Isi 65
Njem E Ji Nzuzo Jee Jerusalem
Ọ BỤ n’oge mgbụsị akwụkwọ osisi nke 32 O.A., Ememe Ụlọ Ikwuu na-erukwa nso. Jisọs echewo ozi ya ihu karịsịa na Galili kemgbe Ememe Ngabiga nke 31 O.A., bụ́ mgbe ndị Juu nwara igbu ya. O yiri ka nanị mgbe Jisọs jere Jerusalem kemgbe ahụ bụ mgbe ọ na-eje maka ememe atọ ndị Juu na-eme kwa afọ.
Ugbu a, ụmụnne Jisọs gbara ya ume, sị: “Si n’ebe a pụọ, jee na Judia.” Jerusalem bụ isi obodo Judia, bụrụkwa isi ebe mba ahụ dum na-abịa ife ofufe. Ụmụnne ya chere echiche, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla na-eme ihe ọ bụla na nzuzo, ma a sị na ya onwe ya na-achọ ka ọha mmadụ mara ya.”
Ọ bụ ezie na Jemes, Saịmọn, Josef, na Judas ekweghị na nwanne ha nke tọrọ ha, bụ́ Jisọs bụ Mesaịa ahụ n’ezie, ha chọrọ ka o gosi ike ọrụ ebube ya n’ahụ ndị ahụ nile zukọrọ n’ememe ahụ. Ma Jisọs maara ihe ize ndụ nke dị n’ebe ahụ. Ọ na-asị, “Ụwa apụghị ịkpọ unu asị; ma ọ na-akpọ mụ onwe m asị, n’ihi na mụ onwe m na-agbara ya àmà, na ọrụ ya nile jọrọ njọ.” Ya mere Jisọs gwara ụmụnne ya, sị: “Rịgoonụ onwe unu n’ememe a: mụ onwe m agaghị arịgoro ememe a ugbu a.”
Ememe Ụlọ Ikwuu na-ewe ụbọchị asaa. A na-eweta ya n’ọgwụgwụ n’ụbọchị nke asatọ site n’ime ihe omume ndị dị nsọ. A na-eji ememe ahụ emechi afọ ọrụ ubi, ọ na-abụkwa oge oké ọṅụ na inye ekele. Mgbe ọtụtụ ụbọchị gasịrị, mgbe ụmụnne Jisọs sonyeere ìgwè ndị na-eje njem ahụ wee jee, ya na ndị na-eso ụzọ ya ji nzuzo jee, na-eme ka ọha mmadụ ghara ịhụ ha. Ha si ụzọ Sameria, kama ụzọ nke ahụ dị na nso Osimiri Jọdan nke ọnụ ọgụgụ mmadụ ka ukwuu si na-eje.
Ebe ọ bụ na Jisọs na ndị ya na ha so ga-achọ ebe obibi na Sameria, o bu ụzọ zipụ ndị na-eje ozi ịkwadebe maka nke ahụ. Ma ndị ahụ jụrụ imere Jisọs ihe ọ bụla mgbe ha matara na ọ na-eje Jerusalem. Site n’oké iwe, Jemes na Jọn jụrụ ya, sị: “Onyenwe anyị, ị̀ na-achọ ka anyị sị ọkụ site n’eluigwe daa, rechapụ ha?” Jisọs baara ha mba maka ịtụ aro dị otú ahụ, ha wee jee n’obodo ọzọ.
Mgbe ha na-aga n’ụzọ, otu onye odeakwụkwọ sịrị Jisọs: “M ga-eso gị ebe ọ bụla ị na-eje.”
Jisọs na-azaghachi sị, “Nkịta ọhịa nwere ọnụ ha na-edina, anụ ufe nke eluigwe nwekwara ebe ha na-arahụ ụra; ma nwa nke mmadụ enweghị ebe ịtọgbọ isi ya.” Jisọs na-akọwa na onye odeakwụkwọ ahụ ga-enwe ihe isi ike ma ọ bụrụ na ọ ghọọ onye na-eso ụzọ Ya. O yikwara ka ọ na-egosi na onye odeakwụkwọ ahụ dị mpako nke ukwuu nke na ọ pụghị ịnara ụzọ ndụ nke a.
Jisọs gwara onye ọzọ, sị: “Soo m.”
Nwoke ahụ na-aza sị, “Kwee ka m buru ụzọ jee lie nna m.”
Jisọs na-azaghachi sị, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ ka ha lie ndị nke ha ndị nwụrụ anwụ; ma gị onwe gị jee zisaa ozi alaeze Chineke.” Ihe àmà gosiri n’ezie na nna nwoke ahụ anwụbeghị, n’ihi na a sị na ọ nwụrụ, o yighị ka nwa ya ọ gaara abịa ebe ahụ ige Jisọs ntị. O doro anya na nwa ahụ na-achọ ka e nye ya ohere ka o chere ka nna ya nwụọ. Ọ dịghị njikere itinye Alaeze Chineke n’ọnọdụ mbụ ná ndụ ya.
Ka ha na-eje n’ụzọ ahụ na-erute Jerusalem, otu nwoke ọzọ gwara Jisọs, sị: “M ga-eso gị, Onyenwe anyị; ma kwee ka m buru ụzọ kelee ndị nọ n’ụlọ m ekele ikpeazụ.”
Ná nzaghachi, Jisọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-ele anya n’azụ, mgbe o tinyesịrị aka ya n’ọ́gụ̀ anụ ụlọ na-adọkpụgharị, kwesịrị alaeze Chineke.” Ndị nile ga-abụ ndị na-eso ụzọ Jisọs aghaghị ilekwasị anya ha n’ozi Alaeze. Dị nnọọ ka ọgba ala ubi ga-agbagọ agbagọ ma ọ bụrụ na onye ọrụ elegideghị anya n’ihu, otú ahụ ka onye ọ bụla nke na-ele anya n’azụ n’usoro ihe ochie nke a ga-esi sụọ ngọngọ wee dapụ n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ ebighị ebi. Jọn 7:2-10; Luk 9:51-62; Matiu 8:19-22.
▪ Olee ndị bụ ụmụnne Jisọs, oleekwa otú ha si eche echiche banyere ya?
▪ Gịnị mere ndị Sameria ji nwee obi ọjọọ, ọ̀ bụkwa gịnị ka Jemes na Jọn chọrọ ime?
▪ Nkwurịta okwu atọ dị aṅaa ka Jisọs nwere mgbe ọ na-aga n’ụzọ, oleekwa otú o si kwusie okwu ike banyere ịdị mkpa nke mmadụ ịchụ onwe ya n’àjà n’ije ozi?