Nzukọ na Ọrụ Ha Zuru Ụwa Ọnụ
E NWERE ọtụtụ ụzọ e si eduzi ọrụ ịgba àmà ahụ n’ihe karịrị ala 230 bụ́ ebe ndị a na-arụ ya. Ọ bụ Òtù Na-achị Isi nke nọ n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile dị na Brooklyn, New York na-eduzi ya n’ozuzu ya. Kwa afọ Òtù Na-achị Isi ahụ na-eziga ndị nnọchianya n’ógbè dị iche iche n’ụwa nile iji soro ndị nnọchianya alaka nọ n’ógbè ndị ahụ kwurịta okwu. N’alaka ụlọ ọrụ dị iche iche, e nwere Kọmitii Alaka ndị ihe dị ka mmadụ atọ ruo asaa na-emejupụta ilekọta ọrụ ahụ n’ala ndị dị n’ókèala ha. Ụfọdụ n’ime alaka ndị ahụ nwere ebe ndị a na-ebi akwụkwọ, ụfọdụ nwere ígwè obibi akwụkwọ rotary, bụ́ ndị na-ebi akwụkwọ oké ọsọ ọsọ. A na-ekewa mba ma ọ bụ ógbè nke alaka nke ọ bụla na-elekọta na distrikti na distrikti, n’aka nke ọzọ, a na-ekewakwa distrikti ndị ahụ na sekit na sekit. Sekit nke ọ bụla na-enwe ihe dị ka ọgbakọ 20 n’ime ya. Onye nlekọta distrikti na-eleta sekit ndị dị na distrikti ya, o letasịa otu o leta ọzọ. Sekit ọ bụla na-enwe mgbakọ abụọ kwa afọ. E nwekwara onye nlekọta sekit, ọ na-eletakwa ọgbakọ ọ bụla nọ na sekit ya dị ka ọ na-adịkarị ugboro abụọ n’otu afọ, na-enyere Ndịàmà aka n’ịhazi na ịrụ ọrụ nkwusa ahụ n’ókèala e kenyere ọgbakọ ahụ.
Ọgbakọ dị n’ógbè unu na Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, bụ ebe bụ́ isi maka izi ozi ọma n’obodo unu. A na-ahazi ógbè ndị ọgbakọ ọ bụla na-elekọta gaa n’ókèala ndị dị ntakịrị. A na-ekenye Ndịàmà ókèala ndị a n’otu n’otu, bụ́ ndị na-agbalịsi ike ileta na iso ndị bi n’ụlọ ọ bụla dị n’ebe ahụ kwurịta okwu. Ọgbakọ nke ọ bụla, nke ihe mejupụtara ya bụ malite ná Ndịàmà ole na ole ruo n’ihe dị ka 200, na-enwe ndị okenye e kenyere ọrụ dị iche iche. Onye nkwusa ọ bụla nke ozi ọma ahụ bụ onye dị mkpa ná nzukọ Ndịàmà Jehova. Onye ọ bụla n’ime Ndịàmà ahụ, ma ọ na-eje ozi n’isi ụlọ ọrụ, n’alaka dị iche iche, ma ọ bụ n’ọgbakọ di iche iche, na-arụ ọrụ a nke ịgwa ndị ọzọ n’onwe ya okwu banyere Alaeze Chineke.
N’ikpeazụ, a na-ewega akụkọ banyere ọrụ a n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile, a na-achịkọtakwa ma bipụta Yearbook kwa afọ. Ọzọkwa, kwa afọ a na-ebipụta chaatị ná mbipụta Ụlọ Nche nke January 1. Akwụkwọ abụọ ndị a na-enye akụkọ zuru ezu banyere ihe a rụzuru kwa afọ n’ịgba àmà banyere Jehova na Alaeze ya n’okpuru Kraịst Jisọs. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ihe dị ka Ndịàmà na ndị nwere mmasị dị 14,000,000 agawo Ememe Ncheta ọnwụ Jisọs kwa afọ. Ndịàmà Jehova na-etinye ihe karịrị 1,000,000,000 awa n’otu afọ n’ikwusa ozi ọma ahụ, e mekwara ihe karịrị ndị ọhụrụ 300,000 baptism. Akwụkwọ ndị a na-enyefe na-eru ọtụtụ narị nde.