Isi nke 22
Enwela Ọchịchọ maka Ihe Ndị A Hapụworo!
1. (a) Ngọzi dị aṅaa na-eche ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi ihu n’isi nso? (b) Ma, gịnị ka ụfọdụ ndị meworo?
MMEZU amụma Bible na-egosi n’ụzọ obi abụọ na-adịghị ya na anyị nọ nnọọ usoro ihe ọhụrụ dị ebube nke Chineke nso taa. N’oge na-adịghị anya, ajọ ụwa nke a ga-agabiga, ya na obi mgbu, ndakpọ olileanya na ahụhụ nke o wetaworo. A ga-eme ka ụwa ghọọ Paradaịs ebe ndị na-efe Chineke ga-enwe ike ịnụ ụtọ nke ndụ mmadụ zuru okè ruo mgbe ebighị ebi. Banyere ịbụ eziokwu nke nkwa ya nile maka ihe ndị a, Jehova gwara Jọn onye ozi, sị: Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu. (Mkpughe 21:1-5) Otú ọ dị, ọ bụ ezie na o yiri ihe ijuanya, ụfọdụ ndị matara eziokwu ndị a na-alaghachi azụ n’ụzọ ndụ nke ụwa nke Chineke sịrị na ya ga-ebibi. Lee ka o si dị mwute! N’ihi gịnị ka ha ji mee otú ahụ?
2. (a) Iji zere ihe ndabara dị otú ahụ, gịnị ka o kwesịrị ka mmadụ mee mgbe ọ mụtasịrị eziokwu? (b) Ọ bụrụ na o meghị nke a, gịnị pụrụ iduzi echiche ya, gịnị ga-esikwa na nke ahụ pụta?
2 Mgbe mbụ ha nụrụ ozi ọma Alaeze Chineke na ihe ọ ga-emezu, ha ji ọṅụ nakwere ya. Ma, ọ dịkwa mkpa ka ha gaa n’ihu ruo ntozu okè ndị Kraịst, na-amụba nghọta ha nwere n’Okwu Chineke, na-achọkwa ụzọ isi tinyezuo ya n’omume n’ime ndụ ha. (Ndị Hibru 6:1, 11, 12) Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahapụ ime nke a n’ihi enweghị mmasị, ọ gaghị anọgide na-agụ ohere ọma nke ife Chineke dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Mmadụ dị otú a pụrụ ịghọ onye na-enweghị ndidi ichere ngọzi nile a na-ahụ anya ndị Chineke kwere ná nkwa, ma hapụ ịghọta mkpa nke uto ime mmụọ, ya na mkpa ọ dị ikerezu òkè ruo òkè ọ pụrụ ikwe ya mee n’ọrụ nkwusa na ime ndị na-eso ụzọ nke Chineke nyere anyị ịrụ ugbu a. Imejupụta ọchịchọ nke ihe onwunwe na ihe yiri ihe na-enye obi ụtọ pụrụ ịmalite iwere oge ya n’ụzọ dị ukwuu karị. Ọ na-edebe ọdịmma nile nke ihe ime mmụọ n’ọkwá nke abụọ. Ọdịghị eme ihe a nile n’otu mgbe, kama ọ na-eji nwayọọ nwayọọ na-adaghachi azụ n’ime ụwa.—1 Timoti 6:9, 10.
3. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ize ndụ ịhọrọ ndị na-adịghị efe Jehova dị ka ndị enyi? (b) Olee mgbe ọ pụrụ ịdị mfe mmadụ ịchọta onwe ya ná mkpakọrịta ntụrụ ndụ ya na ụdị ndị ahụ?
3 Mmadụ pụrụ ịsị na ya chọrọ ịlanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ, wee dị ndụ n’ime ụwa nke ezi omume bi n’ime ya. Ma ndị ọ họọrọ ịbụ ndị enyi ya hà na-akwado ihe o kwuru? O doro anya na kwa ụbọchị, anyị na ndị na-adịghị efe Jehova aghaghị imekọrịta ihe—n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ahịa, ọbụna n’ụlọ. Ma n’oge izu ike n’ụlọ ọrụ, tupu a malite akwụkwọ, na mgbe e mechisịrị, mgbe ị na-akparịta ụka na telifon ma ọ bụ mgbe ị na-eleta ndị enyi, n’oge ntụrụ ndụ, olee nnọkọrịta nke ndị ị na-ahọrọ? Ọ dị ihe o mere n’ezie? Bible dọrọ aka ná ntị, sị: Unu ekwela ka e duhie unu: Mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma. (1 Ndị Kọrint 15:33) Ma gịnị bụ mkparịta nile ọjọọ? Ọ̀ dị ihe o mere na ụfọdụ mmadụ adịghị efe Jehova, na ha na-eme nanị ihe dị mma n’anya onwe ha? N’ihi ihe anyị mụtaworo, anyị maara na mmadụ ndị dị otú ahụ agaghị alanarị baa n’ime ụwa ọhụrụ ahụ. Ndị ọ bụla ledara ụkpụrụ Jehova anya mgbe ha na-ahọrọ ndị enyi ga-achọtaghachi onwe ha n’ụwa nke ha cheburu na ha na-ahapụ. Ma, ihe nlereanya ịdọ aka ná ndị ndị e dekọrọ n’Akwụkwọ nsọ pụrụ ichebe anyị pụọ n’ịgbaso ụzọ dị otú ahụ ma ọ bụrụ na anyị etinye ha n’omume.—1 Ndị Kọrint 10:11.
‘E DERE HA IJI DỤỌ ANYỊ ỌDỤ’
4. (a) Ụdị ndụ dị aṅaa ka ndị Israel dịrị n’Israel mgbe Josef nwụsịrị? (b) N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị gwara ọgwa ji sonyere Israel mgbe a napụtara ha n’ljipt? (ch) Olee otú ihe ahụ mere n’ụzọ amụma siworo mezuo n’oge anyị a?
4 Mgbe Jehova napụtara Israel site n’ịbụ ohu n’Ijipt, lee nnọọ ka o si bụrụ inwe onwe nye ha! Ajọ mmegbu e megburu ha mgbe Josef nwụsịrị mere ka Ijipt yie oké ọdọ ọkụ nke a tụbara ha n’ime ya. (Ọpụpụ 1:13, 14; Deuterọnọmi 4:20) Ma n’oge ahụ, Jehova tiri ndị Ijipt ihe otiti iri. Ọdị iche dị n’etiti ezi Chineke ahụ na chi nile nke Ijipt pụtara ìhè. Ya mere, mgbe Israel pụrụ n’ala ahụ, ọtụtụ ndị gwara ọgwa ndị na-abụghị ndị Israel sooro ha pụọ, obụna dị ka oké ìgwè mmadụ ahụ kewapụworo onwe ha taa n’ụwa, sonyekwara ihe fọdụrụ n’Israel ime mmụọ. (Ọpụpụ 12:38) Ma gịnị dapụtara n’ogige ndị Israel n’oge na-adịghị anya mgbe Ọpụpụ ha gasịrị?
5. (a) Nwa mgbe nta ka a napụtasịrị ha, olee otú ha si ’laghachi n’Ijipt’? (b) N’ihi gịnị ka nke a ji mee?
5 Onye na-eso ụzọ Kraịst bụ Stifen kọwara, sị: [Ha] wee laghachị azụ n’ljipt n’obi ha. Nke a bụ nanị ọnwa ole na ole mgbe a napụtasịrị ha. (Ọrụ 7:39, 40) Gịnị gosipụtara nke a? Ha mere nwa ehi ọla edo—ụdị ihe maara ha ahụ n’Ijipt—wee sịkwa na ha ’na-emere Jehova ememe.’ Ma, ha na-eṅomi ndị Ijipt. (Ọpụpụ 32:1-6) Jehova wesoro ha oké iwe. Omume ha megidere Iwu ahụ e nyere ha n’Ugwu Sainai. Ọtụtụ puku n’ime ha nwụrụ. N’ihi gịnị ka nke a ji mee? Ọ bụ ezie na ha maara iwu nile nke Jehova, o doro anya na ha ewuliteghị mmasị sitere n’obi maka iwu ndị a ya na eziokwu ahụ bụ na ọ bụ ezi Chineke ahụ na-edu ha n’ezie.
6. (a) Ndokwa dị aṅaa ka Jehova meere ha n’ọzara ahụ? (1 Ndị Kọrint 10:3, 4) (b) N’ihi gịnị ka ụfọdụ ji nwee ọchịchọ maka ihe ha hapụrụ n’Ijipt?
6 Mgbe ha hapụrụ Ijipt, ma Israel ma ọtụtụ ndị gwara ọgwa ndị sonyeere ha maara na nke ahụ bụ ihe kwesịrị ekwesị. Ma, mgbe otu afọ gasịrị, ma ha abanyebeghị n’Ala Nkwa ahụ; ha enwetabeghị ebe obibi n’ime ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Ha nile nwere nri anụ ahụ n’ùjù, karịsịa, ha nwekwara nri ime mmụọ n’ụba. Ógìdì igwe ojii na nke ọkụ na-agba àmà mgbe nile na Jehova na-edu ha. N’Osimiri Uhie na n’Ugwu Sainai, ha ahụwo ihe àmà dị ịtụnanya nke ike Jehova. Ọgbụgba ndụ Iwụ ahụ nyere ha nri na ntụrụ ndụ ime mmụọ. O nyekwara ha ọtụtụ ihe ha ga-eme n’onwe ha, na-egosi ha ebe ọ dị ha mkpa ịhazigharị omume ha, echiche ha, nzube ha, ka ihe ndị a wee bụrụ ihe na-atọ Jehova ụtọ. Ma kama inwe obi ekele maka ihe Jehova na-emere ha, ha malitere inwe ọchịchọ maka ihe anụ ahụ nile ha nwere n’Ijipt. Ọchịchọ onwe onye dubara ọtụtụ mmadụ ná mbibi.—Ọnụ Ọgụgụ 11:4-6, 31-34.
7. (a) Mgbe ndị nledo ahụ weghachiri akụkọ ha, n’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji malite ikwu okwu ịlaghachi n’Ijipt? (b) Gịnị si n’ime ya pụta? (Ndị Hibru 3:17, 19)
7 Nwa mgbe nta mgbe nke a gasịrị, Moses zipụrụ ndị ikom iledo Ala Nkwa ahụ. Mgbe ha lọghachịrị, ha nile kwenyere n’ezie na ọ bụ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru n’ime ya. Ma, mmadụ iri n’ime ndị nledo ahụ tụrụ egwu ndị bi n’ebe ahụ, nakwa n’ihi obodo ha e wusiri ike. Ha atụkwasịghị Jehova obi ha nile, ha mekwara ka obi ndị ọzọ maa jijiji site n’ụjọ. Ọzọkwa, echiche ha laghachiri n’Ijipt, ha kwukwara okwu banyere ime ndokwa ịlaghachi n’ebe ahụ, N’ihi enweghị okwukwe ha, ọgbọ nke ndị nile gbara iri afọ abụọ na ndị nile tọrọ ha mesịrị nwụchapụsịa n’ọzara ahụ, n’abanyeghịkwa Ala Nkwa ahụ.—Ọnụ Ọgụgụ 13:27-33; 14:1-4, 29.
8. (a) Ka e wee zọpụta Lọt na ezinụlọ ya mgbe e bibiri Sọdọm, gịnị ka ha na-aghaghị ime? (b) N’ihi gịnị ka nwunye Lọt ji ghọọ ógìdì nnú? (ch) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka nke ahụ na-adọ anyị?
8 N’ihe karịrị narị afọ anọ tupu oge ahụ, e mere ka otu ihe mmụta nke a pụta ìhè n’okpuru ọnọdụ ọzọ dị iche. Nwa nwanne Abraham bụ Lọt ahọrọwo ibi na Sọdọm, bụ́ obodo omume ha rụrụ arụ, ma nwee ihe ịga nke ọma akụ na ụba. Omume rụrụ arụ nke Sọdọm na obodo ndị dị ya gburugburu dị nnọọ njọ nke ukwuu nke na Jehova kpebiri ibibi ya. N’enweghịkwa mgbe a ga-ewughachi ya ọzọ. E zigara ndị mmwọ ozi ịnapụta Lọt na ezinụlọ ya. Mgbe Lọt gwara ndị chọrọ ịlụ ụmụ ya banyere nke a, n’anya ha, ọ dị ka onye na-akwa emo. Ma nke a abụghị ihe ịkwa emo. Mgbe chi bọrọ, ndị mmụọ ozi ahụ mere ka Lọt na ezinụlọ ya jiri ọsọ ọsọ pụọ n’obodo ahụ, gwakwa ha ka ha gbalaga n’eleghị anya n’azụ. Ndụ ha dabeere ná nrubeisi. Lọt na ụmụ ya ndị inyom abụọ mere ihe a gwara ha, e wee zọpụta ha. Ma o doro anya na ọ masịghị nwunye Lọt ikewapụ onwe ya n’ọtụtụ akụ na ụba nke ọ hapụrụ na Sọdọm. Mgbe ọ tụgharịrị ileghachi anya azụ, ọ nwụrụ, wee ghọọ ógìdì nnú. Ànyị aghọtawo ihe nke ahụ pụtara n’onwe anyị? Ka isi ihe ahụ wee ghara ifunarị anyị, Jisọs gụnyere ya n’okwu ịdọ aka ná ntị banyere otú o si dị oké mkpa ịgbapụ n’usoro ihe ochie nke dị n’oge anyị a. Ọ bụ mgbe ọ na-adọ aka ná ntị megide inwe oké nchegbu banyere ihe onwunwe ka o kwuru kpọmkwem, sị: Chetanụ nwunye t. (Jenesis 19:12-26; Luk 17:31, 32) Gịnị pụrụ ichebe anyị pụọ n’ọnyà nke a nke matara ndị Israel na nwunye Lọt?
ỊCHỌ EBE KA MMA
9. Gịnị bụ okwukwe, oleekwa otú anyị pụrụ isi zụlite ya?
9 Ka anyị wee zere ịbụ ndị e mere ka ha leghachi anya azụ, ọ dị anyị mkpa ịzụlite okwukwe na-esiwanye ike n’ihe dị n’ihu. Ndị Hibru 11:1 kọwara okwukwe dị ka ndabere nke ihe a na-ele anya, bụrụkwa nnwapụta nke ihe a na-ahụghị anya. Ọ bụ ihe ndabere ma ọ bụ ihe akaebe, dị ka ihe ndekọ e ji enyefe mmadụ ihe nke na-egosi na anyị ga-enweta ihe Chineke kwere ná nkwa. Okwukwe dabeere n’ihe àmà doro anya, n’ihi ya, anyị nwere ezi ihe mere anyị ji kwere n’ihe a na-apụghị iji anya efu hụ. Ọ bụghị nkwe nkwe nzuzu, ma ọ bụ ịdị njikere ikwenye n’ihe nanị n’ihi na ọ dị ụtọ ná ntị. Iji nwee ezi okwukwe, anyị kwesịrị ịchọ ụzọ ịmara nke ọma ihe àmà ahụ nke okwukwe dabeere na ya. Ọ dịkwa anyị mkpa iji nlezianya tụgharịa uche banyere ụzọ ihe anyị na-amụta si emetụta ndụ anyị na ịzụlite ezi mmasị sitere n’obi maka ya.
10. (a) Olee otú Abraham si gosipụta okwukwe ya, ruokwa ókè ha aṅaa? (b) Olee otú anyị si mara na ihe o mere ziri ezi?
10 Abraham nwere ụdị okwukwe ahụ. N’ihi ya, ná ntụziaka Jehova, Abraham hapụrụ obodo ihe na-agara nke ọma bụ Ua nke dị na Kaldea, wee kwafee n’ebe dị anya bụ Kenean, bụ́ ala nke ọ na-ahụbeghị mbụ. N’ebe ahụ ka o biri dị ka ọbịa, n’adabereghị n’alaeze obodo nke ọ bụla iji nweta nchebe. Ọ na-ele anya obodo ahụ nke nwere ntọala [Alaeze Jehova dị n’aka Mesaịa], nke Chineke bụ onyeọkà ya na onye rụrụ ya. Ọ bụrụ na ọ nọgidere na-enwe ọchịchọ maka ndụ nke ndị Kaldea, obi abụọ adịghị ya na ọ gaara alaghachị n’ebe ahụ. Kama nke ahụ, ọ na-agbaso ala ka mma, nke ahụ bụ, ala dị n’eluigwe. (Ndị Hibru 11:8-16) Ọ bụghị nanị ruo afọ ole na ole, ọbụna afọ iri ma ọ bụ iri abụọ, ka Abraham nọ na-achọ ala [ahụ] ka mma. Ọ nọgidere na-eme otú ahụ ruo kpọmkwem n’oge ọnwụ ya, otu narị afọ ma ọ bụ karịa mgbe ọ hapụsịrị Ua. Ihe o mere abụghị nanị ịsị na ya nwere okwukwe; o gosiri ya site n’ọrụ ya nile. N’ihi ya, ụgwọ ọrụ ya bụ ihe e ji n’aka. Olileanya nke ịkpọlite ya n’ọnwụ doro nnọọ anya otú a ma, dị ka Jisọs kwuru, ’nye Chineke, Abraham dị ndụ.—Luk 20:37, 38; Jemes 2:18.
11. Olee ụzọ Aisak na Jekọb si gosipụta na ha onwe ha nwekwara okwukwe?
11 Ma, oleekwanụ banyere nwa Abraham, bụ́ Aisak, na nwa Aisak, bụ́ Jekọb? Ọ dịghị mgbe ọ bụla ha bitụrụ ndụ dị ka ndị Kaldea. Ma ha agụghị nke a n’ihe mere ha ga-eji chọọ ịmata otú ụzọ ndụ ahụ dị n’onwe ha. Mgbe ha mụtara banyere nkwa Jehova nile site n’ọnụ ndị mụrụ ha, ha buuru nkwa ndị a n’obi. Ha zụlitere okwukwe yiri nke Abraham. Ha onwe ha ’na-agbasokwa ala ka mma.’ Ihere ha adịghị eme Chineke.—Ndị Hibru 11:9, 16, 20, 21; Jenesis 26:24, 25; 28:20-22.
12. Gịnị dubara Ịsọ na Daịna ná nsogbu ndị jọgburu onwe ha?
12 N’aka nke ọzọ, nwanne Jekọb bụ Ịsọ enweghị mmasị n’ihe ime mmụọ. Ọ lụụrụ ndị inyom na-adịghị efe Jehova. Kama inwe mmasị n’ihe ime mmụọ, o rere ọnọdụ diọkpara ya n’ihi otu efere nri. (Jenesis 25:29-34; 26:34, 35; Ndị Hibru 12:14-17) Ọ bụ onye chọrọ imeju agụụ nke anụ ahụ ozugbo. Ada Jekọb, bụ́ Daịna, dabakwara ná nsogbu dị njọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ masịrị ya isoro ụmụ ndị inyom ala ahụ, bụ́ ndị ọgọ mmụọ na-akpakọ.—Jenesis 34: 1, 2.
13. (a) Olee otú ndụ si dịịrị ndị ahụ bụ akụkụ nke ụwa taa? (b) Gịnị ga-echebe anyị ka anyị wee ghara ịbụ ndị a ga-adọghachi baa n’ime ụwa?
13 Ọ bụrụ na dị ka Abraham, Aisak na Jekọb, na ị na-agbaso ala ka mma n’ezie, nke bụ ndụ n’okpuru Alaeze Jehova dị n’aka Mesaịa, ekwela ka a dọghachị gị azụ baa n’ụwa. Cheta na ụwa apụghị ikwe nkwa ọdịnihu na-adịgide adịgide. Ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebịghị ebi. Lee aha ndụ na-eju afọ nke ahụ ga-abụ!—1 Jọn 2:17.
[Foto dị na peeji nke 172]
Chetanụ nwunye Lọt!