Isi nke 11
“Sinu n’Etiti Babilọn Gbalaga”
1. (a) Olee otú anyị pụrụ isi mara ụdị ofufe nke na-atọ Chineke ụtọ? (b) Gịnị ka Chineke na-agba anyị ume isi na ya pụta?
ỌTỤTỤ mmadụ esiwo n’otu okpukpe gafee n’ọzọ, na-achọgharị azịza na-eju afọ nye ajụjụ ha nile banyere ndụ. Ha na-ahụ ụfọdụ nkwe nkwe na omume ndị yigasịrị ibe ha, na-ahụkwa ọtụtụ ndịrịta iche. Ma ọ bụ nanị site n’iji Okwu Chineke mere ihe nduzi ka mmadụ pụrụ ịmata azịza ndị bụ eziokwu na omume ndị na-atọ Chineke ụtọ n’ezie. Site na Bible, Onye Okike ahụ na-eme ka anyị mata ya, marakwa nzube ya nile. Ọ na-ekpughekwara anyị ntọala nile nke okpukpe ụgha. N’ime nke a, ọ na-adọ anyị aka ná ntị megide ihe ọ kọwara dị ka “Babilọn Ukwu ahụ,” na-agbakwa anyị ume isi n’etiti ya “pụta.” Ì mewo otú ahụ?—Mkpughe 18:4, 21; Jeremaịa 51:6.
2. Gịnị bụ “Babilụn Ukwu’’ ahụ?
2 Gịnị bụ “Babilọn Ukwu ahụ”? Ọ bụrụ na e lee ya anya n’ozuzu ya, ihe mejupụtara Babilọn Ukwu ahụ bụ okpukpe nile ndị na-akwado omume, nkwe nkwe ma ọ bụ ozizi nile nwere ntọala ha n’okpukpe Babilọn nke oge ochie. N’ihi ya, a pụrụ ịchọpụta àgwà nile e ji amara ya site n’inyocha mmalite na okpukpe nke Babilọn oge ochie ahụ n’onwe ya.
3. (a) Olee otú Babilọn oge ochie si malite, ọ bụkwa ụdị mmụọ dị aṅaa ka onye tọrọ ntọala ya kwadoro? (b) N’ụzọ ndị dị aṅaa ka e si egosipụta ụdị mrnụọ ahụ n’okpukpe dị iche iche taa?
3 Mgbe ihe karịrị otu narị afọ mgbe Iju Mmiri nke oge Noa gasịrị, e wuru obodo bụ Babel (nke e mesịrị kpọọ Babilọn) gburugburu otu nnukwute ụlọ elu—ihe owuwu nke o doro anya na ọ bụ Nimrọd mere atụmatụ ya. Nimrọd nke a kpaliri ndị òtù ya inwe mmụọ nnupụisi megide Jehova na inwe ọchịchọ nke ịbụ ndị a ma ama. (Jenesis 10:9, 10; 11:1-9) Ị̀ na-ahụ ụdị mmụọ ahụ taa—ilelị Okwu Chineke anya, ọbụna n’akụkụ nke ndị na-asị na ha bụ ndị okpukpe, ya na iji okpukpe mee ihe iji mee ka a hụ ha ma ọ bụ iji bụrụ ndị a ma ama?
4. N’ụzọ dị aṅaa ka okpukpe Babilọn si gbanwee eziokwu banyere Chineke n’onwe ya?
4 Chi atọ n’ime otu dị iche iche bụ ihe a ma ama n’okpukpe Babilọn. E nwere atọ n’ime otu nke Anu, Bel, na Ea mejupụtara; ọzọkwa gụnyere Sin, Shamash, na Ishtar. Ọzọkwa, ihe oyiyi jupụtara n’ebe ofufe dị iche iche nke Babilọn. Ihe a nile dọpụrụ uche ha n’eziokwu ahụ bụ na e nwere nanị otu ezi Chineke, onye aha ya bụ Jehova. (Deuterọnọmi 4:39; Jọn 17:3) Àgwà na omume ndị e jikọtara ha na ọtụtụ chi ha, ya na iji ihe oyiyi ndị na-adịghị ndụ na-eme ihe, mere ka ọtụtụ ndị nwee echi-che na-ezighị ezi banyere Onye Okike ahụ.—Jeremaịa 10:10, 14; 50:1, 38; 1 Ndị Kọrint 10:14, 19-22.
5. (a) Olee otú nkwe nkwe ndị Babilụn banyere ọnwụ si bụrụ n’ezie mmụbawanye nke okwu ụgha ahụ Setan gwara Iv? (b) N’ozizi ndị ọzọ dị aṅaa ka nke a dubaworo?
5 Ndị Babilọn kwenyere na ọnwụ bụ nanị isi n’otu ụdị ndụ gafee n’ụdị ọzọ, ma nke a megidere ihe Chineke gwara nne na nna anyị mbụ. Ndị ọkà amamihe bụ ndị Grik mụbawanyere echiche a, na-asị na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ. Ụgha mbụ Ekwensu ghara bụ na ọ bụrụ na Adam na Iv enupụrụ Chineke isi, ha ‘agaghị anwụ ma ọlị’ n’anụ ahụ. Ugbu a a gwara ndị mmadụ na ihe na-adị ndụ ebighị ebi bụ akụkụ nọ n’ime ha nke a na-apụghị ịhụ anya. Ozizi ụgha nke a dubara n’ikwere n’ọkụ hell, pọgatrị, ofufe ndị nna oche na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.—Jenesis 3:1-5; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4.
6. (a) Omume ndị ọzọ dị aṅaa zuru ụwa ọnụ taa nwere mmalite ha n’okpukpe Babilọn? (b) Ruo ókè ha aṅaa ka nke a jọruru njọ?
6 Okpukpe Babilọn gụnyekwara ịgụ kpakpando, ịgba afa, anwansi na mgbaasị, nke bụ ụzọ ndị mmadụ si achọ nduzi nke ndị ka mmadụ ike iji baa ọgaranya na iji chịa ndị ọzọ. (Daniel 2:27; Ezikiel 21:21) Lee nnọọ ka omume ndị a si jupụta ebe nile taa, ọ bụ ezie na Bible dọrọ aka ná ntị megide omume nile ahụ! Site n’ime ihe ndị a, ndị mmadụ adabawo kpọmkwem n’aka ndị ajọ mmụọ, ndị na-eme ka ha kwụọ ụgwọ dị ukwuu n’ihi ihe ọma ha meere ha.—Deuterọnọmi 18:10-12; Aịsaịa 8:19; Ọrụ 16:16; Mkpughe 18:21, 23.
7. Ihe àmà dị aṅaa ka ị hụrụ, nke na-egosi na Babilọn Ukwu ahụ (a) na-eso ndị isi ọchịchị na-enwe mmekọ na-ezighị ezi? (b) nwere akụ dị ukwuu? (ch) bụ nke ikpe mwụfu ọbara mara?
7 N’ịgakwu n’ihu n’ịkọwa ihe Babilọn Ukwu ahụ bụ, Bible kwuru okwu banyere ịkwa iko nke ya na ndị isi ọchịchị ụwa, akụ ya na ikpe mwụfu ọbara mara ya, gụnyere ọbara nke ezi ndị ohu Chineke. (Mkpughe 17:1-6; 18:24) A maara ihe okpukpe ụwa meworo n’ihe banyere nke a nke ọma.
RUO ÓKÈ HÀ AṄAA KA Ị HỤRỤ EZIOKWU N’ANYA?
8. Ònye n’ezie bụ chi nke Babilọn Ukwu ahụ?
8 Ọ bụrụ na mmadụ so n’akụkụ ọ bụla nke Babilọn Ukwu ahụ, na-ekere òkè n’ememe ya nile ma ọ bụ ṅomie ụzọ ya nile, ònye ka o si otú a na-enye nsọpụrụ? N’ezie, ọ bụghị Jehova. Kama, onye ahụ na-akpọ isiala n’ezie nye “chi nke oge a,” bụ onye meworo ka anya nke uche ndị mmadụ kpuo ìsì.—2 Ndị Kọrint 4:4.
9. Olee otú Setan siworo nwee ike iduhie ọtụtụ mmadụ n’ụzọ nke okpukpe?
9 Ma, Olee otú o si kwe mee ka e duhie ọtụtụ ndị n’ụzọ dị otú a? Bible zara na ha bụ ndị mara n’ọnyà Ekwensu “n’ihi na ha anaraghị ịhụnanya nke eziokwu nke ọma.” (2 Ndị Tesalọnaịka 2:9-12) Nke a ekwesịghị iju anyị anya. Mmadụ ole ka ị maara na-ekwu eziokwu mgbe nile—n’ebe obibi, n’azụmahịa, na mgbe a tụrụ ha mmehie ha n’anya? Mgbe e gosiri ha ihe Bible, bụ́ okwu eziokwu nke Chineke, kwuru, mmadụ ole na-achọ ịhapụ nkwe nkwe na omenala ochie ha, ọbụna ịgbanwe ụzọ ndụ ha, iji kwekọọ na ya? Ị̀ na-eme otú ahụ?
10. (a) Ụdị mmadụ dịgasị aṅaa ka Jehova na-achọ? (b) Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị bụ ụdị mmadụ ahụ?
10 Jehova na-achọ ndị nwere ụdị ịhụnanya ahụ maka eziokwu. Ya onwe ya bụ “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Ozizi nile dị n’Okwu ya abụghị ihe mmadụ chepụtara n’echiche. Ha bụ eziokwu. Jisọs gwara otu nwanyị onye Sameria, sị: “Ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya. Chineke bụ mmụọ ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Ọ̀ bụ ụdị mmadụ ị chọrọ ịbụ?
ONYINYE CHINEKE MAKA INWE ONWE
11. (a) Gịnị ka e buru amụrna banyere ya n’Aịsaịa 49:8, 9? (b) Olee mgbe amụma ahụ nwere mmezu mbụ ya? (ch) N’ihi gịnị ka anyị ga-eji nwee mmasị n’amụma ahụ?
11 Iji nye anyị ihe nduzi, Jehova mere ka e dekọọ n’ime Bible n’ogologo mgbe gara aga, ihe banyere otu nkwa nke nnapụta pụọ n’aka ọchịchị nchịgbu nke Babilọn. Nke ahụ mezuru mgbe Sairọs Onye Ukwu ahụ mere ka ndị Juu, na ndị Netinim na-abụghị ndị Israel nwere onwe ha, nke mere ha ji nwee ike ịlaghachi na Jerusalem iwughachi ụlọ nsọ Jehova n’ebe ahụ. Ma nke ahụ abụghị nanị mmezu nke amụma ahụ ga-enwe. Ihe mere n’oge ahụ na-ezo aka ná nnapụta ọdịnihu site n’aka Sairọs Ka Ukwuu, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ịgbaso ntụziaka ya ga-echebe anyị pụọ n’ịbụ ndị ụmụ mmadụ ndị chọrọ nanị otuto onwe ha, ga-eduhie. Ọ bụ nnọọ karịsịa n’ahụ Jisọs ka amụma ahụ mezuru, nke sịrị: “Otú a ka Jehova sịrị, Na mgbe ihe mmadụ na-atọ m ụtọ ka m zaworo gị, ọ bụkwa n’ụbọchị nzọputa ka m nyewooro gị aka: m ga-echebekwa gị, nye gị ka ị bụrụ ọgbụgba ndụ nke ndị m, ime ka ala bilie, ime ka ha keta ihe nketa nile tọgbọrọ n’efu; na-asị ndị e kere agbụ, Puọnụ: na-asị ndị nọ n’ọchịchịrị, Pụtanụ n’ìhè.” (Aịsaịa 49:8, 9) Olee otú nke a si mezuo n’ahụ Jisọs?
12. (a) Olee otú amụma ahụ si mezuo n’ahụ Jisọs? (Luk 4:16-16) (b) Olee agbamume nke a na-enye anyị?
12 Jehova zara ekpere Jisọs nile. O nyeere Ọkpara ya aka, chebekwa ya mgbe Jisọs ji obi ike gbaba ozizi ụgha nile nke okpukpe ọtọ, meekwa ka a mara ’eziokwu ahụ nke ga-eme ka mmadụ pụọ n’ohu.’ (Jọn 8:32) N’agbanyeghị mgbalị nile Setan mere ibibi Jisọs, Jehova chebere Ọkpara ya ruo mgbe ọ rụsịrị ọrụ ya n’ụwa. E mesịa, ọ kpọlite Jisọs n’ọnwụ baa ná ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe, ịga n’ihu n’ebe ahụ n’ọru ya nke ime ka ndị mmadụ nwere onwe ha. Chineke nyere ya dị ka “ọgbụgba ndụ” ma ọ bụ ihe ibé ka e wee mee ka ndị mmadụ nwere onwe ha pụọ n’agbụ nke Babilọn Ukwu ahụ. Dị ka o doro anya na e nwere Jisọs Kraịst onye e si n’ọnwu kpọlite, meekwa ka ọ dị ebube n’eluigwe, otú ahụ ka o si dookwa anya na a ghaghị ịnapụta ndị mmadụ nwere obi eziokwu pụọ n’ọchịchịrị okpukpe nke Babilọn Ukwu ahu. Ị̀ ga-erite uru site ná nnapụta ahụ?
13. Malite n’afọ 36 O.A. gaa n’ihu, olee otú Jisọs si gosipụta na ọ bụ “ìhè nke mba nile”?
13 Banyere ókè nnaputa ahu ga-eru, Jehova buru amụma, sị: “Enyewokwa m gị ka ị bụrụ ìhè nke mba nile, ịbụ nzọputa m ruo nsọtụ ụwa.” (Aịsaịa 49:6) Ya mere, n’afọ 36 O.A., a kpọbatara Ndị Jentaịl, ma ọ bu ndị mba ọzọ na-abụghị ndị Juu, n’ọgbakọ Israel ime mmụọ. Otú ọ dị, nnabata nke ndị Jentaịl n’ime ọgbakọ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, abụghị nsọtụ nke ije ozi Jisọs dị ka “ìhè nke mba nile.”
14. (a) Olee ndị ọzọ sitere ná “mba nile” ndị Jisọs ga-abụkwara Ìhè? (b) Olee ìgwẹ̀ ndị hapụrụ Babilọn oge ochie, ndị sere onyinyo ndị a? (ch) Ngọzi ime mmụọ dịgasị aṅaa ka ha nwetaworo, n’imezu amụma Aịsaịa 49:10?
14 Jisọs maara na ya gaje ịchịkọtakwa “atụrụ ọzọ” ndị ga-eketa ndụ ebighị ebi n’elu ụwa. (Jọn 10:16) Ndị Netinim na-abụghị ndị Israel na ụmụ nke ndị ohu Solomon ndị sonyeere ndị Juu n’oge ha si na Babilọn puọ n’afọ 537 T.O.A., sere onyinyo atụrụ ọzọ ahu. (Ezra 2:1, 43-58) N’oge a, oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ndị a emezuworị iwu ahụ bụ ‘ịputa’ na Babilọn Ukwu ahụ. Ndị a na-enwetazi ngọzi ime mmụọ nke e buru amụma ya n’Aịsaịa 49:10: “Agụụ agaghị agụ ha, akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ; [okpomọkụ] na anyanwu agaghị amagbukwa ha: n’ihi na Onye nwere obi ebere n’ahu ha ga-edu ha, ọ bụkwa n’akụkụ isi iyi nile jupụtara ná mmiri ka ọ ga-edu ha nwayọọ.” Ná Mkpughe 7:9, 16, 17, e ji ngọzi ndị a kwuo okwu n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere “oké ìgwé mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ.
“NDỊ NKE M, SINỤ N’IME YA PỤTA”
15. N’ihi gịnị ka Bible ji na-agba ndị ga-abụ ndị nke Chineke ume isi na Babilọn Ukwu ahụ pụta?
15 N’otu ọhụụ sitere n’ike mmuọ nsọ, e gosiri Jọn onyeozi ihe mmezu ikpe Chineke ga-apụtara Babilọn Ukwu ahu. N’ihi na ọ ghaghi ime eme, otu mmụọ ozi si n’eluigwe, nke na-ekwuchitere Chineke, gbara ume, sị: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ufọdụ n’ime ihe otiti ya nile: n’ihi na mmehie ya nile rapakọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.”—Mkpughe 18:4, 5.
16. Gịnị pụrụ igosi ma ànyị emezuwo iwu ahụ n’ezie?
16 Ndị òtù Israel ime mmụọ emewo otú ahụ, ugbu a, ha na-agba ndị ọzọ ume ka ha meekwa otú ahụ. Ha maara na ọ bụrụ na mmadụ na-agwakọta ezi ofufe na nke ụgha, na ọ pụghị ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ọ bụrụ na mmadụ na-eso Ndịàmà Jehova na-akpakọ, ma ọ hapụbeghị ihe nile jikọtara ya na Babilọn Ukwu ahụ, ọ̀ ga-esi aṅaa kwuo na ya abụghị akụkụ ya? Ọbụna ma a si na ọ dịghị ejekwa nnọkọ okpukpe ya, ma ọ ka na-ekere òkè n’ụbọchị ezumike okpukpe ya nile n’ụlọ ọrụ ya ma ọ bụ ya na ndị ikwu ya, ọ ka na-emetụkwa ihe na-adịghị ọcha aka. (Aịsaịa 52:11) Ọ bụrụ na ọ na-ekere òkè n’omenala ezinụlọ ndị na-akwado nkwe nkwe anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, ma ọ bụ egwu na-enweghi isi nke ndị ajọ mmuọ, ọ ka na-ekere òkè ná mmehie ya nile. Anyị apụghị ịnọ n’enweghị ebe anyị kwụ akwụ. Ọ bụrụ na anyị kwere na Jehova bụ ezi Chineke ahụ, anyị aghaghị ife nanị ya.—1 Ndị Eze 18:21.
17. (a) Dị ka e gosiri ná Mkpughe 14:6, 7, gịnị ka a na-akpọ ndị mmadu nọ n’ebe nile òkù ime? (b) Iji fee Jehova ofufe n’ụzọ ọ na-anara nke ọma, iwu ọzọ dị aṅaa ka o kwesịrị ka ha rubere isi?
17 A na-akpọ ndị nke mba, ebo na asụsụ nile òkù na-adọrọ mmasị, sị: Sonyenụ n’ofufe nke Jehova, bú nanị ezi Chineke ahụ! (Mkpughe 14:6, 7) N’ime otú ahụ, ị ghaghị iṅomi ndị ohu Chineke nke oge ochie, ndị gere nti n’iwu ahụ bụ: “Sinụ n’etiti Babilọn gbalaga, wepụgakwanụ onwe unu n’otu n’otu.”—Jeremaịa 51:6.