Isi 24
Ihe Mere Jisọs Ji Bịa n’Ụwa
JISỌS na ndị na-eso ụzọ ya anọ anọrọwo na-arụsi ọrụ ike n’ụbọchị ahụ ha nọ na Kapanaum, bụ́ nke na-abịaru ná ngwụsị ya site na ndị Kapanaum ịkpọtara ya ndị ha nile na-arịa ọrịa n’oge uhuruchi ka ọ gwọọ ha. Ohere ọ bụla adịbeghị maka ịnọrọtụ onwe ya.
Ugbu a, ọ bụ n’isi ụtụtụ echi ya. Mgbe chi na-abọchabeghị, Jisọs bilitere ma pụọ nanị ya. Ọ pụrụ jee n’ebe ọ ga-anọ nanị ya, bụ́ ebe ọ pụrụ ịnọ kpekuo Nna ya ekpere na nzuzo. Ma Jisọs ịnọ nanị ya adịteghị aka, n’ihi na mgbe Pita na ndị ọzọ chọpụtara na ọ nọkwaghị n’etiti ha, ha pụrụ na-achọgharị ya.
Mgbe ha chọtara Jisọs, Pita wee sị: “Mmadụ nile na-achọ gị.” Ndị Kapanaum chọrọ ka ha na Jisọs nọrọ. Ha nwere ezi ekele n’ihe nile o meere ha. Ma nzube bụ isi Jisọs ji bịa n’ụwa ọ̀ bụ ịgwọ ọrịa ndị dị otú ahụ site n’ọrụ ebube? Gịnị ka o kwuru banyere nke a?
Dị ka otu ihe ndekọ Bible si kọọ, Jisọs zaghachiri ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka anyị gaa ebe ọzọ n’obodo nile so nke a, ka m kwusaakwa n’ebe ahụ; n’ihi na ọ bụ ime nke a ka m pụtara.” Ọ bụ ezie na ndị ahụ rịọsiri Jisọs ike ka ha na ya nọrọ, ma ọ gwara ha, sị: “Aghaghị m izikwa obodo nile ọzọ ozi ọma alaeze Chineke: n’ihi na e zitere m ime nke a.”
Ee, Jisọs bịara n’ụwa kpọmkwem maka ikwusa Alaeze Chineke, bụ́ nke ga-ewepụ aha Nna ya n’ụta, gwọtakwa nsogbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma iji gosi na ọ bụ onye Chineke zitere, Jisọs gwọrọ ọrịa dị iche iche site n’ọrụ ebube. N’otu aka ahụkwa, Mosis, n’ọtụtụ narị afọ tupu mgbe ahụ, rụrụ ọrụ ebube dị iche iche iji mee ka a mara ya dị ka ohu Chineke.
Ugbu a, mgbe Jisọs hapụsịrị Kapanaum ikwusara obodo ndị ọzọ ozi ọma, ndị na-eso ụzọ ya anọ sooro ya jee. Mmadụ anọ ndị a bụ Pita na nwanne ya bụ Andru, na Jọn na nwanne ya bụ Jemes. Ị ga-echeta na e buworị ụzọ kpọọ ha n’izu bu nke a ụzọ ịbụ ndị mbụ ha na Jisọs ga-arụkọ ọrụ n’ime ngagharị.
Ọrụ nkwusa Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya mmadụ anọ rụrụ na Galili gara nnọọ nke ọma! N’eziokwu, akụkọ banyere ọrụ ya gbasara ọbụna ruo Siria nile. Oké ìgwè mmadụ sitere Galili, Judia, na ndị sikwa n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan gafeta sooro Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya. Mak 1:35-39; Luk 4:42, 43; Matiu 4:23-25; Ọpụpụ 4:1-9, 30, 31.
▪ Gịnị bụ ihe mere n’ụtụtụ mgbe ụbọchị ahụ Jisọs rụsịrị ọrụ na Kapanaum gasịrị?
▪ N’ihi gịnị ka e zitere Jisọs n’ụwa, gịnị bụkwa nzube nke ọrụ ebube ndị ọ rụrụ mezuru?
▪ Olee ndị sooro Jisọs na njem nkwusa ozi ya na Galili, gịnị sikwa n’ọrụ nile nke Jisọs pụta?