Nkebi nke 7
A Gaje Imezu Nzube Chineke n’Isi Nso
1, 2. N’ihi gịnị ka obi pụrụ iji sie anyị ike na Chineke ga-eme ihe iweta ajọ omume na nhụjuanya ná ngwụsị?
1 Ọ bụ ezie na Chineke ekwerewo ka ezughị okè na nhụjuanya dịrị ruo ogologo oge site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, ọ gaghị ekwere ka ọnọdụ ọjọọ dịgide na-akwụsịghị akwụsị. Bible na-agwa anyị na Chineke nwere oge a kara aka o kwere ka ihe ndị a na-eme.
2 “Ihe ọ bụla nwere oge.” (Eklisiastis 3:1) Mgbe oge Chineke nyere maka ikwere ka ihe ọjọọ na nhụjuanya dịrị gwụsịrị, mgbe ahụ ọ ga-etinye aka n’ihe omume ụmụ mmadụ. Ọ ga-eweta ihe ọjọọ na nhụjuanya ná ngwụsị, mezuokwa nzube mbụ ya inwe ụwa jupụtara n’ezinụlọ mmadụ zuru okè, na-enwe obi ụtọ, na-enwe udo zuru ezu na ọnọdụ ọma akụ na ụba n’ime ọnọdụ nile nke Paradaịs.
Ikpe Chineke
3, 4. Olee otú akwụkwọ Ilu si kọwaa ihe ga-esite ná ntinye aka Chineke?
3 Rịba ole na ole n’ime amụma dị iche iche nke Bible ama, bụ́ ndị na-ekwu ihe ntinye aka Chineke, ya bụ, ihe ikpe ya nile ga-arụpụta, ga-apụtara ezinụlọ mmadụ n’isi nso:
4 “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-aghọ aghụghọ ka a ga-efopụ na ya.”—Ilu 2:21, 22.
5, 6. Olee otú Abụ Ọma 37 si egosi ihe ga-eme mgbe Chineke tinyere aka?
5 “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ: ma ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.”—Abụ Ọma 37:9-11.
6 “Na-ele anya Jehova, na-edebekwa ụzọ ya, ọ ga-ebulikwa gị inweta ala: mgbe a na-ebipụ ndị na-emebi iwu, ị ga-ahụ. Rịba onye zuru okè ama, leekwa onye ziri ezi: n’ihi na ọdịnihu dịịrị onye udo. Ma ndị njehie, a na-ekpochapụ ha n’otu: a ga-ebipụ ọdịnihu nke ndị na-emebi iwu.”—Abụ Ọma 37:34, 37, 38.
7. Ndụmọdụ ọma dị aṅaa ka Okwu Chineke na-enye anyị?
7 Ya mere, n’ihi ọdịnihu dị ebube nke ga-abịara ndị nakweere iru eru Onye Okike ahụ pụrụ ime ihe nile ịchị anyị, a na-agba anyị ume, sị: “Ka obi gị chebe ihe nile m nyere n’iwu: n’ihi na ụbọchị ndụ nke dị ogologo, na ọtụtụ afọ nke ndụ, na udo, ka ha ga-atụkwasịrị gị.” N’ezie, a ga-atụkwasịrị ndị họọrọ ime uche Chineke ndụ ebighị ebi! Otú a, Okwu Chineke na-adụ anyị ọdụ, sị: “Tụkwasị Jehova obi gị nile, adaberekwala nghọta gị: n’ụzọ gị nile mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka okporo ụzọ gị nile zie ezi.”—Ilu 3:1, 2, 5, 6.
Ịchịisi Chineke Site n’Eluigwe
8, 9. Gịnị ka Chineke ga-eji hichasịa ụwa a?
8 Chineke ga-emezu nhicha nke a a ga-ehicha ụwa site na gọọmenti kasị mma nke ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ inwe mgbe ọ bụla. Ọ bụ gọọmenti nke na-egosipụta amamihe si n’eluigwe n’ihi na ọ na-achị site n’eluigwe n’okpuru nduzi Chineke. Alaeze eluigwe ahụ ga-ewepụkwa ụdị nile nke ịchịisi mmadụ site n’ụwa. Ọ dịghịkwa mgbe ọzọ ụmụ mmadụ ga-enwe nhọrọ nke ịnwa ịchị isi n’adabereghị na Chineke.
9 Banyere nke a, amụma dị na Daniel 2:24 na-asị: “N’ụbọchị ha, bụ́ eze ndị a [gọọmenti ndị dị ugbu a], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze [n’eluigwe] bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ [ọ dịghịkwa mgbe ọzọ a ga-ekwe ka ụmụ mmadụ chịa isi n’adabereghị na Chineke]; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile [dị ugbu a] mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.”—Leekwa Mkpughe 19:11-21; 20:4-6.
10. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na n’okpuru Alaeze eluigwe Chineke, ọ dịghị mgbe ọzọ a ga-enwe mmerụ n’ịchịisi?
10 Otú a, ihe a kpọrọ mmadụ adịghịkwa mgbe ọzọ ha ga-enwe ụdị ịchịisi rụrụ arụ, n’ihi na mgbe Chineke wetasịrị usoro ihe nke a ná ngwụsị ya, ịchịisi mmadụ n’adabereghị n’ebe ọ nọ agaghị adịkwa adị ọzọ. A gaghị emerụ Alaeze ahụ na-achị site n’eluigwe, ebe Chineke bụ Onye Mmalite na Onye Nchekwa ya. Kama nke ahụ, ọ ga-eme ihe n’ụzọ ga-ewetara ụmụ mmadụ nọ n’okpuru ya ọdịmma kasị mma. Mgbe ahụ a gaje ime uche Chineke n’ụwa nile dị ka e si eme ya n’eluigwe. Ọ bụ ya mere Jisọs pụrụ iji kụziere ndị na-eso ụzọ ya ikpegara Chineke ekpere, sị: “Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.”—Matiu 6:10.
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Anyị Nọ Ya Nso?
11. Olee ebe na Bible ka anyị na-achọta amụma ndị ga-enyere anyị aka ịmata ókè hà aṅaa anyị nọ nso n’ọgwụgwụ nke usoro ihe a?
11 Ruo ókè hà aṅaa ka anyị nọ nso ọgwụgwụ usoro ihe a na-adịghị eju afọ na mmalite nke ụwa ọhụrụ Chineke? Amụma Bible na-enye anyị azịza ya n’ụzọ doro anya. Dị ka ihe atụ, Jisọs n’onwe ya buru amụma ihe a ga-elepụ anya maka ya ka anyị wee nwee ike ịmata ebe anyị nọ n’ihe banyere, dị ka Bible si kwuo ya, “ọgwụgwụ oge a.” E dekọrọ nke a na Matiu isi nke 24 na 25, Mak 13, na Luk 21. Ọzọ, dị ka e dekọrọ na 2 Timoti isi nke 3, Pọl onyeozi buru amụma na a ga-enwe oge a ga-akpọ “mgbe ikpeazụ” mgbe ihe omume dị iche iche ga-enyekwu ihe àmà nke ebe anyị nọ ná ngafe nke oge.
12, 13. Gịnị ka Jisọs na Pọl gwara anyị banyere oge ọgwụgwụ?
12 Jisọs kwuru na oge a ga-amalite site n’ihe omume ndị a: “Mba ga-ebili imegide mba ọzọ, alaeze ga-ebilikwa imegide alaeze ọzọ: oké ụnwụ na ala ọma jijiji ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” (Maitu 24:7) Luk 21:11 na-egosi na ọ kpọtụkwara aha “ajọ ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche.” O wee dọọkwa aka ná ntị na “ihe na-emebi iwu ga-aba ụba.”—Matiu 24:12.
13 Pọl onyeozi buru amụma, sị: “Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya . . . Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ, na-eduhie ndị ọzọ, a na-eduhiekwa ha.”—2 Timoti 3:1-5, 13.
14, 15. Olee otú ihe ndị na-eme na narị afọ nke 20 nke a si enye ihe àmà na anyị anọwo na-ebi na mgbe ikpeazụ ahụ?
14 Ihe ndị ahụ Jisọs na Pọl buru amụma ha hà ewerewo ọnọdụ n’oge anyị? Ee, ha emewo nnọọ otú ahụ. Agha Ụwa Mbụ bụ agha kasị njọ ruo mgbe ahụ. Ọ bụ agha ụwa nke mbụ, ọ bụkwa ebe ntụgharị n’akụkọ ihe mere eme nke oge a. Ihe sonyeere agha ahụ bụ ụkọ nri, ntiwapụ ọrịa, na ọdachi ndị ọzọ. Ihe omume ndị ahụ malite na 1914 gaa n’ihu, dị ka Jisọs kwuru ya, bụ “mmalite ihe mgbu.” (Matiu 24:8) Ha malitere oge e buru n’amụma nke a kpọrọ “mgbe ikpeazụ,” mmalite nke ọgbọ ikpeazụ mgbe Chineke ga-ekwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịrị.
15 Ma eleghị anya ị maara banyere ihe omume ndị nke narị afọ nke 20 nke a. Ị maara ọgba aghara biliteworo. E gbuwo ihe dị ka 100 nde mmadụ n’agha. Ọtụtụ narị nde ndị ọzọ anwụwo site n’agụụ na site n’ọrịa. Ala ọma jijiji ewerewo ọtụtụ ndụ a na-apụghị ịgụta ọnụ. Akwanyereghị ndụ na ihe onwunwe ùgwù na-arị elu. Egwu nke mpụ aghọwo akụkụ nke ndụ a na-adị kwa ụbọchị. E wezụgawo ụkpụrụ omume ọma n’ụsọ. Ntiwapụ ụba mmadụ na-ewepụta nsogbu ndị a a na-adịghị agwọta. Mmetọ na-emebi ọdịdị nke ndụ, ọbụnakwa na-etinye ya n’ihe ize ndụ. N’eziokwu, anyị anọwo na-ebi na mgbe ikpeazụ ahụ kemgbe 1914, anyị na-erukwa nso ngwụsị nke amụma Bible ndị metụtara oge anyị.
16. Ogologo oge hà aṅaa ka mgbe ikpeazụ ahụ ga-ewe?
16 Ogologo oge hà aṅaa ka mgbe ikpeazụ a ga-ewe? Jisọs kwuru banyere ọgbọ nke ga-enwe ahụmahụ “mmalite ihe mgbu” ahụ malite na 1914 gaa n’ihu, sị: “Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme.” (Matiu 24:8, 34-36) Ya mere, akụkụ nile nke mgbe ikpeazụ ahụ aghaghị iwere ọnọdụ n’ime oge ndụ nke otu ọgbọ, ọgbọ nke 1914. Ya mere ụfọdụ ndị dị ndụ na 1914 ka ga-anọ ndụ mgbe usoro ihe a bịara ná ngwụsị. Ọgbọ nke ụmụ mmadụ ahụ emewo okenye nke ukwuu, na-egosi na e nwekwaghị oge dị ukwuu fọrọ tupu Chineke eweta usoro ihe dị ugbu a ná ngwụsị.
17, 18. Olee amụma na-egosi na anyị nọ nnọọ nso ọgwụgwụ ụwa nke a?
17 Amụma ọzọ na-egosi na usoro ihe a dị ezi nso bụ nke Pọl onyeozi nyere, bụ́ onye kwuru sị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha . . . ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3; leekwa Luk 21:34, 35.
18 Taa, Agha Okpuru ahụ ebiwo, agha mba nile nwere ike ọ gaghị abụkwa ihe iyi egwu bụ isi. Ya mere mba dị iche iche nwere ike iche na ha nọ nso inweta ndokwa ụwa ọhụrụ. Ma mgbe ọ na-adị ha ka mgbalị ha nile hà na-enwe ihe ịga nke ọma, ọ ga-apụta ihe dị iche site n’ihe ha na-eche, n’ihi na nke ahụ ga-abụ ihe mgbaàmà ikpeazụ na mbibi usoro ihe nke a site n’aka Chineke eruwo nso. Cheta, nkwekọrịta na njikọ aka dị iche iche nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị adịghị eweta ezi mgbanwe ọ bụla n’ime ụmụ mmadụ. Ha adịghị eme ka ndị mmadụ hụ ibe ha n’anya. Ndị ndú ụwa adịghịkwa akwụsị mpụ, ha adịghịkwa ewepụ ọrịa na ọnwụ. Ya mere atụkwasịla obi n’ọganihu ọ bụla nke udo na ịnọ ná ntụkwasị obi mmadụ guzobere ma chee na ụwa a nọ n’ụzọ nke ịgwọta nsogbu ya nile. (Abụ Ọma 146:3) Ihe mkpu dị otú ahụ ga-apụta n’ezie bụ na ụwa nke a nọ nnọọ nso n’ụzọ o si apụ apụ.
Ikwusa Ozi Ọma
19, 20. Amụma dị aṅaa metụtara ime nkwusa na mgbe ikpeazụ ahụ ka anyị na-ahụ ka ọ na-emezu?
19 Amụma ọzọ nke na-egosi na anyị anọwo na-ebi na mgbe ikpeazụ ahụ eri 1914 bụ nke Jisọs buru: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke a n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) Ma ọ bụ dị ka Matiu 24:14 si tinye ya: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.”
20 Taa dị ka ọ na-adịbeghị mgbe ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme, a na-ekwusa ozi ọma nke ọgwụgwụ ụwa nke a na nke mbata nke Paradaịs ụwa ọhụrụ n’okpuru Alaeze Chineke n’ụwa nile. Site n’aka olè ndị? Site n’aka ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova. Ha na-eme nkwusa ná mba nile n’elu ụwa.
21, 22. Gịnị, karịsịa, na-egosipụta Ndịàmà Jehova dị ka ezi ndị Kraịst?
21 Tinyere nkwusa ha banyere Alaeze Chineke, Ndịàmà Jehova na-akpa àgwà n’ụzọ na-egosipụta ha dị ka ezi ndị na-eso ụzọ Kraịst, n’ihi na o kwupụtara, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” Ya mere, Ndịàmà Jehova dị n’otu n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ site n’ihe nkekọ nke ịhụnanya a na-apụghị ịdọbi adọbi.—Jọn 13:35; leekwa Aịsaịa 2:2-4; Ndị Kọlọsi 3:14; Jọn 15:12-14; 1 John 3:10-12; 4:20, 21; Mkpughe 7:9, 10.
22 Ndịàmà Jehova kwenyere ihe Bible kwuru: “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ha na-ele Ndịàmà ibe ha anya ná mba nile dị ka ụmụnna ha ndị ikom na ndị inyom n’ime mmụọ, n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ ụcha. (Matiu 23:8) Eziokwu bụ́ na òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ dị otú ahụ dị adị n’ụwa taa na-etinyekwa ihe n’ihe àmà nke na n’isi nso a ga-emezu nzube Chineke.
[Foto dị na peeji nke 26]
Alaeze eluigwe zuru okè nke Chineke ga-abụ ịchịisi ihe a kpọrọ mmadụ nwere nanị ya n’ime ụwa ọhụrụ ahụ