Isi 17
Izi Nikọdimọs Ihe
MGBE ọ na-ekere òkè n’Ememe Ngabiga nke afọ 30 O.A., Jisọs mere ihe ịrịba ama ma ọ bụ ọrụ ebube ndị kwesịrị ịrịba ama. N’ihi nke a, ọtụtụ ndị kwere na ya. Nikọdimọs, onye òtù Sanhedrin, bụ́ ụlọ ikpe ukwu nke ndị Juu, nwere mmasị, chọọkwa ka e zikwuo ya ihe. Ya mere, ọ bịakwutere Jisọs n’ọchịchịrị nke abalị, eleghị anya na-atụ egwu na ùgwù ya nwere n’ebe ndị ọzọ bụkwa ndị ndú ndị Juu nọ ga-akpụ n’ala ma ọ bụrụ na a hụ ya.
Ọ sịrị, “Rabaị, anyị matara na ị bụ onye ozizi nke siworo n’ebe Chineke nọ bịa: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ime ihe ịrịba ama ndị a nke gị onwe gị na-eme, ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.” Ná nzaghachi, Jisọs gwara Nikọdimọs na ka mmadụ wee baa n’Alaeze Chineke, ọ ghaghị ịbụ onye ‘a mụrụ ọzọ.’
Ma olee otú a pụrụ isi mụọ mmadụ ọzọ? Nikọdimọs jụrụ sị, “Ọ̀ pụrụ ịba n’afọ nne ya nke ugbo abụọ, e wee mụọ ya?”
Ee e, nke ahụ abụghị ihe ịmụ mmadụ ọzọ pụtara. Jisọs kọwara na “ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site ná mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” Mgbe e mere Jisọs baptism, mmụọ nsọ wee dakwasị ya n’isi, e si otú a mụọ ya “site ná mmiri na mmụọ nsọ.” Site n’okwu sochiri ya nke sitere n’eluigwe, bụ́, ‘Nke a bụ Ọkpara m onye ihe ya dị m ezi mma,’ Chineke kpọsara na ya ewepụtawo nwa ime mmụọ nke nwere olileanya ịbanye n’Alaeze eluigwe. Mgbe nke ahụ gasịrị, na Pentikọst nke afọ 33 O.A., ndị ọzọ e mere baptism ga-anata mmụọ nsọ, wee sikwa otú a bụrụ ndị a mụrụ ọzọ dị ka ụmụ ime mmụọ nke Chineke.
Ma ọrụ nke Ọkpara Chineke, onye bụ mmadụ pụrụ iche, dị oké mkpa. Jisọs gwara Nikọdimọs sị, “Dị ka Mosis weliri agwọ n’ọhịa, ọbụna otú a a ghaghị iweli Nwa nke mmadụ elu: ka onye ọ bụla nke kwere wee nwee ndụ ebighị ebi na ya.” Ee, dị ka ndị Israel ahụ agwọ ọjọọ tara na-aghaghị ilekwasị anya n’agwọ ọla ahụ iji bụrụ ndị a zọpụtara, otú ahụ ka ihe nile a kpọrọ mmadụ na-aghaghị inwe okwukwe n’ebe Ọkpara Chineke nọ iji bụrụ ndị a zọpụtara n’ọnọdụ ọnwụ ha.
N’imesi ịhụnanya Jehova ike na nke a, Jisọs gwakwara Nikọdimọs, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kwere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.” Otú a, na Jerusalem ebe a, nanị ọnwa isii mgbe ọ malitesịrị ije ozi ya, Jisọs mere ka o doo anya na site n’aka ya ka Jehova Chineke ga-esi azọpụta agbụrụ mmadụ.
Jisọs gara n’ihu ịkọwara Nikọdimọs, sị: “N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya n’ụwa ka o kpee ụwa ikpe,” ya bụ, ọ bụghị ịma ya ikpe, ma ọ bụ ịkatọ ya, na-ama agbụrụ mmadụ ikpe mbibi. Kama nke ahụ, dị ka Jisọs na-ekwu, e zitere ya “ka e wee site n’aka ya zọpụta ụwa.”
Nikọdimọs ejiwo egwu bịakwute Jisọs n’ọchịchịrị nke abalị. Ya mere ọ bụ ihe na-akpali mmasị na Jisọs mechiri mkparịta ụka ha site n’ikwu, sị: “Ma nke a bụ ikpe ahụ, na ìhè ahụ [nke Jisọs mere ihe atụ ya ná ndụ na ozizi ya nile] abịawo n’ụwa, ma mmadụ hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ìhè ahụ; n’ihi na ọrụ ha jọrọ njọ. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe na-adịghị mma na-akpọ ìhè ahụ asị, ọ dịghị abịakwutekwa ìhè ahụ, ka a ghara ịtụ ya ọrụ ya nile n’anya. Ma onye na-eme ihe bụ eziokwu na-abịakwute ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè, na a rụworo ha na Chineke.” Jọn 2:23–3:21; Matiu 3:16, 17; Ọrụ 2:1-4; Ọnụ Ọgụgụ 21:9.
▪ Gịnị kpaliri Nikọdimọs ime nleta ahụ o mere, n’ihi gịnịkwa ka o ji bịa n’abalị?
▪ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘ịmụ mmadụ ọzọ’?
▪ Olee otú Jisọs si kọwaa òkè ọ na-ekere ná nzọpụta anyị?
▪ Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ịsị na Jisọs abịaghị ikpe ụwa ikpe?