Isi 19
Izi Nwanyị Sameria Ihe
MGBE ha nọ n’ụzọ site na Judia na-aga Galili, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya gafere site n’ókèala nke Sameria. N’ihi na ike agwụsịwo ha n’ihi ogologo njem ahụ, mgbe o ruru ihe dị ka etiti ehihie, ha kwụsịtụrụ izuru ike n’otu olulu mmiri dị na nso obodo Saịka. Jekọb gwuru olulu mmiri nke a ọtụtụ narị afọ gara aga, ọ dịgidekwara ọbụna ruo taa, na nso obodo Nablus nke oge a.
Ka Jisọs nọ ebe a na-ezuru ike, ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ime obodo ahụ ịzụta ihe oriri. Mgbe otu nwanyị onye Sameria bịara ịdọrọ mmiri, ọ rịọrọ: “Nye m mmiri ka m ṅụọ.”
Ndị Juu na ndị Sameria adịghị emekọ ihe n’ihi ịkpa ókè nke gbamiworo mkpọrọgwụ. N’ihi ya, nwanyị ahụ jụrụ ná mgbagwoju anya, sị: “Gị onwe gị si aṅaa arịọ mmiri n’aka m ka ị ṅụọ, ebe ị bụ onye Juu, ma mụ bụ nwanyị Sameria?”
“Ọ bụrụ na ị matara,” ka Jisọs na-azaghachi, “onye ọ bụ nke na-asị gị, Nye m mmiri ka m ṅụọ; gị onwe gị ga-arịọ ya rịị, ọ ga-enyekwa gị mmiri dị ndụ.”
Ọ zaghachiri sị, “Onyenwe anyị, i nweghị ihe isere mmiri, ma olulu mmiri a dị omimi: òle ebekwa ka i nwere mmiri ahụ dị ndụ? Ọ̀ ga-abụ na gị onwe gị ka nna anyị Jekọb ukwuu, onye nyere anyị olulu mmiri a; ya onwe ya, na ụmụ ya, na anụ ụlọ ya, ṅụkwara n’ime ya?” Jisọs kwuru sị, “Onye ọ bụla nke na-aṅụ mmiri a, akpịrị ga-akpọ ya nkụ ọzọ: ma onye ọ bụla nke ga-aṅụ mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya, akpịrị agaghị akpọ ya nkụ ma ọlị ruo mgbe ebighị ebi; kama mmiri ahụ nke mụ onwe m ga-enye ya ga-aghọ n’ime ya isi iyi mmiri na-asọpụta hie nne ruo ndụ ebighị ebi.”
Nwanyị ahụ zaghachiri sị, “Onyenwe anyị, nye m mmiri a, ka akpịrị wee ghara ịkpọ m nkụ, ka m gharakwa isi n’ogologo ụzọ a nile bịa ebe a isere mmiri.”
Ugbu a, Jisọs gwara ya: “Laba, kpọọ di gị, bịakwa n’ebe a.”
Nwanyị ahụ zara sị, “Enweghị m di.”
Jisọs sịrị na o kwuru eziokwu. “I kwuru nke ọma, sị, Enweghị m di: n’ihi na i nwewo di ise; ma onye i nwere ugbu a abụghị di gị.”
Ná mgbagwoju anya, nwanyị ahụ kwuru sị, “Onyenwe anyị, ahụrụ m na gị onwe gị bụ onye amụma.” N’igosipụta mmasị o nwere n’ihe ime mmụọ, o kwuru na ndị Sameria “kpọrọ isiala nye Chineke n’ugwu a [Gerizim, bụ́ nke nọ nso ebe ahụ]; ma unu onwe unu [ndị Juu] sị, na ebe mmadụ aghaghị ịkpọ isiala nye Chineke dị n’ime Jerusalem.”
Ma, Jisọs mere ka ọ pụta ìhè na ebe a na-efe ofufe abụghị ihe dị mkpa. “Oge hour na-abịa,” ka o kwuru, “mgbe ndị na-akpọ isiala n’ezie ga-akpọ isiala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu: n’ihi na ndị dị otú ahụ ka Nna m na-achọkwa ka ha bụrụ ndị na-akpọ isiala nye ya. Chineke bụ mmụọ: ndị na-akpọkwa isiala nye ya aghaghị ịkpọ isiala n’ime mmụọ na eziokwu.”
A kpaliri mmasị nwanyị ahụ nke ukwuu. Ọ sịrị, “Amatara m na Mesaịa na-abịa (onye a na-akpọ Kraịst): mgbe ọ bụla onye ahụ ga-abịa, ọ ga-akọrọ anyị ihe nile.”
Jisọs na-ekwupụta sị, “Mụ onwe m nke na-agwa gị okwu bụ ya.” Cheedị nnọọ echiche banyere ya! Nwanyị nke a bịara ịdọrọ mmiri n’etiti ehihie ma eleghị anya iji zere ndị inyom nke obodo ahụ, bụ́ ndị na-akọcha ya n’ihi ụzọ ndụ ya, abụrụwo onye Jisọs meere amara n’ụzọ dị ebube. Ọ gwara nwanyị ahụ hoo haa ihe ọ na-adịbeghị onye ọ bụla ọzọ ọ gwara ya. Gịnị si na ya pụta?
Ọtụtụ Ndị Sameria Ekwere
Mgbe ha bu ihe oriri si Saịka na-alọghachi, ndị na-eso ụzọ Jisọs zutere ya n’olulu mmiri Jekọb, ebe ha hapụrụ ya, ebe ọ nọ ugbu a na-agwa nwanyị Sameria okwu. Nwanyị ahụ lawara mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs lọghachiri, na-ahapụ ite mmiri ya, gawa n’ime obodo ahụ.
N’ihi oké mmasị o nwere n’ihe ndị Jisọs gwara ya, ọ gwara ndị ikom nọ n’obodo ahụ, sị: “Bịanụ, lee otu nwoke, onye gwara m ihe nile m mere.” Mgbe ahụ, n’ụzọ ịkpali ọchịchọ ha ịmara ihe merenụ, ọ jụrụ, sị: “Onye a ọ̀ ga-abụ Kraịst ahụ.” Ajụjụ ahụ mezuru nzube ya—ndị ikom ahụ gara ka ha hụ ya n’onwe ha.
Mgbe ihe ndị a na-eme, ndị na-eso ụzọ Jisọs na-agwa ya ka o rie ihe ha zụtaworo n’ime obodo ahụ. Ma ọ zara ha, sị: “Mụ onwe m nwere ihe oriri iri nke unu onwe unu na-amataghị.”
Ndị na-eso ụzọ ahụ jụrịtara onwe ha sị, “Ọ̀ dị onye wetaara ya ihe ọ ga-eri?” Jisọs na-akọwa, sị: “Ihe oriri m bụ ka m na-eme ihe onye zitere m na-achọ, ka m rụzuokwa ọrụ ya. Unu onwe unu àsịghị, ọnwa anọ fọdụrụ, owuwe ihe ubi ewee bịa?” Ma n’ikwu ihe banyere owuwe ihe ubi ime mmụọ, Jisọs sịrị: “Welienụ anya unu elu, kirie ubi, na ha chara acha ugbu a ka e were ihe dị n’ime ha. Onye na-ewere ihe ubi na-anara ụgwọ ọrụ ya, na-achịkọtakwa mkpụrụ nye ndụ ebighị ebi; ka onye na-agha mkpụrụ na onye na-ewere ihe ubi wee ṅụrịa ọṅụ n’otu.”
Eleghị anya Jisọs amalitelarị ịhụ oké mmetụta nke ihe ya na nwanyị Sameria ahụ kwurịtara—na ọtụtụ ndị na-enwe okwukwe na ya n’ihi àmà nke nwanyị ahụ na-agba. Ọ na-agba àmà nye ndị bi n’obodo ahụ, na-asị: “Ọ gwara m ihe nile m mere.” Mgbe ndị ikom Saịka bịakwutere ya n’olulu mmiri ahụ, ha rịọrọ ya ka ọ nọtụkwuo na-agwa ha okwu. Jisọs naara ọkpụkpọ òkù ahụ wee nọruo ụbọchị abụọ.
Mgbe ndị Sameria nọ na-ege Jisọs ntị, ọtụtụ ndị ọzọ kweere. Mgbe ahụ ha sịrị nwanyị ahụ: “Ọ bụghị n’ihi ihe i kwuru ka anyị na-ekwe ugbu a: n’ihi na anyị anụwo, matakwa na onye a bụ onye nzọpụta nke ụwa n’ezie.” N’ezie, nwanyị Sameria ahụ setịpụrụ ezi ihe nlereanya nke ụzọ anyị ga-esi gbaa àmà banyere Kraịst site n’ịkpali ọchịchọ ịmara ihe ka ndị na-ege ntị wee nyochakwuo ihe!
Cheta na ọ fọrọ ọnwa anọ tupu owuwe ihe ubi—o doro anya na ọ ga-abụ owuwe ihe ubi nke ọka barley, nke a na-eme n’oge opupu ihe ubi na Palestine. N’ihi ya, eleghị anya ọ ga-abụ ihe dị ka oge November ma ọ bụ December. Nke a pụtara na mgbe Ememe Ngabiga nke afọ 30 O.A. gasịrị, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọrọ ihe dị ka ọnwa asatọ ma ọ bụ karịa na Judia, na-ezi ihe, na-emekwa ndị mmadụ baptism. Ha hapụrụ ugbu a laba ebe obodo ha dị na Galili. Gịnị ka ha ga-ezute n’ebe ahụ? Jọn 4:3-43.
▪ Gịnị mere o ji bụrụ ihe ịtụnanya nye nwanyị Sameria ahụ na Jisọs gwara ya okwu?
▪ Gịnị ka Jisọs kụziiri nwanyị ahụ banyere mmiri dị ndụ na ebe e kwesịrị ịnọ na-efe ofufe?
▪ Jisọs si aṅaa kpugheere nwanyị ahụ onye ọ bụ, gịnịkwa mere mkpughe nke a ji bụrụ ihe ịtụnanya otú a?
▪ Àmà dị aṅaa ka nwanyị Sameria ahụ gbara, gịnị sikwa n’ime ya pụta?
▪ Njikọ dị aṅaa dị n’etiti ihe oriri Jisọs na owuwe ihe ubi ahụ?
▪ Olee otú anyị pụrụ isi mata ogologo oge Jisọs jere ozi na Judia mgbe Ememe Ngabiga nke afọ 30 O.A. gasịrị?