Olee Ndị Ka A Mụrụ Ọzọ?
NDỊ ezi omume nile hà na-aga eluigwe? Ọtụtụ na-eche otú ahụ, ma Jisọs Kraịst ekwenyeghị. Ka ọ na-agwa onye ọchịchị ndị Juu bụ́ Nikọdimọs, bụ́ onye bịakwutere ya ná nzuzo n’abalị, okwu, Jisọs sịrị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe.”—Jọn 3:13.
Ma, Jisọs mere ka Nikọdimọs mata na oge ga-abịa mgbe ndị ụfọdụ ga-enwe ohere ịba n’Alaeze eluigwe. Banyere nke a Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịba n’alaeze Chineke. Nke a mụworo site n’anụ ahụ bụ anụ ahụ; nke a mụwokwara site na mmụọ nsọ bụ mmụọ. Ka ọ ghara iju gị anya na m sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ.” Ma Nikọdimọs nwere ijuanya otú a pụrụ isi mụọ mmadụ ọzọ.—Jọn 3:1-9.
Ma eleghị anya gị onwe gị nwekwara ihe ijuanya banyere ihe Jisọs bu n’uche. Okwu ya hà pụrụ ịbụ ahụmahụ ntọghata mberede nke ọtụtụ ndị na-eche na mmụọ nsọ Chineke ejupụtawo n’ime ha, na-ekwu na ha nwere?
Mmetụta Dị Iche Iche na Uche
Ụfọdụ na-asị na n’ịmata ma à mụwo mmadụ ọzọ, ihe dị mkpa bụ inwe mmetụta nke ike mmụọ ahụ. Ma, obi na uche anyị pụrụ iduhie anyị, karịsịa ma ọ bụrụ na mmetụta uche dị ike na-akpa ha ike n’ahụ.—Jeremaịa 17:9.
William Sargant, onye nnyocha banyere ihe ndị na-apụta site ná mmetụta ndị mmetụta uche na-enwe n’ebe uche dị, na-ehota mkpa nke “anyị ịnọ ná nche megide nkwenkwe ndị e nwetara mgbe a nọ n’ọnọdụ nke mkpali mmetụta uche mgbe ụbụrụ anyị pụrụ ịdị na-eduhie anyị.” Dị ka Sargant kwuru, otu ihe atụ bụ mmetụta nke nkwusa ndị okpukpe ntụteghachi na iyi egwu nke ntaramahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Olee onye na-agaghị achọ ịbụ onye a mụrụ ọzọ iji gaa eluigwe ma ọ bụrụ na nhọrọ e nwere nanị ya bụ ịta ahụhụ ná mmekpa ahụ ebighị ebi? Sargant na-asị na n’okpuru nrụgide mmetụta uche dị otú a, “a na-ewezụga ezi uche n’ụsọ, a na-akụsịtụ usoro ụbụrụ na-ejikarị arụ ọrụ, a na-anakwere echiche na nkwenkwe ndị ọhụrụ n’ajụghị ajụjụ.”—The Mind Possessed.
Ya mere, olee otú mmadụ pụrụ isi mara ma nkwenkwe e nwere banyere ịmụ ọzọ ọ bụ nke “a nakweere n’ajụghị ajụjụ”? Ụzọ nke amamihe bụ ịbụ onye e duziri site n’ihe ọ bụla nke mmụọ nsọ Chineke mere ka ndị so dee Bible detuo. A na-agba ndị Kraịst ume ife Chineke ofufe ‘dị ka uche ha si dị,’ ọ dịkwa ha mkpa ijide n’aka na ihe ha kwenyere na ya bụ eziokwu.—Ndị Rom 12:1, 2; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.
Ịbụ onye a mụrụ ọzọ na-emeghepụ otu n’ime ùgwù ndị kasị elu e nyetụworo ụmụ mmadụ. E jikọrọ ya na otu ihe omume dị ịrịba ama n’ezie ná mmezu nke nzube Chineke. Ebe ọ bụ ezie na ihe a dum bụ eziokwu, ajụjụ ụfọdụ dị ka ndị a na-ebilite: Olee ndị ka a mụrụ ọzọ? Olee otú nke a si eme? Olileanya ndị dị aṅaa ka a na-esetịpụrụ ndị dị otú ahụ? Ọ̀ bụkwa nanị ha ka a ga-azọpụta?
[Foto dị na peeji nke 3]
Nikọdimọs nwere ijuanya otú a pụrụ isi mụọ mmadụ ọzọ