Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/15 p. 12-13
  • Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị mere Chineke ji kee ụwa?
  • À ga-ebibi ụwa?
  • Eluigwe ọ̀ bụ ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ma ha bichaa n’ụwa?
  • À Ga-ebibi Ụwa?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • “Ka Uche Gị Meekwa n’Ụwa, Dị Ka Ọ Na-eme n’Eluigwe”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ò Nwere Mgbe A Ga-ebibi Ụwa Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 1/15 p. 12-13
Ụwa

IHE BAỊBỤL KWURU

Ụwa

Gịnị mere Chineke ji kee ụwa?

“Nke a bụ ihe Jehova kwuru, bụ́ Onye . . . kpụrụ ụwa na Onye kere ya, . . . onye na-ekeghị ya n’efu, onye kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.”—Aịzaya 45:18.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ụwa nọkatara dịrị. Ndị ụka ụfọdụ na-ekwukwa na ụwa bụ ebe Chineke na-anọ anwale ndị mmadụ iji mata ndị nke ga-aga eluigwe na ndị nke ga-aga ọkụ mmụọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na “Chineke kere eluigwe na ụwa.” (Jenesis 1:1) Ọ gwara Adam na Iv, sị: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba ma jupụta ụwa, meekwanụ ka ọ dịrị n’okpuru unu, ka . . . ihe ọ bụla e kere eke dị ndụ nke na-agagharị n’elu ala nọrọkwa n’okpuru unu.” (Jenesis 1:28) Naanị ihe ga-eme ka Adam na Iv nwụọ bụ ma ha nupụrụ Chineke isi. (Jenesis 2:17) Ọ pụtara na ihe Chineke bu n’obi kee ụwa bụ ka ụmụ mmadụ biri na ya ruo mgbe ebighị ebi. Ọ chọrọ ka ndị na-erubere ya isi biri n’ụwa, na-elekọtakwa ya ruo mgbe ebighị ebi.

À ga-ebibi ụwa?

“Ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o sie ike; ọ gaghị ama jijiji ruo mgbe ebighị ebi, ma ọ bụ ruo mgbe niile ebighị ebi.”—Abụ Ọma 104:5.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ndị ọkà mmụta sayensị ekwuola ihe dị iche iche nwere ike ibibi ụwa ma ọ bụ mee ka mmadụ ghara ibi na ya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ndị na-emere onwe ha, ụfọdụ abụrụ ihe ndị mmadụ na-eme. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ha kwuru bụ ugwu ịgbọpụta ọkụ, anyanwụ ịkwụsị ịcha, oké okpomọkụ, agha ụwa niile ma ọ bụ ọrịa ọjọọ a ga-agbanye n’ikuku.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe Chineke bu n’obi kee ụwa agbanwebeghị. Ihe Baịbụl kwuru doro anya. Ọ sịrị: ‘Ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.’ (Ekliziastis 1:4) O nweghịkwa mgbe ndị mmadụ na-agaghị ebi na ya. Baịbụl sịrị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

GỊNỊ MERE O JI GBASA ANYỊ?

Ụfọdụ ndị na-emebisi ihe ndị dị n’ụwa n’ihi na ha chere na a ga-emecha bibie ụwa. Ndị ọzọ enweghị olileanya ọ bụla maka na ha chekwara na a ga-ebibi ụwa. Ụdị echiche a na-eme ka mmadụ na-ebi ndụ na-enweghị isi na ọdụ. Ma, ọ bụrụ na anyị kwetara na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa a, anyị ga na-eme ihe ga-abara anyị na ndị ezinụlọ anyị uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu.

Eluigwe ọ̀ bụ ebe ụmụ mmadụ ga-ebi ma ha bichaa n’ụwa?

“Eluigwe bụ eluigwe Jehova, ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.” —Abụ Ọma 115:16.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe.

IHE BAỊBỤL KWURU

Chineke bi n’eluigwe, ma o nyere ụmụ mmadụ ụwa ka ha biri. Baịbụl kwuru banyere “ụwa mmadụ bi nke gaje ịbịa.” (Ndị Hibru 2:5) Jizọs bụ onye mbụ si n’ụwa gaa eluigwe. Baịbụl kwukwara na ọ bụ mmadụ ole na ole ga-aga eluigwe. Ihe ha ji aga bụ maka na ha na Jizọs ‘ga-achị ụwa dị ka ndị eze.’—Mkpughe 5:9, 10; Luk 12:32; Jọn 3:13.

GỊNỊ MERE O JI GBASA ANYỊ?

Ihe ahụ ndị mmadụ na-ekwu na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe abụghị ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na Chineke ga-akpọrọ ndị ezi omume niile gaa eluigwe, ọ pụtara na ọ gaghịzi eme ihe ahụ o bu n’obi kee ụwa nakwa na nkwa o kwere na anyị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa agaghị emezu. Ma, Baịbụl kwere anyị nkwa, sị: “Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, debekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị elu inweta ụwa.”—Abụ Ọma 37:34.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya