Ikiri Ụwa
Ise Siga Na-efu Ọtụtụ Ijeri Ego
Ọ bụ ezie na ọnụ ọgụgụ ndị na-ese siga na-ebelata n’ọtụtụ mba, o belatabeghị na Switzerland, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Berner Oberländer na-ekwu. Ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ atọ nke ndị bi n’ebe ahụ na-ese siga. Ihe karịrị mmadụ 8,000 na-anwụ kwa afọ bụ n’ihi ise siga—bụ́ ihe karịrị ndị ọrịa AIDS, heroin, cocaine, ọkụ, ihe mberede ụgbọala, igbu ọchụ, na igbu onwe onye na-egbu ma a gụkọta ha nile. Otu nnyocha nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ahụ Ike Ọha na Eze ná Mba ahụ mere na Switzerland gosiri na ihe ise siga furu ndị mmadụ na 1995 bụ ijeri franc iri nke ndị Switzerland, ihe karịrị ijeri dollar isii nke ndị United States. Nnyocha ahụ nwara ịgbakọ ihe ọ na-ewe iji lekọta ahụ ike na mmefu ụlọ ọgwụ, mfu nke mbelata nke ihe a na-arụpụta, mbelata nke ọdịdị ndụ nke ndị ọrịa na-ese siga na ndị ha na-azụ, na nhụjuanya nke ndị òtù ezinụlọ nke onye nwụrụ anwụ.
Chebe Obi Gị
“Ọ dịghị mgbe anyị na-amaghị na ọnọdụ ihu igwe na-ekposi ọkụ ike na-amụba ihe ize ndụ nke inwe nkụchi obi—ma ugbu a anyị amatala na ọnọdụ ihu igwe na-ajụ oyi na-emekwa otú ahụ,” ka Dr. Anthony Graham, bụ́ ọkà n’ọrịa obi na ọnụ na-ekwuchitere Òtù Na-ahụ Maka Obi na Ọrịa Strok n’Ontario, Canada, kwuru. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Globe and Mail, otu nnyocha were afọ iri e mere ndị ikom 250,000 nọ na France na-egosi na ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ nke ji degree iri dị elu ma ọ bụ dalata karịa otú o kwesịrị “na-eji pasent 13 amụba ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa nkụchi obi na nke mbụ ya.” Mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ dalatara, obi na-arụsi ọrụ ike karị ma na-arụ ọrụ ngwa ngwa karị n’ihi na ọbara na-esi n’akpụkpọ ahụ eruba n’ime ime ahụ iji chekwaa okpomọkụ. Ihe ize ndụ ahụ na-arị elu mgbe ndị mmadụ na-adọgbubiga onwe ha ókè n’ọrụ ma ọ bụ mgbe ha na-eyighị uwe kwesịrị ekwesị. Dr. Graham na-adọ aka ná ntị, sị: “Ị pụghị ịnọ na-ekiri TV oge nile ruo ọnwa ise ma bilie ozugbo ije kupụ snow n’oyi. Ị ghaghị ịkwadebe ahụ gị maka ya.”
Iji Egwú Na-ada Oké Ụda Egbochi Ihe A Na-achọghị
N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị ndị dọkịta na-adọ na egwú na-ada oké ụda “na-emetụta ahụ dum n’ụzọ dị njọ,” ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị na-eto eto yiri ka ha apụghị ịnọ n’ebughị ntakịrị ngwá egwú stereo ha, ka magazin ndị Poland a na-ebipụta kwa izu bụ́ Przyjaciółka, na-akọ. Gịnị na-akpata ya? Ụfọdụ na-eji ntakịrị ngwá egwú stereo eme ihe “ka uche ha ghara ịdị n’ihe na-eme gburugburu ha. Mgbe onye nọ n’afọ iri na ụma kwụnyere ihe a na-akwụnye ná ntị́, ọ gaghị anụkwa mba ndị mụrụ ya na-abara ya mgbe nile, nke o ji emeghachikwanụ omume, dị ka ihe atụ, mgbe ha gwara ya ka o mee otu ihe,” ka akwụkwọ ahụ na-ekwu. Ka ọ na-ekwu na egwú na-ada oké ụda pụkwara ịkpata “ike ọgwụgwụ, isi ọwụwa, etinyechaghị uche n’ihe, ma ọ bụ ehighị ụra nke ọma,” Przyjaciółka adịghị atụ aro ka ndị nne na nna machibido ha iji ntakịrị ngwá egwú stereo eme ihe kama ọ na-atụ aro ka ndị nne na nna kụziere ụmụ ha ịghara iji ya eme ihe gabiga ókè. “Naratụ ụmụ gị ntakịrị ngwá egwú ahụ site n’oge ruo n’oge,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ na-atụ aro ya. “Ọ ga-eme ka ha kwụsịtụ iji ihe ahụ a na-akwụnye ná ntị eme ihe, ị ga-abịa mara otú ọ na-adị.”
Mkpochapụ Asụsụ
“Mgbe ụfọdụ m na-ewesa onwe m iwe n’ihi na akụzirighị m ụmụ m asụsụ m,” ka Chiifu Marie Smith Jones, bụ́ onye ikpeazụ ná ndị obodo ya nke sụrụ asụsụ ndị Eyak, nọ n’Alaska, na-ekwu. Ihe na-eme ugbu a na-egosi na a pụrụ ikpochapụ ihe nọ n’agbata pasent 40 na 50 n’ime asụsụ 6,000 e mere atụmatụ ya a na-asụ n’ụwa nile n’ime narị afọ ọzọ. Australia, nke nwere asụsụ 250 n’otu oge, adalataworị ruo ihe dị ka 20. N’ihi gịnị ka nke a ji na-eme? Magazin bụ́ Newsweek na-ekwu na “mgbasa nke asụsụ Bekee na asụsụ ‘ukwu’ ndị ọzọ na-eme ka e chezọọ asụsụ dị iche iche.” Prọfesọ Stephen Wurm, bụ́ editọ nke Atlas of the World’s Languages in Danger of Disappearing, nke Òtù Mmụta, Sayensị, na Ọdịbendị nke Mba Ndị Dị n’Otu, bipụtara na-agbakwụnye, sị: “A na-enwekarị nkwenkwe nke bụ́ na i kwesịrị ichezọ asụsụ ndị ‘dị obere,’ bụ́ asụsụ ndị ndị ka nta n’ọnụ ọgụgụ na-asụ, n’ihi na ha abaghị uru.”
Na-ekwusara Nwa Ọhụrụ Gị Okwu
Ikwusara ụmụ ọhụrụ okwu ruo ma ọ dịkarịa ala minit 30 kwa ụbọchị pụrụ ime ka ha nwekwuo ọgụgụ isi na nkà asụsụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Daily Telegraph nke London na-akọ. Ndị nchọpụta nyochara ụmụ ọhụrụ 140 dị ọnwa itoolu. A gwara ndị mụrụ ọkara n’ime ụmụaka ahụ otú kasị mma ha ga-esi na-ekwusara ụmụ ọhụrụ ha okwu, ebe a na-atụrụghị ọkara nke ọzọ aro ime otú ahụ. Mgbe afọ asaa gasịrị “nkezi ọgụgụ isi nke ìgwè [e kwusaara okwu] jiri otu afọ na ọnwa atọ karịa ìgwè nke ọzọ ahụ,” nkà asụsụ ha ‘kakwa nnọọ ukwuu,’ ka akụkọ ahụ na-ekwu. Onye na-eme nnyocha bụ́ Dr. Sally Ward kwenyere na ndị nne na nna taa anaghị ekwusachara ụmụ ọhụrụ ha okwu dị ka a na-eme n’oge gara aga n’ihi oké mgbanwe ndị e nwere n’ọha mmadụ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nne na-aga ọrụ, tepụ vidio anọchiwokwa anya mkparịta ụka n’ọtụtụ ebe obibi.
Izere Ọnụma Okporo Ụzọ
“E kwesịghị iji ndị ọkwọ ụgbọala chọgburu onwe ha n’okwu egwuri egwu,” ka otu aka ochie n’iji obere ụgbọala eme egwuregwu, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na magazin bụ́ Fleet Maintenance & Safety Report, na-adọ aka ná ntị. Ịnọrọ jụụ na izere ọnọdụ ndị dị njọ pụrụ inye aka ibelata ihe ize ndụ nke ọnụma okporo ụzọ. Ndị na-akwalite izere ihe ize ndụ na-atụ aro ndị a na-esonụ:
◼ Jiri nkwanye ùgwù na-akwọ ụgbọala mgbe nile.
◼ Zere ọkwọ ụgbọala na-achọ okwu ma ọ bụrụ na ị pụrụ ime otú ahụ n’ụzọ na-adịghị ize ndụ.
◼ Ya adịla mgbe ị ga-ama ọkwọ ụgbọala ọzọ aka site n’isochi ya oké nso n’azụ ma ọ bụ ịgbasikwu ike.
◼ Azaghachila omume iyi egwu, zerekwa ime ihe ndị a pụrụ ịghọtahie.
◼ Ekwela ka anya gị na ọkwọ ụgbọala iwe ji kụkọta.
◼ Akwụsịla iji baara ọkwọ ụgbọala ọzọ mba.
Mmerụ Ahụ na Ọnwụ Isikwopụ Afọ Ime Na-akpata
A na-esikwopụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ ime 500,000 na Mexico kwa afọ, ka Francisco Javier Serna Alvarado, bụ́ onyeisi nke Òtù Na-ahụ Maka Ahụ Ike na Ọrụ Ebere na Mexico City, na-ekwu. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ El Universal, pasent buru ibu n’ime ndị a na-akpata ọnwụ nne ahụ, ọtụtụ ndị ọzọ na-akpatakwa nsogbu siri ike na-achọ nlekọta ahụ ike na ọbụna inye àkwà n’ụlọ ọgwụ. Isikwopụ afọ ime na nzuzo bụ ihe nke atọ kasị akpata ọnwụ ndị nne na Mexico. Mgbe ụfọdụ, a na-eji ụzọ na-adịghị mma esikwopụ afọ ime—iji ihe ndị ọnụ ha pịrị apị eme ihe, ịṅụ ọgwụ ma ọ bụ ọgwụ mkpá akwụkwọ ndị na-esikwopụ afọ ime, ọbụna isi na stepụ tụda onwe onye. Ihe ndị na-esikarị na ya apụta na-agụnye “oké ọbara ọgbụgba, ndụpu nke akpa nwa, atụlighị ime, ibute ọrịa, na enwekwaghị akpa nwa,” ka akụkọ ahụ na-ekwu.
Mee Ka A Ghọta Ihe Ị Na-ekwu
N’agbanyeghị otú ozi gị dịruru ná mkpa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ agaghị achọ ịṅa gị ntị ma ọ bụrụ na otú i si ekwu okwu amasịghị ha, ka ọkachamara n’ihe banyere olu okwu bụ́ Dr. Lillian Glass, na-ekwu. Dị ka a kọrọ n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Citizen nke South Africa, iji olu dị ala ekwu ihe n’ụzọ na-ekweghị nghọta, ekwuzighị ihe, agbanweghị ụda olu, ikwu okwu ọsọ ọsọ, okwu rere ure, na ekweghị onye ọzọ tinye ọnụ ná mkparịta ụka na-emecha ka ndị na-ege ntị nwee nkụda aka. N’aka nke ọzọ, ndị mmadụ ga-aṅa ntị ma ị mụmụọ ọnụ ọchị iji mee ka ha tụsara ahụ, na-ekwu okwu n’ụzọ kwere nghọta na nwayọọ nwayọọ, na-ele ha anya n’anya, ma na-aṅa ntị nke ọma ka ha na-ekwupụta echiche ha n’anapụghị ha okwu n’ọnụ. “Chee echiche tupu i kwuo okwu,” ka isiokwu ahụ na-agbakwụnye, “ị ga-ejikwa obi ike na-ekwupụta ihe dị gị n’obi karị.”
Iribiga Nri Ókè Na-amụba Ihe Ize Ndụ nke Nsí Ihe Oriri
Ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa n’ihi iri ihe nje dị na ya na-adị elu karị ma ọ bụrụ na mmadụ na-eribiga nri ókè, ka Dr. Adolfo Chávez, nke Ụlọ Ọrụ Mba Na-ahụ Maka Iri Ihe nke Salvador Zubirán dị na Mexico, kwuru. Ọ na-ekwu na gastric juice dị n’afọ anyị na-egbu ụmụ obere nje na-adị n’ihe oriri anyị na-eri. Ma mgbe e risịrị nri gabiga ókè, ihe oriri ntụkwasị nke dị n’ime afọ na-akarị acid dị n’ime afọ, na-eme ka ikike afọ nwere igbu nje belata. Dr. Chávez gwara Teta! sị: “Ọ bụrụ na mmadụ erie meatroll 15, otu n’ime ha eburukwa nje, ikekwe onye ahụ ga-ebute nje ahụ n’ihi ole o riri. Ọ bụrụ na onye ahụ erie nanị otu meatroll bu nje, o nwere ike nsogbu agaghị adị.”
Ụkọ Ịchị Ọchị
Dị ka ihe àmà e wepụtara ná Nzukọ Mba Nile Maka Ịkpa Ọchị e nwere na Switzerland gosiri, n’afọ ndị 1950 e nwere nsogbu akụ̀ na ụba, nwoke ọ bụla chiri ọchị ruo minit 18 n’otu ụbọchị, ma e jiri ya tụnyere minit 6 a na-achịru ọchị n’otu ụbọchị n’afọ ndị 1990 e nwere ọnọdụ akụ̀ na ụba dị mma. N’ihi gịnị ka o ji belata? “Ndị ọkachamara na-asị na ọ bụ nchụso ihe onwunwe, ọrụ na ihe ịga nke ọma onwe onye kpatara omume ahụ, na-akwado otu ilu ochie bụ́ na ego apụghị ịzụta obi ụtọ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Sunday Times nke London na-ekwu. N’ihi ya, Michael Argyle na-ede akwụkwọ na-ekwubi, sị: “Ndị kasị eji ego akpọrọ ihe na-enwe afọ ojuju dị ala karị, ha na-arịakwa ọrịa uche karị. Nke a pụrụ ịbụ n’ihi na ego na-enye nanị ụdị afọ ojuju na-abụghị nke ezigbo ya.”
E Chebe Ikike Inweta Ọgwụgwọ
N’oge na-adịbeghị anya, Ụlọikpe Kasị Elu nke El Salvador kagburu iwu Ụlọ Ọgwụ Ọha na Eze guzobere bụ́ nke na-achọ ka ndị ọrịa nye ọbara tupu a gwọọ ha. N’oge gara aga, ụkpụrụ ime ihe nke ụlọ ọgwụ ahụ bụ na ndị ọrịa nile aghaghị inye unit ọbara abụọ tupu a waa ha ahụ. Ugbu a, ndị chọrọ ka a gwọọ ha n’Ụlọ Ọgwụ Ọha na Eze nwere ikike iwu kwadoro ịhọrọ ịghara inye ọbara.