Isi 37
Jisọs Ewepụ Iru Újú nke Nwanyị Di Ya Nwụrụ
NWA mgbe nta ka ọ gwọsịrị ohu nke onye ọchịagha ahụ, Jisọs gawara Nain, bụ́ obodo dị ihe karịrị 20 maịlụ n’ebe ndịda ọdịda anyanwụ nke Kapanaum. Ndị na-eso ụzọ ya na oké ìgwè mmadụ sonyeere ya. Eleghị anya ọ ga-abụ n’oge uhuruchi ka ha ruru n’ebe mpụga nke obodo Nain. N’ebe a ha zutere ndị na-eje ili ozu. E bu ozu otu nwa okoro na-apụ n’obodo ahụ ije lie ya.
Ọnọdụ nke nne ya dị nnọọ njọ nke ukwuu, ebe ọ bụ nwanyị di ya nwụrụ, nke ahụ bụkwa nanị nwa ọ mụtara. Mgbe di ya nwụrụ, ọ pụrụ inwe nkasi obi n’ihi na o nwere nwa nwoke. Olileanya, ọchịchọ na nzube ya nile dabeere nnọọ n’ọdịnihu nke nwa ahụ. Ugbu a, ọ dịghịkwa onye ga-akasi ya obi. Iru újú ya dị ukwuu ka ndị obodo ahụ sooro ya na-aga n’ebe ili ozu.
Mgbe Jisọs hụrụ nwanyị ahụ, oké mwute o nwere metụrụ ya n’obi. Ya mere, o ji obi dị nwayọọ, ma siekwa ike n’ụzọ ga-emesi ndị na-anụ olu ya obi ike gwa ya, sị: “Akwala akwá.” Otú o si kpaa àgwà na ihe o mere dọtara mmasị nke ìgwè mmadụ ahụ. N’ihi ya, mgbe ọ gara bitụ ihe e ji ebu ozu nke ozu ahụ nọ na ya aka, ndị bu ya kwụsịrị. Mmadụ nile aghaghị ịdị na-atụle n’uche ha ihe ọ gaje ime.
Ọ bụ ezie na ndị ahụ ha na Jisọs so ahụwo ka o ji ụzọ ọrụ ebube gwọọ ọtụtụ ndị ọrịa ha. Ma, o doro anya na ha ahụbeghị ya ka ọ kpọlitere mmadụ n’ọnwụ. Ọ̀ pụrụ ime ihe dị otú ahụ? N’ịgwa ozu ahụ okwu, Jisọs kwuru, sị: “Nwa okorobịa, gị ka m na-asị, Bilie”! Nwoke ahụ wee bilite! O wee malite ikwu okwu, Jisọs wee kpọrọ ya kpọnye nne ya.
Mgbe ndị mmadụ hụrụ na nwa okorobịa ahụ dị ndụ n’ezie, ha malitere ikwupụta, sị: “Onye amụma ukwu ebiliwo n’etiti anyị.” Ndị ọzọ kwuru, sị: “Chineke eletawo ndị ya.” Ngwa ngwa, akụkọ banyere oké ọrụ nke a gbasara n’ime Judia nile na mba ndị gbara ya gburugburu.
Jọn Onye Na-eme Baptism ka nọkwa n’ụlọ mkpọrọ, ọ chọkwara ịmatakwu banyere ọrụ ndị Jisọs nwere ike ịrụ. Ndị na-eso ụzọ Jọn kọọrọ ya banyere ọrụ ebube ndị a. Gịnị ka ọ zaghachiri? Luk 7:11-18.
▪ Gịnị na-eme mgbe Jisọs na-abịaru nso Nain?
▪ Olee otú ihe Jisọs hụrụ si metụta ya, gịnịkwa ka o mere?
▪ Olee otú ndị mmadụ si meghachi omume n’ọrụ ebube Jisọs?