Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/14 p. 10-11
  • Jizọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jizọs
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs ọ̀ bụ Chineke?
  • Olee mgbe a mụrụ Jizọs?
  • À kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu?
  • À Mụrụ Jizọs Na December?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?
    Teta!—2009
  • Azịza nke Ajụjụ Ndị A Na-ajụ Banyere Jizọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ònye Bụ Jizọs Kraịst?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 1/14 p. 10-11

IHE BAỊBỤL KWURU

Jizọs

Jizọs ọ̀ bụ Chineke?

“Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” —Jọn 1:18.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na Jizọs abụghị Chineke. Ma, ụfọdụ ndị na-ekwu na e nwere amaokwu Baịbụl ndị na-egosi na Jizọs na Chineke hà.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl ekwughị na Jizọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, o kwughịkwa na ha abụọ hà. Kama, o kwuru na Chineke ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Baịbụl kwukwara, sị: “Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Ma, ọtụtụ ndị hụrụ Jizọs mgbe ọ bịara n’ụwa. N’ihi ya, ọ bụghị Chineke.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwughị na ọ bụ Chineke. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dere, sị: “E dere ihe ndị a ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”—Jọn 20:31.a

Olee mgbe a mụrụ Jizọs?

“E nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.”—Luk 2:8.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-agba Krismas n’ụbọchị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba n’ihi na ha na-ekwu na ọ bụ ụbọchị ahụ ka a mụrụ Jizọs. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ n’ọnwa Jenụwarị ka a mụrụ ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ma, o kwuru na mgbe a mụrụ ya, ‘e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa, na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.’ (Luk 2:8) O nweghị ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-esi chịrị atụrụ ha nọrọ n’èzí n’abalị n’ọnwa Disemba ma ọ bụkwanụ n’ọnwa Jenụwarị. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo otú a?

Ọ bụ n’ihi na n’ebe a mụrụ Jizọs, ezigbo oyi na-atụ n’ọnwa Disemba nakwa n’ọnwa Jenụwarị. Baịbụl kwuru na n’oge Disemba na Jenụwarị, ndị mmadụ “na-ama jijiji n’ihi . . . mmiri ozuzo.” (Ezra 10:9, 13; Jeremaya 36:22) N’ihi ya, oge ahụ abụghị oge ndị ọzụzụ atụrụ ga-eji chịrị atụrụ ha gaa ‘biri n’ọhịa.’

À kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu?

“Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite [Jizọs].”—Ọrụ Ndịozi 3:15.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ekwetaghị na e nwere ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ. Ha ekweghịkwa na Jizọs si n’ọnwụ bilite.

IHE BAỊBỤL KWURU

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-ata ya ọtụtụ ahụhụ, gbuokwa ya. O kwukwara na a ga-akpọlite ya n’ụbọchị nke atọ. (Matiu 16:21) Baịbụl kwuru na mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ihe karịrị narị mmadụ ise hụrụ ya. (1 Ndị Kọrịnt 15:6) Ndị ahụ hụrụ ya enweghị obi abụọ na o bilitere n’ọnwụ. E gbudịrị ụfọdụ n’ime ha n’ihi na ha kwetasịrị ike na Jizọs si n’ọnwụ bilie.—Ọrụ Ndịozi 7:51-60; 12:1, 2.

IHE MERE O JI GBASA GỊ

Baịbụl kwuru na ọnwụ Jizọs nwụrụ na otú Chineke si kpọlite ya n’ọnwụ ga-abara ụmụ mmadụ uru. Uru ha ga-erite bụ na ha ga-ebi n’ụwa mgbe Chineke ga-eme ka ọ ghọọ Paradaịs. (Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ọ bụ maka na Jizọs na Nna ya bụ́ Jehova hụrụ anyị n’anya mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs, bụ́ ebe anyị ga-enwe obi ụtọ.—Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23.

a Baịbụl ekwughị na Chineke lụrụ nwaanyị, ya amụtara ya ụmụ. Kama, ihe mere e ji akpọ Jizọs “Ọkpara Chineke” bụ na Chineke ji aka ya kee ya. Ọ na-akpakwa àgwà ka Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya