Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 3/15 p. 8-9
  • Otú Ị Ga-esi Jide Onwe Gị ma Iwe Bịa Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Jide Onwe Gị ma Iwe Bịa Gị
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE MERE O JI ARA AHỤ́
  • Olee Otú M Ga-esi Akwụsị Iwe Iwe Ọkụ?
    Teta!—2009
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Iwe?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Mmadụ Ijide Onwe Ya
    Teta!—2019
  • N’ihi Gịnị Ka Ị Ga-eji Chịkwaa Iwe Gị?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 3/15 p. 8-9
Otu nwa agbọghọ na-ewe iwe ọkụ

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | NDỊ NA-ETO ETO

Otú Ị Ga-esi Jide Onwe Gị ma Iwe Bịa Gị

IHE MERE O JI ARA AHỤ́

Ihuomaa kwuru, sị: “Agbọjara m nwanne m nwaanyị ma meghee ụzọ n’ike, ihe e ji akpọchi ya adụpuo ahụ́ ájá. Mgbe ọ bụla m hụrụ ahụ́ ájá ahụ, ọ na-echetara m otú m si akpabu àgwà ụmụaka.”

Amara kwuru, sị: “E nwere ụbọchị m gwara papa m na ọ bụghị ezigbo mmadụ ma kwachie ụzọ n’ike. Tupu ụzọ ahụ akwachie, m lere ya anya n’ihu ma hụ na ihe ahụ m kwuru wutere ya, mụ agwa onwe m na agaraghị m ekwu ihe ahụ.”

Isiokwu a ga-enyere gị aka ma ọ bụrụ na ị na-ewe iwe ka Ihuoma na Amara.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Iwe iwe ọkụ ga-eme ka i nwee aha ọjọọ. O nwere otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Oluchi. Ọ na-ewebu iwe ọkụ. O kwuru, sị: “M na-ekwubu na ndị mmadụ kwesịrị iwere m otú ha si hụ m. Ma ka oge na-aga, m chọpụtara na ndị mmadụ na-ewere onye iwe ọkụ ka onye iberiibe. Ọ bụkwa otú ahụ ka m dị n’anya ha.”

Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-ewe iwe ọsọ ọsọ ga-eme omume nzuzu.”—Ilu 14:17.

Ebe mmadụ abụọ na-agba ọsọ mgbe ha hụrụ ugwu na-agbọpụta ọkụ

Otú ahụ ndị mmadụ si agbafu ma ugwu na-agbọpụta ọkụ ka e si agbara onye na-ewe iwe ọkụ ọsọ

Iwe iwe ọkụ nwere ike ime ka ndị mmadụ na-agbara gị ọsọ. Otu nwa okorobịa dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Chibuzo kwuru, sị: “Onye na-ewe iwe ọkụ na-ere ùgwù ya.” Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Nneka kwetara ihe a o kwuru ma sị na “ndị mmadụ anaghị aga onye na-ewe iwe ọkụ nso.”

Baịbụl kwuru, sị: “Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe; gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpakọrịtala.”—Ilu 22:24.

I nwere ike ịgbanwe. Otu nwatakịrị dị afọ iri na ise aha ya bụ Chinwe kwuru, sị: “Ị gaghị ekpebili otú obi ga-adị gị ma ihe mee ma ọ bụ ma mmadụ mee gị ihe. Ma, ị ga-ekpebili ihe ị ga-eme ma ihe ọ bụla mee. I kwesịghị iwe iwe ọkụ, ma ihe nwere ike ịkpasu gị iwe mee.”

Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike, onye na-achịkwa mmụọ ya dịkwa mma karịa onye weghaara obodo.”—Ilu 16:32.

IHE I NWERE IKE IME

Kpebie ihe ị ga na-eme ga-enyere gị aka ịgbanwe. Kama ikwu na ị gaghị agbanweli, nye onwe gị oge i nwere ike ịkwụsị ya. I nwere ike inye onwe gị ihe dị ka ọnwa isii. Mgbe ọ bụla i were iwe ọkụ n’ime ọnwa isii ahụ, dee (1) ihe kpatara ya, (2) ihe i mere mgbe ahụ, na (3) ihe ị gaara eme nakwa ihe mere ị gaara eji mee ya otú ahụ. Kpebiekwa na mgbe ọ bụla a kpasuru gị iwe na ị ga-eme ihe ahụ i dere ị gaara eme. Ihe ọzọ ị ga-ede n’akwụkwọ bụ ugboro ole i jideliri onwe gị. Dee otú obi dị gị mgbe ahụ i jidere onwe gị.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:8.

Buru ụzọ chebara ihe ị chọrọ ime echiche. Ọ bụrụ na iwe abịa gị, ekwula ihe mbụ batara gị n’obi. Chebara ihe ị chọrọ ikwu echiche. I nwere ike ibu ụzọ kuru ume kutuo. Otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri na ise aha ya bụ Emeka kwuru, sị: “M kuru ume kutuo, m na-eji ohere ahụ chebara ihe m chọrọ ime echiche ka m ghara ime ihe m ga-emecha kwaara mmakwaara.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 21:23.

Ghọta ihe kpatara ihe ahụ merenụ. Mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike ime ka ị na-ewe iwe bụ ma ị na-eche naanị otú ihe merenụ si gbasa gị. Gbalịa chebara otú obi dị ndị ọzọ echiche. Otu nwaanyị aha ya bụ Ijeoma kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla mmadụ mere m ihe na-adịghị mma, m na-echeta na ọ ga-enwerịrị ihe mere o ji mee ihe ahụ. Ime otú ahụ na-eme ka m ghara iwe oké iwe.”—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 19:11.

I nwere ike isi ebe ahụ pụọ. Baịbụl kwuru, sị: “Tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.” (Ilu 17:14) Amaokwu Baịbụl a gosiri na ọ bụrụ na a kpasuo gị iwe, ọ ga-aka mma mgbe ụfọdụ ka i si ebe ahụ pụọ. Kama ịnọ na-eche gbasara ya, ọsụkọsụ ana-asụ gị, chọrọ otu ihe mewe. Otu nwaanyị aha ya bụ Onyinye kwuru, sị: “Ọ na-abụ iwe bịa m, mụ agaa megaa ahụ́ n’ihi na ọ na-eme ka m jide onwe m.”

Na-eleghara ihe ụfọdụ anya. Baịbụl kwuru, sị: “Weenụ iwe, ma unu emehiela. Kwuonụ ihe unu chọrọ ikwu n’ime obi unu, . . . ma gba nkịtị.” (Abụ Ọma 4:4) Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na mmadụ iwe iwe adịghị njọ. Ma, ebe okwu dịzi bụ ihe onye ahụ a kpasuru iwe ga-eme. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ikechukwu kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i kwe ka ndị ọzọ na-akpasu gị iwe, ha ga na-eji gị eme ihe ọ bụla dị ha mma. Ọ ga-adị mma ka i leghara ihe ụfọdụ ha mere gị anya.” I mee otú ahụ, ị ga-enwe ike ịna-ejide onwe gị kama ịna-ewe oké iwe.

a Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ, ya bụ, ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị.”—Ndị Kọlọsi 3:8.

  • “Onye na-eche ọnụ ya na ire ya nche na-echebe mkpụrụ obi ya ka ọ ghara ịbanye n’ahụhụ.”—Ilu 21:23.

  • “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” —Ilu 19:11.

Daniel

DANIEL

“Na-eri nri na-edozi ahụ́, na-aṅụkwa mmiri nke ọma. M chọpụtara na ihe m na-eri na-eme ka obi na-adị m mma.”

Natalie

NATALIE

“Ọ bụrụ na mmadụ amụta ijide onwe ya, ọ na-egosi na onye ahụ aghọwala dimkpa. Ụmụaka na-esekarị okwu, ma ndị torola eto na-ewetu obi akparịta ụka.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya