Isi 18
Jọn Na-ebelata, Jisọs Na-amụbawanye
MGBE Ememe Ngabiga ahụ gasịrị n’oge opupu ihe ubi nke afọ 30 O.A., Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Jerusalem. Otú ọ dị, ha alaghachighị n’ụlọ ha dị iche iche na Galili, kama ha banyere n’obodo Judia ebe ha na-eme ndị mmadụ baptism. Jọn Onye Na-eme Baptism anọwo na-arụ ọrụ dị otú ahụ ihe ruru otu afọ ugbu a, ọ ka nwekwara ndị na-eso ụzọ, ndị na-esonyere ya.
N’ezie, Jisọs ejighị aka ya mee ndị mmadụ baptism n’onwe ya, kama ndị na-eso ụzọ ya mere otú a site na ntụziaka ya. Baptism nke ha na nke Jọn mere pụtara otu ihe ahụ, ebe ọ bụ ihe àmà nke nchegharị ndị Juu ná mmehie ha megide ọgbụgba ndụ Iwu nke Chineke. Otú ọ dị, mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-eme baptism nke pụtara ihe dị iche. Baptism ndị Kraịst bụ ihe àmà nke nrara mmadụ raara onwe ya nye ijere Jehova Chineke ozi.
Otú ọ dị, n’akụkụ mbụ nke a nke ozi Jisọs, ma ya ma Jọn, ọ bụ ezie na ha na-arụ ọrụ iche iche, na-ezi ihe, na-emekwa ndị chegharịrị echegharị baptism. Ma ndị na-eso ụzọ Jọn malitere ikwo ekworo, wee na-emere ya mkpesa banyere Jisọs, sị: “Rabaị, . . . lee, onye ahụ na-eme baptism, mmadụ nile na-abịakwutekwa ya.”
Kama ikwo ekworo, Jọn ṅụrịrị ọṅụ n’ọganihu nke Jisọs, wee chọọkwa ka ndị na-eso ụzọ ya ṅụrịa ọṅụ. O chetaara ha, sị: “Unu onwe unu na-agbara m àmà, na m sịrị, mụ onwe m abụghị Kraịst ahụ, kama, na e zitewo m n’ihu ya.” Mgbe ahụ o ji ihe ịma atụ mara mma wee mee ihe: “Onye nwere nwunye ọhụrụ bụ onye na-alụ nwunye ọhụrụ: ma enyi nke onye na-alụ nwunye ọhụrụ, onye na-eguzo na-anụkwa okwu ya, ọ na-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu n’ihi olu onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ: ya mere e mezuwo ọṅụ m a.”
Jọn, dị ka enyi Onye ahụ na-alụ nwunye ọhụrụ, nwere ọṅụ n’ihe dị ka ọnwa isii gara aga, mgbe ọ kọwaara ndị na-eso ụzọ ya onye Jisọs bụ. Ụfọdụ n’ime ha ghọrọ ndị nwere olileanya isonye n’òtù nwunye eluigwe Kraịst, iso bụrụ ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. Jọn chọrọ ka ndị ahụ na-eso ụzọ ya ugbu a sorokwa Jisọs, ebe ọ bụ na nzube ya bụ idozi ụzọ maka ozi Kraịst ịga nke ọma. Dị ka Jọn Onye Na-eme Baptism na-akọwa: “Ya onwe ya aghaghị ịdị na-aba ụba, ma aghaghị m ịdị na-ala ala.”
Jọn, bụ́ onye ọhụrụ na-eso ụzọ Jisọs, nke bụbu onye na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptism, na-ede banyere mmalite Jisọs na ọrụ dị mkpa Ọ ga-arụ n’ịzọpụta mmadụ, na-asị: “Onye si n’elu bịa ka ihe nile elu. . . . Nna na-ahụ Ọkpara ya n’anya, o nyewokwa ya ihe nile n’aka. Onye kwere n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi; ma onye na-ekwenyeghị Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ, kama iwe Chineke na-anọgide n’ahụ ya.”
Ọ dịghị anya mgbe Jọn Onye Na-eme Baptism kwusịrị banyere mbelata nke ozi ya, Eze Herọd jidere ya. Herọd akpọrọwo Herọdias, bụ́ nwunye Filip nwanne ya nwoke, ịbụ nke ya, mgbe Jọn kpughekwara omume ahụ n’ihu ọha dị ka ihe na-ekwesịghị ekwesị, Herọd mere ka a tụba ya n’ụlọ mkpọrọ. Mgbe Jisọs nụrụ banyere njide e jidere Jọn, ya na ndị na-eso ụzọ ya hapụrụ Judia ije Galili. Jọn 3:22–4:3; Ọrụ 19:4; Matiu 28:19; 2 Ndị Kọrint 11:2; Mak 1:14; 6:17-20.
▪ Gịnị ka baptism ndị ahụ e mere site na ntụziaka Jisọs tupu mbilite n’ọnwụ ya pụtara? Nakwa mgbe mbilite n’ọnwụ ya gasịrị?
▪ Olee otú Jọn si gosi na mkpesa ahụ ndị na-eso ụzọ ya mere ekwesịghị ekwesị?
▪ Gịnị mere e ji tụba Jọn n’ụlọ mkpọrọ?