Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bh p. 221-222
  • À Mụrụ Jizọs Na December?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • À Mụrụ Jizọs Na December?
  • Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jizọs
    Teta!—2014
  • Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?
    Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
  • Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?
    Teta!—2009
  • Ọmụmụ Jisọs—n’Ole Ebe, Ole Mgbekwa?
    Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
bh p. 221-222

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

À Mụrụ Jizọs Na December?

BIBLE agwaghị anyị mgbe a mụrụ Jizọs. Otú ọ dị, ọ na-enye anyị ihe ọmụma gbara ọkpụrụkpụ mere anyị ga-eji kwubie na a mụghị ya na December.

Chee banyere otú ihu igwe na-adị n’oge ahụ n’afọ n’obodo Betlehem, bụ́ ebe a mụrụ Jizọs. Ọnwa ndị Juu bụ́ Chislev (nke kwekọrọ na November/December) bụ ọnwa oge oyi na udu mmiri. Ọnwa na-esochi ya bụ Tebeth (December/January). Ọ bụ oge oyi kasị atụ n’afọ, bụ́ mgbe a na-enwe snow n’ebe ndị bụ́ ugwu. Ka anyị lee ihe Bible na-agwa anyị banyere otú ihu igwe na-adị ógbè ahụ.

Ezra, bụ́ onye so dee Bible, na-egosi na ọnwa Chislev bụ n’ezie ọnwa e ji oge oyi na udu mmiri mara. Mgbe o kwusịrị na ìgwè mmadụ gbakọrọ na Jeruselem ‘n’ọnwa nke itoolu [Chislev], n’ụbọchị nke [iri abụọ] n’ọnwa ahụ,’ Ezra kọrọ na ndị mmadụ nọ “na-ama jijiji . . . site n’oké mmiri ozuzo nile.” Banyere ọnọdụ ihu igwe e nwere n’oge ahụ n’afọ, ndị ahụ gbakọtaranụ kwupụtara n’onwe ha, sị: ‘Ọ bụ mgbe oké mmiri ozuzo, ike adịghịkwa anyị iguzo n’èzí.’ (Ezra 10:9, 13; Jeremaịa 36:22) Ka a sịkwa ihe mere ndị ọzụzụ atụrụ biri n’akụkụ ụwa ahụ ji ahụ na ha na ìgwè atụrụ ha anọghị n’èzí n’abalị n’ọnwa December!

Otú ọ dị, Bible kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa na-elekọta ìgwè atụrụ ha n’abalị ahụ a mụrụ Jizọs. N’eziokwu, Luk, bụ́ onye so dee Bible, kwuru na n’oge ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ “bi ebi n’ọhịa, na-echekwa ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8-12) Rịba ama na ndị ọzụzụ atụ ahụ bi ebi n’ọhịa, ọ bụghị na ha nọ nanị na-agagharị agagharị n’ehihie. Ha na ìgwè atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị. Nkọwa dị otú ahụ e nyere nke bụ́ na ha bi n’ọhịa ọ̀ ga-ekwe omume n’oge oké oyi na mmiri ozuzo a na-enwe na Betlehem na December? Mbanụ, ọ gaghị ekwe omume. N’ihi ya, ọnọdụ ndị e nwere n’oge a mụrụ Jizọs na-egosi na a mụghị ya na December.a

Okwu Chineke gwara anyị kpọmkwem oge Jizọs nwụrụ, ma o nyere ihe ọmụma dị nta banyere oge a mụrụ ya. Nke a na-echetara anyị ihe Eze Solomọn kwuru: “Ezi aha dị mma karịa ezi mmanụ otite na-esi ísì ụtọ; ọzọ, ụbọchị ọnwụ mmadụ dị mma karịa ụbọchị a mụrụ ya.” (Eklisiastis 7:1) Ya mere, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-enye ihe ọmụma dị ukwuu banyere ozi na ọnwụ Jizọs ma na-enye ihe ọmụma dị nta banyere oge a mụrụ ya.

Mgbe ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa dị nso na Betlehem na-azụ atụrụ n’abalị

Mgbe a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ na ìgwè atụrụ ha nọ n’ọhịa n’abalị

a Iji nwetakwuo ihe ọmụma, lee Ụlọ Nche nke December 15, 2000, peeji nke 3-7, bụ́ nke Ndịàmà Jehova bipụtara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya