Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 1 p. 7-8
  • Ọgwụgwụ Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgwụgwụ Ụwa
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee “ụwa” a na-ekwu na ọ ga-agabiga?
  • Olee otú a ga-esi bibie ụwa?
  • Olee mgbe a ga-ebibi ụwa a?
  • Olee Mgbe Ụwa Ga-agwụ? Ihe Jizọs Kwuru
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2021
  • A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
    Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?
  • A Zaa Ajụjụ Anọ Banyere Ọgwụgwụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
  • Gịnị Ka Ihe A Nile Pụtara?
    Nọrọ na Nche!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 1 p. 7-8

IHE BAỊBỤL KWURU

Ọgwụgwụ Ụwa

Baịbụl kwuru na 1 Jọn 2:17, sị: “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa.” Gịnị ka “ụwa” a a kpọrọ aha ebe a pụtara? Olee otú ọ ga-esi gabiga? Oleekwa mgbe ọ ga-agabiga?

Olee “ụwa” a na-ekwu na ọ ga-agabiga?

IHE BAỊBỤL KWURU

N’amaokwu ahụ, ụwa ahụ a kpọrọ aha nwere ‘ọchịchọ’ nke Chineke kpọrọ asị. N’ihi ya, o doro anya na ọ gaghị abụ ala nkịtị anyị na-azọ ụkwụ ka a na-ekwu okwu ya. Kama, ihe ọ pụtara bụ ụmụ mmadụ ndị merela onwe ha ndị iro Chineke n’ihi na ha anaghị erubere ya isi. (Jems 4:4) Ụmụ mmadụ ndị a “ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke bụ́ mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:7-9) Ma, ụmụ mmadụ ndị ‘na-abụghị nke ụwa’ n’ihi na ha na-erubere Jizọs isi, ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Jọn 15:19.

Baịbụl kwukwara na 1 Jọn 2:17, sị: “Onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ihe Abụ Ọma 37:29 kwuru gosikwara na ọ bụ n’ụwa a ka ndị na-eme uche Chineke ga-ebi. Ọ sịrị: “Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”

“Unu ahụla ụwa ma ọ bụ ihe ndị dị n’ụwa n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya maka Nna anyị adịghị n’ime ya.”—1 Jọn 2:15.

Olee otú a ga-esi bibie ụwa?

IHE BAỊBỤL KWURU

E nwere ụzọ ihe abụọ Chineke ga-eme. Nke mbụ, ọ ga-ebibi okpukpe ụgha niile. Na Baịbụl, e ji okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa tụnyere nwaanyị akwụna aha ya bụ “Babịlọn Ukwu ahụ.” (Mkpughe 17:1-5; 18:8) Okpukpe ndị a na-ekwu na ha na-ejere Chineke ozi, ma, ọ bụ ndị ọchịchị ka ha tụkwasịrị obi. Ndị ọchịchị a ga-emechakwa bibie ha. Baịbụl kwuru, sị: “[Ha] ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya [ya bụ, akụnụba ya] ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.”—Mkpughe 17:16.

Ihe nke abụọ Chineke ga-eme bụ ibibi ndị ọchịchị ahụ, ya bụ “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” na ndị ọzọ na-eme ihe ọjọọ. Ọ ga-ebibi ha ‘n’agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.’ A na-akpọ agha ahụ agha “Amagedọn.”—Mkpughe 16:14, 16.

“Chọọnụ Jehova, unu niile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa . . . Chọọnụ ezi omume, chọọnụ ịdị umeala n’obi. Ma eleghị anya, a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.”—Zefanaya 2:3.

Olee mgbe a ga-ebibi ụwa a?

IHE BAỊBỤL KWURU

Mgbe Chineke ga-ebibi ụwa a bụ mgbe ozi ọma Alaeze ya a na-ekwusa iji dọọ ụmụ mmadụ aka ná ntị juru ya afọ, ha anụ ya ma ghọta na ọ bụ ọchịchị ya ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. (Daniel 7:13, 14) Jizọs Kraịst kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) Otu n’ime ihe ndị na-egosi na ọgwụgwụ ụwa eruwela nso bụ ozi ọma Alaeze ahụ a na-ekwusa. Ozi ọma a na-egosikwa na Chineke nwere obi ebere ma na-ekpe ikpe ziri ezi. Ihe ndị ọzọ a ga-eji mara na ọgwụgwụ ụwa adịla nso bụ agha, ala ọma jijiji, ụkọ nri, na ọrịa dị iche iche.—Matiu 24:3; Luk 21:10, 11.

Ihe ndị ahụ abụghị naanị ihe Baịbụl kwuru ga-egosi na ọgwụgwụ ụwa adịla nso. O kwukwara gbasara otú ndị mmadụ ga-esi na-akpa àgwà. Ọ sịrị: “A ga-enwe oge dị oké egwu, nke tara akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, . . . ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị na-eme ihe ike, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.”a—2 Timoti 3:1-5.

Ìgwè mmadụ iwe ji

N’oge na-adịghị anya, ụwa ọjọọ a ‘ga-agabiga.’​—1 Jọn 2:17

Ihe ndị a niile Baịbụl kwuru ndị ga-egosi na ọgwụgwụ ụwa adịla nso malitere imezu n’afọ 1914 mgbe a lụrụ Agha Ụwa Mbụ. Kemgbe ahụ, a na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe dị iche iche n’ụwa. Obi dịkwa Ndịàmà Jehova ụtọ na e ji ikwusa ozi ọma a mara ha. Akwụkwọ ha kacha eji eme ya bụ Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova.

“Na-echenụ nche, n’ihi na unu amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abụ.”—Matiu 25:13.

a Ị chọọ ịgụkwu gbasara ihe e kwuru ebe a, gụọ isi nke itoolu n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike inweta ya na www.pr2711.com/ig.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya