Ịghọta Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo
“N’ABALỊ, ANA M ELE ỤKWỤ NA AKA M NWERE NKWARỤ WEE KWAA ÁKWÁ.”—MIDORI, JAPAN.
ỌRỊA ogbu na nkwonkwo etiwo ụmụ mmadụ ihe otiti ruo ọtụtụ narị afọ. Ozu ndị Ijipt a gbasiri agbasi na-enye ihe àmà na ọrịa ahụ dịrịị n’ọtụtụ narị afọ gara aga. Ihe àmà gosiri na onye na-eme nchọpụta bụ́ Christopher Columbus rịara ya. Ọtụtụ nde mmadụ taa na-arịakwa ya. Gịnịdị bụ ọrịa a na-akpata nkwarụ?
E si n’okwu Grik ndị pụtara “nkwonkwo ndị zara aza” nweta okwu a sụgharịrị ịbụ “ọrịa ogbu na nkwonkwo,” a na-ejikọtakwa ya na ìgwè ọrịa na nsogbu karịrị nnọọ 100 bụ́ ndị yiri ajụ oyi. Ọrịa ndị a pụrụ imetụta ọ bụghị nanị nkwonkwo kamakwa uru ahụ, ọkpụkpụ, na akwara bụ́ ndị na-akwagide ya. Ụdị ụfọdụ nke ọrịa ogbu na nkwonkwo pụrụ ibibi akpụkpọ ahụ gị, akụkụ ahụ ndị dị n’ime ahụ gị, nakwa ọbụna anya gị. Ka anyị lekwasị anya n’ọrịa abụọ a na-ejikọtakarị ha na ogbu na nkwonkwo—ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi na ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage bụ́ ihe na-adị n’isi ọkpụkpụ.
Otú Nkwonkwo Dị
Nkwonkwo bụ ebe ọkpụkpụ abụọ jikọtara ọnụ. Nkwonkwo nke nwere uru ahụ na-emepụta mmiri ahụ bụ́ synovia, na-enwe akwara ndị siri ike gbara ya gburugburu bụ́ ndị na-echebe ma na-akwagide ya. (Lee ihe osise dị na peeji nke 4.) Akwara ndị ahụ na-agba nkwonkwo gburugburu nwere uru ahụ na-emepụta mmiri n’ime ha. Uru ahụ a na-emepụta mmiri na-alọ alọ. N’ime akwara na-ekpuchi nkwonkwo, e nwere ihe na-akwọ mụrụmụrụ nke dị ka rọba bụ́ nke a maara dị ka cartilage na-ekpuchi isi ọkpụkpụ abụọ ndị ahụ. Nke a na-egbochi ọkpụkpụ gị ịdị na-echikọta ma na-echihịa ibe ha. Cartilage na-arụkwa ọrụ dị ka ajụ́, na-adị ka fom n’etiti isi ọkpụkpụ gị ma na-eme ka ọkpụkpụ gị soro na-ebu ibu ndị na-abịakwasị ha.
Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-aga ije, na-agba ọsọ, ma ọ bụ na-awụli elu, ibu dị arọ nke a na-ebokwasị úkwù na ikpere gị pụrụ iji okpukpu anọ ruo okpukpu asatọ karịa ịdị arọ nke ahụ gị! Ọ bụ ezie na uru ahụ na akwara ndị na-ejikọta ọkpụkpụ bụ́ ndị dị gburugburu ha na-enye aka n’ibu ibu ndị na-abịakwasị ha, cartilage na-enyere ọkpụkpụ gị aka ibuli ibu a site n’ịfụkọta dị ka fom.
Ọrịa Ogbu na nkwonkwo nke Yiri Ajụ Oyi
N’ihe banyere ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi, usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ na-awakpo nkwokwo nile ajọ mwakpo. N’ihi ihe a na-amaghị ihe kpatara ya, ọnụ ọgụgụ buru ibu nke mkpụrụ ndụ ọbara—gụnyere mkpụrụ ndụ T, bụ́ ndị na-arụ ọrụ bụ́ isi n’usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ—na-asọbanye n’oghere ndị dị na nkwonkwo. Nke a na-akpalite mmeghasị nke mmiri ọgwụ dị n’ahụ bụ́ nke na-eme ka nkwonkwo zaa azaa. Mkpụrụ ndụ uru ahụ nke na-emepụta mmiri ahụ bụ́ synovia pụrụ ịmalite ịmụba n’ụzọ na-enweghị nchịkwa, na-emepụta uru ahụ yiri akpụ̀ bụ́ nke a na-akpọ pannus. N’aka nke ya, akpụ̀ pannus na-emepụta enzyme ndị na-ebibi cartilage bụ́ ihe ahụ na-adị n’isi ọkpụkpụ. Elu ọkpụkpụ dị iche iche pụrụ ịrapara n’ibe ha, na-eme ka ha ghara ịdị na-emegharịcha emegharị—na-akpatakwa oké ihe mgbu. Usoro mbibi a na-emekwa ka akwara ndị na-ejikọta nkwonkwo nakwa uru ahụ gharazie isi ike, na-emekwa ka nkwonkwo bụrụ nke na-akwụsikwaghị ike ma bụrụ nke chipụtụrụ echipụ, mgbe mgbe na-eme ka ahụ zaa azaa. Dị ka ọ na-adịkarị, ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi na-emetụta nkwonkwo n’ụzọ na-agakọ ọnụ, na-emetụta nkwonkwo aka, ikpere, na ụkwụ. Etuto na-etokwa ihe ruru pasent 50 nke ndị a chọpụtara na ha bu ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi n’ahụ. Ụfọdụ ndị na-enwe ụkọ ọbara na akpịrị ịkpọ nkụ na igbu mgbu nke anya na akpịrị. Ike ọgwụgwụ na mgbaàmà ndị yiri nke ahụ ọkụ, gụnyere igbu mgbu nke uru ahụ na ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi na-agakọ.
Ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi dịgasị iche iche n’otú o si emetụta mmadụ, amalite, nakwa n’oge ọ na-anọru. N’ebe otu onye nọ, ihe mgbu ya na isi ike ya pụrụ iji nwayọọ nwayọọ malite n’ime ọtụtụ izu ma ọ bụ ọbụna ọtụtụ afọ. N’ebe onye ọzọ nọ, ọ pụrụ ịmalite nnọọ na mberede. N’ebe ụfọdụ ndị nọ, ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi na-adịru ọnwa ole na ole ma laa n’enweghị mbibi ihe ọ bụla pụtara ìhè. Ndị ọzọ pụrụ inwe oge mgbe mgbaàmà ha na-aka njọ, bụ́ nke oge nke mbelata nke mgbaàmà na-esochi bụ́ mgbe ha na-agbaketụ. N’ebe ụfọdụ ndị na-arịa ya nọ, ọrịa ahụ na-adịgide ruo ọtụtụ afọ, nọgide na-akwarụ ha.
Olee ndị pụrụ ịrịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi? “Ọ na-arịakarị ndị inyom katatụrụla ahụ,” ka Dr. Michael Schiff na-ekwu. Otú ọ dị, Schiff kwukwara na “ọ pụrụ imetụta onye ọ bụla nọ n’afọ ndụ ọ bụla gụnyere ụmụaka, nakwa ndị ikom.” N’ebe ndị nwere ndị ikwu nwere ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi nọ, ohere ha nwere ịrịa ya na-arị elu. Ọtụtụ nnyocha na-egosikwa na ise siga, oké ibu, na mmadụ ịbụ onye a mịnyetụworo ọbara bụcha ihe ndị na-amụba ohere ahụ.
Ọrịa Ogbu na Nkwonkwo nke Na-ebibi Cartilage
“N’ọtụtụ ụzọ,” ka akwụkwọ bụ́ Western Journal of Medicine na-ekwu, “ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage, yiri ihu igwe—ọ na-emetụta ebe nile, a dịkarịghịkwa ama na ọ bụ ya, mgbe ụfọdụ mmetụta ya na-adị ukwuu.” N’adịghị ka ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi, ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage adịkebeghị agbasaru akụkụ ahụ ndị ọzọ kama ọ na-anọgide na-enwe mmetụta ya na-ebibi ebibi nanị n’otu ma ọ bụ na nkwonkwo ole na ole. Ka o ji nwayọọ nwayọọ ebibi cartilage, ọkpụkpụ na-amalite ichita ibe ha. Ntopụta ọkpụkpụ nke a na-akpọ osteophytes na-esochi nke a. Akpụ̀ nwere ike itopụta, ọkpụkpụ dịkwa n’ebe ahụ na-esi ike ma nwee nkwarụ. Mgbaàmà ndị ọzọ na-agụnye nkwonkwo inwe akpụ̀, nkwonkwo ịda kwịkị kwịkị, na nsekọta nke uru ahụ, ya na ahụ mgbu, nkwonkwo apịajighị apịaji, na agagharịzighị agagharị.
N’oge ndị gara aga, e chere na ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage bụ nanị ihe ịka nká na-akpata. Otú ọ dị, ndị ọkachamara agbahapụwo nkwenkwe ahụ e nweworo eri oge. Akwụkwọ bụ́ The American Journal of Medicine na-ekwu, sị: “E nweghị ihe àmà na-egosi na nkwonkwo na-enweghị ọrịa, bụ́ nke na-ebu ibu dị otú o kwesịrị, ga-akwụsị ịrụ ọrụ n’oge ndụ mmadụ.” Gịnịzi na-akpata ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage? Mgbalị ndị a na-eme ịghọta ihe na-akpata ya kpọmkwem abụwo nke “a na-arụrụ nnukwu ụka,” dị ka magazin Britain bụ́ The Lancet si kwuo. Ndị nnyocha ụfọdụ na-atụ aro na a pụrụ ibu ụzọ nwee mbibi nke ọkpụkpụ, dị ka mgbaji ọkpụkpụ nke anya na-apụghị ịhụ. N’aka nke ya, nke a pụrụ ịkpalite ntopụta nke ọkpụkpụ ma mee ka cartilage jiri nke nta nke nta na-ebibi. Ndị ọzọ na-eche na ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage na-amalite n’ime cartilage n’onwe ya. Ha na-eche na ka ọ na-emebi ma na-agbarisị, ibu ọkpụkpụ ọ dị na ya na-ebu na-ebuwanye ibu. A na-enwe mgbanwe ndị ọrịa ahụ na-akpata ka ahụ na-agbalị idozi cartilage ahụ mebiri emebi.
Olee ndị pụrụ ịrịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage? Ọ bụ ezie na ịka nká nanị adịghị akpata ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage, cartilage na-ebibi karị ka mmadụ na-akawanye nká. Ndị ọzọ ọ pụrụ imetụta pụrụ ịgụnye ndị isi nkwonkwo ha na-ejikọtaghị ọnụ nke ọma ma ọ bụ ndị nwere ụkwụ na uru apata na-esighị ike, ụkwụ ndị na-ahaghị nhata, ma ọ bụ ọkpụkpụ azụ na-adịzighị adịzi. Mmebi nke ihe ọghọm ma ọ bụ ọrụ nke na-eme ka e jiri nkwonkwo rụọ ọrụ gabiga ókè kpataara nkwonkwo pụkwara iso kpata ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage. Mgbe mmerụ ahụ kawanyere njọ, ibubiga ibu ókè pụrụ ime ka ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage ka njọ.
Dr. Tim Spector na-ekwu, sị: “Ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage bụ ọrịa dị mgbagwoju anya nke nwere ihe ndị dị gburugburu ebe obibi na-akpata ya, ma, e nwekwara ihe siri ike na-egosi na a na-ebute ya site n’ọmụmụ.” Ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịrịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage bụ ndị inyom katatụrụ ahụ nakwa ndị inyom meworo agadi karị bụ́ ndị ndị ezinụlọ ha na-arịa ọrịa ahụ. N’adịghị ka ọrịa ọkpụkpụ bụ́ osteoporosis, a na-enwe ịdị arọ nke ọkpụkpụ kama ịdị fere fere tupu a rịawa ọrịa ogbu na nkwonkwo nke na-ebibi cartilage. Ndị nchọpụta ụfọdụ na-ekwu na mbibi sitere n’ikuku oxygen na-adịghị mma na ụkọ vitamin C na vitamin D bụkwa ihe ndị na-akpata ya.
Ọgwụgwọ
Ọgwụgwọ maka ọrịa ogbu na nkwonkwo na-agụnyekarị ngwakọta nke ịṅụ ọgwụ, mmega ahụ, na mgbanwe nke ụzọ ndụ. Onye na-eji mmega ahụ agwọ ọrịa pụrụ ịtụpụta otu usoro ọgwụgwọ mmega ahụ. Ọ pụrụ ịgụnye ụdị mmega ahụ dịgasị iche iche, mgbatị uru ahụ, nsekọta uru ahụ ma ọ bụ mbuli na mbuda ihe. E gosiwo na ihe ndị a pụrụ ibelata ọtụtụ mgbaàmà gụnyere igbu mgbu na ọzịza nke nkwonkwo, ike ọgwụgwụ, ahụ mkpaghasị, na ịda mbà n’obi. A na-ahụ abamuru nke mmega ahụ ọbụna n’ebe ndị agadi nọ. Mmega ahụ pụkwara ime ka ịdị arọ nke ọkpụkpụ ghara ịdalata. Ụfọdụ ndị na-azọrọ na e belatatụwokwa ihe mgbu site n’ụdị dị iche iche nke usoro iji okpomokụ na oyi agwọ ọrịa na iji ịdụnye agịga n’ahụ agwọ ọrịa.a
Ebe ọ bụ na ndalata nke ịdị arọ mmadụ pụrụ ibelata ihe mgbu nke nkwonkwo n’ụzọ dị ukwuu, ihe oriri pụrụ ịbụ isi ihe na-enye aka n’ịnagide ọrịa ogbu na nkwonkwo. Ọbụna ụfọdụ ndị azọrọwo na ihe oriri ndị gụnyere nri ndị nwere calcium n’ụba dị ka akwụkwọ nri, mkpụrụ osisi ndị a ghọtara ọhụrụ, na azụ̀ ndị na-ebi na mmiri jụrụ oyi bụ́ ndị abụba bụ́ omega-3 jupụtara na ha—nakwa ibelata iri nri ndị e ji mmiri ọgwụ dị iche iche chekwaa na ndị jupụtara n’abụba—pụrụ ọ bụghị nanị inye aka mee ka e felata kamakwa ibelata ihe mgbu. N’ụzọ dị aṅaa? Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe oriri dị otú ahụ na-egbochi ahụ ịza aza. A na-azọrọkwa na ihe oriri ndị na-enweghị anụ, mmiri ara ehi, ọka wheat, na akwụkwọ nri ndị na-adịghị eto ka osisi, ndị dị ka tomato, poteto, ose, na aṅara, arụwokwa ọrụ n’ebe ụfọdụ ndị nọ.
N’ọnọdụ ụfọdụ, a na-atụ aro usoro ịwa ahụ a na-akpọ arthroscopy. Nke a gụnyere ịwanye ihe kpọmkwem na nkwonkwo, bụ́ nke na-ekwe ka dọkịta na-awa ahụ wepụ uru ahụ na-emepụta mmiri ahụ bụ́ enzyme na-ebibi ihe. Otú ọ dị, ịdị irè nke usoro a bụ nke a kpaara ókè, ebe ọ bụ na ahụ ọzịza na-abịaghachikarị. Usoro kadị sie ike bụ mgbanwe nkwonkwo, bụ́ mgbe nkwonkwo dum (nke na-abụkarị úkwù ma ọ bụ ikpere) na-aghọ ndị e ji ndị nke aka mere dochie anya ha. Ịwa ahụ a na-adị irè ruo afọ 10 na afọ 15, ọ na-adịkarịkwa nnọọ irè n’ịkwụsị ihe mgbu.
N’oge na-adịbeghị nnọọ anya, ndị dọkịta anwalewo ụdị ọgwụgwọ ndị na-ebelata ịwakasị mmadụ ahụ, dị ka usoro nke ime ka uru ahụ nke na-emepụta mmiri ahụ synovia na-emepụtaghachi nke na-alọ alọ, bụ́ usoro nke ịgbanye mmiri ọgwụ bụ́ hyaluronic kpọmkwem na nkwonkwo. A na-emekarị nke a n’ikpere. Ịgbanye mmiri ọgwụ ndị na-akpali ndozi nke cartilage (ihe ndị na-echekwa cartilage) enwewokwa ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma, dị ka nnyocha ụfọdụ e mere na Europe si gosi.
Ọ bụ ezie na ọ dịbeghị ọgwụ ọ bụla a chọpụtara na-agwọ ọrịa ogbu na nkwonkwo, ọtụtụ ọgwụ na-ebelata ihe mgbu na ahụ ọzịza, ụfọdụ enwewokwa ihe ịga nke ọma n’ibelata mgbasa nke ọrịa ahụ. Ọgwụ ahụ mgbu nakwa ọgwụ corticosteroid, ọgwụ ndị so ná ndị na-agwọ ahụ ọzịza bụ́ ndị a na-ejighị mmiri ọgwụ steroid mee (NSAID), ọgwụ ndị na-ebelata ọrịa bụ́ ndị e ji agwọ ajụ oyi (DMARD), ọgwụ ndị na-egbochi ahụ anabataghị ihe, ndị na-ebelata mkpaghasị nke ahụ, nakwa ọgwụ ndị e megharịrị emegharị iji gbanwee usoro mmeghachi omume nke usoro ahụ ji alụso ọrịa ọgụ bụcha akụkụ nke ngwá ọgụ ndị e ji eme ihe iji belata mgbaàmà ndị na-agwụ ike nke ọrịa ogbu na nkwonkwo. Otú ọ dị, ọ pụrụ ifu ihe dị ukwuu iji nweta ahụ efe, ebe ọ bụ na nke ọ bụla n’ime ụdị ọgwụ ndị a nile pụrụ ịkpata mmetụta ndị dị oké njọ. Ịtụle abamuru na ihe ize ndụ ndị pụrụ ịdị na ha na-abụrụ ma onye na-arịa ọrịa a ma onye dọkịta ihe ịma aka.
Olee otú ụfọdụ ndị nweworo mmetụta na-ebibi ihe nke ọrịa ogbu na nkwonkwo siworo nwee ike ịnagide ọrịa a na-akpata ihe mgbu?
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Teta! adịghị akwado usoro ọgwụgwọ, ọgwụ, ma ọ bụ ịwa ahụ nke ọ bụla. Onye nke bụla na-arịa ọrịa nwere ibu ọrụ nke ịchọpụta na iji nlezianya tụlee ọgwụgwọ nke ọ bụla dabere n’ihe ndị a maara banyere ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
OKÉ IBU, ISE SIGA, NA MMADỤ ỊBỤ ONYE A MỊNYETỤWORO ỌBARA PỤRỤ ỊMỤBA OHERE NKE ỊMALITE ỊRỊA ỌRỊA OGBU NA NKWONKWO NKE YIRI AJỤ OYI
[Igbe/Foto dị na peeji nke 8]
USORO ỌGWỤGWỌ NDỊ ỌZỌ
E chere na ụfọdụ ihe ndị e ji agwọ ya adịchaghị ize ndụ otú usoro ọgwụgwọ ọdịnala dị, ha na-enwekwa mmetụta ọjọọ ole na ole karịa ya. N’ime ha bụ ọgwụ type II collagen a na-aṅụ aṅụ, bụ́ nke ndị nnyocha ụfọdụ na-azọrọ na o nwewo ihe ịga nke ọma n’ibelata ọzịza nkwonkwo na ihe mgbu nke ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi (RA). N’ụzọ dị aṅaa? Site n’igbochi protein bụ́ cytokine ndị na-akpata ahụ ọzịza na ndị na-ebibi ihe, bụ́ interleukin-1 na tumor necrosis factor α (protein na-akụkpọ etuto). E kwuwokwa na ihe oriri ole na ole na-edozi ahụ egosiwokwa ikike ụfọdụ nke ibelata ihe ndị a na-ebibi ihe. Ha gụnyere vitamin E, vitamin C, niacinamide, mmanụ azụ̀ ndị jupụtara na eicosapentaenoic acid na gammalinolenic acid, mmanụ sitere ná mkpụrụ osisi borage, na mmanụ nke okooko osisi bụ́ evening primrose. Na China, e jiwo Tripterygium wilfordii Hook F, bụ́ ọgwụ mkpá akwụkwọ mee ihe ruo ọtụtụ afọ. A kọrọ na o nwewo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga nke ọma n’ibelata mmetụta nke ọrịa ogbu na nkwonkwo nke yiri ajụ oyi.
[Ihe Osise dị na peeji nke 4, 5]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
NKWONKWO NA-EBUGHỊ ỌRỊA
IHE NA-ADỊ N’ETITI AKWARA NA ỌKPỤKPỤ
URU AHỤ
CARTILAGE
AKWARA NA-EJIKỌTA ỌKPỤKPỤ
AKWARA NDỊ NA-EKPUCHI NKWONKWO
URU AHỤ NA-EMEPỤTA MMIRI AHỤ BỤ́ SYNOVIA
ỌKPỤKPỤ
MMIRI AHỤ BỤ́ SYNOVIA
NKWONKWO NWERE ỌRỊA OGBU NA NKWONKWO YIRI AJỤ OYI
MKPACHIKỌTA
MBIBI NKE ỌKPỤKPỤ NA CARTILAGE
URU AHỤ ZARA AZA NKE NA-EMEPỤTA MMIRI AHỤ BỤ́ SYNOVIA
NKWONKWO NWERE ỌRỊA OGBU NA NKWONKWO NKE NA-EBIBI CARTILAGE
AKỤKỤ ỤFỌDỤ NKE CARTILAGE NA-ESIGHỊZI IKE
MBIBI NKE CARTILAGE
ỌKPỤKPỤ NUPỤTARA ENUPỤTA
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ebe e si nweta ya: Òtù Na-ahụ Maka Ọria Ogbu na Nkwonkwo
[Foto ndị dị na peeji nke 7]
Ogbu na nkwonkwo pụrụ imetụta ndị nọ n’afọ ndụ ọ bụla
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Usoro mmega ahụ na ihe oriri kwesịrị ekwesị pụrụ ime ka o belatatụ