Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 10/8 p. 5-8
  • Ihe Mere Egwú Ji Emetụta Anyị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Egwú Ji Emetụta Anyị
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Dị n’Egwú
  • Ndakọ, Enweghị Ndakọ, na Ụda Olu Ụtọ
  • Egwú na Ụbụrụ
  • Egwú, Okwu Abụ, na Gị
  • Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Nọgide Na-enwe Echiche Ziri Ezi Banyere Egwú
    Teta!—1999
Teta!—1999
g99 10/8 p. 5-8

Ihe Mere Egwú Ji Emetụta Anyị

Ọ BỤ nanị mmadụ na-eti egwú ma na-asụ asụsụ. Ọ ga-esi ike iche echiche banyere ụwa nke na-enweghị ha abụọ. “Ma asụsụ ma egwú bụ njimara ụmụ mmadụ yiri ka hà zuru ebe nile,” ka akwụkwọ bụ́ The Musical Mind na-ekwu. Ha bụ akụkụ nke mkpa anyị ikwurịta okwu. Ya mere a pụrụ ikwu na, dị ka ọ dị n’ihe banyere asụsụ, mgbe egwú “na-ekwu okwu,” mmetụta uche anyị “na-aṅa ntị.”

N’ihi gịnị, oleekwa otú egwú si agwa mmetụta uche anyị okwu? Iji zaa nke ahụ, ọ dị mkpa ka anyị tụlee: (1) ihe ndị dị n’egwú n’onwe ya na ụzọ ụbụrụ anyị na-esi aghọta ya; (2) ọdịdị mmetụta uche anyị na ọdịbendị anyị si pụta, bụ́ ndị na-emetụta mmeghachi omume anyị n’ebe egwú dị; na (3) asụsụ, bụ́ nke pụkwara imetụta mmeghachi omume anyị.

Ihe Ndị Dị n’Egwú

A na-ezokarị aka n’ụda dị iche iche nke egwú dị ka “ihe ndị dị n’egwú.” Ihe ndị a gụnyere ụda, ma ọ bụ ụdị ụda, nke ngwá egwú. Dị ka ihe atụ, a kọwawo opì ndị France dị ka “nke na-eyi egwu,” ma ọ bụ nke dị oké arọ, ụda ya dịkwa nnọọ iche na nke opì ike “na-adasi ike.” Ọ bụ ezie na ha abụọ so n’otu ìgwè ngwá egwú ndị a na-afụ afụ, nke ọ bụla n’ime ha na-ada oké ụda, ruo n’ókè dịgasị iche. Nke a bụ ihe na-enye ngwá nke ọ bụla “ụda” pụrụ iche. Ndị na-arọ egwú na-eji ihe ndị a emepụta ụda dị iche iche iji kpalie mmetụta uche nke onye na-ege ya.

Ikekwe otu n’ime ihe ndị mbụ dị na ya nke anyị na-amata nke ọma bụ usoro ụda—ikekwe mgbe anyị ka nọ n’ime akpa nwa, na-ege otiti obi nke nne anyị. E kwuwo na otiti obi ma ọ bụ ọbụna iku ume anyị pụrụ imetụta mmeghachi omume anyị nye usoro ụda egwú, mgbe anyị na-amaghị. N’ihi ya, ọ pụghị ịbụ ihe mere ná ndabakọ na ihe ka n’ọtụtụ ndị yiri ka hà nwere mmasị karị n’egwú ndị na-asụru ugboro 70 ruo 100 n’otu minit—bụ́ otu ihe ya na nkezi otiti obi nke onye toworo eto ahụ gbasiri ike. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, nke a ka magazin bụ́ Perceptual and Motor Skills na-enye echiche ya.

Nnukwu ọdịiche dị n’egwú bụ́ ndị ụda ndị a na-ewepụta na-apụta ìhè ma a tụlee ngwá egwú dị iche iche, gụnyere ụda na ụda olu ụtọ ha na-ewepụta. Ụda na-enwe mmetụta dị omimi n’ahụ nke opì bassoon ná nkebi nke abụọ n’egwú Mozart nke o ji nanị bassoon fụọ pụrụ ịkpali mmetụta miri emi. Ụda na-akụda mmụọ nke ọjà shakuhachi nke ndị Japan pụrụ ịdajụ obi. Ụda dị elu nke ngwá egwú saxophone na-eme ka egwú jazz nke dị ụtọ dịgide n’obi ọtụtụ ndị. Ụda na-asụ asụ nke ngwá egwú tuba nke ndị òtù egwú Germany na-akpalikarị obi ụtọ. Ụda na-agbanwe agbanwe nke ngwá egwú violin e ji na-eti egwú waltz nke Strauss rọrọ, na-akpali ndị na-ege ya ịchọ ịpụta gbawa egwú. A na-enwe mmetụta ndị dị otú ahụ n’ihi na “egwú na-agwa mmadụ okwu,” dị ka Clive E. Robbins, nke Ogige Nordoff-Robbins Na-eji Egwú Agwọ Ọrịa, dị na New York, si kwuo.

Ndakọ, Enweghị Ndakọ, na Ụda Olu Ụtọ

Ndakọ na-ewepụta ụda ndị dị ụtọ, ebe enweghị ndakọ na-ewepụta ụda ndị na-agbakasị ahụ. Ma ị̀ ma na ihe ndị a na-enyere ibe ha aka n’egwú ụfọdụ? Egwú na-ada ka ọ̀ dakọrọ adakọ pụrụ inwe adakọghị adakọ karịa otú ị pụrụ iche. Njikọta a na-ejikọtakarị ndakọ na enweghị ndakọ na-eme ka e nwee ndali elu na-agbanwe agbanwe, ọ bụ ezie na a dịghị achọpụtakarị ya, bụ́ nke ndalata ya na-emetụta uche anyị. Mgbanwetụ nke a nke mmetụta na-atọ anyị ụtọ, ebe nanị egwú na-adịghị adakọ adakọ pụrụ ịgbakasị ahụ ma kpalite mmetụta na-adịghị mma—dị nnọọ ka ịka mbọ aka na sleeti ma ọ bụ bọọdụ ide ihe ga-akpali. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na egwú nwere nanị ebe ndị na-adakọ adakọ, ọ pụrụ ịgbụ agbụ̀.

Ụda olu ụtọ bụ nhazi kwekọrọ ekwekọ nke ụda dị iche iche n’ụzọ dị n’usoro. Dị ka akwụkwọ ụfọdụ si kwuo, e nwetara nsụgharị nke okwu ahụ site n’okwu Grik bụ́ meʹlos, nke pụtara “abụ.” Olu ụtọ, dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu si kwuo, bụ egwú dị ụtọ, ụda ọ bụla dị ụtọ.

Otú ọ dị, ọ bụghị nnọọ usoro ụda dị iche iche ọ bụla bụ ụda olu ụtọ. Dị ka ihe atụ, nkwụsịtụ tere aka na-ewere ọnọdụ mgbe mgbe n’etiti usoro ụda dị iche iche pụrụ ime ka ụda olu ụtọ na-akpali akpali ma ọ gaghị eme ka ọ tọọ ụtọ. N’aka nke ọzọ, usoro ụda dị iche iche nwere nkwụsịtụ ole na ole tere aka pụrụ ime ka ụda olu ụtọ dị ụtọ. Nhazi dịgasị iche nke ụda na nkwụsịtụ na-eme ka ụda olu ụtọ na-akpasu iwe ma ọ bụ na-enye obi ụtọ. Dị ka ọ dị ndakọ, ụda olu ụtọ na-enwe ndali elu na ndalata nke ya, na-emetụta mmetụta uche anyị n’ihi mgbanwe nke ọ̀tụ̀tụ̀ ụda ya—ya bụ́, ókè ụda ya dịruru elu ma ọ bụ ala.

Mgbe e jikọtara ha, ihe ndị a nile na-emepụta ike buru ibu nke pụrụ ịkpali ma ọ bụ mee ka mmetụta uche anyị jụrụ. Nke a bụ n’ihi ụzọ dịgasị iche ụbụrụ anyị na-esi anabata ma na-aghọta egwú.

Egwú na Ụbụrụ

Ụfọdụ na-ekwu na asụsụ na ntụgharị uche kasị bụrụ ọrụ dịịrị akụkụ aka ekpe nke ụbụrụ, ebe a na-eji akụkụ aka nri nke ụbụrụ, bụ́ nke kasị ahụ maka mmetụta na mmetụta uche, aghọta egwú. Ma nke a ọ̀ dị otú ahụ ma ọ bụ na ọ dịghị, o doro anya na egwú na-eme ka ndị na-ege ya nwee mmetụta n’onwe ha. Magazin bụ́ Perceptual and Motor Skills na-ekwu ya n’ụzọ dị otú a: “Egwú nwere ikike nke ime ka e nwee mmetụta, na-akpalikwa mmetụta uche ngwa ngwa na n’ụzọ dị irè. Ihe a pụrụ iji nanị otu ụda egwú ma ọ bụ otu ìgwè ụda egwú kpalie mgbe mgbe n’egwú . . . , ga-achọ ọtụtụ ahịrịokwu iji kọwaa ha n’akwụkwọ.”

N’ihe banyere mmekọrịta dị n’etiti ịhụ ihe na ịnụ ihe na mmeghachi omume n’ebe nke ọ bụla n’ime ihe ndị a dị, akwụkwọ bụ́ Music and the Mind kwuru ihe a na-adọrọ mmasị: “E nwere njikọ chiri anya n’etiti ịnụ ihe na mkpali mmetụta uche karịa ka e nwere n’etiti ịhụ ihe na mkpali mmetụta uche. . . . Ikiri anụmanụ merụrụ ahụ ma ọ bụ onye na-ata ahụhụ bụ́ onye mechiri ọnụ pụrụ ịkpali mmetụta uche dị nta n’ime onye na-ekiri ya. Ma ozugbo ha malitere iti mkpu, a na-akpalikarị onye na-ekiri ya n’ụzọ dị ukwuu.”

Egwú, Okwu Abụ, na Gị

Otu ìgwè ndị nwere otu echiche na-ekwusi ike na otu egwú na-enwe otu ụdị mmetụta n’ahụ ndị nile gere ya. Otú ọ dị, ìgwè ọzọ na-ekwu na otú otu ụda olu ụtọ ma ọ bụ abụ si metụta mmadụ na-egosi otú obi dị onye ahụ mgbe ahụ ma ọ bụ ahụmahụ ya n’oge gara aga. Otu ihe atụ banyere nke a pụrụ ịbụ mgbe onye onye ọ hụrụ n’anya nwụnahụrụ nụrụ otu abụ, ikekwe n’ebe a na-efe ofufe. Abụ ahụ pụrụ ime ka onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ chetawa ihe, ọ pụkwara ime ka o wute ya ma ọ bụ ọbụna mee ka anya mmiri rujuo ya anya. Ndị ọzọ na-anọghị n’ọnọdụ ahụ pụrụ iji obi aṅụrị bụọ otu abụ ahụ.

Ọzọkwa tụlee nkọwa nke opì ndị France na opì ike e nyere ná mmalite. O nwere ike ị gaghị ekweta na opì ndị France na-ada ka ihe mgbaàmà. Nye gị ọ pụrụ ịdasi ụda ike ma ọ bụ dị ụtọ, ma opì ike pụrụ iyi nke na-emetụta emetụta karị. N’ime anyị nile, e nwere isi iyi mmetụta pụrụ iche nke egwú pụrụ ịkpali—n’ụzọ dị otú a, anyị na-emeghachi omume n’ụdị nke anyị.

Egwú na-enye aka ejikọta okwu ma ọ bụ echiche na mmetụta uche. N’ihi ya, ọ bụ mkpọsa ngwá ahịa nke telivishọn ma ọ bụ nke redio ole na ole ka a na-eme n’ejighị egwú. Ọtụtụ mgbe okwu ha adịghị enwe ezigbo ihe ha pụtara. Otú ọ dị, e jiri egwú dị mma mee ya, mkpọsa ngwá ahịa ahụ ga-akpalite mmetụta uche nke onye na-ege ya. Lee ka o si bụrụ eziokwu na nzube nke ihe ka ọtụtụ ná mkpọsa ngwá ahịa bụ ime ka ịzụ ihe bụrụ nke mmetụta uche kpaliri kama ịbụ nke ezi uche kpaliri!

Ọ bụ ezie na ime mkpọsa ngwá ahịa pụrụ ime ka ọha na eze mefuo ego ha n’ụzọ na-adịghị mma, e nwere akụkụ ka nnọọ njọ n’ihe banyere ike nke okwu abụ na egwú. Magazin bụ́ Journal of Youth and Adolescence na-ekwu na site n’okwu abụ a na-abụ ugboro ugboro, ndị na-ede abụ na-akụziri ndị nọ n’oge uto ka ha leghara echiche nke ndị ọzọ anya ma bụrụ “isi ekwe ọnwụ.” Dị ka akwụkwọ ọzọ si kwuo, ozi ‘okwu egwú rap na-akpata esemokwu na-enye, bụ́ nke na-agbaghebe ọnụ ekwu okwu karịa nke ya na ya na-eso bụ́ egwú rock na-ada oké ụda,’ pụrụ ịbanye n’ọdịdị mmetụta uche nke onye na-ege ya, ọ na-arụpụtakwa àgwà ịkpọ ndị ọzọ asị.

À pụrụ igbochi mmetụta na-adịghị mma ma ọ bụrụ na mmadụ egee nanị egwú ma leghara okwu ya anya? A ghaghị ikweta na n’ụzọ dị ukwuu, okwu egwú rock na-ada oké ụda na egwú rap na-esi ike nghọta. N’eziokwu, ọtụtụ mgbe ọ na-afọdụ nke nta ka ha ghọọ ihe a na-apụghị ịghọta aghọta, ọ gwụla ma a gbalibigara ya elu ókè. N’agbanyeghị nke ahụ, ma à pụrụ ịghọta okwu ha ma ọ bụ na a pụghị, ozi ha ka dị n’usoro ụda ha na-ada otu otu na ụda olu ụtọ ha na-apụta ugboro ugboro!

Ò si aṅaa dị otú ahụ? Ụfọdụ n’ime isiokwu ha nanị nwere ihe ọ na-eme ka anyị cheta. Ọzọkwa, ụdị egwú ọ bụ na-abụkarị ozi ọ na-ezi. Olee ozi a na-enye? Otu akwụkwọ ndị ntorobịa na-ekwu, sị: “O yiri ka ọ bụ onyinyo nke ike, ikike ime ihe, na inwe mmeri ná mmekọahụ a na-eche n’echiche.” Onye ọzọ na-ekwu, sị: “Isiokwu ha ndị bụ́ isi . . . bụ oké nnupụisi, ime ihe ike, iji ihe ndị na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, inwe mmekọahụ aghara aghara, omume rụrụ arụ, na ofufe Setan.”

Ụfọdụ ndị ntorobịa na-ekwu na ọ bụ ezie na nke a pụrụ ịbụ eziokwu, ọ dịghị emetụta ha n’ụzọ dị njọ. Ha ga-arụ ụka na egwú dị otú ahụ bara uru n’ihi na ọ na-enyere ha aka ‘ịhụ onwe ha’ dị ka ndị mmadụ. Ọ̀ na-eme otú ahụ? Magazin bụ́ Journal of Youth and Adolescence na-ekwu, sị: “Ụmụ okoro na-adịghị emetacha nke ọma pụrụ ịkasị nabata iwe, mmegide, na ike dị n’egwú rock na-ada oké ụda nke ụmụ okoro na-eche na ọ na-akọwa ọnọdụ ha, n’ọgwụgwụ ụbọchị mgbe ha disịrị otu ụbọchị nke ịbụ ndị a gwara n’ụlọ akwụkwọ na ha erughị eru.” Ọ na-ekwukwasịzi, sị: “Ihe na-emegide onwe ya ma ọ bụ ihe na-agbagwoju anya bụ na ọchịchọ ndị nọ n’oge uto na-achọ ịbụ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi na ndị a na-anabata karị na-agụnye iji ụzọ nzirịta ozi ọha na eze eme ihe. Kama ịchọ ahụmahụ bụ́ nke ọ bụ nanị ha nwere n’ezie mgbe ha nọọrọ onwe ha, ndị nọ n’oge uto na-anabata echiche ndị e chepụtaworo echepụta nke ndị na-eti egwú na-ezisa.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, onye ọzọ na-agwa ndị na-eto eto ndị a ihe ha ga-eche na mmetụta ha ga na-enwe.

Ka anyị tụlee ebe ndị a na-eti egwú rock. Mmetụta dị aṅaa ka ha na-enwe n’ahụ ìgwè mmadụ na-aga ha? Akwụkwọ bụ́ Music and the Mind na-aza, sị: “A pụghị inwe obi abụọ na, site n’ịkpalikwu mmetụta ìgwè mmadụ na site n’ịhụ na mmetụta ndị ahụ rịrị elu n’otu oge kama ịbụ otu otu, egwú pụrụ nnọọ iso kpata ejikwaghị nlezianya eche echiche, nkwenyere a na-ekwenyere mmetụta dị mgbe ahụ n’ajụghị ajụjụ, nke bụ́ nnọọ ihe e ji amara akparamàgwà ìgwè mmadụ.” Ụfọdụ omume ime ara ara na-adị n’ebe a na-eti egwú rock na-egosi ịbụ eziokwu nke okwu ahụ.

Ya mere, iji zere imetọ uche na obi anyị, anyị aghaghị ime nnọọ nhọrọ n’egwú anyị. Olee otú anyị pụrụ isi mee nke ahụ? Isiokwu ikpeazụ anyị ga-aza ajụjụ a.

[Foto dị na peeji nke 7]

Egwú na-emekarị ka ndị na-ege ya chọọ ịgba egwú

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya