Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • rq ihe ọmụmụ 14 p. 28-29
  • Ụzọ E Si Hazie Ndịàmà Jehova

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ E Si Hazie Ndịàmà Jehova
  • Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Họọrọ Ka Ha Na-efe Ya?
    Ozi Ọma Si n’Aka Chineke!
  • Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Nzukọ na Ọrụ Ha Zuru Ụwa Ọnụ
    Ndịàmà Jehova—Ole Ndị Ka Ha Bụ? Gịnị Ka Ha Kweere?
  • Ka E Wulie Ọgbakọ Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
rq ihe ọmụmụ 14 p. 28-29

Ihe Ọmụmụ nke 14

Ụzọ E Si Hazie Ndịàmà Jehova

Olee mgbe Ndịàmà Jehova nwere mmalite ha nke oge a? (1)

Olee otú e si eduzi ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova? (2)

Olee otú e si ahụ banyere mmefu ego? (3)

Ònye na-ebute ụzọ n’ọgbakọ ọ bụla? (4)

Nzukọ ndị dị aṅaa ka ibu ka a na-enwe kwa afọ? (5)

Ọrụ dị aṅaa ka a na-arụ n’isi ụlọ ọrụ na n’alaka ụlọ ọrụ ha dị iche iche? (6)

1. Ndịàmà Jehova nwere mmalite ha nke oge a n’afọ ndị 1870. Na mbụ, a kpọrọ ha Ndị Mmụta Bible. Ma na 1931 ha nakweere aha Akwụkwọ Nsọ ahụ bụ́ Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10) Site ná mmalite dị nta ọgbakọ ahụ etowo ruo ọtụtụ nde Ndịàmà, ndị ji ọrụ n’aka n’ime nkwusa n’ihe karịrị 230 ala.

2. Ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova na-enwe nzukọ ugboro atọ n’izu. A na-akpọ gị òkù ịbịa nke ọ bụla n’ime ndị a. (Ndị Hibru 10:24, 25) Bible bụ ihe ndabere nke ihe a na-akụzi. A na-eji ekpere emeghe ma na-emechi nzukọ. A na-abụkwa “abụ mmụọ nsọ” sitere n’obi n’ihe ka ọtụtụ n’ime nzukọ ndị ahụ. (Ndị Efesọs 5:18, 19) Nnabata bụ n’efu, ọ dịghịkwa ụtụ ọ bụla a na-anara.—Matiu 10:8.

3. Ihe ka ọtụtụ n’ime ọgbakọ ndị ahụ na-enwe nzukọ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ndị a na-abụkarị ihe owuwu dị mfe nke ndị ọrụ afọ ofufo bụ́ Ndịàmà wuru. Ị gaghị ahụ ihe oyiyi ọ bụla, ngosipụta nke obe, ma ọ bụ ihe ndị yiri ndị a n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. A na-akwụ ụgwọ mmefu ego site n’onyinye afọ ofufo. Maka ndị chọrọ inye ihe, e nwere igbe onyinye.—2 Ndị Kọrint 9:7.

4. N’ọgbakọ ọ bụla, e nwere ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta. Ha na-ebute ụzọ n’izi ihe n’ọgbakọ. (1 Timoti 3:1-7; 5:17) Ndị ohu na-eje ozi na-enyere ha aka. (1 Timoti 3:8-10, 12, 13) E bulighị ndị ikom a elu karịa ndị ọzọ nọ n’ime ọgbakọ. (2 Ndị Kọrint 1:24) A dịghị enye ha utu aha ndị pụrụ iche. (Matiu 23:8-10) Ha adịghị eji ejiji dị iche na nke ndị ọzọ. A dịghịkwa akwụ ha ụgwọ maka ọrụ ha. Ndị okenye na-eji ọchịchọ obi elekọta mkpa ime mmụọ nke ọgbakọ. Ha pụrụ inye nkasi obi na nduzi n’oge nsogbu.—Jemes 5:14-16; 1 Pita 5:2, 3.

5. Ndịàmà Jehova na-enwekwa mgbakọ ndị buru ibu kwa afọ. N’oge ndị a ọtụtụ ọgbakọ na-ezukọta ọnụ maka usoro ihe omume pụrụ iche nke ntụziaka Bible. Baptism nke ndị ọhụrụ na-eso ụzọ bụ akụkụ na-adị mgbe nile n’usoro ihe omume nke mgbakọ ọ bụla.—Matiu 3:13-17; 28:19, 20.

6. Isi ụlọ ọrụ nke Ndịàmà Jehova dị na New York. N’ebe ahụ ka e nwere Òtù Na-achị Isi, ìgwè bụ isi nke ndị okenye nweworo ahụmahụ ndị na-elekọta ọgbakọ ahụ zuru ụwa ọnụ. E nwekwara ihe karịrị 100 alaka ụlọ ọrụ gburugburu ụwa. N’ebe ndị a, ndị ọrụ afọ ofufo na-enye aka ibipụta na izipụ akwụkwọ Bible. A na-enyekwa ntụzi iji wee hazie ọrụ ime nkwusa ahụ. Gịnị ma i mee atụmatụ ileta alaka ụlọ ọrụ nke dị gị nso?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya