Olileanya E Ji n’Aka
“Malite n’ọmụmụ ọ nọgidewo na-ekwe omume na mmadụ pụrụ ịnwụ mgbe ọ bụla; n’ụzọ a na-apụghịkwa izere ezere ihe a ga-aghọ ihe ga-emezu emezu.”—ONYE BRITAIN NA-AKỌ AKỤKỌ IHE MERE EME BỤ́ ARNOLD TOYNBEE.
1. Eziokwu dị aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ na-aghaghị ịnakwere, na-ewelite ajụjụ ndị dị aṅaa?
ÒNYE pụrụ ịrụ eziokwu a doro anya nke akụkọ ihe mere eme e hotara n’elu ụka? Ihe a kpọrọ mmadụ abụrụwo ndị na-aghaghị ịnakwere mgbe nile eziokwu ahụ na-atụ egwu nke bụ na a ga-anwụ anwụ. Leekwa echiche nke enweghị enyemaka anyị na-enwe mgbe onye anyị hụrụ n’anya nwụrụ! Mgbe ahụ mfu ahụ na-eyi ka a pụghị imegharị ya ma ọlị. Ọ̀ pụrụ ikwe omume ijikọghachi anyị na ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ? Olileanya dị aṅaa ka Bible nwere maka ndị nwụrụ anwụ? Tụlee akụkọ na-esonụ.
‘Enyi Anyị Anwụwo’
2-5. (a) Mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ, olee otú Jisọs si gosi ịdị njikere ya na ikike o nwere ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ? (b) E wezụga ịkpọghachite Lazarọs ná ndụ, gịnị ka ọrụ ebube mbilite n’ọnwụ ahụ rụzuru?
2 Afọ ahụ bụ 32 O.A. Lazarọs na ụmụnne ya nwanyị bụ́ Meri na Mata bi n’obodo nta nke Betani, nke dị kilomita atọ ná mpụga Jerusalem. Ha bụ ezi ndị enyi Jisọs. Otu ụbọchị, Lazarọs dara nnukwu ọrịa. N’egbughị oge, ụmụnne ya nwanyị ndị nọ na-enwe nchegbu zigaara Jisọs bụ́ onye nọ n’ofe Osimiri Jọdan, ozi a. Jisọs hụrụ Lazarọs na ụmụnne ya nwanyị n’anya, ya mere ka oge na-aga ọ gawara Betani. N’ụzọ, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Enyi anyị Lazarọs adawo n’ụra; ma ana m aga, ka M wee kpọtee ya n’ụra.” Ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ozugbo ihe okwu a pụtara, Jisọs kwuru hoo haa, sị: “Lazarọs nwụrụ anwụ.”—Jọn 11:1-15.
3 Mgbe ọ nụrụ na Jisọs na-abịa Betani, Mata gbapụtara izute ya. N’ịbụ onye iru újú ya metụrụ n’ahụ, Jisọs mesiri ya obi ike, si: “Nwanne gị nwoke ga-esi n’ọnwụ bilie.” Mata zara, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” Mgbe ahụ Jisọs gwara ya, sị: “Mụ onwe m bụ mbilite n’ọnwụ na ndụ: onye na-ekwere na Mụ, ọbụna ma a sị na ọ nwụrụ anwụ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.”—Jọn 11:20-25.
4 Mgbe ahụ Jisọs gara n’ili ahụ ma kwuo ka e bupụ nkume e ji mechie ebe e si aba na ya. Mgbe o kpesịrị ekpere n’olu dara ụda, o nyere iwu, sị: “Lazarọs, pụta n’èzí.” Ka anya nile lekwasịkwara ili ahụ, Lazarọs pụtara n’ezie. Jisọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ—na-ewetaghachiri nwoke nwụrụ anwụ kemgbe ụbọchị anọ ndụ!—Jọn 11:38-44.
5 Mata enweworị okwukwe ná nkwa nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29; 11:23, 24) Ọrụ ebube nke ịkpọghachite Lazarọs ná ndụ wusiri okwukwe Mata ike, meekwa ka ndị ọzọ nwee okwukwe. (Jọn 11:45) Ma gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara kpọmkwem?
“Ọ Ga-esi n’Ọnwụ Bilie”
6. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” pụtara?
6 A sụgharịrị okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” site n’okwu Grik bụ́ a·naʹsta·sis, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “iguzo ọtọ ọzọ.” Ndị Hibru na-asụgharị okwu Grik asụgharịwo a·naʹsta·sis na-eji okwu Hibru bụ́ techi·yathʹ ham·me·thimʹ eme ihe, nke pụtara “ntụte nke onye nwụrụ anwụ.”a Ya mere, mbilite n’ọnwụ gụnyere ịkpọlite onye ahụ site n’ọnọdụ adịghị ndụ nke ọnwụ—ịtụteghachi ụzọ ndụ nke onye ahụ.
7. N’ihi gịnị ka ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ na-agaghị eji bụụrụ Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nsogbu?
7 N’ịbụ onye amamihe ya na-enweghị nsọtụ na onye ikike ncheta ya zuru okè, Jehova Chineke pụrụ ịkpọlite mmadụ n’ọnwụ n’ụzọ dị mfe. Icheta ụzọ ndụ nke ndị nwụrụ anwụ—ụdị onye ha bụ, akụkọ ha, na ụmụ irighiri ihe e ji mara ha—abụghịrị ya nsogbu. (Job 12:13; tụlee Aịsaịa 40:26.) Jehova bụkwa Onye Mmalite nke ndụ. N’ihi ya, ọ pụrụ ịkpọghachite otu onye ahụ ná ndụ n’egbughị oge, na-enye ya otu ọdịdị ahụ n’ahụ nke e mere ọhụrụ. Ọzọkwa, dị ka ahụmahụ Lazarọs na-egosi, Jisọs Kraịst dị njikere ma nweekwa ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.—Tụlee Luk 7:11-17; 8:40-56.
8, 9. (a) N’ihi gịnị ka mbilite n’ọnwụ na echiche nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi na-ejighị kwekọọ? (b) Gịnị bụ ihe ngwọta maka ọnwụ?
8 Otú ọ dị, nkụzi nke Akwụkwọ Nsọ banyere mbilite n’ọnwụ ekwekọghị n’ozizi nke anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi. Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na-adịgide ndụ mgbe a nwụsịrị, ọ dịghị onye ọ ga-adị mkpa ka a kpọlite ya n’ọnwụ, ma ọ bụ kpọghachite ná ndụ. N’ezie, Mata ekwutụghị banyere mkpụrụ obi nke na-anọ na-adị ndụ n’ebe ọzọ mgbe a nwụsịrị. O kwenyeghị na Lazarọs agaworị n’otu ógbè ndị bụ mmụọ iji nọgide na-adị ndụ. N’ụzọ dị iche, o gosiri okwukwe ya ná nzube Chineke ịgbanwe mmetụta nke ọnwụ. Ọ kwuru, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:23, 24) N’otu aka ahụ, Lazarọs n’onwe ya akọghị akụkọ banyere ahụmahụ ụfọdụ o nwere mgbe ọ nwụsịrị. Ọ dịghị ihe o nwere ịkọ.
9 N’ụzọ doro anya, dị ka Bible si kwuo, mkpụrụ obi na-anwụ anwụ, ngwọta e nwekwara maka ọnwụ bụ mbilite n’ọnwụ. Ma ọtụtụ ijeri mmadụ anwụwo eri nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam bisịrị ndụ n’ụwa. Ya mere olee ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ, n’ole ebe kwa?
‘Ndị Nile Nọ n’Ili Ncheta’
10. Nkwa dị aṅaa ka Jisọs kwere banyere ndị nọ n’ili ncheta?
10 Jisọs Kraịst kwuru, sị: “Oge hour na-abịa mgbe ndị nile dị n’ili [ncheta, NW] ga-anụ olu [Jisọs], ha ga-apụtakwa.” (Jọn 5:28, 29) Ee, Jisọs Kraịst kwere nkwa na a ga-akpọlite ndị nile nọ ná ncheta Jehova n’ọnwụ. Ọtụtụ ijeri mmadụ adịwo ndụ ma nwụọ. Olee ndị n’ime ha nọ ná ncheta Chineke, na-echere mbilite n’ọnwụ?
11. Olee ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ?
11 A ga-akpọlite ndị chụsoworo ụzọ ezi omume dị ka ndị ohu Jehova n’ọnwụ. Ma ọtụtụ nde ndị ọzọ anwụwo n’egosighị ma hà ga-ekwekọ n’ụkpụrụ ezi omume nke Chineke. Ha amaghị ihe ndị Jehova chọrọ ma ọ bụ ha enweghị oge zuru ezu ime mgbanwe ndị dị mkpa. Ndị a kwa nọ ná ncheta Chineke, n’ihi ya kwa a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, n’ihi na Bible na-ekwe nkwa, sị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.”—Ọrụ 24:15.
12. (a) Ọhụụ dị aṅaa ka Jọn onyeozi natara banyere mbilite n’ọnwụ? (b) Olee ihe ndị a ‘tụbara n’ọdọ ọkụ ahụ,’ gịnịkwa ka okwu ahụ pụtara?
12 Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ na-akpali akpali nke ndị a kpọlitere n’ọnwụ na-eguzo n’ihu ocheeze Chineke. N’ịkọwa ya, o dere, sị: “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị. E wee tụba ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ.” (Mkpughe 20:12-14) Cheedị echiche ihe nke ahụ pụtara! A ga-esi na Hedis ma ọ bụ Sheol, ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ tọhapụ ndị nile nwụrụ anwụ bụ́ ndị nọ ná ncheta Chineke. (Abụ Ọma 16:10; Ọrụ 2:31) Mgbe ahụ a ga-atụba “ọnwụ na Hedis” n’ime ihe a kpọrọ “ọdọ ọkụ ahụ,” nke na-anọchi anya mbibi zuru ezu. Ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-akwụsị ịdị adị.
À Ga-akpọlite Ha n’Ọnwụ Gaa n’Ebee?
13. N’ihi gịnị ka Chineke ji dokwaa ka a kpọlite ụfọdụ n’ọnwụ gaa n’eluigwe, ụdị ahụ dịkwa aṅaa ka Jehova ga-enye ha?
13 A ga-akpọlite ọnụ ọgụgụ dị nta nke ndị ikom na ndị inyom n’ọnwụ gaa ná ndụ n’eluigwe. Ndị a na Kraịst ga-achị dị ka ndị eze na ndị nchụàjà, ha ga-ekerekwa òkè n’idozi mmetụta nile nke ọnwụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ketara site n’aka nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam. (Ndị Rom 5:12; Mkpughe 5:9, 10) Dị ka Bible si kwuo, ọnụ ọgụgụ ha bụ nanị 144,000, a họpụtakwara ha site n’etiti ụmụazụ Kraịst, na-amalite ná ndị ozi ahụ kwesịrị ntụkwasị obi. (Luk 22:28-30; Jọn 14:2, 3; Mkpughe 7:4; 14:1, 3) Jehova ga-enye onye nke ọ bụla n’ime ndị a a kpọlitere n’ọnwụ ahụ mmụọ ka ha wee nwee ike ibi n’eluigwe.—1 Ndị Kọrint 15:35, 38, 42-45; 1 Pita 3:18.
14, 15. (a) Gaa n’ụdị ndụ dị aṅaa ka a ga-akpọlite ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nwụrụ anwụ? (b) Ngọzi dị aṅaa ka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-enweta?
14 Otú ọ dị, a ga-akpọlite ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nwụworo anwụ gaa ná ndụ n’ụwa. (Abụ Ọma 37:29; Matiu 6:10) Ụdị ụwa dị aṅaa? E ji esemokwu, mwụfu ọbara, mmetọ, na ime ihe ike mejupụta ụwa taa. Ọ bụrụ na ndị nwụrụ anwụ ga-abịaghachi ná ndụ n’ụwa dị otú a, n’ezie obi ụtọ ọ bụla agaghị adịte aka. Ma Onye Okike ekwewo nkwa na ya ga-eweta ụwa ọha mmadụ dị ugbu a, bụ́ nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan, ná njedebe n’isi nso. (Ilu 2:21, 22; Daniel 2:44) Ọha mmadụ ọhụrụ nke ezi omume—“ụwa ọhụrụ”—ga-abụzi ihe dị adị n’ezie. (2 Pita 3:13) N’oge ahụ “onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.” (Aịsaịa 33:24) A ga-ewepụ ọbụna ihe mgbu nke ọnwụ, n’ihi na Chineke “ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:4.
15 N’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa, ‘ịba ụba nke udo ga-atọ ndị dị ume ala n’obi ụtọ.’ (Abụ Ọma 37:11) Ọchịchị eluigwe nke Kraịst Jisọs na 144,000 ya na ha ga-achịkọ ga-eji nwayọọ nwayọọ weghachi ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi n’izu okè ahụ nne na nna anyị mbụ, bụ́ Adam na Iv, tụfuru. Ndị ga-eso na ndị ga-ebi n’ụwa ga-abụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ.—Luk 23:42, 43.
16-18. Ọṅụ dị aṅaa ka mbilite n’ọnwụ ga-ewetara ezinụlọ dị iche iche?
16 Bible na-egositụ ọṅụ mbilite n’ọnwụ ga-ewetara ezinụlọ dị iche iche. Cheedị obi ụtọ nwanyị ahụ di ya nwụrụ nke Nain nwere mgbe Jisọs kwụsịrị ndị ahụ na-aga ili ozu wee kpọlite nwa nwoke ọ mụrụ nanị ya n’ọnwụ! (Luk 7:11-17) E mesịa, n’ebe dị nso Osimiri Galili, mgbe Jisọs kpọghachitere nwa agbọghọ dị afọ 12 ná ndụ, ‘ibubo wee nwụbiga nne na nna ya ókè n’ahụ.’—Mak 5:21-24, 35-42; leekwa 1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37.
17 Nye ọtụtụ nde ndị nọ n’ụra ọnwụ ugbu a, mbilite n’ọnwụ ga-apụta ndụ n’ụwa ọhụrụ nke udo. Cheedị nnọọ banyere atụmanya na-akpali akpali nke a na-emeghere Tommy na onye ọchụ ntá ego ahụ, ndị a kpọtụrụ aha ná nkebi mmalite nke broshuọ a! Mgbe Tommy ga-eteta gaa ná ndụ na Paradaịs n’elu ala, ọ ga-abụ otu Tommy ahụ nne ya maara—ma n’enweghị ọrịa. Nne ya ga-enwe ike imetụ ya aka, jide ya n’aka ya, hụkwa ya n’anya. N’otu aka ahụ, kama ịbụ onye e kechibidoro n’usoro mmụghachi fọrọ nke nta ka ọ ghara ịdị na-agwụ agwụ, onye ọchụ ntá ego ahụ sitere India nwere olileanya magburu onwe ya nke imeghe anya ya n’ụwa ọhụrụ Chineke ma hụ ụmụ ya ndị nwoke.
18 Ịma eziokwu banyere mkpụrụ obi, banyere ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ, na banyere olileanya nke mbilite n’ọnwụ pụkwara inwe oké mmetụta n’ahụ ndị dị ndụ ugbu a. Ka anyị hụ ka o si bụrụ otú ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ ezie na okwu ahụ bụ́ “mbilite n’ọnwụ” adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e gosipụtara olileanya nke mbilite n’ọnwụ n’uzọ doro anya na Job 14:13, Daniel 12:13, na Hosea 13:14.
[Foto dị na peeji nke 26]
Mbilite n’ọnwụ ga-eweta ọṅụ na-adịgide adịgide