Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 4/15 p. 19-24
  • Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iji Egwú Eme Ihe n’Ụzọ Na-ekwesịghị Ekwesị
  • Mkpa Ọ Dị Ịkpachara Anya
  • Egwú Rap​—⁠Egwú Nnupụisi
  • Egwú Rock Na-ada Oké Ụda​—⁠Mmekọahụ, Ime Ihe Ike, na Ofufe Setan
  • Ịghọta Mkpụrụ Ị Kụrụ
  • Nọrọ na Nche
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka Egwú Ghara Iri M Isi?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • È Nwere Ihe Ụdị Egwú M Na-akpọ Mere?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Ike nke Egwú
    Teta!—1999
  • Ihe Mere Egwú Ji Emetụta Anyị
    Teta!—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 4/15 p. 19-24

Nọrọ Na Nche Megide Egwú Na-adịghị Ewuli Elu!

“Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị mara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.”—NDỊ EFESỌS 5:15, 16.

1. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji na-akpọ egwú “onyinye Chineke”?

“EGWÚ . . . bụ onyinye Chineke.” Otú a ka Lulu Rumsey Wiley dere n’akwụkwọ ya bụ́ Bible Music. Site n’oge gboo, ndị ikom na ndị inyom na-atụ egwu Chineke aghọtawo echiche nke a. Site n’egwú, mmadụ ekwupụtawo mmetụta ya kasị omimi​—⁠ọṅụ, iru újú, iwe, na ịhụnanya. Otú a egwú arụwo ọrụ dị mkpa n’oge Bible, na-abụ nke a kpọtụrụ aha n’akụkụ nile nke akwụkwọ ahụ dị nsọ.​—⁠Jenesis 4:21; Mkpughe 18:22.

2. Olee otú e si jiri egwú mee ihe n’ito Jehova n’oge Bible?

2 Ọ bụ n’ofufe Jehova ka egwú nwetara ngosipụta ya kasị mma. Ụfọdụ n’ime okwu otuto ndị kasị mma a gwatụworo Jehova Chineke na mgbe ọ bụla bụ nke e tinyere ná mbụ n’ụzọ egwú. “M ga-eji abụ too aha Chineke,” ka onye ọbụ abụ ahụ bụ́ Devid dere. (Abụ Ọma 69:30) E jiri egwú mee ihe mgbe mmadụ nọ nanị ya, dị ka ihe a na-agbakwụnye ná ntụgharị uche nke e mere n’ụzọ ekpere. “M ga-echeta abụ m na-abụ n’ịkpọ ụbọ akwara n’abalị: m ga-eso obi m tụgharịa uche; mmụọ m wee chọsie ike,” ka Esaf dere. (Abụ Ọma 77:6) N’ime ụlọ nsọ Jehova, a haziri egwú n’ụzọ buru ibu. (1 Ihe Emere 23:1-⁠5; 2 Ihe Emere 29:​25, 26) Mgbe ụfọdụ, a na-ahazi òtù egwú dị iche iche, dị ka n’oge a raara ụlọ nsọ ahụ nye, mgbe e jiri 120 ndị na-afụ opi mee ihe. (2 Ihe Emere 5:​12, 13) Anyị enweghị ihe ndekọ nke otú egwú nke a dị ebube si daa ụda, ma akwụkwọ ahụ bụ́ The Music of the Bible na-ekwu, sị: “Ọ gaghị esi ike iwulite echiche nke mmetụta egwú Ụlọ Nsọ ahụ na-enwe n’ozuzu ya n’oge ndị dị mkpa . . . Ọ bụrụ na a pụrụ ibufe otu onye n’ime anyị ugbu a banye n’ime otu n’ime oge ndị dị otú ahụ, ọ ga-esi ike izere echiche siri ike nke egwu na nke mkpali.”a

Iji Egwú Eme Ihe n’Ụzọ Na-ekwesịghị Ekwesị

3, 4. Olee otú ndị Chineke na ndị agbata obi ha na-ekpere arụsị si jiri egwú mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị?

3 Otú ọ dị, ọ bụghị mgbe nile ka e jiri egwú mee ihe n’ụzọ dị otú ahụ nke e buliri elu. N’ugwu Saịnaị, e jiri egwú mee ihe ịkpali ofufe ikpere arụsị nke chi nwa ehi. (Ọpụpụ 32:18) N’otu oge e jikọtara egwú na omume ịṅụbiga mmanya ókè na ọbụna ịgba akwụna. (Abụ Ọma 69:12; Aịsaịa 23:15) Ndị agbata obi Israel na-ekpere arụsị bụkwa ndị ikpe iji onyinye nke a nke Chineke na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mara. “Na Finisia na Siria,” ka akwụkwọ bụ́ The Interpreter’s Dictionary of the Bible na-ekwu, “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ egwú nile a ma ama na-egosipụta ofufe nke Ishtar, bụ́ chi nwanyị nke ọmụmụ. Otú a, abụ ndị a ma ama na-abụkarị ihe na-ebute oké omume mmekọahụ rụrụ arụ.” Ndị Grik oge ochie n’otu aka ahụ jiri egwú mee ihe ‘n’ịgba egwú na-akpali mmekọahụ’ bụ́ ndị a ma ama.

4 Ee, egwú nwere ike nke ịkpali, ịdọrọ mmasị, na inwe mmetụta n’ahụ mmadụ. Ọtụtụ iri afọ gara aga, akwụkwọ John Stainer bụ́ The Music of the Bible gara ọbụna n’ihu nke ukwuu ruo n’ikweta, sị: “Ọ dịghị nkà ọ bụla nke na-enwe ike dị ukwuu otú a n’ebe agbụrụ mmadụ nọ n’oge dị ugbu a dị ka nkà nke Egwú.” Egwú ka nọgidere na-enwe ike dị ukwuu taa. N’ihi ya, ụdị egwú na-adịghị mma pụrụ ịbụ ajọ ihe ize ndụ nye ndị ntorobịa na-atụ egwú Chineke.

Mkpa Ọ Dị Ịkpachara Anya

5. (a) Ọrụ buru ibu dị aṅaa ka egwú na-arụ ná ndụ ọtụtụ ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu? (b) Gịnị bụ echiche Chineke banyere ndị na-eto eto inwe obi ụtọ?

5 Ọ bụrụ na ịbụ onye na-eto eto, mgbe ahụ ị maara ụzọ egwú si bụrụ ihe dị mkpa​—⁠karịsịa ụdị dị iche iche nke egwú ndị a ma ama ma ọ bụ egwú rock​—⁠nye ọtụtụ ndị bụ ndị ọgbọ gị. Ọbụna na a kpọwo egwú “akụkụ nke ihe dị onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu mkpa.” E mere atụmatụ na n’afọ isii ndị ikpeazụ nke ụlọ akwụkwọ ya, onye ntorobịa nkịtị na United States ga-eji ihe karịrị hour anọ gee ntị n’egwú rock kwa ụbọchị! Nke ahụ n’ezie na-egosi ụkọ nke ime ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Ọ bụghị na ọ dị ihe dị njọ n’ịma ụtọ nke ihe na-eme ka ahụ dị mma ma ọ bụ ihe na-eme ka i nwee obi ụtọ. N’ezie Jehova, bụ́ Onye Okike nke egwú na-atọ ụtọ, adịghị atụ anya n’aka ndị na-eto eto ịbụ ndị obi na-ajọ njọ ma ọ bụ ndị obi na-adịghị ụtọ. N’ezie, o nyere ndị ya iwu, sị: “Ṅụrịanụ ọṅụ na Jehova, tegharịakwanụ egwú ọṅụ, unu ndị ezi omume: tiekwanụ mkpu ọṅụ, unu nile ndị ziri ezi n’obi.” (Abụ Ọma 32:11) Nye ndị na-eto eto Okwu ya na-ekwu, sị: “Ṅụrịa, nwa okorobịa, na nwata ị bụ; ka obi gị meekwa gị mma n’ụbọchị nile nke okorobịa ị bụ.”​—⁠Eklisịastis 11:9.

6. (a) N’ihi gịnị ka o ji dịrị ndị ntorobịa mkpa iji mkpachara anya mee ihe n’ụdị egwú ha na-ahọrọ? (b) N’ihi gịnị ka ihe dị ukwuu n’egwú ndị e nwere taa ji bụrụ ndị dị njọ karịa egwú ndị e nwere n’ọgbọ ndị gara aga?

6 Otú o sina dị, ọ dị ezi ihe mere ị ga-eji dịrị akọ n’ụdị egwú ị na-ahọrọ. Pọl onyeozi kwuru ná Ndị Efesọs 5:​15, 16, sị: “Lezienụ anya nke ọma otú unu na-ejegharị, ọ dịghị ka ndị na-amaghị ihe, kama dị ka ndị maara ihe; na-azụchapụrụ onwe unu oge a nile, n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.” Ụfọdụ ndị ntorobịa pụrụ ịrụ nke a ụka, dị ka otu nwa agbọghọ na-eto eto mere: “Ndị mụrụ anyị gere egwú nke ha mgbe ha dị na nwata. N’ihi gịnị ka anyị na-apụghị ịgere nke anyị?” Ụfọdụ n’ime egwú ndị mụrụ gị gere mgbe ha bụ ọgbọ gị pụkwara inwe akụkụ ya ndị na-adịghị mma. Mgbe e nyochara ha nke ọma, ọtụtụ n’ime ụkpụrụ ndị a ma ama na-emesị nwee ọnụ ọgụgụ na-atụ n’anya nke okwu ndị metụtara mmekọahụ na okwu ndị na-apụtachaghị ihe banyere omume rụrụ arụ. Ma ihe a na-akpọtụ nanị aha ná mbụ bụ ugbu a ihe a na-akọwazi n’ụzọ pụtara ìhè. Otu onye na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ugbu a ụmụaka bụ ndị a na-eji ozi ndị pụtara ìhè na-awakwasị n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị ka ihe ọdịbendi anyị hụtụworo ná mbụ.”

Egwú Rap​—⁠Egwú Nnupụisi

7, 8. (a) Gịnị bụ egwú rap, gịnịkwa mere o ji bụrụ ihe a ma ama? (b) Olee ihe pụrụ ime ka a mata mmadụ dị ka onye na-arapara n’ụdị ndụ nke egwú rap?

7 Dị ka ihe atụ, tụlee egwú rap nke na-ewu ewu ugbu a. Dị ka magazin Time si kwuo, egwú rap aghọwo “oké mgbanwe ụda egwú nke a pụrụ ikwu n’ụzọ e ji n’aka,” ọ bụkwa nke a ma ama n’ụzọ dị ukwuu na Brazil, Europe, Japan, Russia, na United States. N’ịbụ ọtụtụ mgbe nke na-enweghị olu ụtọ ma ọlị, a na-ekwunye okwu ndị dị na ya n’ụda egwú na-adasi ike, ọ bụghị ịgụnye ya agụnye. Otú ọ dị, ọ bụ ụda ahụ na-adasi ike yiri ka ọ bụ ya bụ isi ihe dị n’oké ihe ịga nke ọma egwú rap na-enwe n’ụzọ azụmahịa. “Mgbe m gere ntị n’egwú rap,” ka otu onye ntorobịa bụ onye Japan na-ekwu, “m na-enwe mkpali, mgbe m na-agbakwa egwú, m na-enwere onwe m.”

8 Okwu ndị dị n’egwú rap​—⁠nke na-abụkarị ngwakọta a na-achịkwaghị achịkwa nke okwu rụrụ arụ na asụsụ okporo ámá⁠—​yiri ka ọ bụ ihe ọzọ mere egwú rap ji bụrụ ihe a ma ama. N’adịghị ka okwu ndị dị n’egwú rock ndị oge gboo, bụ́ nke ọtụtụ n’ime ya na-abụ banyere isiokwu nke ịhụnanya ndị dị n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu, okwu ndị na-adị n’egwú rap na-enwekarị ozi ndị siri ike karị. Egwú rap ụfọdụ na-ekwu okwu n’ụzọ pụtara ìhè megide ikpe na-ezighị ezi, ịkpa ókè agbụrụ, na àgwà obi ọjọọ nke ndị uwe ojii. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, a na-eji okwu ndị kasị ruo unyi na asụsụ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ, ndị a pụrụ ichetụdị n’echiche na-ekwe egwú ahụ. Egwú rap yikwara ka ọ bụ nnupụisi megide ụkpụrụ dị iche iche nke uwe oyiyi, ejiji, na omume ziri ezi nke mmekọahụ. N’abụghị ihe na-eju anya, egwú rap enwewo iru eru nke ịbụ ụzọ ịdị ndụ n’onwe ya. Ndị kwere na ya bụ ndị a na-amata site n’oké mmegharị ahụ n’okwu, asụsụ okporo ụzọ, na uwe oyiyi​—⁠uwe jeans ndị owoghoro, akpụkpọ ụkwụ egwuregwu ndị elu ha gafetụrụ nkwonkwo ụkwụ, bụ́ ndị a na-ekechighị eriri ha ekechi, ihe olu e ji ọla edo mee, okpu ndị na-eme egwuregwu pịpụtara apịpụta n’ọnụ ihu, enyo anya ojii.

9, 10. (a) Gịnị bụ ihe ndị ntorobịa kwesịrị ịtụle n’ikpebi ma egwú rap na ụdị ndụ ya hà bụ “ihe dị Onyenwe anyị ezi mma”? (b) Gịnị ka o yiri ka ụfọdụ ndị Kraịst adịghị eji akpọrọ ihe?

9 Ná Ndị Efesọs 5:10, a gwara ndị Kraịst ka ha “na-anwapụta ihe dị Onyenwe anyị ezi mma.” N’ịtụle aha egwú rap mewooro onwe ya, ì chere na ọ ga-abụ “ihe dị Onyenwe anyị ezi mma” ma ọ bụrụ na i nwee ihe jikọtara gị na ya? Onye Kraịst bụ onye ntorobịa ọ̀ ga-achọ ịbụ onye e jikọtara ya na ụdị ndụ nke ọbụna ọtụtụ ndị ụwa lere anya dị ka ihe a na-ekwesịghị ịnakwere anakwere? Rịba ama otú otu onye ntụleghachi si kọwaa otu ememe egwú rap: “Ndị na-agụ egwú rap marịtara onwe ha aka maka ịbụ onye nke ya kasị awụ akpata oyi n’ahụ site n’iji okwu rụrụ arụ na okwu mmekọahụ ndị pụtara ìhè mee ihe. . . . Ndị ikom na ndị inyom na-agba egwú mere ihe ndị na-egosi inwe mmekọahụ n’elu ebe ahụ a nọ na-eti egwú.” Banyere otu ihe omume bụ isiakụkọ, otú n’ime ndị isi na-akwalite ememe ahụ kwuru, sị: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okwu nile e kwuru (ruru arụ).”

10 Ọbụna otú ahụ, egwú e tiri n’abalị ahụ bụ egwú rap nkịtị. Onye na-eduzi ụlọ nzukọ ememe ahụ kwuru, sị: “Ihe ị na-anụ bụ egwú rap nkịtị​—⁠otu ụdị ahụ ndị ntorobịa na-azụrụ n’ụlọ ahịa.” Lee ka o si bụrụ ihe mwute ịkọ na n’etiti ihe ahụ karịrị 4,000 ndị ntorobịa nọ n’ebe ahụ n’ememe ahụ, e nwere ụfọdụ ndị sị na ha bụ Ndịàmà Jehova! O doro anya na ụfọdụ ejighị eziokwu ahụ bụ na Setan bụ “onye isi nke ike nke mbara eluigwe” kpọrọ ihe. Ọ bụ ya na-achị “mmụọ ahụ [ma ọ bụ, àgwà bụ isi nke uche] nke na-arụsi ọrụ ike n’ime ụmụ nke ekwenyeghị ekwenye.” (Ndị Efesọs 2:2) Ọdịmma ònye ka ị ga-ejere ozi ma ọ bụrụ na i jikọta onwe gị n’egwú rap ma ọ bụ n’ụzọ ndụ nke egwú rap? Ee, ọ pụrụ ịbụ na egwú rap ụfọdụ adịchaghị njọ n’ihe dị n’ime ha. Ma ọ̀ bụ ihe ezi uche dị n’ime ya iwulite mmasị maka ụdị egwú ọ bụla nke ihe jupụtara na ya bụ ihe ndị na-emegide ụkpụrụ ndị Kraịst?

Egwú Rock Na-ada Oké Ụda​—⁠Mmekọahụ, Ime Ihe Ike, na Ofufe Setan

11, 12. Gịnị bụ egwú rock na-ada oké ụda, gịnịkwa bụ akụkụ dị iche iche na-adịghị mma nke e ji mara ya?

11 Ụdị egwú ọzọ a ma ama bụ egwú rock na-ada oké ụda. Egwú rock na-ada oké ụda karịrị ụdị egwú rock nkịtị na-adasi ụda ike ná ntị. Otu akụkọ dị n’akwụkwọ bụ́ The Journal of the American Medical Association na-ekwu, sị: “Egwú rock na-ada oké ụda . . . na-ewepụta ụda egwú na-adasi ike ná nkebi ná nkebi na nke jupụtara n’okwu ndị na-eto ịkpọasị, mmetọ, mmekọahụ na-ekwesịghị ekwesị, na mgbe ụfọdụ ofufe Setan.” Leenụ, nanị aha nke ụfọdụ n’ime òtù egwú ndị a ma ama na-agba àmà banyere ịrụ arụ nke ụdị egwú rock nke a. Ha na-agụnye okwu ndị dị ka “nsí,” “égbè,” na “ọnwụ.” Ma, egwú rock na-ada oké ụda yiri ihe dịtụ mma ma e jiri ya tụnyere egwú rock iwe na egwú rock nke ọnwụ​—⁠ụdị egwú ndị si n’egwú rock na-ada oké ụda pụta. Aha òtù egwú ndị a na-ejikarị okwu ndị dị ka “onye na-eri anụ mmadụ” na “ọkwá ọnwụ” eme ihe. Ndị ntorobịa n’ọtụtụ ala nwere ike ha agaghị aghọta otú aha ndị a jọruru ná njọ n’ihi na e dere ha n’asụsụ Bekee ma ọ bụ n’asụsụ ọzọ na-abụghị nke ha.

12 Egwú rock na-ada oké ụda abụrụwo nke e jikọtara ọtụtụ mgbe ya na ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu igbu onwe ha, ịda mbà n’obi, na iji ọgwụ ọjọọ na-eme ihe. Njikọ o nwere n’ebe omume ime ihe ike dị kpatara otu onye ọkachamara na-enye ndụmọdụ na redio ji kpọkwasị ya aha bụ “egwú i ji egbu ndị mụrụ gị.” Ọ bụ njikọ o nwere n’ebe ofufe Setan nọ bụ ihe na-atụ ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ egwú​—⁠na ndị ọrụ uwe ojii. Otu onye na-eme nnyocha kwupụtara na ụfọdụ ndị ntorobịa na-emikpu n’ofufe Setan bụ ndị e ji egwú a mee ka ha banye n’òtù ahụ. “Ha amaghị ihe ha na-abanye na ya,” ka o kwubiri.

13. Gịnị bụ ihe ize ndụ dị n’itinye aka n’egwú rock na-ada oké ụda?

13 Otú ọ dị, ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst, ekwesịghị ịbụ “ndị na-amaghị ihe nile [Setan] na-echepụta.” (2 Ndị Kọrint 2:11) E kwuwerị, ‘ịgba mgba anyị bụ imegide ndị agha mmụọ nke ajọ ihe n’ebe dị n’eluigwe.’ (Ndị Efesọs 6:12) Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe nzuzu mmadụ ịkpọbata ndị mmụọ ọjọọ ná ndụ ya site n’ụdị egwú ọ na-ahọrọ! (1 Ndị Kọrint 10:​20, 21) Ma, o doro anya na ụfọdụ ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst nwere ezi mmasị n’ebe egwú a dị. Ọbụna na ụfọdụ na-ejizi ụzọ nzuzo na-egbo mkpa agụụ egwú na-agụ ha. Otu nwa agbọghọ na-eto eto kwupụtara, sị: “M na-egebu egwú rock na-ada oké ụda, mgbe ụfọdụ, ogologo abalị nile. M na-azụ magazin ndị nwere mmasị n’egwú rock na-ebipụta ma zoo ha pụọ n’ebe ndị mụrụ m ga-ahụ ya n’ime igbe a na-etinye akpụkpọ ụkwụ. M ghaara ndị mụrụ m ụgha. Ama m na obi adịghị Jehova ụtọ n’ebe m nọ.” Otú isiokwu dị na magazin Teta! mere ka o nwetaghachi ezi echiche ya. Ònye ma ndị ntorobịa òle ndị ọzọ ka nwere ike ịbụ ndị egwú ndị dị otú ahụ matara n’ọnyá?

Ịghọta Mkpụrụ Ị Kụrụ

14, 15. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na ige egwú na-adịghị ewuli elu ga-enwe mmetụta na-adịghị mma n’ebe mmadụ nọ? Nye ihe atụ.

14 Ebelatala ihe ize ndụ nke egwú dị otú ahụ pụrụ ịbụrụ gị. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na obi gị adịghị n’igbu mmadụ, ma ọ bụ inwe mmekọahụ rụrụ arụ nanị n’ihi na i gere ntị n’egwú. Otú o sina dị, Ndị Galetia 6:8 na-ekwu, sị: “Onye na-agha mkpụrụ nye anụ ahụ onwe ya ga-esite n’anụ ahụ weta mmebi dị ka ihe ubi.” Igere egwú nke bụ banyere ihe ụwa, nke na-eme ka a na-eme ka anụ ọhịa, na ọbụna nke metụtara ndị mmụọ ọjọọ pụrụ inwe nanị mmetụta na-adịghị mma n’ebe ị nọ. (Tụlee Jemes 3:15.) Onye prọfesọ n’egwú bụ́ Joseph Stuessy ka e hotara na o kwuru, sị: “Ụdị egwú ọ bụla na-emetụta ọnọdụ ahụ anyị, mmetụta uche anyị, àgwà na omume anyị nke si na ya pụta . . . Onye ọ bụla nke na-asị, ‘M pụrụ ige egwú rock na-ada oké ụda, ma ọ dịghị enwe mmetụta ọ bụla n’ahụ m,’ hiere nnọọ ụzọ. Ọ na-emetụta nnọọ ndị dị iche iche n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche na n’ụzọ dị iche iche.”

15 Otu onye ntorobịa bụ onye Kraịst kwetara, sị: “M mikpuru onwe m nke ukwuu n’egwú rock iwe nke na ọdịdị mmadụ m dum gbanwere.” N’oge na-adịghị anya ọ malitere inweta nsogbu nke ndị mmụọ ọjọọ. “N’ikpeazụ m tụfusịrị egwú m nile, a tọhapụkwara m pụọ n’aka ndị mmụọ ọjọọ.” Onye ntorobịa ọzọ kwupụtakwara, sị: “Egwú ndị m na-egebu metụtara mgbaasị, ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụkwanụ mmekọahụ. Ọtụtụ ndị ntorobịa na-ekwu na ọ dịghị emetụta ha, ma ọ na-emetụta ha n’ezie. Ọ fọrọ nnọọ nke nta ka m pụọ n’eziokwu.” Otu ilu na-ajụ, sị: “Mmadụ, ọ̀ ga-agụrụ ọkụ tinye n’uwe obi ya, ma uwe ya agaghị ere ọkụ?”​—⁠Ilu 6:27.

Nọrọ na Nche

16. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ndị na-ede na ndị na-akụ ihe dị ukwuu n’egwú ndị e nwere taa?

16 Pọl degaara ndị Kraịst nọ n’Efesọs oge ochie akwụkwọ, sị: “Ya mere nke a ka m na-ekwu, kwusiekwa ike n’ime Onyenwe anyị, ka unu ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa, n’ihe efu nke uche ha, n’ihi na e mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị n’ihi amaghị ihe dị n’ime ha, n’ihi na a na-eme ka obi ha mee etili.” (Ndị Efesọs 4:​17, 18) Ọ̀ bụ na a pụghị ikwu nke a banyere ndị na-ede na ndị na-agụ ihe dị ukwuu n’egwú ndị e nwere taa? Karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ụdị egwú nile na-egosipụta ikike nke “chi nke oge a,” bụ́ Setan Ekwensu.​—⁠2 Ndị Kọrint 4:4.

17. Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi kpebie, ma ọ bụ nyochaa, egwú?

17 Banyere “mgbe ikpeazụ” ahụ, Bible buru amụma, sị: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.” (2 Timoti 3:​1, 13) Mgbe ahụ, karịa mgbe ọ bụla ọzọ, ọ dị gị mkpa ịnọsi na nche ike banyere egwú ị na-ahọrọ. Ọtụtụ mgbe, aha na-adịghị mma nke egwú ga-eme ka ọ ghara ịdị mma. Job 12:11 jụrụ, sị: “Ntị́, ọ́ dịghị anwa okwu? Okpo ọnụ kwa, ọ́ dịghị edetụrụ onwe ya ihe oriri ya?” N’ụzọ yikwara nke ahụ, ị pụrụ ịnwale ihe egwú bụ site n’ige ntị nke ọma n’otu iji mara otú ọ dị. Olee ụdị mmetụta ndị ụda olu ụtọ ahụ na-akpali n’ime gị? Ọ̀ na-akwalite àgwà a nachịkwaghị achịkwa, nke retọrọ eretọ​—⁠mmụọ nke oriri oké mkpọtụ? (Ndị Galetia 5:​19-⁠21) Gịnị banyere okwu ndị dị na ya? Hà na-akwalite omume mmekọahụ rụrụ arụ, iji ọgwụ ọjọọ eme ihe, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ jọrọ njọ bụ́ ndị “bụ ihe ihere ọnụna ikwu okwu banyere” ha? (Ndị Efesọs 5:12) Bible na-ekwu na e kwesịghị “ịkpọ ọbụna aha” ihe ndị dị otú ahụ n’etiti ndị Chineke, ya fọdụkwa ịkụnye ya n’ụda egwú ma gụghachi ya ọtụtụ ugbo. (Ndị Efesọs 5:3) Gịnị banyere ihe e sere n’elu ihe e ji afụchi egwú? Ò nwere isiokwu dị iche iche nke mgbaasị ma ọ bụ ihe osise ndị na-akpali mmekọahụ?

18. (a) Olee mgbanwe ụfọdụ ndị ntorobịa pụrụ ime mgbe a bịara n’ihe banyere egwú? (b) Olee otú ndị ntorobịa pụrụ isi wulite mmasị maka egwú ndị na-ewuli elu karị?

18 Ma eleghị anya ọ dị gị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ n’ụdị egwú ị na-ahọrọ. Ọ bụrụ na i nwere efere egwú, tepu, na nke efere egwú pụrụ iche ndị nwere isiokwu rụrụ arụ na ndị metụtara ndị mmụọ ọjọọ, i kwesịrị ịtụfusị ha ozugbo. (Tụlee Ọrụ 19:19.) Nke a apụtaghị na ị gaghị ege ntị n’egwú; ọ bụghị egwú nile a ma ama dị njọ. Ụfọdụ ndị ntorobịa amụtawokwa ime ka ụdị egwú ndị na-amasị ha buwanye ibu, ha na-egekwa ụfọdụ egwú olu ụtọ, egwú ọdịnala, egwú jazz na-adị ụtọ ná ntị, na ụdị egwú ndị ọzọ. Tepu Kingdom Melodies enyeworo ọtụtụ ndị ntorobịa aka iwulite mmasị maka egwú orchestra (egwú e ji ngwá egwú olu ụtọ nanị tie) na-ewuli elu.

19. N’ihi gịnị ka o ji dịrị mkpa idebe egwú n’ọnọdụ ya?

19 Egwú bụ onyinye sitere n’aka Chineke. Otú ọ dị, nye ọtụtụ ndị ọ na-abụ ihe na-adọrọ uche gabiga oké n’ụzọ na-adịghị mma. Ndị a dị ka ndị Israel oge ochie bụ́ ndị tiri egwú “une na egwú otiti na ọja . . . ma ha [elegideghị] ọrụ Jehova anya.” (Aịsaịa 5:12) Mee ka ọ bụrụ nzube gị idebe egwú n’ọnọdụ ya, meekwa ka ọrụ Jehova bụrụ ihe bụ isi na-echegbu gị. Na-eme ezi nhọrọ, na-akpachapụkwa anya banyere egwú ị na-ahọrọ. Otú a ị ga-enwe ike iji onyinye Chineke nke a na-eme ihe​—⁠ọ bụghị iji ya na-eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a O doro anya na mba Israel karịrị ndị ọzọ na nkà iti egwú. Otu ihe a tụrụ atụ n’Asiria na-ekpughe na Eze Senakerib kwuru ka a kpọtara ya ndị Israel na-eti egwú site n’aka Eze Hezekaịa dị ka ụtụ a na-atụrụ ya. Akwụkwọ bụ́ Grove’s Dictionary of Music and Musicians kwuru, sị: “Ikwu ka a kpọta ndị na-eti egwú dị ka ụtụ a na-atụ . . . bụ n’ezie ihe a na-adịghị ahụkebe.”

Ị̀ Na-echeta?

◻ N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kpọọ egwú onyinye Chineke?

◻ Olee otú e si jiri egwú mee ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị n’oge gboo?

◻ Ihe ize ndụ ndị dị aṅaa ka egwú rap na egwú rock na-ada oké ụda na-eche n’ihu ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst?

◻ Olee otú ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst pụrụ isi lezie anya n’ụdị egwú ha na-ahọrọ?

[Foto dị na peeji nke 23]

N’oge Bible, a na-ejikarị egwú eme ihe dị ka ụzọ e si e wetara Jehova otuto

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya