Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • kl isi 9 p. 80-89
  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?
  • Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • GỊNỊ BỤ “MMỤỌ” DỊ N’IME ỤMỤ MMADỤ?
  • “ÁJÁ KA Ị GA-ALATA”
  • “ADAWO N’ỤRA”
  • “NDỊ NILE DỊ N’ILI”
  • MBILITE N’ỌNWỤ GAA N’EBEE?
  • Olileanya E Ji n’Aka
    Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?
  • Nanị Ihe Ga-emeri Ọnwụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndụ Mgbe A Nwụsịrị—Gịnị Ka Bible Na-ekwu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi
kl isi 9 p. 80-89

Isi nke 9

Gịnị Na-eme Ndị Anyị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ?

1. Olee otú ọ na-adị ndị mmadụ mgbe ọnwụ gburu onye a hụrụ n’anya?

“MMADỤ na-ata ahụhụ mgbe onye ọ hụrụ n’anya nwụrụ n’ihi na ọnwụ bụ mfu gaa n’ebe a na-apụghị ịghọta aghọta.” Nke ahụ bụ ihe otu nwa nwoke kwuru mgbe nna ya nakwa nwa oge mgbe nke ahụ gasịrị nne ya nwụrụ. Ihe mgbu ya na echiche nke mfu dị omimi mere ka o nwee mmetụta nke na “mmiri na-eri ya n’ụzọ mmetụta uche.” Ma eleghị anya ị tawo ahụhụ n’otu ụzọ ahụ. Ị pụrụ ịjụwo banyere ebe ndị ị hụrụ n’anya nọ na ma ọ dị mgbe ị ga-ahụkwa ha ọzọ.

2. Ajụjụ dịgasị aṅaa na-eju anya na-ebilite banyere ọnwụ?

2 A gwawo nne na nna ụfọdụ na-eru újú sị, “Chineke na-ahọrọ okooko osisi ndị kasị maa mma iwere ha gaa n’ebe ọ nọ n’eluigwe.” Ọ̀ bụ otú ahụ n’ezie? Ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ hà agawo n’ógbè ndị bụ́ mmụọ? Ọ̀ bụ ihe ụfọdụ na-akpọ Nirvana, nke a kọwara dị ka ọnọdụ oké ọṅụ nke inwere onwe onye pụọ n’ihe mgbu na ọchịchọ nile? Ndị anyị hụrụ n’anya hà agabigawo ọnụ ụzọ na-eduje ná ndụ anwụghị anwụ n’ime paradaịs? Ma ọ bụ dị ka ndị ọzọ na-azọrọ, ọnwụ ọ̀ bụ ndabanye n’ime ntaramahụhụ na-adịghị ebi ebi nye ndị mejọworo Chineke? Ndị nwụrụ anwụ hà pụrụ imetụta ndụ anyị? Iji nweta azịza ndị bụ eziokwu nye ajụjụ ndị dị otú a, ọ dị anyị mkpa ịgakwuru Okwu Chineke, bụ́ Bible.

GỊNỊ BỤ “MMỤỌ” DỊ N’IME ỤMỤ MMADỤ?

3. Echiche dị aṅaa ka Socrates na Plato nwere banyere ndị nwụrụ anwụ, oleekwa otú nke a si emetụta ndị mmadụ taa?

3 Ndị ọkà ihe ọmụma ụwa bụ́ ndị Gris n’oge ochie bụ́ Socrates na Plato kwuru na a ghaghị inwe ihe na-adịghị anwụ anwụ e kenyere n’ime nwoke na nwanyị​—⁠mkpụrụ obi nke na-alanarị ọnwụ, na-adịghịkwa mgbe ọ na-anwụ anwụ n’ezie. Gburugburu ụwa, ọtụtụ nde mmadụ kwere na nke a taa. Nkwenkwe nke a na-akpalitekarị ụjọ maka ndị nwụrụ anwụ dị ka ọ na-akpalitekwa nchegbu maka ọdịmma ha. Bible na-akụziri anyị ihe dịwagara nnọọ iche banyere ndị nwụrụ anwụ.

4. (a) Gịnị ka Jenesis na-agwa anyị banyere mkpụrụ obi? (b) Gịnị ka Chineke tinyere n’ime Adam ka o wee dịrị ndụ?

4 N’ịtụle ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, anyị aghaghị icheta na nna anyị mbụ, bụ́ Adam, enweghị mkpụrụ obi. Ọ bụ mkpụrụ obi. N’ihe omume na-akpali ụjọ nke okike ihe, Chineke kpụrụ mmadụ​—⁠mkpụrụ obi⁠—​site n’ihe ndị bụ́ isi mejupụtara ala ma kunyezie “ume ndụ” n’ime ya. Jenesis 2:7 na-agwa anyị, sị: “Jehova, bụ́ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, O wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi dị ndụ.” E ji iku ume kwadoo ndụ Adam. Ma, e mere ihe karịrị ikunye ikuku n’ime akpa ikuku nke mmadụ mgbe Chineke tinyere ume ndụ n’ime Adam. Bible na-ekwu banyere “mmụọ nke ndụ” nke na-arụ ọrụ n’ime ihe ndị dị ndụ e kere n’elu ụwa.​—⁠Jenesis 7:22.

5, 6. (a) Gịnị bụ “mmụọ nke ndụ”? (b) Gịnị na-eme mgbe “mmụọ” ahụ e hotara n’Abụ Ọma 146:4 kwụsịrị ime ka anụ ahụ dịrị ndụ?

5 Gịnị bụ “mmụọ nke ndụ”? Ọ bụ ike ndụ dị oké mkpa nke Chineke tinyere n’ime anụ ahụ na-enweghị ndụ nke Adam. E jizi usoro iku ume na-akwado mmụọ nke a. Ma gịnị bụ “mmụọ” ahụ nke e zoro aka na ya n’Abụ Ọma 146:4? Amaokwu ahụ na-ekwu banyere onye nwụrụnụ, sị: “Mmụọ ya na-apụ apụ, o wee laghachi n’ala o si pụta; n’ụbọchị ahụ echiche ya nile alawo n’iyi.” Mgbe ndị ahụ dere Bible jiri okwu bụ́ “mmụọ” mee ihe n’ụzọ a, ha ebughị n’uche mkpụrụ obi e si n’anụ ahụ wepụ bụ́ nke na-anọgide ndụ mgbe anụ ahụ nwụsịrị.

6 “Mmụọ” nke na-apụ n’ahụ mmadụ n’ọnwụ bụ ike ndụ ahụ nke sitere n’aka Onye Okike anyị. (Abụ Ọma 36:9; Ọrụ 17:28) Ike ndụ a enweghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị e ji mara ihe e kere eke nke ọ na-eme ka ọ dịrị ndụ, dị nnọọ ka ike eletrik na-enweghị ihe ndị e ji mara ngwá ọrụ ndị ọ na-enye ike. Mgbe mmadụ nwụrụ, mmụọ ahụ (ike ndụ) na-akwụsị ime ka mkpụrụ ndụ anụ ahụ dịrị ndụ, dị nnọọ ka ọkụ na-anyụ mgbe a gbanyụrụ eletrik. Mgbe ike ndụ ahụ kwụsịrị ịkwado anụ ahụ mmadụ, mmadụ​—⁠mkpụrụ obi⁠—​na-anwụ.​—⁠Abụ Ọma 104:29; Eklisiastis 12:​1, 7.

“ÁJÁ KA Ị GA-ALATA”

7. Gịnị ga-eme Adam ma o nupụrụ Chineke isi?

7 Jehova kọwara n’ụzọ doro anya ihe ọnwụ ga-apụtara Adam mehierenụ. Chineke sịrị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:19) Adam ga-alata n’ebee? N’ala, n’ájá ebe e siworo kepụta ya. N’ọnwụ Adam ga-akwụsị nnọọ ịdị adị!

8. Dị ka mkpụrụ obi, n’ụzọ dị aṅaa ka ụmụ mmadụ na-akaghị ụmụ anụmanụ?

8 N’ọnọdụ nke a, ọnwụ mmadụ adịghị iche na nke ụmụ anụmanụ. Ha onwe ha kwa bụ mkpụrụ obi, otu mmụọ ahụ, ma ọ bụ ike ndụ, na-enyekwa ha ume. (Jenesis 1:24) N’Eklisiastis 3:​19, 20, nwoke amamihe ahụ bụ́ Solomọn na-agwa anyị, sị: “Dị ka ọnwụ nke anụmanụ si dị, otú a ka ọnwụ nke mmadụ dị; ee, otu mmụọ ka ha nile nwere; ọ dịghịkwa ọkaaka mmadụ nwere karịa anụmanụ [n’ọnwụ] . . . Ha nile siri n’ájá pụta, ha nile na-alaghachikwa n’ájá.” Mmadụ karịrị ụmụ anụmanụ n’ihi na e kere ya n’onyinyo Chineke, ọ na-egosipụta àgwà dị iche iche nke Jehova. (Jenesis 1:​26, 27) Ma, n’ọnwụ ma mmadụ ma ụmụ anụmanụ na-alaghachicha n’ájá.

9. Gịnị bụ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ebeekwa ka ha na-aga?

9 Solomọn gara n’ihu ịkọwa ihe ọnwụ pụtara, na-asị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.” Ee, ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị. N’ihi nke a, Solomọn gbara ume, sị: “Ihe ọ bụla aka gị na-ahụ ime, were ike gị mee ya; n’ihi na ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị [na Sheol, NW], ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:​5, 10) Olee ebe ndị nwụrụ anwụ na-ala? Na Sheol (Hibru, sheʼohlʹ), ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla. Ha adịghị ata ahụhụ, ha apụghịkwa ịkpa ike n’ahụ anyị n’ụzọ ọ bụla.

10. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ọ bụghị iwu na ọnwụ ga-abụ ebe njedebe?

10 Ọ̀ bụ iwu na anyị nile na ndị anyị hụrụ n’anya ga-ebi ndụ nanị afọ ole na ole wee kwụsịzie ịdị adị ruo ebighị ebi? Ee e dị ka ihe Bible na-ekwu si dị. N’oge nnupụisi Adam, Jehova Chineke mere ndokwa ozugbo iji mezie ihe ọjọọ nile mmehie mmadụ kpatara. Ọnwụ abụghị akụkụ nke nzube Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ. (Ezikiel 33:11; 2 Pita 3:9) N’ihi ya, ọ bụghị iwu na ọnwụ ga-abụ ebe njedebe nye anyị ma ọ bụ nye ndị anyị hụrụ n’anya.

“ADAWO N’ỤRA”

11. Olee otú Jisọs si kọwaa ọnọdụ Lazarọs bụ́ enyi ya nwụrụ anwụ?

11 Ọ bụ nzube Jehova ịgbapụta anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ site n’ọnwụ Adam. Ya mere, Okwu Chineke na-ezo aka n’ebe ndị nwụrụ anwụ nọ dị ka ndị nọ n’ụra. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ nụrụ na enyi ya bụ́ Lazarọs anwụwo, Jisọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ Ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka M wee kpọtee ya n’ụra.” Ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ozugbo ihe okwu ahụ pụtara, Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Lazarọs nwụrụ anwụ.” (Jọn 11:​11, 14) Jisọs gaziri n’obodo Betani, ebe ụmụnne nwanyị Lazarọs bụ́ Mata na Meri na-eru újú n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke. Mgbe Jisọs gwara Mata, “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie,” o kwupụtara okwukwe ná nzube Chineke ichigharị mmetụta nile nke ọnwụ n’ahụ ezinụlọ mmadụ ihu. Ọ sịrị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.”​—⁠Jọn 11:​23, 24.

12. Olee olileanya Mata mmadụ nwụnahụrụ nwere banyere ndị nwụrụ anwụ?

12 Mata ekwupụtaghị echiche ọ bụla banyere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adị ndụ n’ebe ọzọ mgbe a nwụsịrị. O kwenyeghị na Lazarọs agaworị n’ógbè ọ bụla nke ndị bụ mmụọ iji nọgide na-adị adị. Mata nwere okwukwe n’olileanya dị ebube nke mbilite n’ọnwụ. Ọ ghọtara, ọ bụghị na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ esiwo n’anụ ahụ Lazarọs pụọ, kama na nwanne ya nwụrụ anwụ akwụsịwo ịdị adị. Ngwọta ya ga-abụ mbilite n’ọnwụ nke nwanne ya.

13. Ike dị aṅaa Chineke nyere ka Jisọs nwere, o sikwa aṅaa gosipụta ike a?

13 Jisọs Kraịst bụ onye Jehova Chineke nyere ike ịgbapụta ihe a kpọrọ mmadụ. (Hosea 13:14) N’ihi ya, ná nzaghachi nye okwu Mata, Jisọs sịrị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” (Jọn 11:25) Jisọs gosipụtara ike Chineke nyere ya n’akụkụ nke a mgbe ọ gara n’ili Lazarọs, onye nwụworonụ ruo ụbọchị anọ, ma weghachi ya ná ndụ. (Jọn 11:​38-⁠44) Cheedị nnọọ banyere ọṅụ nke ndị hụrụ mbilite n’ọnwụ nke a ma ọ bụ ndị ọzọ Jisọs Kraịst mere!​—⁠Mak 5:​35-⁠42; Luk 7:​12-⁠16.

14. N’ihi gịnị ka a na-apụghị ijikọta mbilite n’ọnwụ na echiche nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi?

14 Kwụsịtụ nke nta iji tụlee nke a: Ọ dịghị onye ọ ga-adị mkpa ka a kpọlite ya, ma ọ bụ weghachi ya ná ndụ, ma ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na-alanarị ọnwụ. N’ezie, ọ gaghị abụ ihe obi ọma ịkpọlite onye dị ka Lazarọs bịaghachi ná ndụ ezughị okè n’elu ụwa ma ọ bụrụ na ọ gafereworị ná nkwụghachi ụgwọ dị ebube nke eluigwe. N’ezie, Bible adịghị mgbe o jiri okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ” mee ihe. Kama nke ahụ, Akwụkwọ Nsọ na-ekwu na mkpụrụ obi mmadụ nke na-emehie emehie na-anwụ anwụ. (Ezikiel 18:​4, 20) Ya mere Bible na-atụ aka ná ndokwa nke mbilite n’ọnwụ dị ka ezi ihe ngwọta maka ọnwụ.

“NDỊ NILE DỊ N’ILI”

15. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara? (b) N’ihi gịnị ka mbilite n’ọnwụ nke ndị mmadụ na-agaghị eji bụrụ Jehova Chineke nsogbu?

15 Okwu ndị na-eso ụzọ Jisọs ji mee ihe maka “mbilite n’ọnwụ” pụtara n’ụzọ nkịtị “ibili ọtọ” ma ọ bụ “iguzoro ọtọ.” Nke a bụ ibili ọtọ site n’ọnọdụ enweghị ndụ nke ọnwụ​—⁠dị ka a pụrụ ikwu ya, iguzoro ọtọ pụta n’ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. Jehova Chineke pụrụ ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ n’ụzọ dị mfe. N’ihi gịnị? N’ihi na Jehova bụ Isi Mmalite nke ndụ. Taa, ụmụ mmadụ pụrụ ichekwa olu na onyinyo ndị ikom na ndị inyom na tepu vidio, ha pụkwara ịkpọghachi rekọd ndị a mgbe ndị ahụ nwụsịrị. Mgbe ahụ, n’ezie, Onye Okike anyị kachasị ihe nile elu pụrụ ichekwa ihe ọmụma nile banyere onye ọ bụla ma kpọlite otu onye ahụ, na-enye ya anụ ahụ a kpụrụ ọhụrụ.

16. (a) Olee nkwa Jisọs kwere banyere ndị nile nọ n’ili ncheta? (b) Gịnị ga-ekpebi ihe mbilite n’ọnwụ onye nke ọ bụla ga-aghọ?

16 Jisọs Kraịst sịrị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili ga-anụ olu Ya [Jisọs], ha ga-apụtakwa; ndị mere ezi ihe ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ndụ; ma ndị mere ihe na-adịghị mma ga-aba ná mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:​28, 29) A ga-akpọlite ndị nile nọ ná ncheta Jehova ma zie ha ihe n’ụzọ ya nile. Nye ndị mere ihe kwekọrọ n’ihe ọmụma Chineke, nke a ga-aghọ mbilite n’ọnwụ nke ndụ. Otú ọ dị, ọ ga-aghọ mbilite n’ọnwụ nke ọmụma ikpe nye ndị jụrụ nkụzi nile na ịchịisi nke Chineke.

17. Ole ndị ka a ga-akpọlite?

17 Dị ka o kwesịrị, a ga-akpọlite ndị gbasoworo ụzọ ezi omume dị ka ndị ohu Jehova. N’ezie, olileanya mbilite n’ọnwụ wusiri ọtụtụ ndị ike iche ọnwụ ihu, ọbụna n’ọnọdụ nke ajọ mkpagbu. Ha maara na Chineke pụrụ iweghachi ha ná ndụ. (Matiu 10:28) Ma ọtụtụ nde mmadụ anwụwo n’egosighị ma hà ga-ekwekọ n’ụkpụrụ ezi omume Chineke. A ga-akpọlitekwa ha. N’obi ike ná nzube Jehova banyere nke a, Pọl onyeozi sịrị: “Enwere m olileanya n’ebe Chineke nọ . . . na mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”​—⁠Ọrụ 24:15.

18. (a) Jọn onyeozi natara ọhụụ dị aṅaa banyere mbilite n’ọnwụ? (b) Gịnị ka a na-ebibi n’ime “ọdọ ọkụ ahụ,” gịnịkwa ka “ọdọ” a na-eme ihe atụ ya?

18 Jọn onyeozi natara ọhụụ na-akpali akpali nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ ka ha na-eguzo n’ihu ocheeze Chineke. Jọn deziri: “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị. E wee tụba ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ.” (Mkpughe 20:​12-⁠14) Cheedị banyere nke ahụ! Ndị nile nwụrụ anwụ nọ ná ncheta Chineke nwere atụmanya nke ntọhapụ site na Hedis (Grik, haiʹdes), ma ọ bụ Sheol, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:31) Ha ga-enwe ohere igosipụta site n’ọrụ ha ma hà ga-efe Chineke. Mgbe ahụ a ga-atụba “ọnwụ na Hedis” n’ihe a na-akpọ “ọdọ ọkụ ahụ,” na-eme ihe atụ nke mbibi zuru ezu, dị ka okwu ahụ bụ́ “Gehena” na-eme. (Luk 12:5, NW) A ga-emewo ka ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ n’onwe ya tọgbọrọ chakoo, ọ gaghị adịkwa ọzọ mgbe e mesịrị mbilite n’ọnwụ ahụ. Lee aha ihe nkasi obi ọ bụ ịmụta site na Bible na Chineke adịghị emekpọ onye ọ bụla ọnụ!​—⁠Jeremaịa 7:​30, 31.

MBILITE N’ỌNWỤ GAA N’EBEE?

19. N’ihi gịnị ka a ga-eji kpọlite ụfọdụ n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’eluigwe, ụdị ahụ dị aṅaa ka Chineke ga-enyekwa ha?

19 A ga-akpọlite ọnụ ọgụgụ a kpaara ókè nke ndị ikom na ndị inyom gaa ná ndụ n’eluigwe. Dị ka ndị so Jisọs bụrụ eze na ndị nchụàjà, ha ga-ekere òkè n’imeghasị mmetụta nile nke ọnwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ketara n’aka mmadụ mbụ ahụ, bụ́ Adam. (Ndị Rom 5:12; Mkpughe 5:​9, 10) Mmadụ ole ka Chineke ga-ewere gaa n’eluigwe iso Kraịst chịa? Dị ka Bible na-ekwu, nanị 144,000. (Mkpughe 7:4; 14:1) Jehova ga-enye nke ọ bụla n’ime ndị a a kpọlitere ahụ nke mmụọ ka ha wee nwee ike ịdị ndụ n’eluigwe.​—⁠1 Ndị Kọrint 15:35, 38, 42-⁠45; 1 Pita 3:18.

20. Gịnị ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi, tinyere ndị a kpọlitere n’ọnwụ, ga-enwe ahụmahụ ya?

20 A ga-akpọlite ihe ka nnọọ ukwuu n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị nwụrụ anwụ bịa n’ụwa paradaịs. (Abụ Ọma 37:​11, 29; Matiu 6:10) Akụkụ nke ihe mere a ga-eji kpọlite ụfọdụ gaa n’eluigwe bụ iji mezuo nzube Chineke maka ụwa. Jisọs Kraịst na 144,000 ahụ n’eluigwe ga-ewere ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu gaghachi n’izu okè ahụ nne na nna anyị mbụ tụfuru. Nke a ga-agụnye ndị a kpọlitere n’ọnwụ, dị ka Jisọs gosiri mgbe ọ gwara nwoke ahụ na-anwụ anwụ a kpọgidere n’osisi n’akụkụ ya, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”​—⁠Luk 23:​42, 43.

21. Dị ka Aịsaịa onye amụma na Jọn onyeozi kwuru, gịnị ga-eme ọnwụ?

21 N’ụwa Paradaịs ahụ, a ga-ewepụ ọnwụ, nke na-arụpụta ihe efu dị ukwuu taa. (Ndị Rom 8:​19-⁠21) Aịsaịa onye amụma kwupụtara na Jehova Chineke ‘ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.’ (Aịsaịa 25:8) E nyere Jọn onyeozi ọhụụ nke oge mgbe ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enwere onwe ya pụọ n’ihe mgbu na ọnwụ. Ee, “Chineke Onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”​—⁠Mkpughe 21:​1-⁠4.

22. Olee otú ihe ọmụma nke mbilite n’ọnwụ si emetụta gị?

22 Nkụzi ndị doro anya nke Bible na-ewepụ mgbagwoju anya banyere ihe na-eme ndị nwụrụ anwụ. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu hoo haa na ọnwụ bụ “onye iro ikpeazụ” nke a ga-ebibi. (1 Ndị Kọrint 15:26) Lee aha ume na nkasi obi anyị pụrụ inweta site n’ihe ọmụma nke olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ! Leekwa ka anyị pụrụ isi nwee ọṅụ na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke ga-esi n’ụra ọnwụ teta ịnụ ụtọ nke ihe ọma nile ọ kwadebeere ndị hụrụ ya n’anya! (Abụ Ọma 145:16) A ga-eweta ngọzi ndị dị otú ahụ site n’Alaeze Chineke. Ma olee mgbe ọchịchị ya gaje ịmalite? Ka anyị lee.

NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ

Gịnị bụ mmụọ dị n’ime ụmụ mmadụ?

Olee otú ị ga-esi kọwaa ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ?

Ole ndị ka a ga-akpọlite?

[Foto dị na peeji nke 85]

Dị nnọọ ka Jisọs si kpọọ Lazarọs òkù ka o si n’ili pụta, otú ahụ ka a ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ

[Foto dị na peeji nke 86]

Ọṅụ ga-eju ebe nile mgbe ‘Chineke lodara ọnwụ ruo ebighị ebi’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya