Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
◼Ruo ókè ha aṅaa ka onye Kraịst kwesịrị iguzogide mmịnye ọbara nke ụlọ ikpe nyeworo iwu ma ọ bụ nye ike ka a mịnye ya?
Ọnọdụ nke ọ bụla dị iche n’ibe ya, ya mere ọ dịghị ụkpụrụ ọ bụla ga-ejikọta ihe nile n’ihe banyere nke a. A maara ndị Kraịst nke ọma maka iji nkwanye ùgwù ‘na-enyeghachi Siza ihe nke Siza,’ na-erubere iwu dị iche iche nke ndị ọchịchị ụwa isi. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ha matara na ibu ọrụ ka elu ha nwere bụ inyeghachi “Chineke ihe nke Chineke,” na-aghara imebi iwu ya.—Mak 12:17.
Ndị Rom 13:1-7 tụlere mmekọrịta dị n’etiti ndị Kraịst na “ndị na-achị isi” nke ọchịchị. Ndị ọchịchị dị otú ahụ nwere ikike inye iwu ma ọ bụ nduzi, ndị na-abụkarị iji kwalite ọdịmma nke ọha mmadụ. Ndị ọchịchị ‘na-ejikwa mma agha’ iji hụ na e debere iwu ha nakwa ‘iji wetara onye na-eme ihe ọjọọ iwe dị ka iwu ha si kwuo.’ N’ịbụ ndị na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi, ndị Kraịst na-achọ irube isi n’iwu na ihe ụlọ ikpe nyere n’iwu, ma ido onwe onye n’okpuru nke a aghaghị ịbụ ihe a kpaara ókè. Ọ bụrụ na a gwa onye Kraịst ka o kwenyere ihe ga-abụ imebi iwu ka elu nke Chineke, iwu Chineke ahụ na-ebute ụzọ; ọ nọ n’ọkwá dị elu karị.
Ụfọdụ iwu ndị e nwere n’oge a, ndị dị mma n’ụzọ bụ isi, pụrụ ịbụ ndị a kọwahiere iji nye ike ịmịnyere onye Kraịst ọbara ná mmanye. N’ọnọdụ nke a, ndị Kraịst aghaghị iwere otu ọnọdụ ahụ Pita onyeozi weere, bụ: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke [“dị ka onye ọchịchị,” NW] karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.
Jehova nyere ndị Israel iwu, sị: “Dị ike ka ị ghara iri ọbara: n’ihi na ọbara bụ ndụ; erikwala ndụ tinyere anụ.” (Deuterọnọmi 12:23) Otu nsụgharị Bible ndị Juu e mere na 1917 na-agụ, sị: “Nanị guzosie ike n’ịghara iri ọbara.” Isaac Leeser sụgharịkwara amaokwu ahụ otú a: “Nanị dịrị ike ka i wee ghara iri ọbara.” Nke ahụ ò yiri ka ndị ohu Chineke hà ga-eji ya n’ihe na-adịghị oké mkpa bụ́ ime ihe kwekọrọ n’iwu ya?
E nwere ezi ihe mere ndị Kraịst jiworo kpebisie ike irubere Chineke isi, ọbụna ma a sị na ndị ọchịchị agwa ha ka ha mee ihe megidere nke ahụ. Professor Robert L. Wilken dere, sị: “Ọ bụghị nanị na ndị Kraịst jụrụ ije ozi agha [nke ndị Rom] kama ha agaghị anara ọkwá ọrụ ọchịchị ọ bụla, ha agaghị anakwerekwa ibu ọrụ ọ bụla metụtara ịchị obodo ndị ahụ.” (The Christians as the Romans Saw Them) Ịjụ ajụ pụrụ ime ka ha bụrụ ndị a kpọrọ ndị na-emebi iwu ma ọ bụkwa maa ha ikpe ịbụ ndị a tụbara n’ámá egwuregwu ndị Rom.
Ndị Kraịst taa aghaghịkwa iguzosi ike, kpebisie ike ịghara imebi iwu Chineke, ọbụna ma a sị na nke ahụ na-etinye ha n’ihe ize ndụ ụfọdụ n’aka ndị ọchịchị ụwa. Iwu kasị elu nke eluigwe na ala—iwu Chineke—gwara ndị Kraịst ka ha zere iji ọbara eme ihe, dị ka e nyere ha iwu ka ha zere ịkwa iko (mmekọahụ na-adịghị ọcha). Bible kpọrọ mmachibido ndị a ‘ihe ndị dị mkpa.’ (Ọrụ 15:19-21, 28, 29) E kwesịghị ile iwu Chineke ndị dị otú ahụ anya dị ka ihe ndị na-adịghị oké mkpa, dị ka ihe ndị a ga-erubere isi nanị ma ọ bụrụ na ọnọdụ nyere ohere maka ya ma ọ bụ mgbe ha na-ewetaghị nsogbu ọ bụla. A ghaghị irubere iwu Chineke isi!
Ya mere, anyị pụrụ ịghọta ihe mere nwa agbọghọ nta onye Kraịst ahụ e hotara na peji 17 ji gwa otu ụlọ ikpe na ‘ya lere mmịnye ọbara anya dị ka mwakwasị a na-awakwasị ahụ ya n’ike, jirikwa ya tụnyere idina mmadụ n’ike.’ Ò nwere nwanyị onye Kraịst ọ bụla, ma ọ bụ nwata ma ọ bụ okenye, nke ga-agbachi nnọọ nkịtị ka e dinaa ya n’ike, ọbụna ma a sị na iwu kwadoro ka a kwaa iko site n’ịwakwasị mmadụ n’ike n’ụzọ mmekọahụ?
N’otu aka ahụkwa, onye ahụ dị afọ 12 nke e hotara n’otu peji ahụ mekwara ka a ghara inwe obi abụọ ọ bụla na ‘ya ga-eji ike ya nile lụsoo mmịnye ọbara ọ bụla ụlọ ikpe nyere ike ka e mee ọgụ, na ya ga-eti mkpu, lụọ ọgụ, na ya ga-efopụ ihe ahụ e ji amịnye ọbara n’aka ya, na ya ga-anwakwa ịwụfu ọbara dị n’ime akpa ahụ nke e kokwasịrị n’elu àkwà ya.’ O kpebisiri ike irubere iwu Chineke isi.
Jisọs siri na gburugburu ebe ahụ pụọ mgbe ìgwè mmadụ chọrọ ime ya eze. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na o yie ka à gaje inweta ikike ụlọ ikpe iji mịnye mmadụ ọbara, onye Kraịst pụrụ ịhọrọ ime ka a ghara ịhụ ya anya maka mmebi dị otú ahu nke iwu Chineke. (Matiu 10:16; Jọn 6:15) N’otu mgbe ahụ, onye Kraịst kwesịrị iji amamihe chọọ ụdị ọgwụgwọ ọzọ, wee si otú ahụ na-eme ezi mgbalị ịkwado ndụ ya nakwa inwetaghachi ezi ahụ ike.
Ọ bụrụ na onye Kraịst etinye mgbalị siri ike iji zere imebi iwu Chineke n’ihe banyere ọbara, ndị ọchịchị pụrụ ile ya anya dị ka onye na-emebi iwu ma ọ bụ gbaa ya akwụkwọ. Ọ bụrụ na e nye ya ahụhụ n’ihi nke a, onye Kraịst pụrụ ile ya anya dị ka ịta ahụhụ n’ihi ezi omume. (Tụlee 1 Pita 2:18-20.) Ma n’ihe ka ọtụtụ n’ọnọdụ ndị e nwere, ndị Kraịst ezerewo ịnara mmịnye ọbara, sitekwa n’ezi nlekọta ahụ ike, ha agbakewo n’ọrịa ha, nke mere na e nweghị nsogbu ọ bụla na-adịgide adịgde ha nwere n’ihe banyere iwu. Dịkwa ka nke kasị mkpa, ha ejigidewo nguzosi ike n’ezi ihe ha nye Chineke, bụ́ Onye Na-enye ha Ndụ na Onye Ikpe ha.