Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g03 7/8 p. 10-11
  • Ihe Ngwọta Dị Irè—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ngwọta Dị Irè—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?
  • Teta!—2003
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • A Chọrọ Mgbanwe Uche na Obi
  • Ị Pụrụ Irite Uru Ugbu A
  • Ụwa Mpụ Na-adịghị Ga-abịa n’Isi Nso!
    Teta!—1998
  • Mgbe Mpụ Na-adịghị
    Teta!—1998
  • “Okwu Chineke Dị Ndụ, Na-arụsikwa Ọrụ Ike”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Otú Anyị Ga-esi Yiri Mmadụ Ọhụrụ Ahụ, Gharakwa Iyipụ Ya Ọzọ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2003
g03 7/8 p. 10-11

Ihe Ngwọta Dị Irè—Ọ̀ Ga-ekwe Omume?

O YIRI ka mpụ ọ̀ bụ ihe na-adịgide adịgide n’etiti ọha mmadụ n’oge a. N’agbanyeghị mgbalị ndị ọrụ ebere, ndị ọrụ nchekwa iwu, na ndị ọkà n’ịkpụzigharị àgwà ndị omekome ji ezi nzube obi na-eme, ụwa na-aghọwanye ebe dị ize ndụ. È nwere ihe ngwọta dịnụ?

Bible na-egosi na a na-aga inwe mgbanwe dị ukwuu. Nke a agaghị abịa site ná mgbalị nke ndị ọchịchị bụ́ mmadụ. A kpaara ikike nke ndị ọchịchị nile bụ́ mmadụ ókè, otú ọ sọrọ ihe mgbaru ọsọ ha ya dịruo ná mma. Ha enweghị nnọọ ikike na ihe ndị dị mkpa iji wepụ ihe na-akpata mpụ ma ọ bụ iji guzobe usoro ihe nke dị nchebe n’ụzọ na-adịgide adịgide.

Ọ bụ Onye Okike anyị ga-eweta mgbanwe ahụ Bible na-ekwu banyere ya. Ebe ọ bụ ya kere eluigwe na ala, o nwere ikike, o rukwaara ya ime ihe ụmụ mmadụ na-apụghị ime. Bible na-akọwa ya dị ka onye “na-eme ndị isi ka ha ghọọ ihe efu; O mewo ndị ikpe ụwa ka ha dị ka ebe tọgbọrọ n’efu . . . , O nwere ume n’ike.” (Aịsaịa 40:23-26) Olee mgbanwe ndị Chineke na-ekwe nkwa na a ga-enwe, oleekwa otú mgbanwe ndị a si enye anyị ezi olileanya maka ụwa ka mma?

Abụ Ọma 37:10 na-agwa anyị banyere nkwa Chineke, sị: “Ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa: ị ga-elekwasịkwa ọnọdụ ya anya, ma [onye ahụ na-emebi iwu agaghị] anọ.” Chineke zubere ikpochapụ ndị ajọ omume na-ekweghị mmekwata, bụ́ ndị na-enweghị ọchịchọ ọ bụla ime mgbanwe. Otú ọ dị, ọ gaghị ebibi mmadụ nile. Ọbụ abụ ahụ na-ekwe ndị nwere ọchịchọ ịghọ ndị dị nwayọọ, ndị dị obi umeala, na ndị na-eme udo, nkwa, sị: “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ Ya, ọ ga-ebulikwa gị inweta ala; mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ.” Mgbe e bibisịworo ndị na-emebi iwu, ndị ga-afọdụ ga-enwe “ịba ụba nke udo”—ụwa ebe ụdị mpụ ọ bụla na-agaghị adị.—Abụ Ọma 37:11, 34.

A Chọrọ Mgbanwe Uche na Obi

Iji dozie nsogbu nke ime mpụ kpam kpam, o zughị ezu nanị ibibi ndị ajọ omume na ịzọpụta ndị ezi mmadụ. Ime mpụ na-esitekarị n’azụghị obi na uche ndị mmadụ nke ọma. Otú ọ dị, ọ bụ ebe ahụ ka ọchịchị Chineke ga-akarị ọchịchị ndị ọzọ. A ga-enye ntụziaka na mmụta ndị dị irè iji zụọ ndị mmadụ ka ha wee hụ ezi omume n’anya. Aịsaịa 54:13 na-ekwu, sị: “Ụmụ gị nile ga-abụ ndị mmụta Jehova; udo nke ụmụ gị ga-abakwa ụba.”

Ihe ọ ga-arụpụta ga-abụ nke na-enye afọ ojuju n’ezie! Bible na-ekwu n’ụzọ ihe atụ banyere mgbanwe a ga-enwe n’ebe ndị nwetụworo àgwà ndị yiri nke ụmụ anụmanụ nọ. Ọ na-ekwu, sị: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe.” N’ihi gịnị? “N’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa, dị ka mmiri si ekpuchi oké osimiri.” (Aịsaịa 11:6, 9) Otú ọ dị, ọ dịghị mkpa ka gị na ezinụlọ gị chere ruo n’ọdịnihu tupu unu emee mgbanwe ndị dị otú ahụ. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

Ị Pụrụ Irite Uru Ugbu A

E nwere ndị na-eme mgbanwe ndị dị mkpa ugbu a iji kwadebe maka ụwa nke ime mpụ na-agaghị adị na ya. Ha amaliteworị iyikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ, ụdị àgwà Chineke chọrọ ka ndị ga-ebi n’ụwa ọhụrụ ya nwee. (2 Pita 3:13) Ha na-eme nke a site n’itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ ná ndụ ha. Rịba ama nkọwa na-akpali mmasị Bible na-enye: “Ka e wee mee ka unu dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche unu, ka unu wee yikwasịkwa ụdị mmadụ ọhụrụ ahụ bụ́ nke e kere dị ka uche Chineke si dị n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.”—Ndị Efesọs 4:23, 24.

Ndị Kọlọsi 3:12-14 na-akọwakwu banyere àgwà ọma ndị nwere obi eziokwu na-azụlite ugbu a. Ọ na-ekwu, sị: “Dị ka ndị Chineke họọrọ, ndị dị nsọ a hụkwara n’anya, yikwasịnụ onwe unu mmetụta ndị dị nro bụ́ ọmịiko, obiọma, ịdị umeala n’obi, ịdị nwayọọ, na ogologo ntachi obi. Nọgidenụ na-anagiderịta ibe unu ma na-agbaghara ibe unu kpam kpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpam kpam, na-emekwanụ otú ahụ. Ma, e wezụga ihe ndị a nile, yikwasịnụ onwe unu ịhụnanya, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”

Ọ̀ ga-amasị gị inweta enyemaka iji yikwasị ụdị mmadụ ọhụrụ nke Ndị Kraịst? Ọtụtụ nde mmadụ gburugburu ụwa emewalarị otú ahụ site n’enyemaka nke Ndịàmà Jehova. Ná nzukọ ndị a na-enwe mgbe nile n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche, nakwa ná mgbakọ ndị buru ibu, ọbụna ndị bụbu ndị omekome na-eme ihe ike amụtawo ụzọ ha ga-esi yikwasị ụdị mmadụ na-eme udo.a Ọ bụrụ na ọ ga-amasị gị irite uru site n’usoro ọmụmụ Bible dị otú ahụ magburu onwe ya, egbula oge n’ịkpọtụrụ ndị bipụtara magazin a. Ha ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka isonye ná ndị na-akwadebe ugbu a ibi n’ụwa ọhụrụ Chineke nke mpụ na-agaghị adị na ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Iji nweta ihe atụ dị iche iche, lee mbipụta Teta! nke May 8, 2001, peeji nke 8-10.

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

Ọtụtụ nde mmadụ na-enweta ọzụzụ maka ibi ndụ n’ụwa mpụ na-agaghị adị na ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya