Isi 10
Ihe Chineke Ṅụrụ n’Iyi Imere Ihe A Kpọrọ Mmadụ—Dị Nso Ugbu A!
1, 2. (a) N’echiche dị aṅaa ka Chineke na-aṅụ iyi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị ka Chineke na-ekwu n’Aịsaịa 45:23? (ch) Okwu ndị dị aṅaa nke Aịsaịa onye amụma ka anyị kwesịrị inwe ike ikwere na ha?
CHINEKE ọ̀ na-aṅụ iyi? Ee, Chineke na-aṅụ iyi, ma ọ naghị eji ịkpọ iyi eme ihe, na-etiwapụ n’iwe ma na-atụfu njide onwe onye. Ịṅụ iyi ya na-abụkarị iji mesie ike ihe o kwupụtaworo ịbụ nzube ya. Ọ na-emesikwu ndị ahụ ọ gaje imetụta obi ike. N’ihi ya, ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-eme nke ọma ige ntị n’okwu ya dị n’Aịsaịa 45:23: “Ejiwo m onwe m ṅụọ iyi, otu okwu esiwo n’ọnụ m pụta n’ezi omume, ọ gaghị alaghachikwa, sị, na mụ onwe m ka ikpere nile ọ bụla ga-egburu, mụ ka ire nile ọ bụla ga-aṅụrụ iyi.”
2 Taa, ihe karịrị 2,700 afọ kemgbe e busịrị amụma ahụ, ò dowo anyị anya na okwu onye amụma ahụ dị n’Aịsaịa 45:24 bụ eziokwu: “Nanị na Jehova ka ezi omume nile na ike dị, . . . ya ka mmadụ ga-abịakwute, ihere ga-emekwa ndị ahụ nile iwe ha dị ọkụ megide ya”? Ọ bụrụ otú ahụ, mgbe ahụ anyị pụrụ ikwetakwa n’okwu ndị ọzọ sonụ nke Aịsaịa n’amaokwu nke 25: “Na Jehova ka a ga-agụ mkpụrụ nile nke Israel ná ndị ezi omume, ọ bụkwa na ya ka ha ga-anya isi.”
3, 4. (a) N’ihi gịnị ka Aịsaịa 45:25 na-ekwesịghị ime ka anyị chee echiche maka Republic of Israel? (b) È nwewo ọdịda ọ bụla ná mmezu nke Aịsaịa 45:23-25, n’ihi gịnịkwa ka i ji zaa otú a?
3 Mgbe anyị na-agụ Aịsaịa 45:25, ànyị ga na-eche banyere mba Republic of Israel? Ee e! Ndị Israel ndị ahụ adịghị ekwu na ọ bụ Chineke nke Akwụkwọ Nsọ Hibru ha na-enye ha mmeri. N’ihi nsọpụrụ hiere ụzọ, ha na-ajụ ọbụna ịkpọpụta aha ya.
4 Site na nke a, ànyị na-arụ ụka na Aịsaịa 45:23-25 emezubeghị ruo n’afọ a? Ee e! E nwebeghị ọdịda ọ bụla ná mmezu nke amụma ahụ n’oge a kara aka nke Jehova. N’ebe ọ nọ, enweghị mmezu nke amụma ya bụ ihe na-apụghị ime eme! Ọ bụghị nanị na okwu ya n’onwe ya bụ ihe a pụrụ ịtụkwasị obi na ịdabere na ya kama ọ na-adị otú a karị mgbe Jehova ṅụrụ iyi maka ya, iji mesie okwu ike.
Chineke Ewere Ịṅụ Iyi Bata n’Okwu
5. Olee otú Ndị Hibru 6:13-18 si akọwa Chineke iji ịṅụ iyi gboo okwu ná nkwa o kwere Abraham?
5 Banyere nke a, anyị na-agụ ná Ndị Hibru 6:13-18: “N’ihi na mgbe Chineke kwere Abraham nkwa, ebe ọ na-enweghị onye ọ bụla ka ya ukwuu iji ṅụọ iyi, o ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Mee elu mee ala n’ịgọzi m ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba m ga-eme ka ị baa ụba. Otú a o wee nwee ogologo ntachi obi, wee natakwa nkwa ahụ. N’ihi na mmadụ ji onye ka ha ukwuu aṅụ iyi: ịṅụ iyi bụkwaara ha nkwubi okwu nke okwu ọ bụla, ime ka o guzosie ike. N’otu ụzọ ahụ Chineke, ebe ọ na-ezube igosibiga ndị nketa nke nkwa ya ókè karị na izu ya bụ ihe na-adịghị agha agha, o weere ịṅụ iyi gboo okwu: ka anyị wee were ihe abụọ na-adịghị agha agha, nke Chineke na-apụghị ikwu okwu ụgha n’ime ha, nwee nkasi obi siri ike, anyị, bụ́ ndị gbabara ijidesi olileanya ahụ ike, bụ́ nke e debere n’ihu anyị.”
6. (a) Ihe nkwali dị aṅaa ka e nwere maka Chineke iji onwe ya ṅụọ iyi banyere nkwa o kwere Abraham? (b) Olee otú Jehova pụrụ isi jiri “enyi” ya mee ihe?
6 N’ozuzu, e nwere ihe mkpali siri ike maka ịṅụ iyi. Nke ahụ bụ eziokwu karịsịa mgbe ịṅụ iyi ahụ bụ dị ka Chineke chepụtara, n’abụghị ná mmanye. E gosiri ụdị mkpali dị otú ahụ n’ọnọdụ a bụ́ ebe a kọrọ na Jehova ṅụrụ iyi, ee, jiri onwe ya ṅụọ iyi. Nkwa ahụ a ṅụrụ iyi n’elu ya bụ́ nke Jehova kwere Abraham, “enyi” ya, na-emetụta anyị nile taa. Ọ masịrị Jehova mgbe Abraham mere ihe banyere ọkpụkpọ òkù ahụ Chineke kpọrọ ya wee hapụ ala nke aka ya iji jee ala ahụ Jehova ga-enye ụmụ Abraham dị ka ihe nketa. Jehova pụrụ ime ka aha “enyi” ya nke a dị ukwuu n’enweghị ihe ize ndụ ọ bụla, pụọkwa iji ya mee ihe maka ịgọzi ndị ọzọ. Jehova pụrụ nnọọ ịgwa ya, sị: “M ga-agọzikwa ndị na-agọzi gị, ọ bụkwa onye na-akọcha gị ka m ga-abụ ọnụ: a ga-agọzikwa agbụrụ nile nke ụwa n’ime gị.”—Jenesis 12:3; Aịsaịa 41:8.
7. (a) Ọrụ ebube dị aṅaa ka Chineke ji gosi Abraham ihu ọma mgbe nwunye ya gbara 90 afọ? (b) Olee otú Abraham si gosipụta okwukwe na nrubeisi ya n’ụzọ pụrụ iche?
7 Mgbe nwunye Abraham bụ́ Sera gbara 90 afọ, mgbe oge ịmụ nwa ya gafesịworo, n’ụzọ ọrụ ebube Chineke meere ya ihe ọma nke ịmụtara Abraham nwa ha hụrụ n’anya bụ́ Aịsak, n’ịga n’ihu ná nkwa ọma Ya nke o kwere Abraham. Abraham gosipụtara onwe ya ịdị njikere ịchụ ọbụna nwa nke a dị oké ọnụ ahịa dị ka àjà mmadụ n’irube isi n’iwu nke Chineke ya, bụ́ Jehova. Ngosi nke a pụrụ iche nke okwukwe na nrubeisi kpaliri Jehova otú a nke na ọ gwara “enyi” ya, bụ́ Abraham:
8, 9. (a) Olee otú Jehova si zaghachi ngosipụta nke a nke okwukwe na nrubeisi Abraham? (b) Ònye ka Chineke mere onwe ya ka o jide ụgwọ?
8 “Eji m onwe m ṅụọ iyi, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta, na n’ihi na i mewo ihe a, n’ihi na i gbochighịkwa nwa gị nwoke, onye i nwere nanị ya: na n’ịgọzi m ga-agọzi gị, n’ime ka a baa ụba m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka kpakpando nke eluigwe, na dị ka ájá nke dị n’ụsọ oké osimiri; mkpụrụ gị ga-enwetakwa ọnụ ụzọ ámá nke ndị iro ya; ọ bụkwa ná mkpụrụ gị ka mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha; n’ihi na i gewo nti n’olu m.”—Jenesis 22:15-18.
9 Nke a bụ ebe mbụ na Bible ebe a kọrọ na Jehova ṅụrụ iyi. N’ihi na o nweghị onye ka ya elu ọ pụrụ iji ṅụọ iyi, o jiri onwe ya ṅụọ iyi, na-ekegide onwe ya na ya. N’ụzọ dị otú a o mere ka ọ ghara ijide onye ọ bụla ụgwọ ma e wezụga onwe ya. Ọ ghaghị ịbụ maka otuto nke onwe ya mere o ji mezuo nkwupụta nke nzube nke onwe ya.
Ruo n’Ókè Hà Aṅaa?
10. Ihe dị ka ogologo oge hà aṅaa gara aga ka Chineke na Abraham gbara ndụ, n’ihi ya kwa ajụjụ dị aṅaa na-ebilite?
10 Abraham banyere n’ala nkwa ahụ nke Kenean n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 4,000 afọ gara aga. Ya mere ka ọ dị ugbu a, ruo ókè hà aṅaa ka e mezuworo ọgbụgba ndụ ahụ a gbara na 1943 T.O.A.?
11. (a) Gịnị ka ọbụbụ Republic of Israel bụ onye òtù nke òtù UN na-egosi, gịnịkwa bụ ihe ndị ọ rụpụtara? (b) Ụmụ Abraham nke anụ ahụ hà na-eru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ndị a chọrọ ha iji bụrụ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa?
11 Taa, e nwere Republic of Israel n’Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Maka ọdịmma onwe ya, ọ bụ onye òtù nke òtù United Nations. Òtù UN na-anọchi anya ọjụjụ a jụrụ Alaeze Jehova Chineke site ná “mkpụrụ” Abraham ahụ e kwere ná nkwa, n’ihi ya kwa a ga-ebibi ya ‘n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,’ bụ́ Amagedọn. A ga-ebipụ ndị òtù nile ọ bụla nke UN, tinyere Republic of Israel. N’ụzọ na-adịghị enye obi ụtọ, ụmụ anụ ahụ nke Abraham adịghị eru ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe a chọrọ n’aka ha iji bụrụ “mkpụrụ” Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa nke ọ bụ site na ya ka Jehova Chineke ga-agọzi ihe nile a kpọrọ mmadụ.—Mkpughe 16:14-16.
12, 13. (a) N’adịghị ka nna ya ochie bụ́ Devid, n’ihi gịnị ka “Onyeisi Udo” ahụ na-agaghị eji chịa nanị ya? (b) Ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ hà cheere ruo mgbe e guzobere Alaeze ahụ na 1914 iji nweta ngọzi ahụ e kwere ná nkwa, oleekwa otú anyị si mara?
12 N’ụzọ dị nnọọ mfe otú onye ọ bụla pụrụ ịrịba ama, Mesaịa ahụ e kwere ná nkwa adịghị achị na Jerusalem elu ala nke Ebe Etiti Ọwụwa Anyanwụ Ụwa maka mmezu nke ọgbụgba ndụ Abraham. N’adịghị ka nna ya ochie bụ́ Devid nke oge ochie, Mesaịa ahụ na “Onyeisi Udo” ahụ agaghị achị nanị ya. O kwere nkwa na ndị ozi 12 ya ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ga-esonyere ya n’ọchịchị, tinyere ndị na-eso ụzọ ya ndị ọzọ e ji mmụọ nsọ mụọ, ruo ọnụ ọgụgụ bụ 144,000. (Mkpughe 7:1-8; 14:1-4) A ka nwere ihe fọdụrụ ná ndị dị otú a na-eso ụzọ n’elu ala. Gịnị ka e mewooro ha n’ime ka mmezu nke ọgbụgba ndụ Abraham ahụ nke Chineke ṅụkwasịrị iyi nwee ọganihu? Onye bụbu onye na-ebute ụzọ nke nwere olileanya iso n’Alaeze ahụ, Pọl onyeozi, dere ná Ndị Galetia 3:8, sị: “Ma ihe e deworo n’akwụkwọ nsọ, ebe o buru ụzọ hụ na Chineke na-esite n’okwukwe gụọ ndị mba ọzọ ná ndị ezi omume, o buru ụzọ zie Abraham ozi ọma, sị, A ga-agọzi mba nile n’ime gị.”
13 Ndị Kraịst a họtara site ná mba dị iche iche echereghị ruo mgbe e guzobesịrị Alaeze ahụ na 1914 tupu ha enweta ngọzi ahụ e kwere ná nkwa, n’ihi na Pọl onyeozi gara n’ihu ikwu, sị: “Ya mere ndị sitere n’okwukwe, ndị a ka a na-agọzi, ha na onye okwukwe ahụ, bụ́ Abraham.” (Ndị Galetia 3:9) Pọl bụ onye Kraịst, a na-agọzikwa ya, otú a kwa ka ọ dị ndị Kraịst ndị ọzọ nile e ji mmụọ nsọ mụọ n’ụbọchị ya.a N’otu aka ahụ taa, ihe fọdụrụ ahụ, nke ihe mejupụtara ya bụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ, ndị na-arapagidesi ike n’okwukwe ha nwere na Mesaịa ahụ dị ka “mkpụrụ” bụ́ isi nke Abraham maka ịgọzi ihe nile a kpọrọ mmadụ, na-enwe ngọzi ahụ e kwere ná nkwa.
14. (a) Olee otú ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ siworo bụrụ ndị a gọziri agọzi n’ụzọ pụrụ iche n’ikwekọ n’ọgbụgba ndụ Abraham? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka nke a siworo wepụ Jehova n’ụta?
14 Site n’ịrara onwe ha nye Jehova na igosipụta nraranye nke a site na baptism ime mmiri na mgbe ahụ ịbụ ndị e ji mmụọ nke Chineke mụọ gaa n’ọnọdụ ime mmụọ, ndị Kraịst ndị a aghọwo ụmụ ime mmụọ nke Abraham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova Chineke. Ha aghọwokwa ndị ha na Jisọs Kraịst, bụ́ Aịsak ahụ Ka Ukwuu ga-eso ketakọọ ihe. (Ndị Rom 8:17) N’ezie ha bụ ndị a gọziri agọzi n’ụzọ pụrụ iche n’ụzọ kwekọrọ n’ọgbụgba ndụ Abraham ahụ. Jehova anọwo na-emezu ihe ọ ṅụrụ n’iyi ime, si otú a na-ewepụ onwe ya n’ụta dị ka onye na-ekwu eziokwu, Onye nwere ike n’ụzọ zuru okè imezu ihe o ji aha ya ṅụọ iyi n’ụzọ siri ike ime.
15. Gịnị ka Pọl onyeozi kwuru na nke ọ bụla ná ndị òtù nke ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst ahụ e ji mmụọ nsọ mụọ bụ?
15 Onye òtù ọ bụla nke ihe fọdụrụ ahụ ná ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ mụọ bụ onye Juu n’ụzọ ime mmụọ. Dị ka Pọl onyeozi kwuru: “Onye nke bụ onye Juu n’anya mmadụ abụghị onye Juu; obibi úgwù ahụ nke mmadụ na-ahụ anya, nke dị n’anụ ahụ, abụghịkwa obibi úgwù: kama onye nke bụ onye Juu n’ihe zoro ezo, onye ahụ bụ onye Juu; obibi úgwù bụkwa nke mkpụrụ obi, n’ime mmụọ, ọ bụghị n’ihe e deworo n’akwụkwọ.”—Ndị Rom 2:28, 29.
16. Ndị Juu ime mmụọ na-emejupụta òtù dị aṅaa e buru amụma ya na Zekaraịa 8:23?
16 ‘N’ọgwụgwụ ihe nile’ nke a, ndị Kraịst ahụ e ji mmụọ nsọ mụọ, ndị bụ ndị Juu n’ihe zoro ezo, ndị e biri úgwù n’obi ha, mejupụtara òtù nke ndị Juu ahụ e buru amụma ha na Zekaraịa 8:23, bụ́ ebe e dere, sị: “Otú a ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha sịrị: Ná mgbe ahụ ka ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile jide, ọbụna ijide ọnụ ọnụ ala uwe nwoke bụ onye Juu, sị, Anyị na unu ga-ayịkọ jee, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”
17. (a) Olee ndị ka “ndị ikom iri” ahụ chọrọ isoro ihe fọdụrụ taa ná ndị Juu ime mmụọ fee Jehova na-anọchite anya ha? (b) Site n’isonyere ndị Juu ime mmụọ ahụ n’ofufe Jehova, gịnị ka ndị òtù nke “atụrụ ọzọ” ahụ na-ama ụtọ ya ugbu a?
17 ‘Ndị ahụ’ “ndị ikom iri” ahụ chọrọ isoro jee n’ofufe Jehova Chineke bụ ihe fọdụrụ ahụ dị taa nke ndị ahụ bụ ndị Juu n’ime mmụọ, òtù ahụ mejupụtara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” nke dị na Matiu 24:45-47. Ebe ọnụ ọgụgụ bụ iri na-anọchite anya ozuzu n’ụdị nke ihe dị n’elu ala, “ndị ikom iri ga-esi n’asụsụ nile nke mba nile” ga-anọchite anya atụrụ ihe atụ ahụ nile e buru amụma ya na Matiu 25:32-46. Ndị a bụ òtù nke “atụrụ ọzọ” ahụ nke Jisọs kwuru na ya ga-ejikọta ha na ihe fọdụrụ ahu yiri atụrụ, iji ha mepụta “otu ìgwè atụrụ” n’okpuru nlekọta nke “otu onye ọzụzụ atụrụ,” bụ́ ya onwe ya. (Jọn 10:16) N’ụzọ dị otú a ha na-ebu ụzọ detụ ngọzi dị iche iche nke ọgbụgba ndụ Abraham ire site ná “mkpụrụ” Abraham ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Jehova Chineke. Mgbe ahụ, n’ezie, ihe Chineke ṅụrụ n’iyi imere ihe nile a kpọrọ mmadụ dị nso!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’izo aka n’aha ahụ bụ́ “ndị Kraịst,” ntụaka ala ala peji nke Reference Bible n’Ọrụ Ndị Ozi 11:26 na-ekwu, sị: “Hibru, Meshi·chi·yimʹ, ‘ndị kwere na Mesaịa.’”
[Foto dị na peeji nke 89]
Bible buru amụma na ndị si ná mba nile ga-abịa sonyere Israel ime mmụọ