Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 3 p. 8-9
  • Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Na-agaghị Akọwali

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Na-agaghị Akọwali
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otu Ọkachamara Kwuru Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke
    Teta!—2016
  • Olee Otú Eluigwe na Ala na Ndụ Si Malite?
    Teta!—2002
  • Otú Sayensị Si Abara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 3 p. 8-9
Ebe onye nkụzi sayensị na ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ya na-akparịta ụka.

Ihe Ndị Ọkà Mmụta Sayensị Na-agaghị Akọwali

Ndị ọkà mmụta sayensị amụọla banyere ọtụtụ ihe dị na mbara igwe nakwa n’ụwa. Ma, a ka nwere ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa ha na-agaghị azali.

Ndị ọkà mmụta sayensị hà akọwaala otú eluigwe na ụwa, nakwa ndụ si malite? Azịza ya bụ mba. Ụfọdụ ndị na-ekwu na ndị ọkà mmụta sayensị ndị na-amụ banyere mbara igwe ga-akọwali otú eluigwe na ụwa si malite. Ma, Marcelo Gleiser bụ́ prọfesọ na-akụzi gbasara ihe ndị dị na mbara igwe na mahadum Datmaụt, onye na-ekwetachaghị na Chineke dị, kwuru, sị: “Anyị akọwabeghị ihe ọ bụla gbasara otú eluigwe na ụwa si malite.”

Otu isiokwu gbara na magazin a na-akpọ Science News kwukwara ihe yiri ya mgbe ọ na-ekwu gbasara otú ndụ si malite. Ọ sịrị: “O yiri ka ọ gaghị ekwe omume ịmata kpọmkwem otú ndụ si malite n’ụwa. Ọtụtụ n’ime nkume na ihe ndị ọzọ e nwere ike iji mata ihe ndị mere mgbe ụwa bidoro adịghịzi.” Ihe ndị a na-egosi na ndị sayensị enwebeghị ike ịza ajụjụ bụ́, Olee otú eluigwe na ụwa nakwa ndụ si malite?

Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Ọ bụrụ na e nwere onye kere ihe ndị dị ndụ n’ụwa a, ònye ka ọ bụ?’ O nwekwara ike ịbụ na ị jụọla ajụjụ ndị dị ka, ‘Ọ bụrụ na onye kere anyị ma ihe ma hụ anyị n’anya, gịnị mere o ji kwe ka ụmụ mmadụ o kere eke na-ata ahụhụ? Gịnị mere o ji kwe ka e nwee okpukpe dị iche iche na-akụzi ihe na-emegide ibe ha? Gịnịkwa mere o ji kwe ka ndị sị na ha na-efe ya na-eme ọtụtụ ihe ọjọọ?’

Ndị ọkà mmụta sayensị agaghị azali ajụjụ ndị a. Ma, ọ pụtaghị na ị gaghị amatali azịza ha. Ọtụtụ ndị amatala azịza ha na Baịbụl.

Ị chọọ ịmata ihe mere ụfọdụ ndị sayensị wepụtara oge mụọ Baịbụl ji kweta na e nwere Onye kere ihe niile, gaa na jw.org. N’ebe ahụ, chọọ vidio ndị gbara n’isiokwu bụ́ Ihe Ndị Mmadụ Kwuru Mere Ha Ji Kwere na Chineke Dị.

Sayensị Na Baịbụl Mere Ka Ha Kweta

Georgiy N. Koidan. Ọ mụrụ banyere kemikal

“Ihe m kacha arụ bụ ịchịkọta mọlekụl dị iche iche. Ọ dị ka iti okwe. Tupu gị etie okwe, ị ga-ebu ụzọ gbakọọ otú okwe ga-esi aga ma i tie ya. Mgbe ị na-achịkọta mọlekụl, o nwee otu ihe i chefuru ime, ọ ga-eme ka ihe niile ghasasịa. Ọrụ a m na-arụ adịghị mfe. Ma, e jiri ya tụnyere otú mkpụrụ ndụ si achịkọta mọlekụl dị iche iche, o nweghị ihe ọ bụ. Ihe a mere ka m kweta na a ga-enwerịrị Onye kacha mara banyere kemikal, ya bụ, Onye kere ihe niile.

“Mgbe m mụrụ Baịbụl, m bịara chọpụta na Baịbụl adịghị ka akwụkwọ ndị ọzọ. E dechara Baịbụl ihe fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ puku afọ abụọ (2,000) gara aga. Ma, ihe dị na ya ka bara uru taa otú ọ bara mgbe e dere ya. Ihe o kwuru banyere otú anyị ga-esi edozi esemokwu n’ezinụlọ anyị, n’ebe ọrụ anyị, nakwa n’ebe anyị bi ka bara uru taa. Ọ bịara doo m anya na ọ gwụla onye nwere amamihe karịrị nke mmadụ ga-enyeli ụdị ndụmọdụ a bara ezigbo uru.”

Yan-Der Hsuuw. Ọ mụrụ banyere ịmụ nwa

“Ka nwa na-eto n’ime afọ, mkpụrụ ndụ niile dị ya n’ahụ́ ga na-arụkọ ọrụ ọnụ iji mee ka mkpụrụ ndụ ụfọdụ ghọọ akwara, uru ahụ́, ọkpụkpụ, ọbara, na ihe ndị ọzọ ga-eme ka nwa ahụ ghọọ mmadụ zuru ezu. Otú mkpụrụ ndụ ndị a niile si eme ihe ndị a ka na-agba anyị gharịị. M chere na a ga-enwerịrị onye ma ihe haziri ihe ndị a.

“Otú Baịbụl kwuru nwa si eto n’ime akpa nwa nne ya n’Abụ Ọma 139:15, 16 yichara ihe ndị ọkà mmụta sayensị chọpụtarala na nso nso a. Olee otú onye dere ihe ahụ n’Abụ Ọma kemgbe ọtụtụ afọ gara aga gaara esi akọwa ya nke ọma ma ọ bụrụ na ọ bụghị Onye kere ihe niile mere ka ọ mata ya?”

Lee vidio bụ́ Rocío Picado Herrero: Onye Na-akụzi Kemistri Ekwuo Ihe Mere O Ji Kwere na Chineke. Denye aha vidio a n’ebe a na-achọ ihe na jw.org ka ị hụ ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya