Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
Eziokwu Bible Emee Ka Onye Nọn Nwere Onwe Ya na Bolivia
ỌTỤTỤ ndị nwere obi eziokwu na-agbapụ n’okpukpe ụgha, na-amụ eziokwu Bible, ma na-abịa ife Jehova, bụ́ ezi Chineke ahụ. Ihe karịrị 7,600 emewo otú ahụ na Bolivia, gụnyere onye nọn.
Mgbe ọ dị nanị afọ itoolu, M—— zutere otu onye n’ime Ndịàmà Jehova na nke mbụ ya. O mepere ụzọ mgbe Onyeàmà ahụ kpọtụrụ n’ebe obibi ya, na nke mbụ ya kwa, ọ nụrụ ka a kpọrọ aha Chineke, bụ́ Jehova. Nke ahụ dịgidere n’uche ya ruo ọtụtụ afọ.
Ebe ọ bụ na nanị ya bụ nwatakịrị nwanyị e nwere n’ezinụlọ ha, e kpebiri na o kwesịrị ịghọ onye nọn. “Lee otú m si nwee obi ụtọ na m gaje ịnọ n’ozi Chineke—ma ọ dịghị ihe ọzọ, nke ahụ bụ ihe m chere,” ka M—— kwuru. Ma ọṅụ ya ghọrọ nke a kụdara mgbe ọ hụrụ ikpe na-ezighị ezi na ile mmadụ anya n’ihu e ji eme ihe n’ebe obibi ndị nọn. Ọ sịrị: “Ma eleghị anya agaghị m echefu oge ndị ahụ nke inwe nkụda mmụọ nakwa ihe otiti ndị ahụ nke anụ ahụ na nke ime mmụọ nke na-egbu mmụọ, na-eme ka m lee Chineke anya, ọ bụghị dị ka Onye na-ahụ n’anya, kama dị ka Onye na-ata mmadụ ahụhụ n’enweghị obi ebere.”
Ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Mgbe m ghọrọ onye nọn, enweghị m ihe ịga nke ọma n’ịchọta aha ahụ bụ́ Jehova na Bible. Nanị ihe m hụrụ bụ ‘Yahweh,’ nke ahụ gbagwojukwara m anya. Otu ụbọchị ọbụna na m pụrụ ije chọọ ndị ahụ na-ekwu banyere Jehova, ma ọ dịghị mgbe m chọtara ha.
“Oge ụfọdụ gara, n’otu ụbọchị mgbe m na-agakwa n’ebe ndị ezinụlọ m bi, ahụrụ m otu ihe odide, ‘Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova.’ Achọrọ m ịgwa ha na ha bụ ndị amụma ụgha, ma ọ dịghị onye nọ n’ụlọ nzukọ ahụ. Alaghachiri m na Sunday. A na-enwe otu nzukọ, o yiri ka o juru mmadụ ole na ole n’ime ha anya ịhụ onye nọn kere ekike ha n’etiti ha. Mgbe e nwesịrị nzukọ ahụ, anwara m ịpụ ngwa ngwa. Otú o sina dị, otu n’ime Ndịàmà ahụ kelere m, ya mere ajụrụ m ya, sị, ‘N’ihi gịnị ka unu ji ekwulu aha Onye Nsọ site n’ịza aha ahụ?’ Ajụjụ m dujere n’inwe nkwurịta okwu na Bible, emekwara m ndokwa ka ọ bịa leta m n’ebe obibi ezinụlọ m. Ndị mụrụ m chụpụrụ ya. Otú ọ dị, anyị zutere ọzọ mgbe ọnwa abụọ gasịrị, o wee kpọọ m òkù ịbịa n’ebe obibi ya maka inwe ọmụmụ Bible. Ihe ọmụma ndị o gosiri m kpaliri mmasị m nke ukwuu, na-anwapụta na ndị Kraịst kwesịrị iji aha Chineke na-eme ihe. Ihe àmà ahụ nyere m ume dị mkpa iji jụ ihe nile na-abaghị uru a kụziwooro m dị ka onye nọn.
“Echetara m ọtụtụ ihe banyere ndụ m n’ebe obibi ndị nọn. Dị ka ihe atụ, ọ dị mgbe m chọrọ inwetakwu ihe oriri m ga na-eri. Ya mere edegaara m ndị mụrụ m akwụkwọ ma rịọ ka ha wetara m ụfọdụ, n’amaghị na a na-enyocha akwụkwọ ozi n’ebe obibi ndị nọn. N’oge iri ihe anyị ọzọ, e butere bredi buru ibu na ihe a na-anya n’elu ya n’ihu m, a manyekwara m iri ha nile. Ugbu a ihe oriri e nyere m gabigara ókè. Akọọrọ m ndị enyi m banyere nke a, otu onye tụrụ aro ka m gbarisie bredi nke m na-apụghị ịta ma fesasịa ha n’ala ụlọ. Mgbe m mere nke ahụ, otu onye nọn jidere m ozugbo ma kwatuo m n’ala ụlọ ahụ, na-eji olu ike na-enye iwu ka m jiri ire m hichaa ala ụlọ ahụ dum. Ime ụlọ ahụ buru ibu. Mgbe m na-eme ihe e nyere m iwu ka m mee, anụrụ m ka ọtụtụ ndị na-emumu ọnụ ọchị ma na-achị ọchị—ọ dịghị onye meere m ebere ma ọlị.
“Ugbu a apụrụ m ịhụ ihe magburu onwe ya ọ bụ inwere onwe m pụọ n’ihe ahụ nile. Dị ka a pụrụ ịtụ anya ya, ntọhapụ nke a chọrọ ịchụ ọtụtụ ihe n’àjà. Dị ka ihe atụ, nna m chụpụrụ m n’ụlọ ya. Otú o sina dị, tupu m hapụ ebe obibi ndị nọn ahụ, enwere m ihe ùgwù nke inyere ndị nọn ndị ọzọ ka na-eto eto aka ịmụta eziokwu. Enwere m ọṅụ ikwu na ụfọdụ n’ime anyị ararawo ndụ anyị nye Jehova Chineke!
“Mgbe m hapụrụ ebe obibi ndị nọn ahụ, o siiri nna m ike ịghọta ihe mere m ji jụ ịrụ ọrụ ndị na-enye ezigbo ego ma bụrụ ndị na-ewe oge. Otú ọ dị, achọkwuru m oge maka ijere Chineke ozi. Ugbu a m na-eje ozi dị ka onye ọsụ ụzọ oge nile, site na-ebighị ndụ dị mgbagwoju anya ma bụrụ nke na-akwụghachi ụgwọ. Dịkwa ka nke na-enye oké ọṅụ, nne m na nwanne m nwoke esonyeworo m n’ozi Jehova.”
N’ezie, eziokwu Bible na-eme ka mmadụ nwere onwe ya pụọ n’usoro okpukpe ụgha nke ụwa a, ọ na-ewetakwa ọṅụ na obi ụtọ na-adịgide adịgide.—Jọn 8:32.