Isi 66
N’Ememe Ụlọ Ikwuu
JISỌS aghọwo onye a ma ama n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ atọ kemgbe e mesịrị ya baptism. Ọtụtụ puku ndị mmadụ ahụwo ọrụ ebube ya nile, akụkọ nke ihe omume ya nile agbasawokwa ruo mba ahụ dum. Ugbu a, ka ndị mmadụ na-agbakọta maka Ememe Ụlọ Ikwuu na Jerusalem, ha chọrọ ya n’ebe ahụ. “Olee ebe onye ahụ nọ?” ka ha chọrọ ịmata.
Jisọs aghọwo isiokwu e ji arụrịta ụka. Ụfọdụ na-asị, “Ọ bụ ezi mmadụ.” Ndị ọzọ na-asịkwa, “Ee e, kama ọ na-eduhie ìgwè mmadụ a.” E nwere ọtụtụ okwu ndị ọzọ dị otú a, ndị e kwuru n’olu dị ala n’ụbọchị ndị bu ụzọ nke ememe ahụ. Ma ọ dịghị onye nwere obi ike ime nkwupụta n’ihu ọha, ịzọchitere Jisọs. Nke a bụ n’ihi na ndị mmadụ ahụ na-atụ egwu ịta ahụhụ n’aka ndị ndú Juu.
Mgbe ememe ahụ gaworo ọkara, Jisọs bịarutere. Ọ gara n’ụlọ ikwuu, bụ́ ebe ike dị ebube o nwere izi ihe juru ndị mmadụ anya. Ebe ọ na-adịghị mgbe Jisọs gara ụlọ akwụkwọ ndị rabaị, ndị Juu ahụ nọ na-arụgharị ụka, sị: “Onye a, o si aṅaa mata akwụkwọ hie nne, n’ebe ọ dịghị mgbe ọ mụworo akwụkwọ?”
Jisọs na-akọwa sị, “Ozizi m abụghị nke m, kama ọ bụ nke onye zitere m. Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọọ ime ihe Ọ na-achọ, ọ ga-amara ihe ozizi a bụ, ma ò sitere n’aka Chineke, ma ọ bụ na mụ onwe m na-ekwu site n’onwe m.” Ihe Jisọs na-ezi rapagidesiri ike n’iwu Chineke. Ya mere, o kwesịrị ido anya na ọ na-achọ otuto Chineke, ọ bụghị nke ya onwe ya. Jisọs na-ajụ sị, “Ọ́ bụghị Mosis nyere unu Iwu unu?” Ma n’ụzọ ịbara ha mba, ọ gara n’ihu, sị: “Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime unu na-eme Iwu ahụ.”
Jisọs na-ajụ sị, “Gịnị mere unu na-achọ ụzọ igbu m?”
Ndị nọ n’ìgwè mmadụ ahụ, ndị o yiri ka ha bụ ndị ọbịa bịara maka ememe ahụ, amaghị na e nwere ụdị mgbalị dị otú ahụ. O yiri ha ka ihe na-agaghị ekwe omume na onye ọ bụla ga-achọ igbu onye ozizi dị ebube otú a. Ya mere ha kwere na ọ dị ihe na-enye Jisọs nsogbu mere o ji eche echiche otú a. Ha na-asị, “Ị nwere mmụọ ọjọọ: ònye na-achọ ụzọ igbu gị?”
Ndị ndú Juu chọrọ ka e gbuo Jisọs, ọ bụ ezie na ma eleghị anya ìgwè mmadụ ahụ amataghị. Mgbe Jisọs gwọrọ mmadụ n’Ụbọchị Izu Ike otu afọ na nkera gara aga, ndị ndú ahụ nwara igbu ya. Ya mere ugbu a Jisọs gosipụtara enweghị echiche ha site n’ịjụ ha, sị: “Ọ bụrụ na e bie mmadụ úgwù n’ụbọchị izu ike, ka e wee ghara imebi iwu Mosis; ùnu nwere òlùlù ọjọọ n’ahụ m, n’ihi na emere m ka ahụ dịchasịa otu mmadụ mma n’ụbọchị izu ike? Unu elela ihu na-ekpe ikpe, kama kpeenụ ikpe ziri ezi.”
Ndị bi na Jerusalem, bụ́ ndị matara ọnọdụ ahụ sịrị ugbu a: “Onye a ọ́ bụghị onye ha na-achọ ụzọ igbu? Ma lee, ọ na-ekwuwa okwu, ma ha agwaghị ya okwu ọ bụla. Ọ̀ ga-abụ na ndị isi maara n’ezie na onye a bụ Kraịst anyị?” Ndị a ndị bi na Jerusalem kọwara ihe mere na ha ekweghị na Jisọs bụ Kraịst ahụ, na-asị: “Anyị matara onye a ebe o si pụta: ma mgbe ọ bụla Kraịst anyị ga-abịa, ọ dịghị onye ọ bụla maara [“ga-ama,” NW] ebe o si pụta.”
Jisọs na-aza, sị: “Unu matara m, matakwa ebe m si pụta; ọ bụghịkwa n’onwe m ka m bịaworo, kama onye zitere m bụ ezi onye, nke unu onwe unu na-amataghị. Mụ onwe m matara ya; n’ihi na esi m n’ebe ọ nọ bịa, Ya onwe ya zitekwara m.” Na nke a ha nwara ijide ya, ma eleghị anya itinye ya n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ gbuo ya. Ma ha enweghị ihe ịga nke ọma n’ihi na o rubeghị oge mgbe Jisọs ga-anwụ.
N’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị tinyere okwukwe na Jisọs dị ka ha kwesịrị ime n’ezie. Leenụ, o jewo ije n’elu mmiri, mee ka oké ifufe dajụọ, mee ka ebili mmiri jụrụ, jiri ogbe achịcha na azụ ole na ole zụọ ọtụtụ puku ndị mmadụ site n’ọrụ ebube, gwọọ ndị ọrịa, mee ka ndị ngwụrọ jee ije, meghee anya ndị ìsì, gwọọ ndị ekpenta, ọbụna kpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ya mere ha jụrụ, sị: “Mgbe ọ bụla Kraịst anyị ga-abịa, ọ̀ ga-eme ihe ịrịba ama karịa nke onye a mere?”
Mgbe ndị Farisii nụrụ ka ìgwè mmadụ ahụ na-atamu okwu ndị a, ha na ndị isi nchụàjà zigara ndị ọrụ ha ijide Jisọs. Jọn 7:11-32.
▪ Olee mgbe Jisọs rutere n’ememe ahụ, gịnịkwa ka ndị mmadụ ahụ na-ekwu banyere ya?
▪ Gịnị pụrụ ịbụ ihe kpatara ụfọdụ ji asị na Jisọs nwere mmụọ ọjọọ?
▪ Olee otú ndị bi na Jerusalem si ele Jisọs anya?
▪ Gịnị mere ọtụtụ ndị ji tinye okwukwe na Jisọs?