Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g03 2/8 p. 14
  • Nweta Ihe Ọmụma Ziri ezi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nweta Ihe Ọmụma Ziri ezi
  • Teta!—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ịntanet Na-eme Ihe Otú Kwesịrị Ekwesị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Mmadụ Ịchọ Onye Ọ Ga-alụ n’Intanet Ọ̀ Pụrụ Ịdị Ize Ndụ n’Ezie?
    Teta!—2005
  • Ozi Ọma n’Internet
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Iji Internet Na-eme Ihe—Nọrọ na Nche Maka Ihe Ize Ndụ Ndị Dị na Ya!
    Ozi Alaeze Anyi—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2003
g03 2/8 p. 14

Nweta Ihe Ọmụma Ziri ezi

O siri ike inweta ihe ọmụma ziri ezi n’isiokwu dị iche iche. Gọọmenti na ụlọ ọrụ dị iche iche adịghị ekwucha ihe nile bụ eziokwu. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị iche iche na-ekwekarị nkwa na ha ga na-akọ ihe otú ha si mee n’ezie, ma ha adịghị emezu nkwa ha. Ndị dọkịta adịghị akọwacha mgbe nile mmetụta na-adịghị mma ọgwụ ndị ha na-enye anyị na-enwe. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi nweta ihe ọmụma a pụrụ ịtụkwasị obi?

Ọtụtụ ndị toro mpụta Intanet pụtara dị ka ụzọ a ga-esi na-enweta ihe ọmụma ndị a pụrụ ịdabere na ha bụ́ ndị sitere gburugburu ụwa. N’ezie, nke ahụ pụrụ ikwe omume ma ọ bụrụ na ị maara kpọmkwem ebe ị ga-achọ ihe ọmụma ahụ. “Akụkụ kasị baa uru nke Intanet bụ na ọ pụrụ ime ka ndị mmadụ nweta ihe ọmụma n’ụzọ dị ngwa karịa ngwá ọrụ mgbasa ozi ọ bụla ọzọ. Akụkụ ya kasị njọ bụ na ọ pụrụ ibelata uto nke ọgụgụ isi ndị mmadụ n’ụzọ dị ngwa karịa ngwá ọrụ mgbasa ozi ọ bụla ọzọ,” ka uche akwụkwọ akụkọ The New York Times kwuru.

Uche akwụkwọ akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ebe ọ bụ na a na-ele Intanet anya dị ka ‘nkà na ụzụ’ bụ́ ọkpọka, ndị na-amaghị nke a na-akọ na-ekwenye n’ihe ọmụma ọ bụla sitere na ya ọbụna karị. Ha adịghị aghọta na Intanet, n’akụkụ ya kasị njọ, yiri nnọọ olulu nsị: ngwá ọrụ electronic a na-ekponye ihe ọmụma a na-anwapụtaghị anwapụta, nke a na-ahọchaghị ahọcha.” N’ụzọ dị mwute, dị ka onye dere ya kwuru, e nweghị ihe omume kọmputa a pụrụ iji na-ewepụ ihe ọmụma ndị na-abaghị uru.

Onye ọ bụla pụrụ itinye ihe ọ bụla n’Intanet, na magazin, ma ọ bụ n’akwụkwọ. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị jiri nghọta mee ihe ma zụọ onwe anyị ka anyị wee ghara nnọọ ịbụ ndị a ghọgburu ikwenye n’ihe ọ bụla anyị gụrụ. Ndị ọ bụla n’ime anyị chọrọ inweta ihe ọmụma ziri ezi aghaghị ibu ụzọ hụ na ebe anyị si enweta ya bụ ebe a pụrụ ịdabere adabere. Nke a pụrụ iwe oge. Ma ozugbo anyị mere otú ahụ ma nweta ihe ọmụma ziri ezi karị, echiche anyị pụrụ izi ezi, anyị pụrụ ile ihe anya n’ụzọ ziri ezi, na-enwekwa obi ike mgbe anyị na-eme mkpebi ndị dị mkpa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya