Fee Chineke Ofufe n’Ụzọ O Si Chọọ
JISỌS kwuru n’ekpere o kpegaara Chineke, sị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ̀ bụ ihe ọmụma dị aṅaa? “[Chineke] na-achọ ka a zọpụta mmadụ nile, ka ha bịaruokwa mmazu nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Nsụgharị The Amplified Bible dere akụkụ ikpeazụ nke ahịrị okwu ahụ n’ụzọ dị otú a, sị: “Mara Eziokwu ahụ [banyere Chineke] kpọmkwem na n’ụzọ ziri ezi.”
Ya mere Chineke chọr[o ka anyị mara ya na nzube ya nke ọma, n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu nke Chineke. Okwu Chineke, bụ́ Bible Nsọ, bụkwa isi iyi nke eziokwu ahụ. (Jọn 17:17; 2 Timoti 3:16, 17) Mgbe ndị mmadụ mụtara ihe Bible na-ekwu banyere Chineke nke ọma, mgbe ahụ ha ga-ezere ịdị ka ndị ahụ e kwuru okwu ha ná Ndị Rom 10:2, 3, bụ́ ndị “na-anụ ọkụ n’obi n’ebe Chineke nọ, ma ọ bụghị dị ka mmazu si dị.” Ma ọ bụ dị ka ndị Sameria ahụ, ndị Jisọs gwara, sị: “Unu onwe unu na-akpọ isiala nye ihe unu na-amataghị.”—Jọn 4:22.
Ya mere, ọ bụrụ na anyị chọrọ nnwapụta nke Chineke, ọ dị anyị mkpa ịjụ onwe anyị, sị: Gịnị ka Chineke na-ekwu banyere onwe ya? Olee otú ọ chọrọ ka e si fee ya ofufe? Olee ihe ndị bụ nzube ya, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi kwekọọ na ha? Ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ na-enye anyị azịza ziri ezi n’ajụjụ ndị dị otú a. Mgbe ahụ, anyị pụrụ ife Chineke ofufe n’ụzọ o si chọọ.
Asọpụrụghị Chineke
CHINEKE kwuru, sị: “Ndị na-asọpụrụ m ka m ga-asọpụrụ.” (1 Samuel 2:30) Ọ̀ na-ewetara Chineke nsọpụrụ bụ́ ịsị na ya na onye ọ bụla hà nhata? Ọ̀ na-ewetara ya nsọpụrụ bụ́ ịkpọ Meri “nne nke Chukwu” na “Onye Ogbugbo Nwanyị . . . n’etiti Onye Okike na ihe O kere eke,” dị ka akwụkwọ bụ New Catholic Encyclopedia mere? Ee e, echiche ndị dị otú a na-ewetara Chineke mkparị. Ọ dịghị onye ya na ya hà nhata; o nweghịkwa nne nke bụ mmadụ, ebe ọ bụ na Jisọs abụghị Chineke. E nweghịkwa “Onye Ogbugbo Nwanyị,” n’ihi na Chineke ahọpụtawo ‘otu onye ogbugbo n’etiti Chineke na mmadụ,’ bụ́ Jisọs.—1 Timoti 2:5; 1 Jọn 2:1, 2.
N’ụzọ ihe ịrụ ụka ọ bụla na-adịghị na ya, ozizi Atọ n’Ime Otu emegharịwo ma gwagbuo nghọta ndị mmadụ banyere ihe bụ ọnọdụ Chineke n’ezie. Ọ na-egbochi ndị mmadụ inwe ezi nghọta nke Ọkaaka Eluigwe na Ala ahụ, bụ́ Jehova Chineke, nakwa ife ya ofufe n’ụzọ o si chọọ. Dị ka onye ọkà mmụta okpukpe bụ Hans Küng si kwuo: “N’ihi gịnị ka onye ọ bụla ga-eji chọọ ịtụkwasị ihe ọ bụla n’echiche nke ịdị otu na ịdị iche nke Chineke, bụ́ nke pụrụ nanị ịgwagbu ma ọ bụ bibie ịdị otu na ịdị iche ahụ?” Ma ọ bụ ihe ikwere n’Atọ n’Ime Otu meworo.
Ndị ahụ kwere n’Atọ n’Ime Otu enweghị ‘ezi mmazu nke Chineke.’ (Ndị Rom 1:28) Amaokwu ahụ kwukwara, sị: “Chineke rakwaara ha nye n’aka uche a jụrụ ajụ, ime ihe ahụ nile na-ekwesịghị.” Amaokwu 29 ruo 31 depụtara ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ “na-ekwesịghị,” dị ka ‘igbu mmadụ, esemokwu, imebi ọgbụgba ndụ, ịbụ ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, enweghị obi ebere.’ Okpukpe ndị nakweere Atọ n’Ime Otu emewo ihe ndị a nile.
Dị ka ihe atụ, ndị kwere n’Atọ n’Ime Otu akpagbuwo ọbụna gbuokwa ndị jụrụ ozizi Atọ n’Ime Otu mgbe mgbe. Ha emewokwa ọbụna karị. Ha egbuwo ndị òtù ha kwere n’Atọ n’Ime Otu n’oge agha. Gịnị ka a pụrụ ịkpọ ‘ihe na-ekwesịghị ekwesịghị’ karịa ndị Katọlik igbu ndị Katọlik, ndị Orthodox igbu ndị Orthodox, ndị Protestant igbu ndị Protestant—ha nile n’aha otu Chineke Atọ n’Ime Otu ahụ?
Ma, Jisọs kwuru n’ụzọ doro anya, sị: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.” (Jọn 13:35) Okwu Chineke mere ka nke a dowanye anya, na-asị: “N’ime nke a ka ụmụ Chineke bụ ndị e meworo ka ha pụta ìhè, ha na ụmụ Ekwensu: onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esighị na Chineke pụta, onye nke na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya esighịkwa na ya pụta.” O ji ‘Ken onye sitere n’ajọ onye ahụ [Setan] pụta, wee gbuo nwanne ya’ tụnyere ndị na-egbu ụmụnna ime mmụọ ha.—1 Jọn 3:10-12.
Otú a, izi ozizi ndị na-agbagwoju anya banyere Chineke edujewo n’ihe omume ndị na-emebi iwu ya. N’ezie, ihe meworo na Krisendọm nile bụ ihe otu onye ọkà mmụta okpukpe si Denmark, bụ́ Søren Kierkegaard kọwara, sị: “Krisendọm ebibiwo Iso Ụzọ Kraịst n’amataghị na ha mere otú ahụ.”
Ọnọdụ ime mmụọ nke Krisendọm kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi dere: “Ha na-ekwupụta na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnahụ ya, ebe ha bụ ihe arụ, ndị na-adịghị ekwenyekwa, bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ n’ebe ezi ọrụ nile ọ bụla dị.”—Taịtọs 1:16.
N’oge na-adịghị anya, mgbe Chineke ga-eweta ajọ usoro ihe ndị a ná ngwụsị ya, Krisendọm nke na-anakwere Atọ n’Ime Otu ga-aza ajụjụ. A ga-amakwa ya ikpe maka ihe omume na ozizi ya dị iche iche ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.—Matiu 24:14, 34; 25:31-34, 41, 46; Mkpughe 17:1-6, 16; 18:1-8, 20, 24; 19:17-21.
Jụ Atọ n’Ime Otu
APỤGHỊ iji eziokwu Chineke gbanwere ihe ọ bụla ọzọ. N’ihi nke a, ife Chineke ofufe n’ụzọ o si chọọ pụtara ịjụ ozizi Atọ n’Ime Otu. Ọ na-emegide ihe ndị amụma, Jisọs, ndị ozi, na ndị Kraịst mbụ kwere ma kụzie. Ọ na-emegide ihe Chineke kwuru banyere onwe ya n’Okwu ya nke e dere n’ike mmụọ nsọ. Otú a, ọ na-adụ ọdụ, sị: “Mata na nanị m bụ Chineke na e nweghịkwa onye ọzọ di ka m.”—Aịsaịa 46:9, TEV.
Adịghị eme uche Chineke site n’ime ka ọ bụrụ ihe mgbagwoju anya na ihe omimi. Kama nke ahụ, ka ndị mmadụ nọ ná mgbagwoju anya karị banyere Chineke na nzube ya nile, otú a ka ọ na-amasị Onye Na-ebuso Chineke iro, bụ́ Setan Ekwensu karị, onye bụ ‘chi nke ụwa nke a.’ Ọ bụ ya na-akwalite ụdị ozizi ụgha ndị dị otú ahụ iji ‘mee ka uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.’ (2 Ndị Kọrint 4:4) Ozizi Atọ n’Ime Otu bụkwa maka ọdịmma nke ndị ndú okpukpe bụ́ ndị chọrọ ijigide ikike ha nwere n’ebe ndị mmadụ nọ, n’ihi na ha na-eme ka o yie ka a ga-asị na nanị ndị ọkà mmụta okpukpe pụrụ ịghọta ya.—Lee Jọn 8:44.
Ezi ihe ọmụma nke Chineke na-eweta inwe onwe dị ukwuu. Ọ na-eme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ozizi ndị na-emegide Okwu Chineke na nzukọ ndị si n’ezi ofufe dapụ. Dị ka Jisọs kwuru: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.
Site n’ịsọpụrụ Chineke dị ka onye kachasị ihe nile ma na-efe ya ofufe n’ụzọ o si chọọ, anyị pụrụ izere ikpe ọmụma nke ọ ga-eweta n’oge na-adịghị anya n’ebe Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ nọ. Kama nke ahụ, anyị pụrụ ilepụ anya n’ihu gaa n’inweta ihu ọma nke Chineke mgbe usoro ihe nke a gwụsịrị: “Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:17.
[Foto dị na peeji nke 31]
Ihe a a tụrụ atụ nke dị na France, bụ́ nke dịworo ọtụtụ narị afọ, na-egosipụta ichi echichi nke “nwa agbọghọ na-amaghị nwoke” bụ Meri site n’aka Atọ n’Ime Otu. Nkwenye n’Atọ n’Ime Otu dujere n’ịsọpụrụ Meri dị ka “Nne nke Chukwu”