Ihe Dị n’Ime Akwụkwọ Ahụ
Onye na-abanye n’ọ́bá akwụkwọ na nke mbụ ya nwere ike inwe mgbagwoju anya n’ọtụtụ akwụkwọ e nwere. Ma site ná nkọwa dị nta nke otú e si hazie akwụkwọ ndị ahụ, ọ na-amụta ngwa ngwa ụzọ e si achọta ihe. N’otu aka ahụ, ịchọta ụzọ gị n’ime Bible na-aka mfe mgbe ị ghọtara ụzọ e si hazie ihe dị n’ime ya.
E SI n’okwu Grik bụ́ bi·bliʹa, nke pụtara “ọtụtụ mpịakọta papyrus” ma ọ bụ “ọtụtụ akwụkwọ,” nweta okwu ahụ bụ́ “Bible.”1 Bible bụ n’ezie nchịkọta—ọ́bá akwụkwọ—nke akwụkwọ 66 dị iche iche, ndị odide ha were ihe dị ka afọ 1,600, bido na 1513 T.O.A. ruo ihe dị ka 98 O.A.
A maara akwụkwọ 39 mbụ, ihe dị ka ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ihe dị na Bible, dị ka Akwụkwọ Nsọ Hibru, ebe e dere ha karịsịa n’asụsụ ahụ. A pụrụ ikewa akwụkwọ ndị a n’ozuzu ha gaa n’ìgwè atọ: (1) Akụkọ Ihe Mere Eme, Jenesis ruo Esta, akwụkwọ 17; (2) Uri, Job ruo Abụ nke Abụ, akwụkwọ 5; na (3) Amụma, Aịsaịa ruo Malakaị, akwụkwọ 17. Akwụkwọ Nsọ Hibru kọrọ maka akụkọ mmalite nke ụwa na nke ihe a kpọrọ mmadụ nakwa akụkọ ihe mere eme nke mba Israel oge ochie bido ná mmalite ya ruo na narị afọ nke ise T.O.A.
A maara akwụkwọ 27 fọrọnụ dị ka Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, n’ihi na e dere ha na Grik, asụsụ mba dị iche iche n’oge ahụ. A haziri ha n’ụzọ bụ isi dị ka isiokwu si dị: (1) akwụkwọ 5 nke akụkọ ihe mere eme—Oziọma ndị ahụ na Ọrụ Ndị Ozi, (2) akwụkwọ ozi 21, na (3) Mkpughe. Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst lekwasịrị anya ná nkụzi na ọrụ Jisọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya na narị afọ mbụ O.A.