Isi 38
Ọ̀ Bụ na Jọn Enweghị Okwukwe?
JỌN Onye Na-eme Baptism, onye nọworo ihe dị ka otu afọ n’ụlọ mkpọrọ ugbu a, natara akụkọ banyere mbilite n’ọnwụ nke nwa nwanyị ahụ di ya nwụrụ na Nain. Ma Jọn chọrọ ịnụ site n’ọnụ Jisọs kpọmkwem ihe nke ahụ pụtara, ya mere o zipụrụ mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ịchọpụta: “Gị onwe gị [ị̀] bụ Onye na-abịa, ma ọ bụ na ànyị na-ele anya onye ọzọ?”
Nke ahụ pụrụ iyi ajụjụ na-ekwesịghị ekwesị, karịsịa ebe ọ bụ na Jọn ahụwo ka mmụọ nsọ Chineke bekwasịrị Jisọs, nụkwa olu Chineke ji nwapụta ya mgbe a na-eme Jisọs baptism ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ abụọ tupu mgbe ahụ. Ajụjụ ahụ Jọn jụrụ pụrụ ime ka ụfọdụ ndị kpebie na ọ dawo mbà n’okwukwe ya. Ma ọ bụghị otú ahụ. Jisọs agaraghị ekwu okwu dị mma nke ukwuu banyere Jọn dị ka o mere n’oge a, ma a sị na Jọn na-enwe obi abụọ. Ya mere, gịnị mere Jọn ji jụọ ajụjụ nke a?
Ọ pụrụ ịbụ nanị na Jọn chọrọ ka Jisọs nye ya ihe nnwapụta na Ọ bụ Mesaịa ahụ. Nke a ga-ewusi Jọn ike nke ukwuu ebe ọ nọ n’ọnọdụ ọjọọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma n’ụzọ pụtara ìhè, e nwere ihe karịrị nke ahụ dị n’ajụjụ ahụ Jọn jụrụ. Ihe àmà gosiri na ọ chọrọ ịma ma è nwere onye ọzọ na-abịa, onye ga-anọchi ya, dị ka a pụrụ ikwu ya, nke ga-emezu ihe nile e buru n’amụma na Mesaịa ahụ gaje imezu.
Dị ka amụma Bible ndị Jọn maara banyere ha si dị, Onye ahụ E Tere Mmanụ nke Chineke ga-abụ eze, onye nnapụta. Ma Jọn ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ, ọbụna ọtụtụ ọnwa mgbe Jisọs mesịrị baptism. Ya mere ihe àmà gosiri na Jọn na-ajụ Jisọs, sị: ‘Ọ̀ bụ gị n’ezie bụ onye ga-eguzobe Alaeze Chineke n’ike a na-ahụ anya, eka è nwere onye ọzọ, onye ga-anọchi anya gị, onye anyị nile ga-echere ka o mezuo amụma ndị metụtara ebube Mesaịa ahụ?’
Kama ịgwa ndị na-eso ụzọ Jọn sị, ‘Eenụnụ, abụ m onye ahụ gaje ịbịa?’ Jisọs nọrọ n’otu oge ahụ mee ihe omume a rịbara ama site n’ịgwọ ọtụtụ ndị ụdị ọrịa na nrịanrịa ha nile. Mgbe ahụ ọ gwara ndị na-eso ụzọ ahụ sị: “Gaanụ, kọọrọ Jọn ihe nile unu hụrụ na nke unu nụrụ; ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwụrọ na-eje ije, a na-eme ndị ekpenta ka ha dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụ ihe, a na-eme ndị nwụrụ anwụ ka ha si n’ọnwụ bilie, a na-ezi ndị ogbenye ozi ọma.”
N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ajụjụ Jọn pụrụ ịpụta na ọ na-atụ anya na Jisọs ga-eme ihe karịrị nke ọ ka na-eme, ma eleghịkwa anya tọhapụ Jọn n’onwe ya. Otú ọ dị, Jisọs na-agwa Jọn ka ọ ghara ịtụ anya ihe karịrị ọrụ ebube ndị Jisọs na-arụ.
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jọn lawara, Jisọs chigharikwuuru ìgwè mmadụ ahụ wee gwa ha na Jọn bụ “onye ozi” nke Jehova e buru amụma ya na Malakaị 3:1 bụrụkwa Elaịja onye amụma nke e kwuru okwu ya na Malakaị 4:5, 6. O si otú ahụ bulie Jọn elu dị ka onye ya na onye amụma ọ bụla dịrị ndụ tupu ya hà nhata, wee na-akọwa, sị: “N’ezie asị m unu, n’etiti ndị ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Baptist ukwuu: ma onye dịkarịrị nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwuu. Site n’ụbọchị Jọn Baptist ruo ugbu a a na-eme alaeze eluigwe ihe ike [“alaeze eluigwe bụ ihe mgbaru ọsọ nke ụmụ mmadụ na-achụso,” NW].”
N’ebe a, Jisọs na-egosi na Jọn agaghị anọ n’Alaeze eluigwe ebe ọ bụ na onye dịkarịrị nta n’ebe ahụ karịrị Jọn. Jọn doziiri Jisọs ụzọ, ma ọ nwụrụ tupu Kraịst esoro ndị na-eso ụzọ ya gbaa ndụ, ma ọ bụ nwee nkwekọrịta isoro ya chịa n’Alaeze ya. Ọ bụ ya mere Jisọs ji sị na Jọn agaghị anọ n’Alaeze eluigwe. Kama nke ahụ, Jọn ga-abụ onye Alaeze Chineke ga-achị n’ụwa. Luk 7:18-30; Matiu 11:2-15.
▪ Gịnị mere Jọn ji jụọ ma Jisọs ọ̀ bụ Onye ahụ Na-abịa ma ọ bụ na e kwesịrị ịtụ anya onye ọzọ?
▪ Amụma ndị dị aṅaa ka Jisọs sịrị na Jọn mezuru?
▪ Gịnị mere Jọn Onye Na-eme Baptism na-agaghị eji soro Jisọs nọọ n’eluigwe?