Iyi Egwu Nuklia Akwụsịbeghị Ma Ọlị
“Mmụba nke ngwá agha ndị bụ́ ọkpọka bụ ihe ize ndụ kasị akpata egwu na-eche mbara ụwa a ihu ugbu a.”—CRITICAL MASS, NKE WILLIAM E. BURROWS NA ROBERT WINDREM DERE.
N’ISI ụtụtụ January 25, 1995, otu onyinyo na-agba àmà ihe ọjọọ pụtara na mberede n’ihu ígwè ọrụ radar na-adọ aka ná ntị n’ezi oge ndị dị n’ebe ugwu Russia. A gbapụwo otu rọket n’otu ebe ná mpụga ụsọ oké osimiri Norway! Ndị ji ígwè ọrụ radar ahụ na-arụ ọrụ mere ka Moscow mata banyere bọmbụ nuklia pụrụ ịdakwasị ha. N’ime minit ole na ole, e bunyere president ndị Russia otu igbe ngwá ọrụ electronics nke ga-eme ka o nwee ike inye iwu ka ha gbapụgwara ngwá agha nuklia na-ebibi ihe. O yiri ka agha nuklia doro anya ọ̀ fọrọ nanị nke nta ka o tiwapụ.
Dị ka ihe ndabara ọma, ha jidere onwe ha, a hụkwara na ụzọ rọket ahụ si gaa abụghị ihe iyi egwu nye Russia. E mesịrị mata na rọket ahụ bu ngwá ọrụ e ji enyocha ọnọdụ ihu igwe. N’agbanyeghị nke ahụ, otu isiokwu dị na The Washington Post kwuru, sị: “Ndị a gaara abụ ụfọdụ n’ime oge ndị kasị dị ize ndụ n’ọgbọ nuklia. Ha na-atụpenye anyị azụ̀ banyere otú usoro ịdị oké njikere maka ịgbapụ ngwá agha nuklia n’oge Agha Nzuzo si ka dịrị irè, na otú ọ pụkwara isi gahie ụzọ n’ụzọ ga-akpata mbibi, ọ bụ ezie na asọmpi banyere mba bụ́ dike ebiela.”
A Pụrụ Ịgbapụ Ha Mgbe Ọ Bụla
Ruo ọtụtụ iri afọ, ọnọdụ nuklia nke ma ebe bụbu Soviet Union ma United States dabeere n’echiche nke ịkwakọba ngwá agha iji menye ndị ọzọ egwu nke a maara dị ka mkpochapụrịta e ji n’aka (MAD). Otu akụkụ dị mkpa na MAD bụ atụmatụ a kpọrọ gbapụ ngwá agha ozugbo a hụrụ ihe àmà. Nke a mere ka mba nke ọ bụla mara nke ọma na ọ bụrụ na ya emee mwakpo, na ndị iro ya ga-awakpogwara ya n’ụzọ dị oké egwu ọbụna tupu bọmbụ ndị ahụ ọ gbapụrụ enwee ike iru n’ebe a gbagara ha. Akụkụ nke abụọ dị mkpa nke MAD bụ atụmatụ a na-akpọ gbapụ ngwá agha ozugbo e mere mwakpo. Nke a zoro aka n’ikike e nwere ịgbapụ ngwá agha iji megwara ọbụna mgbe bọmbụ ndị ahụ ndị iro gbapụrụ bibisiworo ihe.
N’agbanyeghị nkwụsị a kwụsịrị Agha Nzuzo, iyi egwu nke MAD ka na-echegbu ihe a kpọrọ mmadụ. Ee, e gbubilatawo nkwakọba ngwá agha nuklia nke United States na nke Russia nke ukwuu—ụfọdụ na-ekwu na ọ bụ ruo ọkara—ma ọtụtụ puku bọmbụ nuklia ka dị. Mgbe ahụ, ịgbapụ ngwá agha na mberede ma ọ bụ n’anataghị ikike pụrụ ikwe omume. Ebe ọ bụkwa na mba abụọ ahụ ka na-atụ egwu mba nke ọzọ ibu ụzọ mee mwakpo bụ́ nke na-eyighị ka ọ ga-eme, a hapụwo ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ogbunìgwè otú ọ ga-adị mfe ịgbapụ ha mgbe ọ bụla.
N’eziokwu, na 1994 United States na Russia kwekọrịtara ịkwụsị iji mgbọ ogbunìgwè echere ibe ha aka ọgụ. “Mgbanwe a, ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị mma, enwechaghị uru ọ bara n’ihe banyere agha,” ka magazin bụ́ Scientific American na-ekwu. “Ndị ọchịagha na-ahụ maka mgbọ ogbunìgwè pụrụ iji sekọnd ole na ole tinyeghachi ihe ndị na-ekpebi ebe e lekwasịrị anya n’ime kọmputa nke na-achịkwa ihe a gbapụrụ.”
À Ga-akpụpụta Ngwá Agha Ndị Ọhụrụ n’Isi Nso?
Ihe a na-agaghị elefuru anya bụ eziokwu ahụ bụ́ na ime nchọpụta banyere ngwá agha nuklia na ịkpụpụta ya na-aga n’ihu. Dị ka ihe atụ, na United States, atụmatụ mmefu ego a na-eme kwa afọ maka ngwá agha ndị dị otú ahụ bụ ihe dị ka ijeri $4.5! Na 1997, The Toronto Star kọrọ, sị: “N’ụzọ dị iche n’ihe e mere, ugbu a United States na-emefu ihe karịa otú o mefuru n’oge agha nzuzo n’ichekwa ngwá agha nuklia ya. A mawapụtakwara ụfọdụ n’ime ego ahụ maka atụmatụ ndị na-edoghị anya nke ndị nkatọ na-ekwu na ọ pụrụ iduba n’asọmpi mkpụpụta ngwá agha ọhụrụ n’ụwa nile.”
Dị ka ihe atụ, e nwere arụmụka dị ukwuu banyere atụmatụ ga-ewe ọtụtụ ijeri dollar nke gọọmenti United States mere bụ́ nke a kpọrọ Usoro Nlekọta na Nchekwa nke Ngwá Agha A Kwakọbara. Ọ bụ ezie na nzube nke usoro ahụ yiri ka ọ̀ bụ ilekọta ngwá agha nuklia ndị dị adị, ndị nkatọ na-ekwu na o nwere nzube dị njọ karị ọ na-emezu. Akwụkwọ bụ́ The Bulletin of the Atomic Scientists na-akọ, sị: “E nwere atụmatụ ndị e mere maka ịgbanwe, idozigharị, ime ha ka ha bụrụ ọgbara ọhụrụ, na idochi ha—ọ bụghị nanị ka ngwá agha nuklia ndị ahụ nọtekwuo aka . . . kamakwa iji ‘meziwanye’ ha.”
Na 1997 esemokwu dapụtara banyere mkpụpụta nke bọmbụ nuklia a kpọrọ B-61, nke nwere ikike ịbanye n’ime ala tupu ọ na-agbawa. Ya mere ọ pụrụ ibibi ụlọ ọrụ ndị ọchịagha, ụlọ mmepụta ihe, na ụlọ ime nnyocha ndị dị n’okpuru ala. Ọ bụ ezie na ndị na-akwado ya na-ekwu na ọ bụ nanị ịkpụgharị bọmbụ ochie, ndị na-emegide ya na-ekwu na ọ bụ bọmbụ ọhụrụ n’ezie—mmebi dị oké njọ nke nkwa gọọmenti United States kwere na ọ ga-akwụsị ịkpụpụta ngwá agha nuklia ndị ọhụrụ.
Ka o sina dị, Ted Taylor, bụ́ ọkà n’ihe ọmụmụ nuclear physics na Mahadum Princeton kwuru, sị: “Echere m na ụdị nnyocha na-aga n’ihu (na United States) ugbu a na-agakwa n’ihu na Russia, France, Germany na n’ebe ndị ọzọ, echekwara m na ụfọdụ n’ime atụmatụ anyị na-eduga ụwa n’asọmpi ọhụrụ nke ịkpụpụta ngwá agha.” Ndị nkatọ na-ekwukwa na ndị na-akpụpụta ngwá agha n’onwe ha na-akwalitesi nnyocha, nchepụta, na mkpụpụta nke ngwá agha ndị ọhụrụ ike. Ùgwù onwe onye e mebiri emebi, ùgwù na-adalata adalata, na ihe isi ike ego pụrụ ịbụ ihe siri ike na-akpali ndị ọkà mmụta sayensị ndị a nwere nkà ịkwalite ime nnyocha banyere ngwá agha.
Mba Ọhụrụ Ndị Nwere Ngwá Agha Nuklia
E nwekwara mgbanwe n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa. Kemgbe ụwa, ọ bụ mba ise mejupụtaburu òtù ndị nwere ngwá agha nuklia: Britain, China, France, Russia, na United States. Otú ọ dị, a ma ebe nile na mba ndị ọzọ akpụpụtawokwa ngwá agha nuklia. Dị ka ihe atụ, na nso nso a India na Pakistan mere nnwale ngwá agha nuklia bụ́ nke kpaliri ịtụ egwu maka oké asọmpi mkpụpụta ngwá agha n’Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia. Mba ndị ọzọ a na-enyo enyo na ha nwere atụmatụ inwe ngwá agha nuklia gụnyere Algeria, Iran, Iraq, na North Korea. Ihe karịrị mba 180 abịanyewo aka n’akwụkwọ Nkwekọrịta Igbochi Mmụba nke Ngwá Agha Nuklia, nke malitere ịdị irè na 1970. Ma ruo ugbu a, ọtụtụ mba a na-enyo enyo n’ebe nile na ha na-ezo ọchịchọ ha inweta ngwá agha nuklia ezo abịanyebeghị aka na ya.
Magazin bụ́ Asiaweek na-akọ, sị: “Ndị Ọkachamara na-ahụ banyere mmụba nke ngwá agha nuklia ka kwenyere na ihe iyi egwu e nwere n’ezie bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke mba ndị ndị ndú ha ga-enwe mmasị inwe ngwá agha nuklia.” Ụfọdụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ na-eche na Nkwekọrịta Igbochi Mmụba nke Ngwá Agha Nuklia agaghị enwe nnọọ ike ịkwụsị gọọmenti ndị chọsiri ike, n’agbanyeghị ntaramahụhụ ndị ọ ga-eweta, inweta nkà na ụzụ na ihe ndị dị ha mkpa iji kpụpụta ngwá agha nuklia na nzuzo. James Clapper, bụ́ onyeisi nke Ụlọ Ọrụ Na-enweta Ihe Ọmụma Nzuzo Banyere Nchebe nke United States, buru amụma, sị: “Ka ọ na-erule ngwụsị nke narị afọ a anyị pụrụ ịhụ ọtụtụ mba ndị nwere ikike nke isi n’ihe ndị ha nwere kpụpụta mgbọ ogbunìgwè ndị ha na ndị [e ji mmiri ọgwụ mee, ndị nwere nje na-akpata ọrịa, ma ọ bụ bọmbụ nuklia] ha nhata.”
O yighịkwa ihe ga-eme eme bụ́ mba nile iji n’ihi nrụgide machibido ịnwale ngwá agha nuklia iwu. Mgbe a ranyere ọtụtụ mba ịbịanye aka ná Nkwekọrịta Ịmachibido Ụdị Nnwale Nile nke Ngwá Agha na 1996, otu uche akwụkwọ akụkọ pụtara n’Asiaweek kwuru, sị: “Ọ dịịrị ndị America ma ọ bụ ndị Europe mma ikwusa ụkpụrụ mmachibido iwu megide ịnwale ngwá agha nuklia, ebe ha nwaleworo ngwá agha nuklia zuru ezu iji dabere n’ihe ọmụma ndị ha nwetaworo.”
Ibubata Ngwá Agha Nuklia na Nzuzo na Iyi Ọha Egwu
Ụfọdụ na-eche na iyi egwu kasị njọ bụ na ụfọdụ òtù ndị na-eyi ọha egwu pụrụ inweta ngwá agha nuklia ma kpebie ịgbawa—ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ yie egwu ịgbawa ha—iji nwee ike ịkwalite atụmatụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ha. A na-atụkwa egwu na n’otu aka ahụ, òtù ndị omekome pụrụ iji ihe ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu pụnara gọọmenti ma ọ bụ otu ụlọ ọrụ ihe dị ukwuu. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ Scientific American na-akọwa, sị: “Ọ ga-adịtụrụ onye ji ngwá agha nuklia eyi mmadụ egwu mfe ime ka e kwenye n’ihe ọ na-ekwu site idebetụ ụfọdụ maka ime nnyocha. Iyi egwu imetọ ikuku ma ọ bụ mmiri bụ́ nke ga-esochi, ma ọ bụ ọbụna ịgbapụ obere ngwá agha nuklia, pụrụ inwe mmetụta dị ukwuu.” Ụlọ ọrụ ndị na-ahụ na e debere iwu ekpugheelarị mgbalị ndị e mere ibubata ihe ndị e ji akpụpụta ngwá agha nuklia na nzuzo. Nke a na-eme ka a na-atụkwu egwu na òtù ndị omekome pụrụ n’ezie ịdị na-anwa ịkpụpụta ngwá agha nuklia.
N’eziokwu, ụfọdụ ndị na-eme nnyocha na-ekwu na ibubata ngwá agha nuklia na nzuzo bụ ihe iyi egwu dị nta. Ha na-ekwu na ọ bụghị nanị na o yiri ka ọ bụ obere ihe ndị e ji akpụpụta ngwá agha nuklia siworo n’aka fere n’aka, kama na e wezụga ole na ole, ihe ka ọtụtụ n’ime ha erughị ụdị e ji akpụpụta ngwá agha. Otú ọ dị, Scientific American na-echetara ndị na-agụ ya na “n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ahịa nzuzo nile, ọ bụ nanị akụkụ dị nta nke ihe na-aganụ ka a na-ahụ, e nweghịkwa ihe mere ahịa nzuzo nke ihe ndị e ji akpụpụta ngwá agha nuklia ga-eji pụọ iche. . . . Ikweta na ndị ọchịchị na-akwụsị ihe karịrị pasent 80 nke azụmahịa ahụ ga-abụ nzuzu. Ọzọkwa, ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta na-amịfere pụrụ ịkpata ihe ọjọọ dị egwu.”
Ọ bụ ezie na a na-ezochi ọ̀tụ̀tụ̀ ya kpọmkwem nke ọma, e mere atụmatụ na ọ na-ewe ihe nọ n’agbata kilogram 3 na 25 nke uranium a kwalitekwuru ọdịdị ya ma ọ bụ ihe nọ n’agbata 1 kilogram na 8 nke plutonium e ji akpụpụta ngwá agha, iji kpụpụta otu bọmbụ nuklia. N’ịbụrụ ndị na-azụ ahịa iwu ihe ọṅụ, kilogram asaa nke plutonium na-abanyecha n’ihe ha ka mkpọ mmanya ọtọ bịrịbịrị. Ụfọdụ na-eche na a pụrụ ọbụna iji ụdị plutonium e ji arụ ọrụ n’ebe a na-emepụta ike nuklia—nke dị mfe nnweta karịa nke e ji akpụpụta ngwá agha—kpụọ bọmbụ nuklia na-abụchaghị ọkpọka, ma bụrụ nke ka nwere ikike ibibi ihe. Ọ bụrụ na dị ka ọtụtụ ndị ọkachamara na-ekwu, e chebeghị ihe ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu ndị a kwakọbara nke ọma, a pụrụ izuru ha karịa otú ọtụtụ ndị maara. Mikhail Kulik, bụ́ onye ọrụ na Russia, kwuru n’ụzọ na-atọ ọchị, sị: “Ọ pụrụ ịbụ na a na-echebe ọbụna poteto nke ọma taa karịa ihe ndị na-ewepụta ụzarị na-egbu egbu.”
N’ụzọ doro anya, ihe ize ndụ nuklia, dị ka mmiri ruru eru, ka na-eyi ihe a kpọrọ mmadụ egwu. Ọ̀ dị olileanya e nwere na ọ dị mgbe a ga-ewepụ ya?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 8]
“Ndị ọkachamara na-ahụ banyere mmụba nke ngwá agha nuklia ka kwenyere na ihe iyi egwu e nwere n’ezie bụ ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke mba ndị ndị ndú ha ga-enwe mmasị inwe ngwá agha nuklia.”—Asiaweek
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 6]
Iyi Egwu nke Ngwá Agha Ndị Nwere Nje Ndị Na-akpata Ọrịa na Ndị E Ji Mmiri Ọgwụ Mee
Mba ndị na-alụkarị ọgụ bụ́ ndị dara ogbenye nke ukwuu nke na ha apụghị ịkpụpụta ngwá agha nuklia pụrụ iji mgbọ ogbunìgwè ndị na-adịghị agate aka bụ́ ndị nwere ikuku gas na-egbu egbu ma ọ bụ ngwá agha nwere nje ndị na-akpata ọrịa mee ihe. E nyewo ndị a aha bụ́ ngwá agha nuklia nwa ogbenye. N’ezie, ọtụtụ ndị na-eme nnyocha na-atụ egwu na ngwá agha ndị dị otú ahụ pụkwara ịghọrọ òtù ndị na-eyi ọha egwu ezi ngwá agha.
Otú ọ dị, ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa na ndị e ji mmiri ọgwụ mee pụrụ ibibi ihe ọbụna mgbe a na-ejighị usoro bụ́ ọkpọka e ji agbapụ ngwá agha gbapụ ha. Odeakwụkwọ nke Ụlọ Ọrụ Nchebe nke United States bụ́ William Cohen kwuru na November 1997, sị: “N’ihi nkà na ụzụ dịwanyere mma na ụwa nke usoro nzirịta ozi na ime njem n’ime ya na-adịwanye mfe, ikike ịkpatara ọtụtụ ndị ọrịa, ọnwụ, na mbibi taa eruwo ọ̀tụ̀tụ̀ dị oké elu karị. Otu nwoke ara na-agba ma ọ bụ òtù ndị na-anụbigara ihe ọkụ n’obi ókè nke nwere otu karama mmiri ọgwụ, ìgwè nje na-akpata mbibi, ma ọ bụ bọmbụ nuklia na-abụghị ọkpọka pụrụ iyi ọtụtụ iri puku mmadụ egwu ma ọ bụ gbuo ha n’otu omume obi ọjọọ.” E mere ka e kwere n’egwu ndị dị otú ahụ mgbe òtù nzuzo na-eyi ọha egwu jiri sarin, bụ́ mmiri ọgwụ na-akpata ahụ mkpọnwụ, wakpoo ndị na-eme njem n’ụzọ okpuru ala dị na Tokyo na March 1995. E gburu mmadụ 12 ma merụọ mmadụ 5,500 ahụ.
“Ọ bụrụ na iji mmiri ọgwụ mee mwakpo na-emenye egwu, ngwá agha ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa ka njọ,” ka prọfesọ nke nkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ́ Leonard Cole na-ekwu. “Mmiri ọgwụ bụ ihe na-adịghị ndụ, ma nje bacteria, nje virus na ihe ndị ọzọ dị ndụ pụrụ ịdị na-efe efe ma na-amụpụta ndị ọhụrụ. Ọ bụrụ na ha abata n’ógbè, ha pụrụ ịmụba. N’adịghị ka ngwá agha ọ bụla ọzọ, ha pụrụ ịdị ize ndụ karị ka oge na-aga.”
Ná mgbalị iji kwụsị mmụba nke ngwá agha ndị e ji mmiri ọgwụ mee na ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa, e tinyelarị Nkwekọrịta Megide Ngwá Agha Ndị Nwere Nje Ndị Na-akpata Ọrịa na Ndị Nwere Ihe Ndị Na-egbu Egbu nke 1972 na Nkwekọrịta Megide Ngwá Agha Ndị E Ji Mmiri Ọgwụ Mee nke 1993 n’ọrụ. Otú ọ dị, magazin bụ́ The Economist na-ekwu na n’agbanyeghị ezi nzube ndị dị otú ahụ, “ọ dịghị usoro nchịkwa ngwá agha zuru okè. . . . Ha apụghị ịchọpụtacha ịda iwu nile.” Otu magazin ahụ na-ekwu, sị: “Otú ọ dị, o yighịkwa ka ndị na-aghọ aghụghọ n’ezie ha ga-abịanye aka ná nkwekọrịta ahụ.”
[Foto]
Ndị na-ahụ na e debere iwu na-atụ egwu na ọ pụrụ ịdịrị ndị na-eyi ọha egwu mfe iji ngwá agha ndị e ji mmiri ọgwụ mee na ndị nwere nje ndị na-akpata ọrịa mee ihe
[Map dị na peeji 7]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Mba Ndị nwere ike ịkpụpụta ngwá agha nuklia
BRITAIN
CHINA
FRANCE
RUSSIA
UNITED STATES
Mba ndị a ma na ha anwaleela ngwá agha nuklia
INDIA
ISRAEL
PAKISTAN
Mba ndị e kwenyere na ha nọ na-achọ inweta ikike ịkpụpụta ngwá agha nuklia
ALGERIA
IRAN
IRAQ
NORTH KOREA
[Foto dị na peeji nke 4, 5]
Ịtụ bọmbụ nuklia bụ́ B-61, bụ́ nke a kpụpụtara ibibi ihe owuwu ndị dị n’okpụrụ ala
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto Ndị Agha Ụgbọelu nke United States
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 4]
Foto Ndị Agha Ụgbọelu nke United States