Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 9/8 p. 3
  • Ọ̀ Bụ Njedebe nke Iyi Egwu Nuklia?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Bụ Njedebe nke Iyi Egwu Nuklia?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Iyi Egwu Nuklia Akwụsịbeghị Ma Ọlị
    Teta!—1999
  • Agha Nuklia—À Ka Na-atụ Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Agha Ọgwụrụ Mba?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 9/8 p. 3

Ọ̀ Bụ Njedebe nke Iyi Egwu Nuklia?

RUO ihe karịrị afọ 40, agha nuklia yiri ụwa egwu. Na 1989, Mgbidi Berlin dakasịziri—mmalite nke ọdịda nke Ọchịchị Kọmunist ndị Soviet. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, mba ndị bụ́ dike kwekọrịtara ịkwụsị ichere ibe ha aka ọgụ. Ebe o yiri ka “Amagedọn” a ga-eji nuklia lụọ ò biela, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ ka e yigharịrị ya eyigharị, ụwa kudara ume ndụ a tụwara anya ya eri ogologo oge.

Otú ọ dị, ọtụtụ ndị ọkachamara na-eche na ọ dị oké ngwa ịṅụrị ọṅụ. Na 1998 a hịgharịrị klọọkụ ụbọchị mbibi ahụ a ma ama nke akwụkwọ bụ́ The Bulletin of the Atomic Scientists ka o jiri minit ise gakwuo n’ihu, o wee fọdụ minit itoolu ka ọ kụọ elekere anya iri na abụọ nke etiti abalị—ihe àmà doro anya nke na-egosi na iyi egwu nuklia akwụsịbeghị.a N’eziokwu, ọnọdụ ụwa agbanwewo. Ọ bụghịzi mba abụọ bụ́ isi bụ ndị nwere ikike nuklia ha nhata. Ugbu a ọtụtụ mba nwere ikike nuklia! Ọzọkwa, ndị ọkachamara na-atụ egwu na ka oge na-aga òtù ndị na-eyi ọha egwu ga-enweta ihe na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu ma rụọ bọmbụ atọm na-esighị ike.

Ọzọkwa, United States na Russia ka nwere nkwakọba dị egwu nke bọmbụ nuklia, n’agbanyeghị oké mgbubilata e gbubilatara ha. Dị ka otu ìgwè ndị nnyocha a kpọrọ Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Metụtara Ngwá Agha Nuklia si kwuo, ugbu a e nwere ihe dị ka ngwá agha nuklia 5,000 ndị a pụrụ ịgbapụ mgbe ọ bụla. “Ya mere,” ka akụkọ ha na-ekwu, “ka ihe si kwụrụ ugbu a, ọ bụrụ na e nye iwu ka a gbapụ ha, 4,000 [mgbọ ogbunìgwè ndị na-esi n’otu kọntinent gaa n’ọzọ] (2,000 site n’akụkụ nke ọ bụla) pụrụ ịnọ n’ụzọ na-aga ebe a gbagara ha n’ime minit ole na ole, 1,000 ọzọ [mgbọ ogbunìgwè a na-esi n’ụgbọ okpuru mmiri agbapụ] pụkwara ịnọ n’ụzọ na-aga ebe a gbagara ha ngwa ngwa nke ahụ gasịrị.”

Ịdị adị nke nkwakọba ngwá agha a na-eme ka ọ bụrụ ihe pụrụ ime eme karị ịlụ agha mberede ma ọ bụ ọbụna nke a kara aka. “Ihe mberede dị njọ pụrụ itinye ụwa n’ọgba aghara nke oké mbibi nke ngwá agha nuklia, nke na-abụghị ihe ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị chọrọ,” ka onye Russia a ma ama bụ́ Vladimir Belous bụ́ ọkà n’ime atụmatụ, dọrọ aka ná ntị. Ya mere ọ bụ ezie na Agha Nzuzo ebiela, iyi egwu nke oké mgbukpọ nuklia akwụsịbeghị n’ezie. Ma ruo ókè hà aṅaa ka iyi egwu ahụ bururu ibu? Ọ̀ dị mgbe a ga-ewepụsị ngwá agha nuklia n’ụwa? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ihe ndị a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Klọọkụ ụbọchị mbibi dị n’ihu akwụkwọ bụ́ The Bulletin of the Atomic Scientists bụ ihe àmà na-egosi ihe e chere na ọ fọrọ ka ụwa ruo “etiti abalị” nke agha nuklia. Ruo ọtụtụ iri afọ, a hịgharịwo aka ogologo nke klọọkụ ahụ iji gosi mgbanwe a na-enwe n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Mgbawa bọmbụ ndị dị na peji nke 2 na nke 3: Foto U.S. National Archives

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya