Isi 9
Mmalite nke Ndụ Ezinụlọ Jisọs
MGBE Jisọs na-etolite na Nazaret, ọ bụ nnọọ obodo nta, nke a na-amaghị ama. Ọ dị n’obodo dị n’ugwu nke ebe a na-akpọ Galili, ọ dịghị anya site na Ndagwurugwu Jezreel ahụ mara mma.
Mgbe Josef na Meri si Ijipt kpọta Jisọs n’ebe a, eleghị anya mgbe ọ dị ihe dị ka afọ abụọ, o doro anya na ọ bụ nanị nwa Meri ka nwere. Ma ọ dịgideghị otú ahụ ruo ogologo oge. Mgbe oge na-aga, a mụrụ Jemes, Josef, Saịmọn, na Judas, Meri na Josef mụkwara ụmụ ndị inyom. N’ikpeazụ, Jisọs nwere ma ọ dịkarịa ala, ụmụnne nwoke na nwanyị isii ndị ọ tọrọ.
Jisọs nwekwara ndị ikwu ndị ọzọ. Anyị amaworị na nwa nwanne nne ya nke tọrọ ya bụ Jọn, onye biri na Judia nke dị ọtụtụ maịlụ site n’ebe ahụ. Onye nke bi n’ebe ka dịrị nso na Galili bụ Salome, onye o yiri ka ọ bụ nwanne Meri. Salome bụ nwunye Zebedi, nke bụ na ụmụ ha abụọ bụ Jemes na Jọn ga-abụkwa ụmụ nwanne nne Jisọs. Anyị amaghị ma, mgbe Jisọs na-etolite, ọ̀ nọnyeere ụmụ okoro ndị a ruo ogologe oge, ma n’ikpeazụ ha ghọrọ ndị ha na ya kpakọrịtara n’ụzọ chiri anya.
Josef rụsiri ọrụ ike iji kwadoo ezinụlọ ya nke na-amụba amụba. Ọ bụ onye ọkwa nkà. Josef zụrụ Jisọs dị ka nwa nke aka ya, n’ihi ya a kpọrọ Jisọs “nwa onye ọkà.” Josef kụziiri Jisọs ịbụkwa onye ọkwa nkà, ọ mụtakwara ya nke ọma. Ọ bụ ihe mere ndị mmadụ ji mesịa kwuo banyere Jisọs sị, “Onye ọkà ahụ.”
Ihe bụ isi ihe ná ndụ ezinụlọ Jisọs bụ ofufe nke Jehova Chineke. N’ikwekọ n’Iwu Chineke, Josef na Meri na-enye ụmụ ha ntụziaka ime mmụọ ‘mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha, mgbe ha na-eje ije n’ụzọ, mgbe ha na-edina ala, na mgbe ha na-ebili ọtọ.’ E nwere ụlọ nzukọ dị na Nazaret, anyị pụkwara ijide n’aka na Josef na-akpọrọ ezinụlọ ya na-eje ebe ahụ mgbe mgbe maka ofufe. Ma ịrụ ụka adịghị ya na nke na-amasị ha karịsịa bụ njem a na-eje mgbe nile n’ụlọ ukwu Jehova dị na Jerusalem. Matiu 13:55, 56; 27:56; Mak 15:40; 6:3; Deuterọnọmi 6:6-9.
▪ Ya dịkarịsịa ala, ụmụnne nwoke na ndị nwanyị nta ole ka Jisọs nwere, gịnị bụkwa aha ụfọdụ n’ime ha?
▪ Olee mmadụ atọ ndị bụ ụmụ ụmụnne nne Jisọs a maara nke ọma?
▪ Olee ọrụ ego Jisọs mesịrị malite ịrụ, n’ihi gịnịkwa?
▪ Ihe ọmụma dị aṅaa dị mkpa ka Josef na-enye ezinụlọ ya?