Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • hp isi 17 p. 161-167
  • Iwu Ònye Ka Ị Ga-etinye n’Ọnọdụ Mbụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iwu Ònye Ka Ị Ga-etinye n’Ọnọdụ Mbụ?
  • Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • À GA-ERUBERE IWU ỌCHỊCHỊ ISI?
  • IRUBE ISI N’ỤZỌ A KPAARA ÓKÈ
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Iwu Chineke Bụ Maka Abamuru Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Ịsọpụrụ Ndị Na-achị Isi Dị Mkpa maka Ịdị Ndụ Udo
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • “Iwu Jehova Zuru Okè”
    Bịaruo Jehova Nso
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Obi Ụtọ—Ụzọ E Si Enweta Ya
hp isi 17 p. 161-167

Isi 17

Iwu Ònye Ka Ị Ga-etinye n’Ọnọdụ Mbụ?

1-4. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji cheba echiche n’otú anyị ga-esi lee iwu dị iche iche anya?

ANYỊ ji iwu biri​—⁠iwu ndị nke okike; iwu ndị sitere n’aka Chineke banyere omume na àgwà; iwu obodo. N’ụzọ dị mfe anyị na-anabata ma na-erite uru site n’ọtụtụ n’ime ndị a. Ma olee ma ọ bụrụ na iwu eyie ka ọ na-egbochi ihe n’ụzọ na-enweghị isi? Ma ọ bụ ọ bụrụ na e nwere mmegiderịta n’etiti iwu abụọ ndị metụtara gị?

2 Ebe iwu ndị sitere n’okike yiri ka o nweghị onye a kpọrọ aha nye ha, mmadụ ole na ole na-enwe ihe isi ike n’ịnabata ha. Ònye ga-enupụ isi n’iwu ike ndọda site n’isi n’elu oké nkume dị elu mapụ? Iwu ahụ na-abakwara anyị uru; ọ na-eme ka anyị guzosie ike n’elu ala ma na-eme ka nri nọgide n’ime efere anyị. Iwu ndị ọzọ nke okike metụtara mkpụrụ ndụ ihe nketa, bụ́ ndị na-emetụta ihe ụmụ anyị ga-adị ka ha. Site n’ịmara banyere iwu mkpụrụ ndụ ihe nketa wee ghara ịlụ onye ikwu dị nso, anyị na-ezere ihe ize ndụ nke ibufere ụmụ anyị nkwarụ ụfọdụ. (Tụlee Levitikọs 18:​6-⁠17.) Ma olee banyere iwu ndị metụtara àgwà ma ọ bụ omume?

3 Ọtụtụ ndị na-azụlite iwe n’ebe iwu ndị ọchịchị mebere dị. Otu ihe kpatara ya bụ na ụmụ mmadụ yiri ka hà na-eme iwu ndị na-adịghị mkpa na iji iwu na-emegbu ndị ọzọ. (Matiu 15:2; 23:4) Otú ọ dị, e nwere ihe ize ndụ n’ile iwu nile anya dị ka ndị dị njọ ma ọ bụ ịdị na-eleghara ha anya.

4 A pụrụ ịchọpụta na ọnọdụ ịnwụ anwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ malitere n’otu nnupụisi megide iwu. Chineke machibidoro Adam na Iv iwu iri site n’osisi nke ịma ezi ihe na ihe ọjọọ. Ma Setan tụụrụ Iv aro na iwu Chineke na-egbochi ihe n’ụzọ na-enweghị isi. (Jenesis 3:​1-⁠6) Ihe Setan chọrọ bụ​—⁠‘Ụkpụrụ nduzi ọ bụla adịla. Guzobe ụkpụrụ ndị nke gị.’ Mmụọ ahụ nke achọghị iwu abụrụwo ihe na-ewu ewu n’akụkọ ihe mere eme nile, ọbụna ruo taa.

5, 6. Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịmata banyere iwu nile nke Chineke?

5 Jehova adịghị nnọọ eji iwu mgbochi ma ọ bụ ndị dị arọ na-emegbu ndị ya, n’ihi na “ebe mmụọ nke Onyenwe anyị nọ, n’ebe ahụ ka mmadụ nweere onwe ha.” (2 Ndị Kọrint 3:17; Jemes 1:25) Ma, n’ụzọ megidere ihe Setan chọrọ ka ụmụ mmadụ kwere, Jehova bụ Onye Ọchịchị Ukwu nke eluigwe na ala. Ọ bụ Onye Okike ya bụkwaara anyị Onye Na-enye Ndụ na Onye Na-enye Ihe. (Ọrụ 4:24; 14:15-⁠17) Ya mere o ruuru ya iduzi anyị na ime iwu banyere omume anyị.

6 Ọtụtụ ndị kwere na, dị ka ikike kasị elu, o ruuru Chineke inye iwu banyere ihe ụmụ mmadụ pụrụ ime na ihe ha na-apụghị ime. Ya bụ, ha na-ekwere ruo mgbe ha chọsiri ike ime ihe Chineke machibidoro. O doro anya na nke ahụ dị ize ndụ. E nwere ihe àmà zuru ezu na iwu Chineke bụ maka ọdịmma anyị. Dị ka ihe atụ, izere ịṅụbiga mmanya ókè, iwe na anyaukwu ga-enyere anyị aka inwe ahụ ike ka mma na inwekwu afọ ojuju. (Abụ Ọma 119:​1-9, 105) Ọzọ, iwu Chineke pụrụ inyere anyị aka inwe nnwapụta na nzọpụta ya. (Ilu 21:​30, 31) Ya mere ọ bụrụgodi na ụmụ mmadụ aghọtabeghị ihe mere Jehova ji nye iwu ụfọdụ, ha ịjụ irubere ya isi, ikekwe n’ihi mpako nke ịdabere n’onwe onye, bụ nzuzu.

7, 8. Ihe ndị dị aṅaa ka anyị nwere ndị mere anyị ga-eji rubere iwu Chineke isi megide “ịkwa iko”?

7 Ihe atụ nke iwu Chineke maka ndị Kraịst bụ iwu otu kansụl nke ndị ozi na ndị okenye na Jerusalem, bụ́ ndị mejupụtara òtù na-achị isi nke ndị Kraịst oge ochie nyere:

“Ọ dị Mmụọ Nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma, ka anyị ghara ibo unu ibu arọ karịa ihe ndị a dị mkpa: ka unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko.”​—⁠Ọrụ 15:​22-⁠29.

8 Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji rube isi n’iwu Chineke banyere “ịkwa iko”​—⁠nchebe pụọ n’ọrịa, ịmụ ụmụ a kwatara n’iko, alụmdi na nwunye kewara ekewa. Iwu ahụ pụtara na ụmụ mmadụ agaghị eme ndina ụdị onwe ma ọ bụ omume mmekọahụ ndị ọzọ jọrọ oké njọ, ndị e jikọtara ha nile n’okwu Grik bụ porneia (ịkwa iko) e ji mee ihe n’Ọrụ 15:29. (Ndị Rom 1:​24-27, 32) Ma olee ma ọ bụrụ na a pụrụ izere ihe ize ndụ nile nke “ịkwa iko”? Ànyị ka ga na-erube isi n’iwu Chineke n’ihi na ọ bụ Eze Onye Ọchịchị anyị? Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-enye aka igosi na Setan bụ onye ụgha, na ụmụ mmadụ ga-erubere Jehova isi n’ihi na ha hụrụ ya n’anya.​—⁠Job 2:3-⁠5; 27:5; Abụ Ọma 26:​1, 11.

9-11. Olee otú anyị pụrụ isi rubere iwu Chineke isi banyere ọbara?

9 Iwu ahụ e setịpụrụ n’Ọrụ 15:​22-⁠29 na-egosi akụkụ ọzọ anyị pụrụ isi gosi nrubeisi anyị. Ọ bụ iwu Chineke ‘izere ọbara’ na anụ a nyagburu anyagbu iji hapụ ọbara ha n’ime ha. Chineke gwara nna ochie anyị bụ Noa na ụmụ mmadụ pụrụ iri anụ ụmụ anụmanụ, ma ha agaghị eji ọbara nke ihe ọzọ e kere eke kwadoo ndụ ha. (Jenesis 9:​3-⁠6) Mgbe ọ na-enyeghachi ndị Israel iwu a, Chineke sịrị na “ndụ nke anụ ahụ, n’ọbara ka ọ dị.” Nanị ụzọ ha ga-esi jiri ọbara mee ihe bụ n’elu ebe ịchụàjà iji kpuchie mmehie. Ma ọ bụghị ya, a ga-awụfu ọbara nke ihe e kere eke, na-enyeghachi ya Chineke n’ụzọ ihe atụ. Irube isi n’iwu a pụtara ndụ ma ọ bụ ọnwụ.​—⁠Levitikọs 17:​10-⁠14.

10 Àjà ndị ahụ sere onyinyo mwụfu nke ọbara Jisọs n’ihi anyị. (Ndị Efesọs 1:7; Mkpughe 1:5; Ndị Hibru 9:​12, 23-⁠28) Ọbụna mgbe Kraịst laghachisịrị n’eluigwe, Chineke nyere ndị Kraịst iwu ka ha ‘hapụ ọbara.’ Ma mmadụ ole n’ime ndị na-asị na ha bụ ndị Kraịst na-erubere Onye ahụ Na-enye Iwu na Onye Na-enye Ndụ bụ́ Chineke isi n’okwu a? N’ebe ụfọdụ ọ bụ ihe a na-ahụkarị ka ụmụ mmadụ na-agụnye anụ a na-egbupụghị ọbara, ngwọngwọ ọbara ma ọ bụ nri ndị ọzọ e leziri anya tinye ọbara na ha ná nri ndị ha na-eri.

11 N’ụzọ yiri nke ahụ, ọtụtụ ndị anabatawo mmịnye ọbara ná mgbalị nke iji dịkwuo ndụ. Mgbe mgbe ha adịghị amata na mmịnye ọbara n’onwe ya na-akpata oké ihe ize ndụ ahụ ike nakwa na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a pụrụ ịwa ahụ n’ụdị ọ bụla n’ejighị ọbara mee ihe site n’iji ụzọ ndị ọzọ e si agwọ ọrịa mee ihe.a Ma ọbụna o yie ka ndụ ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ, ọ̀ ga-abụ ihie ụzọ irubere Chineke isi? A gaghị eleghara iwu Chineke anya ma ọlị ọbụna n’ọnọdụ mberede.​—⁠1 Samuel 14:​31-⁠35.

12. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji rubere Chineke isi ọbụna a sị na e yie ndụ anyị egwu?

12 N’ịkwado nkwenkwe ha ná nnwere onwe nke ikwu okwu ma ọ bụ ife ofufe, ma ọ bụ echiche ụfọdụ nke ọchịchị, ọtụtụ ndị etinyewo onwe ha n’ihe ize ndụ nke ọnwụ. Ha erubeworo onye ọchịchị ma ọ bụ onye ọchịagha isi n’agbanyeghị ihe ize ndụ ndị dị na ya. Ọ̀ bụ na anyị enweghị ihe ndị ka ukwuu iji rubere Eze eluigwe na ala isi? ‘Kpọmkwem,’ ka ihe ndekọ iguzosi ike n’ezi ihe nke ọtụtụ ndị ikom nwere okwukwe setịpụrụ na-aza. (Daniel 3:​8-⁠18; Ndị Hibru 11:​35-⁠38) Ha maara, dị ka anyị kwesịrị, na Jehova bụ Onye Na-enye Ndụ, na ọ ga-echetakwa ma kwụghachi ndị na-erubere ya isi ụgwọ​—⁠na-akpọghachite ha ná ndụ site na mbilite n’ọnwụ n’oge ya ma ọ dị mkpa. (Ndị Hibru 5:9; 6:10; Jọn 11:25) Anyị pụrụ ijide n’aka na, n’ọnọdụ ọ bụla, irubere Jehova isi bụ ụzọ ziri ezi na nke kachasị mma nke na-adịgide adịgide.​—⁠Mak 8:35.

À GA-ERUBERE IWU ỌCHỊCHỊ ISI?

13-16. Olee otú ndị Kraịst kwesịrị isi lee ọchịchị dị iche iche nke ụwa anya, n’ihi gịnịkwa? (Matiu 22:​19-⁠21)

13 Ọtụtụ iwu ndị ọzọ na-emetụta anyị kwa ụbọchị na-esite n’ọchịchị ụwa. Olee otú onye Kraịst kwesịrị isi lee iwu ndị a anya ma meghachi omume? Pọl onyeozi dere, sị: “Chetara ndị mmadụ ido onwe ha n’iguzosi ike n’ezi ihe nye ọchịchị na ndị isi ya, irubere iwu dị iche iche isi.”​—⁠Taịtọs 3:1, The New American Bible.

14 Na narị afọ mbụ O.A., ọchịchị ndị Rom adịghị ezi ezi mgbe nile, ụfọdụ n’ime ndị ọchịchị ya rụkwara arụ, gharakwa inwe obi eziokwu. Ma Pọl sịrị: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla na-achị isi ma ọ bụrụ na Chineke edoghị ya.” “Ndị na-achị isi” bụ ọchịchị ụwa ndị dị ugbu a.​—⁠Ndị Rom 13:1.

15 Jehova maara na ruo mgbe a ga-eweghachi ọchịchị ya n’ozuzu ya n’ụwa, ọchịchị obodo na-eje ozi ndị bara uru. Ha na-enye aka ime ka ihe na-agatụ n’usoro n’etiti ọha mmadụ ma na-eje ọtụtụ ozi, gụnyere idekọ alụmdi na nwunye na ọmụmụ nwa. (Tụlee Luk 2:​1-⁠5.) Otú a, ndị Kraịst pụrụ ‘ibi obi udo na nke dị nwayọọ n’ime nsọpụrụ Chineke nile na ikwesị nsọpụrụ nile.’​—⁠1 Timoti 2:2.

16 Ka a na-echere oge Alaeze Chineke ga-agwọta nsogbu nile nke agha, ikpe na-ezighị ezi na mmegbu, ndị Kraịst agaghị ‘eguzogide ike ịchịisi’ ọchịchị obodo. Ha ga-eji obi eziokwu tụọ ụtụ isi ndị a chọrọ, rubere iwu isi ma kwanyere ndị ọchịchị ùgwù. N’ihi nke a ndị isi ajawo ndị Kraịst mma ma nyere ha aka mgbe mgbe, a dịghị ejikarịkwa “mma agha” e ji emegide ndị na-emebi iwu enye ha ahụhụ.​—⁠Ndị Rom 13:​2-⁠7.

IRUBE ISI N’ỤZỌ A KPAARA ÓKÈ

17-21. Olee ụzọ kwesịrị ka a gbasoo mgbe iwu Chineke na iwu obodo megiderịtara onwe ha? Kọwaa.

17 Mgbe ụfọdụ a na-enwe mmegiderịta n’etiti iwu dị iche iche. Ọchịchị obodo pụrụ ịchọ ihe Chineke machibidoro iwu. Ma ọ bụ iwu obodo pụrụ ịmachibido ihe Chineke nyere ndị Kraịst iwu ka ha mee. Mgbe ahụ, gịnị ka a ga-eme?

18 Ụdị mmegiderịta a weere ọnọdụ mgbe ndị ọchịchị machibidoro ndị ozi ikwusa banyere Jisọs Kraịst ahụ e si n’ọnwụ kpọlite. Gụọ ihe ndekọ ahụ na-ewusi okwukwe ike nke dị n’Ọrụ 4:1-⁠23; 5:12-⁠42. Ọ bụ ezie na a tụrụ ha mkpọrọ ma pịa ha ihe, ndị ozi ahụ akwụsịghị ime nkwusa. Pita sịrị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”​—⁠Ọrụ 5:29.

19 Ya mere nrubeisi onye Kraịst nye ndị isi ọchịchị bụ nrubeisi a kpaara ókè. Ibu ọrụ mbụ ya bụ irubere Onye Isi Kachasị Elu isi. Ọ bụrụ na e nye ya ahụhụ n’ihi nke a, ọ pụrụ inweta nkasi obi n’ịmata na ihe ọ na-eme dị Chineke ezi mma.​—⁠1 Pita 2:​20-⁠23.

20 Ndị Kraịst mbụ chekwara mkpebi dị iche iche ihu n’ihe ọzọ nke metụtara ihe Chineke kwuru na ihe ọchịchị ndị Rom chọrọ. Nke a metụtara ịkwado ma ọ bụ ịnọ n’ìgwè ndị agha Rom. Chineke ekwuwo banyere ndị ya, sị: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4; Matiu 26:52) Mgbe ahụ, ọ bụrụ na ọchịchị ndị Rom chọrọ na onye Kraịst ga-anọ n’òtù agha ya ma ọ bụ kwadoo mgbalị agha ya nile, a ga-enwe mmegiderịta n’etiti iwu Siza na nke Chineke.

21 Ndị Kraịst oge mbụ tinyekwara iwu Chineke n’ọnọdụ mbụ mgbe ụmụ mmadụ nyere ha iwu isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ nye chi Siza nke Rom. Ndị ọzọ pụrụ icheworị na omume ahụ bụ nke ịhụ mba n’anya. Ma akụkọ ihe mere eme na-agwa anyị na ndị Kraịst hụrụ ya dị ka otu ụdị nke ikpere arụsị. Ha agaghị eme ihe omume nke ikpere arụsị nye mmadụ ma ọ bụ ihe ọ bụla, na-amata na ofufe ha dịịrị Jehova. (Matiu 22:21; 1 Jọn 5:21) Kamakwa itinye aka n’ọchịchị, ọbụna site n’iti mkpu otuto nke ikpere arụsị nye onye ọchịchị, ha nọpụrụ iche ka ha wee ghara ‘ịbụ akụkụ nke ụwa’ dị ka Jisọs gbaworo ha ume.​—⁠Jọn 15:19, NW; Ọrụ 12:​21-⁠23.

22. Ule dị aṅaa ka anyị na-eche ihu ugbu a?

22 Ị̀ ga-anabata echiche Chineke na nduzi ya n’ihe metụtara iwu? Ime otú ahụ ga-echebe gị pụọ n’ọtụtụ ihe mwute ndị na-elelị iwu Chineke n’àgwà na omume na-enwe. Ị gaghịkwa ata ahụhụ na-enweghị isi n’aka ọchịchị obodo ndị e nwere ugbu a. Ma echiche Chineke n’okwu ahụ gụnyere, karịsịa, ịmata ya dị ka Onye Ọchịchị Kachasị Elu. Ọ bụrụ na ị ga-eme nke ahụ n’ọnọdụ nile, mgbe ahụ ị ga-ekwekọ nke ọma mgbe iwu nke Alaeze Chineke ga-achị n’ụwa dum n’isi nso.​—⁠Daniel 7:27.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a  E gosipụtara akụkụ ndị metụtara okpukpe, omume na nkà ịgwọ ọrịa na broshuọ ahụ bụ́ How Can Blood Save Your Life?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York Inc., bipụtara.

Igbe dị na peeji nke 167]

“Ezi nlezianya n’ịtụleghachi ihe ọmụma nile e nwere na-egosi na, ruo oge Marcus Aurelius [bụ́ onye eze malite na 161 ruo 180 O.A.], ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla ghọrọ onye agha; ọ dịghịkwa onye agha ọ bụla, mgbe ọ ghọsịrị onye Kraịst, nke nọgidere n’ije ozi agha.”​—⁠“The Rise of Christianity.”

[Foto dị na peeji nke 165]

Ụtụ isi gị na-akwụ ụgwọ maka . . .

Nchebe Ndị Uwe Ojii

Ịdị Ọcha

Agụmakwụkwọ

Iziga Akwụkwọ Ozi

Nkesa Mmiri

Imenyụ Ọkụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya