Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ànyị pụrụ ikwubi site na Matiu 11:11 na Jisọs maara tupu o mee na Jọn Onye Na-eme Baptism ga-anwụ tupu Jisọs?
Ee, o doro anya na Jisọs maara na Jọn agaghị alanarị iji bụrụ onye Kraịst e tere mmanụ, n’ihi na Jisọs kwuru, sị: “N’ezie asị m unu, N’etiti ndị ndị inyom mụrụ ọ dịghị onye biliworo nke ka Jọn Baptist ukwu: ma onye dịkarịrị nta n’alaeze eluigwe ka ya ukwuu.”—Matiu 11:11.
Mgbe mmụọ ozi Gebriel mara ọkwa ọmụmụ a gaje ịmụ Jọn, o buru amụma na Jọn ga-aga, “n’ime mmụọ na ike Elaịja, . . . idozi nye Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] otu ndị nke a kwadebewooro ya.” Jọn ga-abụ onye na-akwadebe ụzọ, na-akwadebe ndị mmadụ maka Mesaịa nke Jehova. Ma o nweghị ihe dị n’ime ịma ọkwa ahụ si n’eluigwe nke gosiri na Jọn n’onwe ya ga-abụ onye na-eso ụzọ nke Mesaịa ahụ na-abịanụ, e nweghịkwa ihe na-ezo aka na nke ahụ n’okwu amụma ahụ nna Jọn bụ́ Zekaraịa kwuru.—Luk 1:17, 67-79.
Otú a, mgbe o mesịrị Jisọs baptism, Jọn gara n’ihu ikwusa ozi ọma na ime baptism, na-arapagidesi ike n’ọrụ ya ịkwadebe ndị mmadụ. Jọn n’ụzọ ọrụ ebube maara na Jisọs ga-eweta baptism e ji mmụọ nsọ eme, ma Jọn ekwughị na ya onwe ya ga-anata mmụọ nsọ, na-aghọ onye Kraịst e tere mmanụ. (Matiu 3:11) Jọn matakwara na ya ga-anọgide na-atalata, ebe Jisọs ga-anọgide na-amụbawanye.—Jọn 3:22-30.
Mgbe Jisọs kwuru ihe anyị gụrụ na Matiu 11:11, Jọn abụrụwo onye a tụrụ mkpọrọ. Jisọs mere ka ọ pụta ìhè tupu o mee na onye amụma nke a a tụrụ mkpọrọ dị nta karịa onye dịkarịsịrị nta bụ́ onye n’ọdịnihu ga-eje ozi dị ka onye eze na onye nchụàjà n’eluigwe. Ma, Jisọs yikwara ka ọ maara na Jọn ga-anwụ n’oge na-adịghị anya, na-ahapụ ụwa tupu e meghe ụzọ “ọhụrụ” e ji aga eluigwe. (Ndị Hibru 10:19, 20) Nke ahụ pụtara na Jọn agaghị adị ndụ ruo Pentikọst 33 O.A., mgbe iji mmụọ nsọ tee ndị na-eso ụzọ Jisọs mmanụ malitere. N’ihi nke a, a ga-ewerekwa okwu Jisọs na Matiu 11:11 dị ka ihe na-egosi na ọ maara na Jọn agaghị aga eluigwe.