Isi nke 5
Ihe Atụ Ndị A Pụrụ Ịtụkwasị Obi banyere Ọdịnihu Mmadụ
1. N’ihi gịnị ka amụma Bible ji abụkarị eziokwu?
ANYỊ nwere ezi ihe mere anyị ga-eji nwee ntụkwasị obi n’ihe Bible na-agwa anyị banyere ọdịnihu. Amụma ya nile adabereghị n’ịkọ nkọ nke mmadụ ndị mụworo usoro ihe ndị na-eme eme wee kọọ nkọ dị iche iche. “Ọ dịghị amụma ọ bụla n’ihe e deworo n’Akwụkwọ nsọ nke mmadụ pụrụ ịkọ isi ya site na nanị uche nke aka ya. N’ihi na ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla, kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe mmụọ nsọ na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:20, 21) N’ihi nke ahụ, amụma Bible abụrụwo eziokwu n’akụkụ nile.
2. Nye ihe atụ amụma dị iche iche banyere ihe ndị metụtara ụwa.
2 O buru amụma mbili na ọdịda nke alaeze ụwa dị iche iche n’aha—Babilọn, Mido-Peasia na Gris. Ọ mara ọkwa ihe fọrọ ntakịrị ka o ruo narị afọ abụọ tupu o mee, ụzọ Babilọn ga-esi daa na aha onye ga-emeri ya. Nke a mezuru n’akụkụ nile. O buru amụma na obodo Babilọn ga-emesịa ghọọ ihe tọgbọro nkịtị, n’enweghị ndị ga-ebi na ya ọzọ. Ọnọdụ ahụ dịgidere ruo ụbọchị anyị a. (Daniel 8:3-8, 20-22; Aịsaịa 44:27-45:2; 13:1, 17-20) A kọwara mba ndị ọzọ a na-akpọghị aha nke ọma n’ime Bible nke na ọ pụrụ ịdịrị mmadụ ndị maara ihe mfe ịmata ha.
3. E nwere amụma ndị a na-ekwuputaghị n’ụdị ibu amụma?
3 Otú ọ dị, e kwesịrị ịghọta na e nwere ihe karịrị otu ụdị amụma n’ime Bible. Anyị ahụworị nke a n’ihe banyere ọrụ ebube dị iche iche nke Jisọs, ndị nọ dị ka ihe atụ amụma nke ihe mmadụ ga-enweta n’okpuru Alaeze Chineke. Akụkụ ndị ọzọ nke Bible, ndị ọ pụrụ ịbụ na ha ejighị okwu ndị yiri ibu amụma mee ihe nwekwara ihe dị iche iche metụtara amụma.
IHE ATỤ AMỤMA NDỊ NA-ADỌRỌ MMASỊ
4. È si aṅaa mee ka anyị mara ihe Iwu Moses pụtara n’ụzọ amụma?
4 Dị ka ihe atụ, akwụkwọ Bible bụ Ndị Hibru na-eme ka anyị mata ihe ụfọdụ ihe pụtara n’ụzọ amụma, nke onye na-agụ ya nanị iji mezuo iwu pụrụ iwere dị ka akụkụ ihe mere eme efu. A na-ekpughe na “Iwu [Moses] . . . nwere nanị onyinyo nke ezi ihe ahụ nile gaje ịbịa.”—Ndị Hibru 10:1.
5. Gịnị gosiri na ihe dị iche iche pụrụ ịbụ ihe atụ nke ihe ka ukwuu?
5 Mgbe ụfọdụ, e jiri ihe dị iche iche mee ihe iji mere ihe atụ amụma. Dị ka ihe atụ, n’ihe banyere ụlọ ikwuu ahụ dị nsọ, ma ọ bụ ụlọ ikwuu nke ofufe, nke Moses wuru ná ntụziaka Jehova, ya na ozi dị iche iche e jere n’ime ya, onye ahụ ji ike mmụọ nsọ dee akwụkwọ Ndị Hibru na-akọwa na ọ bụ “ihe nṅomi na onyinyo nke ebube dị n’eluigwe.” O sere onyinyo ụlọ nsọ ime mmụọ ukwu nke Jehova, Ebe Kasị Nsọ nke dị n’eluigwe. Otú a, “Kraist, ebe ọ bịara ka ọ bụrụ onyeisi nchụaja nke ezi ihe nile gaje ịbịa, o sitere n’ụlọ ikwuu ahụ nke ka ukwuu na nke zuru okè karị, ọ bụghị nke e ji aka mee, nke isi ya bụ, ọ bụghị nke okike a, o siteghịkwa n’ọbara nke ewu na nke ụmụ ehi, kama o sitere n’ọbara nke ya onwe ya, baa n’ebe nsọ nanị otu mgbe, [wee wetara anyị mgbapụta ebighị ebi]. . . . Kraist abaghị n’ebe nsọ e ji aka mee, bụ ihe atụ yiri ebe nke bụ ebe nsọ n’ezie, kama ọ bara n’eluigwe onwe ya, igosi onwe ya n’ihu Chineke n’ihi anyị ugbu a.” (Ndị Hibru 8:1-5; 9:1-14, 24-28) Uru dị ukwuu na-abịara ndị Kraist site n’ihe ime mmụọ ndị a bụ ezie, ndị a kọwara n’ebe a, anyị kwesịkwara igosipụta ekele anyị nwere maka ihe ndị a n’ụzọ ndụ anyị.—Ndị Hibru 9:14; 10:19-29; 13:11-16.
6. Ihe atụ amụma dị aṅaa ka e ji mmadụ mee ná (a) Ndị Galetia 4:21-31? (b) Matiu 17:10-13?
6 Mmadụ ndị e zoro aka na ha n’Akwụkwọ nsọ nọkwara dị ka ihe atụ amụma dị iche iche. Ná Ndị Galetia 4:21-31, a kọwara ihe atụ zuru ezu banyere nke a n’ihe gbasara nwunye Abraham bụ Sera (nke a sịrị na o kwekọrọ na “Jerusalem dị n’elu”) na ohu nwanyị bụ Hega (nke e ji tụnyere “Jerusalem nke dị ugbu a”) na ụmụ ha. N’oge ọzọ, Jisọs nyeere ụmụazụ ya aka ịhụta na Elaija onye amụma nwere myirịta dị n’etiti ya na Jọn Onye na-eme baptism, onye, dị ka Elaija, na-atụghị egwu n’ikpughe omume ihu abụọ nile nke ndị okpukpe.—Matiu 17:10-13.
7. N’akụkụ dịgasị aṅaa ka e sere onyinyo Jisọs Kraist site na (a) Solomon? (b) Melkizedek?
7 Solomon, onye a maara nke ọma n’ihi amamihe ya na ihe ịga nke ụma na udo nke ọchịchị ya, sere onyinyo Jisọs Kraist n’onwe ya. (1 Ndị Eze 3:28; 4:25; Luk 11:31; Ndị Kọlọsi 2:3) Ọ bụ ezie na akụkụ dị na Jenesis banyere nzute Abraham zutere Melkizedek dị nnọọ nkénké, Abụ Ọma 110:1-4 na-egosi na nke ahụ pụtakwara ọtụtụ ihe, n’ihi na Mesaia ahụ ga-abụ “onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị,” ya bụ na ọ gaje ịnata ịbụ onye nchụaja ya site ná nhọpụta nke Chineke kpọmkwem, ọ bụghị n’ihi ezinụlọ nke a ga-amụ ya n’ime ya. N’ikpeazụ, akwụkwọ ozi e degaara ndị Hibru kọwakwara nke a, wee jikọta nghọta nke eziokwu ndị dị otú ahụ na ntozu okè ndị Kraist, bụ iru eru dị mkpa maka ndị na-achọ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ.—Ndị Hibru 5:10-14; 7:1-17.
8. (a) Ihe atụ dị aṅaa na-egosi na ahụmahụ ndụ pụrụ ịbụ ihe atụ amụma? (b) Ọ̀ bụ na a ghaghị inwecha mmezu nke akụkụ nile nke ahụmahụ ahụ?
8 Ọ pụtara ìhè na myirịta amụma ndị a metụtara ihe karịrị ọkwá ma ọ bụ ọnọdụ nke mmadụ dị iche iche. Ha gụnyekwara abụmahụ ha ná ndụ. N’otu oge mgbe ndị ndú okpukpe ndị Juu gosipụtara ekweghị ekwe ha, Jisọs sịrị ha: “Ajọ ọgbọ nke na-akwakwa iko na-achọ ihe ịrịba ama, a gaghị enyekwa ha ihe ịrịba ama ma ọ bụghị ihe ịrị ba ama nke Jona onye amụma. N’ihi na dị ka Jona nọrọ ụbọchị atọ ehihie na abalị n’afọ oké anụ mmiri, otú a ka Nwa nke mmadụ ga-anọ n’obi nke ala ụbọchị atọ ehihie na abalị.” (Matiu 12:38-40; Jona 1:17; 2:10) Otú ọ dị, Jisọs asịghị na ihe nile dị ná ndụ Jona sere onyinyo ihe ya onwe ya gaje ịhụ ná ndụ. Mgbe Jehova nyere ya ọrụ ọ ga-arụ, Jisọs agbaghị ọsọ, dị ka Jona gbalịrị ịgbalaga Tashish. Ma dị ka Jisọs gosiri, a gụnyere ahụmahụ Jona n’ime afọ azụ ukwu ahụ n’ime ihe ndekọ Bible n’ihi na ọ kwadebere nkọwa amụma dị iche iche banyere ọnwụ na mbilite n’ọnwụ nke Jisọs.—Matiu 16:4, 21.
9. N’akụkụ amụma ndị dị aṅaa ka Jisọs zoro aka n’ime oge abụọ dị iche iche n’akụkọ ihe mere eme? N’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ, akụkụ ndị ọzọ dị aṅaa dị mkpa ka Pita hotara?
9 Oge dị iche iche nke akụkọ ihe mere eme nyekwara nnyoba anya amụma ndị bụ ihe mmasị pụrụ iche nye anyị. Mgbe ọ na-ekwu banyere oge nke ga-eduba ná mkpughe nke onwe ya n’ike Alaeze, Jisọs ji oge abụọ ọzọ mgbe e mezuru ikpe Chineke n’ahụ ndị ajọ mmadụ mere ihe atụ. O kwuru banyere “ụbọchị Noa” na “ụbọchị Lọt” dị ka ndị dị mkpa, karịsịa na-ekwusi okwu ike banyere ojiji ndị nke oge ahụ ji ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị mejupụta ndụ ha. Ọ gbara anyị ume ime ihe ozugbo, gharakwa iji ọchịchọ maka ihe ndị a hapụworo n’azụ chigharịa azụ dị ka nwu- nye Lọt mere. (Luk 17:26-32) N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pita onyeozi ji ike mmụọ nsọ dee, e hotara ihe ndị ọzọ dị mkpa—nnupụisi nke ndị mmụọ ozi tupu Iju Mmiri ahụ, ọrụ nkwusa Noa, mmekpaahụ nke Lọt nwetara n’ihi omume mmebi iwu nke ndị Sọdọm, eziokwu ahụ bụ na site n’ibipụ ndị ajọ omume n’oge ọ kara aka, Chineke na-atọ ụkpụrụ nke ihe gaje ịbịa, na ihe àmà nke na-egosi na Chineke pụrụ, ọ ghaghịkwa ịnapụta ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.—2 Pita 2:4-9.
10. Site n’iji Jeremaia tụnyere Mkpughe, gosi na amụma ndị mezuworonụ pụrụ inwe abamuru ọzọ n’ụzọ amụma.
10 Mgbe amụma dị iche iche mezuworo, nke a apụtaghị na ha dịzi mma nanị dị ka akụkọ ihe mere eme. Ma ibu ụzọ maa ọkwa banyere ihe gaje ime na ụzọ o si mezuo na-abụkarị ihe atụ amụma nke ọbụna ihe ndị ka ukwuu n’ọdịnihu. Nke a bụ eziokwu n’ihe e dekọrọ banyere Babilọn ochie, bụ alaeze nke pụtara ìhè nke ukwuu n’ụzọ okpukpe, nke a ka na-enwekwa mmetụta ya gburugburu ụwa n’oge anyị a. Ọ bụ ezie na Babịlọn dara nye ndị Midia na Peasia n’afọ 539 T.O.A., akwụkwọ Mkpughe, nke e dere n’ọgwụgwụ narị afọ mbụ O.A., weere asụsụ Jeremaịa onye amụma wee zoo aka ná mmezu ọzọ nke ọdịnihu nke amụma ndị ahụ, n’ihe gbasara Babilọn Ukwu ahụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Dị ka ihe atụ nke a, jiri Mkpughe 18:4 tụnyere Jeremaịa 51:6, 45; Mkpughe 17:1, 15, tinyere Mkpughe 16:12 na Jeremaịa 51:13, tinyere Jeremaịa 50:38; Mkpughe 18:21 na Jeremaịa 51:63, 64.
11. Mkpa dị aṅaa ka ọ dị n’ụzọ amụma, bụ ihe ndekọ nke mmeso Jehova mesoro Israel ahụ dapụrụ n’okwukwe na Juda mgbe ha na-ekwesịghị ntụkwasị obi? N’ihi gịnị?
11 N’otu aka ahụ, mmeso nile nke Jehova mesoro alaeze ebo iri nke Israel dapụrụ n’okwukwe na ndị eze na ndị nchụaja nile na-enweghị okwukwe nke alaeze ebo abụọ nke Juda bụ ihe atụ amụma. Ma amụma ndị metụtara alaeze ochie ndị ahụ na mmezu ha, ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ nsọ, sere onyinyo pụtara ìhè nke ụzọ Chineke ga-esi mesoo Krisendọm nke oge a, nke na-azọrọkwa na ya na-efe Chineke nke Bible, ma na-emebi iwu ezi omume ya n’ụzọ jọgburu onwe ya.
12. Ànyị si aṅaa erite uru n’ihe ndekọ ndị ahụ?
12 Ya mere, akụkọ ndị a nile dị mkpa taa. Ha na-enyere anyị aka ịghọta otú Chineke si ele ọnọdụ dị iche iche anya n’ụbọchị anyị a, na ihe anyị na-aghaghị ime n’otu n’otu iji lanarị mkpagbu ukwu ahụ na-abịanụ. E si otú a nyere anyị aka ịghọta nke ọma karị eziokwu ahụ bụ na “ihe ọ bụla e deworo n’Akwụkwọ nsọ . . . bakwara uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume.”—2 Timoti 3:16, 17.
È BURU ỤZỌ HAZIE IHE A NILE AHAZIE?
13. Olee ụzọ anyị si mara na Chineke akwalighị ndị mrnadụ ime ihe ọjọọ ka e wee nweta ihe atụ amụma?
13 Ànyị ga-aghọta site n’ihe a nile na Chineke buru ụzọ hazie omume nke ndị mmadụ na mba dị iche iche e dekọrọ ihe banyere ha na Bible ka ha nwee ihe ha pụtara n’ụzọ amụma? Ọ pụtara ìhè na Chineke onwe ya mesoro ndị ohu ya n’oge gara aga n’ụzọ nke ịkwadebe ihe atụ nke ihe ka ukwuu ndị o bu n’uche maka ọdịnihu. Ma gịnị banyere omume nke ndị mmadụ? Ụfọdụ n’ime ha mere mmehie ndị dị oké njọ. Chineke ọ kwaliri ha ime ihe ndị a iji mezuo ihe ndekọ Bible? Onye Kraist so dee Bible, bụ Jemes na-aza, sị: “Chineke bụ onye a na-apụghị iwere ihe ọjọọ nwaa ya, ya onwe ya adịghị anwakwa onye ọ bụla.” (Jemes 1:13) Chineke emeghị ka ha mee ihe ọjọọ ka e wee nwee ihe atụ amụma dị iche iche.
14. (a) Jehova si aṅaa amata ihe ụmụ mmadụ, ma ọ bụ ọbụna Setan ga-eme n’oge ka dị n’ihu? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ihe ọmụma Jehova banyere onwe ya na nzube ya si abanye n’amụma Bible?
14 Echefula na Jehova bụ Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ maara otú e si mee anyị na ihe mere ụmụ mmadụ ji akpa àgwà otú ha si akpa. (Jenesis 6:5; Deuterọnọmi 31:21) O nwere ike ibu amụma n’eziokwu ihe ga-apụtara ndị ga-ebi ndụ nke kwekọrọ n’ụkpụrụ ezi omume ya nile na ihe ọ ga-apụtara ndị na-agba mbọ ilefuru mkpa Chineke dị ha anya ma ọ bụ ndi na-ejehie n’ụzọ ya nile. (Ndị Galetia 6:7, 8) Ọ maara na Ekwensu ga-anọgide na-eji aghụghọ ndị yiri ndị o jiworo mee ihe mbụ na-eme ihe. Jehova matakwara ihe ya onwe ya ga-eme n’ọnọdụ dị iche iche, na ọ ga-eme ihe nke kwekọrọ n’àgwà ndị dị elu nke ikpe ziri ezi, eleghị mmadụ anya n’ihu, ịhụnanya na ebere, nke o gosiworo mgbe nile. (Malakaị 3:6) Ebe nzube nile nke Jehova na-aghaghị imezu, ọ pụrụ ibu amụma ihe ndị ga-esi n’ime ha pụta na ihe ọ ga-eme iji mezuo ha. (Aisaia 14: 24, 27) Ya mere, ọ pụrụ ịhọrọ ihe omume dị iche iche site ná ndụ ndị mmadụ na mba dị iche iche wee mee ka e deba ndị a n’ime Bible iji kwadebe nhụta bu ụzọ nke ihe ọdịnihu ga-eweta.
15. Pọl onyeozi si aṅaa mesie ya ike na akụkọ Bible dị iche iche karịrị akụkọ ihe mere eme efu?
15 N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na mgbe ọ kọsịrị ihe ndị mere n’akụkọ ihe mere eme nke Israel, Pọl onyeozi sịrị ndị Kraist ibe ya: “Ma ihe ndị a na-emerị ndị ahụ n’ụzọ ihe atụ, e wee dee ha n’Akwụkwọ nsọ ka ha wee bụrụ ihe ịdụ anyị ọdụ, ndị ọgwụgwụ oge ndị a ruteworo.” (1 Ndị Kọrint 10:11) Nyekwa ọgbakọ ndị Kraist dị na Rom, o dere, sị: “Ka ha hà, bụ ihe nile e dere n’Akwụkwọ nsọ n’oge gara aga, e dere ha izi anyị ihe, ka anyị wee were ntachi obi na nkasi obi nke ihe nile e deworo n’Akwụkwọ nsọ nwee olileanya.” (Ndị Rom 15:4) Mgbe anyị si otú a ghọta na akụkọ Bible karịrị akụkọ ihe mere eme nkịtị, anyị pụrụ ịmalite isi na ha nweta ezi nhụta bu ụzọ nke ọdịnihu nke ihe a kpọrọ mmadụ.
[Igbe\Foto dị na peeji nke 41]
IHE ATỤ AMỤMA—Na-ezo Aka na Gịnị?
Ụbọchị Noa
Ụlọ Ikwuu ahụ
Eze Somolon
Jona n’ime Afọ Azụ ruo Ụbọchị Atọ
Ọdịda nke Babilọn