka anyị tụlee nzọụkwụ anyị nke ọma ma ọ bụrụ na anyị enwee mkpa ịrịọ nwanna ka o binye anyị ego.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji aha nnọchianya mee ihe n’ebe a.
[Foto dị na peeji nke 25]
Ide nkwekọrịta ego mbinye ede bụ ihe àmà nke ịhụnanya, ọ bụghị nke atụkwasịghị obi