Ndị Mụrụ Ya Gbahapụrụ Ya—Chineke Hụrụ Ya n’Anya
DỊ KA BERNADETTE FINN SI KỌỌ
A hapụrụ mụ na ụmụnne m ndị nwanyị atọ tọrọ m n’ebe obibi ndị nọn mgbe m na-erubeghị afọ anọ. Birdie bụ́ onye dị afọ 12, Phyllis nke dị afọ 8, na Annamay nke dị afọ 7, na-echeta mgbe m tigidere mkpu ruo ọtụtụ izu maka ndị mụrụ m. N’ihi gịnị ka e ji hapụ anyị n’ebe ahụ?
A MỤRỤ m na May 28, 1936, n’ezinụlọ buru ibu nke na-ekpe Chọọchị Katọlik. Anyị bụ́ ụmụaka na ndị mụrụ anyị bi n’otu obere ụlọ dị na Duncormick, County Wexford, Ireland. Abụ m nwa nke asatọ, mụ na ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị asaa bụ́ ndị tọrọ m na-ehi n’otu nnukwu àkwà. Nwanne m nke nwoke na nke nwanyị a mụrụ n’oge na-adịghị anya ka e mesịrị na-ehi na drọwa a na-etinye ihe ịchọ mma.
Papa anyị bụ onye na-arụ ọrụ n’ugbo, nke dị uchu. Ọ na-akpata ego dị nnọọ nta; n’ihi ya ezinụlọ anyị na-enwe obere ihe oriri. Mgbe ụfọdụ, mama m na-enwe ike enye ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị tọrọ m obere nri ehihie ha ga-eji gaa akwụkwọ. Ịda ogbenye nke metụtara Ireland n’ozuzu ya na ọchịchị obi ọjọọ nke Chọọchị Katọlik na-achị n’oge ahụ metụtara ọnọdụ anyị kpọmkwem.
Ezinụlọ anyị na-aga chọọchị mgbe nile, ma mama m enweghị ezigbo mmasị n’ihe ime mmụọ. Otú ọ dị, ụmụnne m ndị nwanyị na-echeta na ha na-ahụ ya ka ọ na-anọdụ ala n’akụkụ ekwú ọkụ na-agụ akwụkwọ okpukpe ụfọdụ. Ọ na-agbalị ịkọwara anyị ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ gụtara.
“Olee Mama M?”
Agaghị m echezọ ụbọchị a kpọgara m n’ebe obibi ndị nọn. Ndị mụrụ m guzo na paseeji soro otu nọn na-ekwurịta nnọọ okwu, amalitekwara m isoro ụmụntakịrị nwanyị ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ na-egwuri egwu, n’amaghịdị ihe ha na-ekwurịta. Na mberede, elegharịrị m anya, o wutekwara m nke ukwuu na mama m na papa m anọghịzi ya. “Olee mama m?” ka m tisiri mkpu ike. Dị ka m kwuru ná mmalite, emegidere m nke a ruo ọtụtụ izu.
Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụmụnne m ndị nwanyị atọ tọrọ m bụụrụ m ihe nkasị obi ruo n’ókè ụfọdụ. Ma mụ na ha adịghị akpakebe nso n’ihi na ha nọ n’akụkụ dị iche n’ebe obibi ndị nọn ahụ. Ebe ọ bụ na ha na-amụkwu anya ruo awa abụọ mgbe anyị bụ́ ụmụaka lakpuchara ụra, ana m amụ anya ruo mgbe m nụrụ ka ha na-alakpu. Mgbe ahụ, ana m eji nwayọọ si n’àkwà m rịtuo, rịgoro n’elu steepụ ka ụmụnne m nwee ike ifere m aka. Kwa ụbọchị ana m atụsi anya oge ahụ dị oké mkpa ike.
O yiri ka ebe obibi ndị nọn ahụ adịghị ekwe ka mmadụ hụ ndị mụrụ ya, n’ihi ya anyị adịghị ahụkebe ndị mụrụ anyị. Nkewapụ ahụ metụtara m nke ukwuu. N’eziokwu, nanị otu oge m na-echeta ndị mụrụ m letara anyị, erughị m ha nso, ha abịarughịkwa m nso. Otú ọ dị, ụmụnne m ndị nwanyị tọrọ m na-echeta oge ole na ole ndị ọzọ ha letara anyị.
Ka oge na-aga, abịara m were ebe obibi ndị nọn ahụ dị ka ezinụlọ m, ebe obibi m, ụwa m. N’ime afọ 12 m nọrọ n’ebe ahụ, ọ bụ nanị ugboro abụọ ka m nwara ịpụtụ èzí. Mkpapụ ndị ahụ anyị mere gaa n’ime ime obodo dị nso wetaara anyị obi ụtọ dị ukwuu, n’ihi na anyị hụrụ osisi na ụmụ anụmanụ. E wezụga ya, anyị bụ́ ụmụntakịrị nwanyị ahụtụbeghị obere ụgbọala, bọs, ma ọ bụ ụlọ ahịa, anyị adịghị ahụkebekwa ụmụ nwoke, ma e wezụga ụkọchukwu.
Ndụ n’Ebe Obibi Ndị Nọn
Ụdị ndụ a na-ebi n’ebe obibi ndị nọn dị ọtụtụ—ụfọdụ dị mma, ọtụtụ adịghị mma. Otu nwa agbọghọ nọn nwere omume enyi na-akụziri anyị banyere Chineke ruo ókè ọ maruuru. Ọ gwara anyị na Chineke bụ nna na-ahụ n’anya. Nke ahụ mere m obi ụtọ, ekpebikwara m na malite n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu m ga na-eche banyere Chineke dị ka nna m n’ihi na ọ na-ahụ n’anya ma nwee obi ebere karịa nna mụrụ m. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ana m agwa Chineke okwu ọtụtụ mgbe n’ekpere dị nkenke, yiri nke nwatakịrị. O wutere m mgbe nọn ahụ hapụrụ ebe obibi ndị nọn ahụ.
Agụrụ m akwụkwọ otú dịtụ mma, bụ́ nke m na-enwe ekele maka ya. Ma, ana m echeta ihe a na-akpọ “ụmụ agbọghọ na-esi esi abịa,” bụ́ ndị a na-emeso nke ọma karị mgbe ha bịara akwụkwọ n’ebe obibi ndị nọn ahụ. Ha si n’ezinụlọ ndị bara ọgaranya, ha bịakwa, anyị aghaghị isi n’ọnụ ụlọ klas ahụ pụọ. Ndị nọn ahụ na-echetara anyị mgbe mgbe na anyị bụ nanị ụmụ mgbei nakwa na anyị kwesịrị ịdị na-eme ihe otú ọnọdụ anyị si dị.
E nwere ọtụtụ iwu n’ebe obibi ndị nọn ahụ. Ezi uche dị n’ụfọdụ n’ime ha, n’ihi ya ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ghọtara ihe mere ha ji dị mkpa. E nwere ihe ọmụmụ ndị bara uru banyere akparamàgwà na ihe ndị ọzọ. Echezọbeghị m ha, ha abawokwara m uru ná ndụ m nile. Ma ụfọdụ iwu ndị ahụ adịghị mkpa, o yikwara ka ha ezighị ezi, ebe ndị ọzọ na-agbagwoju anya ma na-akpasu nnọọ iwe. Otu iwu dị otú ahụ kwuru na a ga-enye mmadụ ahụhụ maka ịnyụ mamịrị n’àkwà n’abalị, nke ọzọ bụkwa maka ịchọ ịga mposi n’abalị.
Otu ụbọchị ka m na-arịgo steepụ, amalitere m ịgwa nwatakịrị nwanyị nọ m n’ihu okwu. Otu nọn kpọghachiri m, e nyekwara m ahụhụ maka ikwu okwu. Olee ahụhụ e nyere m? N’oge oké oyi nile nke Ireland ahụ, aghaghị m iyi uwe m na-eyi n’oge okpomọkụ! Abụ m onye na-arịakarị ọrịa, nke na-enwe ụkwara ume ọkụ na ọrịa tonsillitis mgbe nile. Adara m oké ọrịa ma bute ụkwara nta (TB), dịkwa ka ọtụtụ ụmụntakịrị nwanyị nọ n’ebe obibi ndị nọn ahụ butere. Ọ bụ ezie na e debere anyị n’ebe obibi dị iche, e nyeghị anyị nlekọta ahụ ike ọ bụla, ụfọdụ nwụkwara, gụnyere ezigbo enyi m.
A na-etikasị ụfọdụ n’ime anyị ahụ maka ịda ụmụ obere iwu. N’otu oge anyị gbakọrọ, anyị nọ na-ekiri ka otu nọn na-eti otu nwatakịrị nwanyị ihe ruo ihe karịrị awa abụọ. Anyị nile nọ na-ebe ákwá. Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, ọ bụghị ndị nọn nile nwere obi ọjọọ otú ahụ. Ma, ihe ka na-eju m anya ruo taa bụ otú mmadụ ọ bụla ga-esi na-arụsa ụmụntakịrị na-apụghị ichebe onwe ha ajọ arụrụala dị otú ahụ. Ọ dịghịkwanụ mgbe m ga-aghọta ya.
Ka oge na-aga, Birdie na Phyllis hapụrụ ebe obibi ndị nọn ahụ, hapụ mụ na Annamay. Anyị weere mmekọrịta anyị dị ka ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla ọzọ. Annamay na-akasi m obi site n’ịkọrọ m otú ndị mụrụ anyị ga-esi bịa otu ụbọchị ma kpọpụta anyị n’ebe obibi ndị nọn ahụ gaa n’ebe ndị nọn ahụ na-agaghị ahụ anyị ma ọlị. Mgbe Annamay hapụrụ ebe obibi ndị nọn ahụ, ọ fọrọ nke nta ka obi gbawaa m. Anọgidere m n’ebe ahụ ruo afọ atọ ọzọ.
Ịmụ Ibi n’Ebe Ọzọ
Ịhapụ ebe obibi ndị nọn ahụ mgbe m dị afọ 16 bụ ahụmahụ dị egwu. Ọ dịghị ihe ọ bụla m maara banyere ụwa ma e wezụga ebe obibi ndị nọn ahụ, ọ gbagwojukwara m anya n’ezie. Mgbe m bara otu bọs, a jụrụ m ego ụgbọ m, ma ọ dịghị ihe m maara banyere ego ụgbọ. Ebe ọ bụkwanụ na ejighị m ego, a gwara m ka m rituo ozugbo ahụ, aghaghịkwa m iji ụkwụ garuo ebe m na-aga. N’oge ọzọ, achọrọ m ịba bọs, ma ọ dịghị bọs bịaranụ. Amaghị m na a na-aga n’ebe bọs na-akwụsị.
Otú ọ dị, site n’inwetụ obi ike na ime ka o yie ka m watụrụ anya, ejiri m nke nta nke nta bịa mata ihe m kwesịrị ime. Ejisiri m ike nweta ọrụ dị mfe, ma mgbe m rụsịrị ọrụ ruo ọtụtụ ọnwa, ekpebiri m ịlaghachi n’ebe obibi anyị iji hụ mama m. Ezutere m ụfọdụ n’ime ụmụnne m ndị obere na nke mbụ ya—mgbe ahụ enwere m ngụkọta nke ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị 14. Ebe ọ bụ na ụlọ ahụ agaghị aba mụ na ha, ndị mụrụ m mere ndokwa ka m kwaga Wales ka mụ na nwanne m nwanyị bụ́ Annamay nọrọ. Papa m sooro m gaa n’ebe ahụ ma laa ozugbo.
Ọ fọrọ nke nta ka m nọrọ n’ụkọ ma n’ụzọ ụfọdụ ejisiri m ike dịrị ndụ na-aga. Ka e mesịrị, n’afọ 1953, akwagara m London, England, bụ́ ebe m sonyeere Ụmụ Meri, bụ́ òtù ndị nkịtị nke chọọchị Roman Katọlik na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ. Otú ọ dị, isoro ha na-arụ ọrụ mere ka m nwee nnọọ ndakpọ olileanya, ebe ọ bụ na m tụrụ anya isoro ndị dị otú ahụ na-arụ ọrụ metụtara ihe ime mmụọ. Ikwurịta banyere ihe ime mmụọ na-amasị m, ma ọrụ m sooro Ụmụ Meri na-arụ emetụtaghị ihe ime mmụọ, o yikwara ka ọ dịtụghị oge ọ bụla a na-ewepụta maka ikwurịta banyere ihe ime mmụọ.
Mgbe m bi na London, ezutere m Patrick, bụ́ enyi ụmụnne m ndị nwoke. Anyị malitere ịhụ onwe anyị n’anya ma lụọ na 1961. Anyị nọ n’ebe ahụ mụọ ụmụ anyị abụọ mbụ, bụ́ Angela na Stephen. Ka e mesịrị, na 1967, anyị kwagara Australia, bụ́ ebe anyị nọ mụọ nwa anyị nke atọ, bụ́ Andrew. Anyị gara biri n’otu ime obodo bụ́ Bombala dị na New South Wales.
Nri Ime Mmụọ n’Ikpeazụ
N’oge na-adịghị anya anyị rutesịrị Australia, otu nwa okorobịa aha ya bụ Bill Lloyd bịara na nke anyị na Bombala iji soro anyị kwurịta banyere Bible. Obi tọrọ m ụtọ na e ji Bible kpọmkwem zaa ajụjụ m dị iche iche. Ma ọ bụ ezie na ahụrụ m na eziokwu dị n’ihe Bill na-ekwu, arụrụ m ya ụka nke ukwuu iji mee ka ọ ghara ịla na iji nwetakwuo nkọwa site na Bible. Ka e mesịrị, Bill wetaara m Bible na magazin ụfọdụ ka m gụọ.
Ịgụ magazin ndị ahụ na-amasị m nke ukwuu, ma n’ịbụ ihe ijuanya nye m, aghọtara m na ndị bipụtara ha ekweghị n’Atọ n’Ime Otu. N’ihi ya ezoro m magazin ndị ahụ, ka ha ghara imebi okwukwe Patrick ma ọ gụọ ha. Ekpebiri m inyeghachi ha Bill oge ọzọ ọ bịara, ma mgbe ọ bịara ọzọ, o gosiri m na ozizi ndị atọ mejupụtara otu Chineke megidere ozizi Bible kpọmkwem. N’oge na-adịghị anya, ọ bịara doo m anya na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, na ọ bụ Nna ya, bụ́ Jehova Chineke kere ya—n’ihi ya, o nwere mmalite—nakwa na Nna ahụ ka Jisọs ukwuu.—Matiu 16:16; Jọn 14:28; Ndị Kọlọsi 1:15; Mkpughe 3:14.
N’oge na-adịghị anya, amụtara m na ihe ndị ọzọ a kụziiri m mgbe m na-ekpe chọọchị Katọlik bụ ụgha. Dị ka ihe atụ, Bible adịghị ezi na ndị mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ ma ọ bụ na e nwere hel na-ere ọkụ bụ́ ebe a na-emekpa mmadụ ahụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Ịmụta nke ahụ bụ ihe wetaara m nnọọ obi iru ala! Otu ụbọchị, etegharịrị m egwú na kichin n’ihi inwe oké ọṅụ na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, achọtawo m Nna ahụ m nọworo na-ahụ n’anya kemgbe ma bụrụ onye m na-amatụghị. A malitere imeju agụụ ime mmụọ m. N’ịbụkwuru m ihe ọṅụ, Patrick nwekwara otu ịnụ ọkụ n’obi ahụ maka okwukwe ọhụrụ a.
Bill kpọrọ anyị òkù ịbịa mgbakọ Ndịàmà Jehova na Temora, bụ́ ime obodo ọzọ dị ná mba ahụ. Ọ bụ ezie na o ji ọtụtụ kilomita dịpụ adịpụ site n’ebe anyị bi, anyị ji obi ụtọ nakwere ọkpụkpọ òkù ahụ ma rute Temora ná mgbede Friday. N’ụtụtụ Saturday, ìgwè dị iche iche gbakọrọ n’ụlọ mgbakọ ahụ iji kere òkè ná nkwusa ụlọ n’ụlọ. Obi tọrọ mụ na Patrick ụtọ na anyị pụrụ iso gaa, ebe ọ bụ ihe anyị chọworo ime tupu ugbu a. Otú ọ dị, Bill kwuru na anyị agaghị enwe ike ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ n’ihi na anyị abụọ ka na-ese siga. Ma, mgbe Bill pụrụ, mụ na Patrick sonyeere ìgwè ọzọ. Ha chere na anyị bụ Ndịàmà, n’ihi ya kwa kpọrọ anyị gawa.
N’oge na-adịghị anya, anyị matara ihe ndị Akwụkwọ Nsọ chọrọ iji ruo eruo maka ikere òkè n’ikwusa ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14) Anyị mesịrị kwụsị ise siga, mụ na Patrick gosipụtara nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova Chineke site na baptism ime mmiri n’October 1968.
Ule nke Okwukwe Anyị
Ka anyị na-enwekwu ihe ọmụma banyere Bible ma na-enwe ọganihu ná mmekọrịta anyị na Jehova, okwukwe anyị bịara sie ike ná nkwa dị iche iche nke Chineke. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị a họpụtara Patrick dị ka okenye n’otu ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị na Canberra, bụ́ isi obodo Australia. Anyị nwara ike anyị iji zụlite ụmụ anyị n’ịdụ ọdụ nke Jehova, na-anagide ihe ịma aka nile a na-enwekarị n’ịzụlite ndị nọ n’afọ iri na ụma.—Ndị Efesọs 6:4.
N’ụzọ dị mwute, mgbe ọ dị afọ 18, nwa anyị nwoke bụ́ Stephen nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala. N’agbanyeghị mwute anyị, eziokwu ahụ bụ́ na Stephen ghọrọ onye na-efe Jehova bụ ihe nkasi obi nye anyị n’ezie. Anyị na-atụ anya ịhụ ya ọzọ mgbe Jehova ga-akpọlite ndị nọ n’ili ncheta. (Jọn 5:28, 29) N’afọ na-esochi, bụ́ 1983, esonyeere m nwa anyị nwanyị, bụ́ Angela, n’ozi oge nile, anọgidewokwa m n’ozi ahụ kemgbe ahụ. Isoro ndị ọzọ na-ekerịta olileanya anyị dabeere na Bible enyeworo m aka inwe nchekwube ná ndụ, o nyewokwa aka n’iwepụ ihe mgbu ahụ dị m n’obi. N’ịbụrụ m ihe oké ọṅụ, anụrụ m n’oge na-adịbeghị anya na nwanne m nwanyị bụ́ Annamay amalitela iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible na Wales.
Na 1984, Patrick malitere ịrịa ọrịa yiri ka ọ bụ nke a na-amaghị ihe ọ bụ n’oge ahụ. Ka e mesịrị, a chọpụtara na ọ bụ nsogbu oké ike ọgwụgwụ. O mesịrị hapụ ọrụ ego, ọ kwụsịkwara ije ozi dị ka onye Kraịst bụ́ okenye. N’ụzọ na-enye obi ụtọ, ọ gbaketụwo, ugbu a ọ na-ejekwa ozi ọzọ dị ka ohu a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ.
Oge m bụ nnọọ nwata mere ka m mụta nrubeisi na ịchụ onwe onye n’àjà, o mekwara ka m mụta ụzọ isi bie ndụ dị mfe na inwe afọ ojuju n’inwe ihe ole na ole. Ma ihe mere e ji debe anyị bụ́ ụmụntakịrị nwanyị 4 n’ebe obibi ndị nọn ahụ ma ụmụnne m ndị nke ọzọ dị 11 anọrọ n’ụlọ anọwo na-eju m anya. Ana m akasi onwe m obi site n’iche na ndị mụrụ m, bụ́ ndị nwụrụ ọtụtụ afọ gara aga, mere ihe nile ha nwere ike ime n’ọnọdụ ndị m na-apụghị ịghọtazu ma eleghị anya. Ihe siri ike n’oge ahụ, na-eme ka e mee mkpebi ndị siri ike. N’agbanyeghị nke a, ana m ekele ndị mụrụ m maka inye m ndụ na ilekọta m n’ụzọ kasị mma ha maara. Karịsịa, ana m ekele Jehova maka nlekọta ya yiri nke nna.
[Foto dị na peeji nke 26]
Mgbe anyị lụrụ di na nwunye ọhụrụ
[Foto dị na peeji nke 27]
Mgbe ụmụ anyị dị obere
[Foto dị na peeji nke 27]
Mụ na Patrick taa