Isi nke Iri Abụọ na Otu
Ezi Ofufe Agbasaa n’Ụwa Nile
1. Ozi dị aṅaa na-enye agbamume dị n’Aịsaịa isi 60?
E DERE isi 60 nke Aịsaịa n’ụdị ihe nkiri na-akpali akpali. N’amaokwu ndị mbụ, otu ọnọdụ nke na-emetụ n’ahụ dọọrọ uche anyị. Ọtụtụ ihe omume sochiri ibe ha ngwa ngwa, wee duru anyị bịa ná ngwụsị nke na-akpali akpali. Isiakwụkwọ ahụ kọwara n’ụzọ doro anya mweghachi nke ezi ofufe na Jerusalem oge ochie nakwa mgbasa nke ezi ofufe n’ụwa nile taa. Ọzọkwa, ọ na-ezo aka ná ngọzi ebighị ebi ndị na-echere ndị nile ji iguzosi ike n’ihe na-efe Chineke ofufe. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikere òkè ná mmezu nke akụkụ a na-adọrọ adọrọ nke amụma Aịsaịa. Ya mere, ka anyị jiri nlezianya nyochaa ya.
Ìhè Enwuo n’Ọchịchịrị
2. Olee iwu e nyere otu nwanyị nke dina n’ọchịchịrị, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị oké mkpa na o rubere isi?
2 Ọ bụ otu nwanyị nke nọ n’ọnọdụ dị mwute ka a gwara okwu e ji malite isiakwụkwọ a nke Aịsaịa. Dị ka ihe àmà na-egosi, o dina, kpudo ihu n’ala n’ọchịchịrị. Na mberede, ìhè nwubara n’ọchịchịrị ahụ ka Jehova na-ekwu site n’ọnụ Aịsaịa, sị: “Bilie, nwuo; [gị nwanyị], n’ihi na ìhè gị abịawo, ebube Jehova awawokwa n’ahụ gị dị ka anyanwụ.” (Aịsaịa 60:1) Ee, “nwanyị” ahụ kwesịrị ibili wee gosipụta ebube Chineke! N’ihi gịnị ka nke a ji dị oké mkpa? Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa, oké ọchịchịrị na-ekpuchikwa ndị nile dị iche iche: ma n’ahụ gị ka Jehova ga-awa dị ka anyanwụ, ebube Ya ka a ga-ahụkwa n’ahụ gị.” (Aịsaịa 60:2) “Nwanyị” ahụ aghaghị ime ka ‘ìhè nwupụta’ maka abamuru nke ndị nọ ya gburugburu bụ́ ndị ka na-awagharị n’ọchịchịrị. Gịnị ga-esi na ya pụta? “Mba nile ga-ejerukwa ìhè gị, ndị eze ejeruo onwu maramara nke ọwụwa gị.” (Aịsaịa 60:3) Okwu mmeghe ndị a bụ isi ihe a ga-akọwa n’ụzọ sara mbara karị n’amaokwu ndị na-esonụ—ezi ofufe aghaghị ịgbasa n’ụwa nile!
3. (a) Ònye bụ “nwanyị” ahụ? (b) N’ihi gịnị ka “nwanyị” ahụ jiworo dinara n’ọchịchịrị?
3 Ọ bụ ezie na ọ na-ekwu banyere ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, Jehova gwara “nwanyị” ahụ na ìhè ya “abịawo.” Nke a na-emesi ike ojiji e ji n’aka na amụma ahụ ga-emezu. “Nwanyị” a na-ekwu maka ya bụ Zaịọn, ma ọ bụ Jerusalem, bụ́ isi obodo nke Juda. (Aịsaịa 52:1, 2; 60:14) Obodo ahụ na-anọchite anya mba ahụ dum. Oge mbụ amụma a mezuru, a hụrụ “nwanyị” ahụ ka o dina n’ọchịchịrị, bụ́ ebe ọ nọ kemgbe e bibiri Jerusalem na 607 T.O.A. Otú ọ dị, na 537 T.O.A., ihe fọdụrụ ná ndị Juu e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, laghachiri Jerusalem ma weghachi ofufe dị ọcha. N’ikpeazụ, Jehova mere ka ìhè nwukwasị “nwanyị” ya, ndị ya e weghachiri eweghachi ghọkwara isi iyi nke ìhè n’etiti mba ndị nọ n’ọchịchịrị ime mmụọ.
Mmezu Ka Ukwuu
4. Olee ndị taa n’ụwa na-anọchite anya “nwanyị” ahụ, oleekwa ndị okwu amụma ahụ na-emetụta ma a gbatịa ya?
4 Mmasị anyị nwere n’okwu amụma ndị a akwụsịghị nanị ná mmezu ha n’ahụ Jerusalem oge ochie. Taa, “Israel nke Chineke” na-anọchite anya “nwanyị” eluigwe nke Jehova n’ụwa. (Ndị Galetia 6:16) N’oge nile ọ dị, malite na Pentikọst 33 O.A. ruo ugbu a, mba ime mmụọ a abịawo nwee ngụkọta nke 144,000 ndị so na ya bụ́ ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, “ndị a gbatararịị n’ụwa” n’olileanya nke iso Kraịst chịa n’eluigwe. (Mkpughe 14:1, 3) Mmezu nke amụma Aịsaịa isi 60 n’oge a hiwere isi n’ebe ndị so na 144,000 ahụ nọ, bụ́ ndị dị ndụ n’ụwa na “mgbe ikpeazụ.” (2 Timoti 3:1) Amụma ahụ na-emetụtakwa ndị ibe nke ndị Kraịst a e tere mmanụ, bụ́ “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” ahụ.—Mkpughe 7:9; Jọn 10:11, 16.
5. Olee mgbe ndị ka dị ndụ n’Israel nke Chineke hụrụ onwe ha ka ha dina n’ọchịchịrị, oleekwa mgbe ìhè Jehova mụkwasịrị ha?
5 Ruo nwa mkpirikpi oge ná mmalite afọ ndị 1900, ndị so n’Israel nke Chineke, bụ́ ndị ka nọ n’ụwa hụrụ onwe ha ka ha dina n’ọchịchịrị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya. Agha Ụwa Mbụ biri mgbe ha ka nọ n’ọnọdụ ahụ a kọwara n’ụzọ ihe atụ n’akwụkwọ Mkpughe—ozu ha tọgbọ “n’ámá nke obodo ukwu ahụ, bụ́ nke a na-akpọ Sọdọm na Ijipt n’ụzọ nke Mmụọ Nsọ.” (Mkpughe 11:8) Otú ọ dị, na 1919, Jehova mere ka ìhè ya mụkwasị ha. N’imeghachi omume na ya, ha biliri ma gbukepụ ìhè nke Chineke, na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’atụghị egwu.—Matiu 5:14-16; 24:14.
6. Olee otú ụwa n’ozuzu ya siworo meghachi omume ná mkpọsa banyere ọnụnọ Jisọs dị ka eze, ma ole ndị ka a dọtaworo n’ìhè Jehova?
6 N’ịbụ ndị Setan, bụ́ onyeisi nke “ndị onwe ụwa nke ọchịchịrị a” na-achịkwa, ihe a kpọrọ mmadụ n’ozuzu ha ajụwo ịma ọkwa banyere ọnụnọ Jisọs Kraịst dị ka eze, onye bụ́ “ìhè nke ụwa.” (Ndị Efesọs 6:12; Jọn 8:12; 2 Ndị Kọrint 4:3, 4) Ka o sina dị, a dọtawo ọtụtụ nde mmadụ n’ìhè nke Jehova, gụnyere “ndị eze” (ndị na-aghọ ndị nketa e tere mmanụ nke Alaeze eluigwe ahụ) na “mba nile” (oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ ahụ).
Mgbasa Eweta Ọṅụ Si n’Obi
7. Olee ihe na-enye obi ụtọ “nwanyị” ahụ hụrụ?
7 N’ịkọwakwu ihe ahụ e kwupụtara n’Aịsaịa 60:3, Jehova nyere “nwanyị” ahụ iwu ọzọ, sị: “Welie anya gị abụọ lee gburugburu, hụ!” Mgbe “nwanyị” ahụ mere otú ahụ, ọ hụrụ ihe na-enye obi ụtọ—ụmụ ya na-alọta! “Ha nile achịkọtawo onwe ha, ha abịakwutewo gị: ụmụ gị ndị ikom ga-esi n’ebe dị anya bịa, a ga-ekukwa ụmụ gị ndị inyom n’akụkụ gị.” (Aịsaịa 60:4) Mkpọsa Alaeze ahụ n’ụwa nile, bụ́ nke malitere na 1919, rụpụtara ọtụtụ puku ‘ụmụ ndị ikom’ na ‘ụmụ ndị inyom’ ndị ọzọ e tere mmanụ isonyere Israel nke Chineke. N’ụzọ dị otú a, Jehova mere ihe iji mezuo ọnụ ọgụgụ ahụ e buru n’amụma nke bụ́ 144,000, ndị ga-eso Kraịst chịa.—Mkpughe 5:9, 10.
8. Olee ihe na-enye ọṅụ nke Israel nke Chineke nweworo kemgbe 1919?
8 Mmụba a kpatara ịṅụrị ọṅụ. “Mgbe ahụ ị ga-ahụ wee nwuo enwuo, obi gị ga-atụkwa oké egwu, saa mbara; n’ihi na a ga-echigharịkwute gị ihe bara ụba nke oké osimiri, akụ̀ nke mba dị iche iche ga-abịakwute gị.” (Aịsaịa 60:5) Nchịkọbata nke ndị e tere mmanụ n’afọ ndị 1920 na 1930 mere ka Israel nke Chineke nwee obi ụtọ dị ukwuu. Ma, ha enwewo ihe ọzọ mere ha ga-eji na-aṅụrị ọṅụ. Karịsịa kemgbe etiti afọ ndị 1930, ndị sobu ‘n’oké osimiri’ nke ihe a kpọrọ mmadụ e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ esiwo ná mba nile pụta iji soro Israel nke Chineke fee ofufe. (Aịsaịa 57:20; Hagaị 2:7) Ndị a adịghị efe Chineke, onye ọ bụla n’ụzọ nke ya. Kama nke ahụ, ha na-abịakwute “nwanyị” Chineke ma ghọọ akụkụ nke ìgwè atụrụ dị n’otu nke Chineke. N’ihi ya, ndị ohu Chineke nile na-ekere òkè ná mgbasa nke ezi ofufe.
Mba Dị Iche Iche Ezukọọ na Jerusalem
9, 10. Ole ndị ka a hụrụ ka ha na-ezukọ na Jerusalem, oleekwa otú Jehova si nabata ha?
9 N’iji ihe atụ ndị ha na Aịsaịa dịkọrọ ndụ maara nke ọma eme ihe, Jehova na-akọwa mgbasa ahụ. N’isite n’ebe dịziri adịzi ọ nọ n’Ugwu Zaịọn wee lepụ anya, “nwanyị” ahụ bu ụzọ legharịa anya n’akụkụ ọwụwa anyanwụ. Gịnị ka ọ hụrụ? “Ìgwè camel ga-ekpuchi gị, ụmụ camel nke Midian na Ifa: ha nile ga-esi na Sheba bịa: ọlaedo na frankincense ka ha ga-ebute, ọ bụkwa ozi ọma otuto Jehova ka ha ga-ezisa.” (Aịsaịa 60:6) Ìgwè camel nke ndị ahịa na-ejegharị ejegharị, bụ́ ndị si n’ebo dị iche iche, ji eme njem na-agafe n’ụzọ ndị na-eduga na Jerusalem. (Jenesis 37:25, 28; Ndị Ikpe 6:1, 5; 1 Ndị Eze 10:1, 2) Camel juru ebe nile, dị ka idei mmiri nke kpuchiri ala ahụ! Ìgwè camel ndị ahụ bu onyinye ndị dị oké ọnụ ahịa na-abịa, na-egosi na ndị ahịa ahụ bu ihe ọma n’obi wee bịa. Ha chọrọ ife Jehova ofufe ma nye ya ihe kasị mma ha pụrụ inye ya.
10 Ọ bụghị nanị ndị ahịa a nọ na-eme njem. “Ìgwè ewu na atụrụ nile nke Kida ka a ga-achịkọtara gị, ebulu nile nke Nebaiot ga-ejere gị ozi.” Ee, ebo ndị na-azụ atụrụ sokwa na-aga Jerusalem. Ha bu onyinye ndị sitere n’ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa ha nwere na-abịa—ìgwè atụrụ—na-ewepụtakwa onwe ha dị ka ndị ozi. Olee otú Jehova ga-esi anabata ha? Ọ na-ekwu, sị: “Ha ga-arịgota n’ebe ịchụàjà m dị ka ihe na-atọ ụtọ, M ga-emekwa ụlọ nke ịma mma m ka ọ maa mma.” (Aịsaịa 60:7) Jehova nakweere onyinye ha, bụ́ ndị a ga-eji mee ihe n’ofufe dị ọcha.—Aịsaịa 56:7; Jeremaịa 49:28, 29.
11, 12. (a) Gịnị ka “nwanyị” ahụ hụrụ mgbe o lere anya n’akụkụ ọdịda anyanwụ? (b) N’ihi gịnị ka ọtụtụ ndị ji na-eme ngwa ngwa ịga Jerusalem?
11 Ugbu a Jehova gwara “nwanyị” ahụ ka o lee anya n’akụkụ ọdịda anyanwụ, ọ jụọkwa, sị: “Olee ndị bụ ndị a nke na-efe efe dị ka igwe ojii, ndị na-efekwa dị ka nduru si eferu windo ha?” Jehova n’onwe ya na-aza, sị: “Mụ ka àgwàetiti nile ga-echere, ụgbọ nile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ, ime ka ụmụ gị ndị ikom si n’ebe dị anya bịa, ha na ọlaọcha ha na ọlaedo ha, ịbịakwute aha Jehova, bụ́ Chineke gị, na ịbịakwute Onye Nsọ nke Israel, n’ihi na O mewo ka ị maa mma.”—Aịsaịa 60:8, 9.
12 Weredị ya na gị na “nwanyị” ahụ guzo, na-ele anya n’akụkụ ọdịda anyanwụ gabiga Osimiri Ukwu ahụ. Gịnị ka ị na-ahụ? Ụmụ obere ihe na-acha ọcha, ndị dị n’ebe dị anya, ndị sere n’elu mmiri ahụ. Ha yiri nnụnụ, ma, ka ha na-abịakwu nso, ị na-ahụ na ha bụ ụgbọ mmiri ndị a gbasara ákwà ifufe ha agbasa. Ha esiwo “n’ebe dị anya” bịa.a (Aịsaịa 49:12) Ọtụtụ ụgbọ mmiri ji ọsọ na-agbaga Zaịọn nke na ha yiri ìgwè nduru na-efela efela. N’ihi gịnị ka ìgwè ụgbọ mmiri ahụ ji na-eme ngwa ngwa otú ahụ? Ọ dị ha ọkụ n’obi ịga buruo ibu ha bu, bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe, ndị si n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị anya, n’ebe ha na-aga. N’ezie, ndị ahụ nile bịara ọhụrụ—ma ndị Israel ma ndị ala ọzọ, ndị si n’ọwụwa anyanwụ ma ọ bụ n’ọdịda anyanwụ, nakwa n’ala ndị dị nso ma ọ bụ ndị dị anya—na-eme ngwa ngwa ịgaru Jerusalem iji rara ihe nile ha nwere nye aha Jehova, bụ́ Chineke ha.—Aịsaịa 55:5.
13. N’oge a, olee ndị bụ ‘ụmụ ndị ikom’ na ‘ụmụ ndị inyom,’ olee ndị bụkwa “akụ̀ nke mba dị iche iche”?
13 Lee nkọwa doro anya Aịsaịa 60:4-9 nyere banyere mgbasa zuru ụwa ọnụ nke werewooro ọnọdụ kemgbe “nwanyị” Jehova malitere ime ka ìhè nwuo n’ime ọchịchịrị nke ụwa a! ‘Ụmụ ndị ikom’ na ‘ụmụ ndị inyom’ nke Zaịọn nke eluigwe bu ụzọ bịa, bụ́ ndị ghọrọ ndị Kraịst e tere mmanụ. Na 1931, ndị a kọwara onwe ha n’ihu ọha dị ka Ndịàmà Jehova. Mgbe ahụzi, ìgwè ndị dị nwayọọ n’obi, bụ́ “akụ̀ nke mba dị iche iche,” na “ihe bara ụba nke oké osimiri,” mere ngwa ngwa isonyere ihe fọdụrụ n’ụmụnna Kraịst.b Taa, ndị ohu Jehova nile a, bụ́ ndị si n’akụkụ anọ nke ụwa na n’ọkwá dị iche iche na-abịa, na-esonyere Israel nke Chineke n’ito Eze Onyenwe ha, bụ́ Jehova, na n’ibuli aha ya elu dị ka aha kasị ukwuu n’eluigwe na ala.
14. Olee otú o si bụrụ na ndị ahụ bịara ọhụrụ ‘na-arịgota n’ebe ịchụàjà Chineke’?
14 Otú ọ dị, gịnị ka ọ pụtara bụ́ na ndị a bịara ọhụrụ, ndị sitere ná mba dị iche iche, ‘na-arịgota n’ebe ịchụàjà Chineke’? A na-edebe àjà n’elu ebe ịchụàjà. Pọl onyeozi ji okwu metụtara àjà mee ihe mgbe o dere, sị: “[Ana m arịọ] unu, ka unu chee ahụ unu n’ihu Chineke, dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke ezi ụtọ, nke bụ́ ikpe ekpere unu dị ka uche si dị.” (Ndị Rom 12:1) Ezi ndị Kraịst dị njikere inye onwe ha. (Luk 9:23, 24) Ha na-etinye oge ha, ume ha, na nkà ha n’ịkwalite ofufe dị ọcha. (Ndị Rom 6:13) N’ime otú ahụ, ha na-achụrụ Chineke àjà otuto ọ na-anabata. (Ndị Hibru 13:15) Lee ihe na-enye obi ụtọ ọ bụ na ọtụtụ nde ndị na-efe Jehova ofufe taa, ma nwata ma okenye, emewo ka ihe ndị metụtara Alaeze Chineke ahụ na-ebute ọchịchọ onwe onye ha ụzọ! Ha na-egosipụta ezi mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà.—Matiu 6:33; 2 Ndị Kọrint 5:15.
Ndị Bịara Ọhụrụ Ekere Òkè ná Mgbasa Ahụ
15. (a) N’oge ochie, olee otú e si gosipụta ebere Jehova n’ihe banyere ndị ala ọzọ? (b) N’oge a, olee otú “ndị ala ọzọ” siworo kere òkè n’iwulite ezi ofufe?
15 Ndị ahụ bịara ọhụrụ na-enye ma ihe onwunwe ha ma ike ọrụ ha n’ịkwado “nwanyị” Jehova. “[Ndị] ala ọzọ ga-ewukwa mgbidi gị nile, ndị eze ha ga-ejekwara gị ozi: n’ihi na n’iwe m ka M tiworo gị ihe, ma na mgbe ihe gị na-atọ m ụtọ ka M nweworo obi ebere n’ahụ gị.” (Aịsaịa 60:10) E gosipụtara ebere Jehova na narị afọ nke isii T.O.A. mgbe ndị ala ọzọ nyere aka n’ọrụ iwu ihe na Jerusalem. (Ezra 3:7; Nehemaịa 3:26) Ná mmezu ka ukwuu nke taa, “ndị ala ọzọ,” bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, na-akwado ihe fọdụrụ e tere mmanụ n’iwulite ezi ofufe. Ha na-enye aka n’iwunye àgwà ndị Kraịst n’ime ndị ha na-amụrụ Bible, si otú a na-ewuli ọgbakọ ndị Kraịst elu ma na-eme ka “mgbidi” nke nzukọ Jehova, nke yiri obodo, sikwuo ike. (1 Ndị Kọrint 3:10-15) Ha na-ewukwa ihe n’ụzọ nkịtị, na-arụsi ọrụ ike n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na ihe owuwu Betel. N’ụzọ dị otú a, ha na-esonyere ụmụnna ha e tere mmanụ n’igbo mkpa nke nzukọ Jehova nke na-agbasawanye agbasawanye.—Aịsaịa 61:5.
16, 17. (a) Olee otú e siworo ghewe “ọnụ ụzọ ámá” nke nzukọ Chineke oghe? (b) Olee otú “ndị eze” siworo jeere Zaịọn ozi? (ch) Gịnị ga-eme ndị na-agbalị imechi “ọnụ ụzọ ámá” Jehova chọrọ ka ha ghere oghe?
16 Kwa afọ, n’ihi iwu ihe ime mmụọ ahụ, ọtụtụ narị puku “ndị ala ọzọ” na-amalite isonyere nzukọ Jehova, ụzọ ghekwara oghe nye ọtụtụ ndị ọzọ. Jehova na-ekwu, sị: “Ọnụ ụzọ ámá gị nile ga-eghekwa oghe mgbe nile; a gaghị emechi ha n’ehihie ma ọ bụ n’abalị; ka mmadụ wee bubatara gị akụ̀ nke mba dị iche iche, ndị eze ha abụrụkwa ndị [na-ebute ụzọ, NW].” (Aịsaịa 60:11) Otú ọ dị, olee ndị bụ “ndị eze” ahụ na-ebute ụzọ n’iweta akụ̀ nke mba dị iche iche na Zaịọn? N’oge ochie, Jehova kpaliri obi ndị ọchịchị ụfọdụ ‘ijere Zaịọn ozi.’ Dị ka ihe atụ, Saịrọs mere ihe n’onwe ya n’izighachi ndị Juu na Jerusalem ịga wughachi ụlọukwu ahụ. Mgbe e mesịrị, Ataksakses nyere ihe onwunwe dị ka onyinye ma zipụ Nehemaịa ịga wughachi mgbidi Jerusalem. (Ezra 1:2, 3; Nehemaịa 2:1-8) N’eziokwu, “iyi dị iche iche nke jupụtara na mmiri ka obi eze bụ n’aka Jehova.” (Ilu 21:1) Chineke anyị pụrụ ịkpali ọbụna ndị ọchịchị dị ike ime ihe n’ikwekọ n’uche ya.
17 N’oge a, ọtụtụ “ndị eze,” ma ọ bụ ndị ọchịchị ụwa, anwawo imechi “ọnụ ụzọ ámá” nke nzukọ Jehova. Otú ọ dị, ndị ọzọ ejeworo Zaịọn ozi site n’ime mkpebi ndị nyere aka n’ime ka “ọnụ ụzọ ámá” ndị ahụ ghere oghe. (Ndị Rom 13:4) Na 1919, ndị ọchịchị ụwa tọhapụrụ Joseph F. Rutherford na ndị ibe ya na mkpọrọ na-ezighị ezi a tụrụ ha. (Mkpughe 11:13) Ọchịchị ụmụ mmadụ ‘lodara’ ọtụtụ mkpagbu Setan kpatara mgbe o sichara n’eluigwe daa. (Mkpughe 12:16) Ọchịchị ụfọdụ akwadowo ikwe okpukpe dịrị, mgbe ụfọdụ n’ihi Ndịàmà Jehova kpọmkwem. Ije ozi dị otú a emewo ka ọ dịrị ìgwè ndị dị nwayọọ n’obi mfe karị isi ‘n’ọnụ ụzọ ámá’ ahụ ghere oghe baa ná nzukọ Jehova. Gịnịkwanụ maka ndị mmegide ahụ, ndị na-agbalị imechi “ọnụ ụzọ ámá” ndị ahụ? Ọ dịghị mgbe ha ga-enwe ihe ịga nke ọma. Banyere ha, Jehova na-ekwu, sị: “Mba ahụ na alaeze ahụ nke na-agaghị efe gị ga-ala n’iyi; ee, a ghaghị ime ka mba ahụ nile tọgbọrọ n’efu.” (Aịsaịa 60:12) Ndị nile na-alụso “nwanyị” Chineke ọgụ—ma ha bụ ndị mmadụ n’otu n’otu ma ha bụ òtù dị iche iche—ga-ala n’iyi, ọ dịkarịa anya n’agha Amagedọn ahụ na-abịanụ.—Mkpughe 16:14, 16.
18. (a) Gịnị ka nkwa ahụ bụ́ na osisi ga-ejupụta n’Israel pụtara? (b) Gịnị bụ ‘ọnọdụ ụkwụ Jehova’ taa?
18 Mgbe ịdọ aka ná ntị a banyere ikpe gasịrị, amụma ahụ gaghachiri ná nkwa mbuli elu na ọganihu. N’ịgwa “nwanyị” ya okwu, Jehova na-ekwu, sị: “Ebube Lebanọn ga-abịakwute gị, osisi fir na osisi pine na osisi cypress n’otu; ime ka ọnọdụ ebe nsọ m maa mma, M ga-emekwa ka ọnọdụ ụkwụ m abụọ nwee nsọpụrụ.” (Aịsaịa 60:13) Osisi ndị na-ama pokopoko na-anọchite anya ịma mma na ịmị mkpụrụ. (Aịsaịa 41:19; 55:13) Okwu bụ́ “ebe nsọ” na “ọnọdụ ụkwụ m,” bụ́ ndị dị n’amaokwu a, na-ezo aka n’ụlọukwu Jerusalem. (1 Ihe E Mere 28:2; Abụ Ọma 99:5) Otú ọ dị, Pọl onyeozi kọwara na ụlọukwu ahụ dị na Jerusalem bụ nnọọ ihe atụ nke na-ese onyinyo ụlọ nsọ ime mmụọ ka ukwuu, bụ́ ndokwa maka ịbịakwute Jehova n’ofufe dabere n’àjà Kraịst. (Ndị Hibru 8:1-5; 9:2-10, 23) Taa, Jehova na-eme ka ‘ọnọdụ ụkwụ ya,’ nke bụ́ ogige elu ala nke oké ụlọ nsọ ime mmụọ a, dị ebube. Ndị a na-aghọ ihe ndị na-adọrọ nnọọ adọrọ nke na ha na-adọta ndị mmadụ site ná mba nile ịbịa kere òkè n’ezi ofufe n’ebe ahụ.—Aịsaịa 2:1-4; Hagaị 2:7.
19. Gịnị ka a ga-amanye ndị mmegide ikweta, oleekwa mgbe ha ga-eme nke a ma ọ dịkarịa anya?
19 Ugbu a, n’iche ihu ọzọ n’ebe ndị mmegide ahụ nọ, Jehova na-ekwu, sị: “Ụmụ nke ndị na-eweda gị n’ala ga-ejekwuru gị na-ehuda n’ala; ndị nile nke na-elelị gị anya ga-akpọkwa isiala n’ọbụ ụkwụ nke ụkwụ gị abụọ; ha ga-akpọkwa gị, Obodo Jehova, Zaịọn nke Onye Nsọ nke Israel.” (Aịsaịa 60:14) Ee, ịhụ oké mmụba na ụzọ ndụ ka mma nke ngọzi Chineke na-ewetara ndị ya ga-amanye ndị mmegide ụfọdụ ịkpọ isiala na ịkpọku “nwanyị” ahụ. Ya bụ, a ga-amanye ha ikweta—ọ dịkarịa anya n’Amagedọn—na ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na ndị ibe ha na-anọchite anya nzukọ eluigwe nke Chineke n’ezie, bụ́ “Obodo Jehova, Zaịọn nke Onye Nsọ nke Israel.”
Iji Ihe Onwunwe Ndị E Nwere Na-eme Ihe
20. Oké mgbanwe dị aṅaa nke ọnọdụ ka “nwanyị” ahụ nwere?
20 Lee oké mgbanwe ọnọdụ nke “nwanyị” Jehova nwere! Jehova na-ekwu, sị: “N’ọnọdụ ịbụ onye a hapụrụ ahapụ na onye a na-akpọ asị nke ị bụworo, nke ọ na-adịghị onye na-agabiga n’etiti gị, M ga-eme gị ka ị ghọọ [ihe e ji eme ọnụ ruo mgbe ebighị ebi, NW], na ihe obi ụtọ nke ọtụtụ ọgbọ. Ị ga-aṅụkwa mmiri ara nke mba dị iche iche, ọ bụkwa ara ndị eze ka ị ga-amị: i wee mara na Mụ onwe m, Jehova, bụ Onye nzọpụta gị na Onye mgbapụta gị, bụ́ Onye dị ike nke Jekọb.”—Aịsaịa 60:15, 16.
21. (a) Olee otú Jerusalem oge ochie si ghọọ “ihe e ji eme ọnụ”? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa ka ndị ohu Jehova e tere mmanụ nweworo kemgbe 1919, oleekwa otú ha siworo mịa “mmiri ara nke mba dị iche iche”?
21 Ruo afọ 70, Jerusalem oge ochie adịghị adị, dị ka a pụrụ isi kwuo ya, ‘n’adịghị onye na-agabiga n’etiti ya.’ Ma malite na 537 T.O.A., Jehova mere ka e birighachi n’obodo ahụ, na-eme ka ọ ghọọ “ihe e ji eme ọnụ.” N’otu aka ahụ, ka ọ na-eru ná ngwụsị nke Agha Ụwa Mbụ, Israel nke Chineke nwere oge ịtọgbọrọ n’efu bụ́ mgbe ha chere na ‘a hapụrụ ha ahapụ.’ Ma na 1919, Jehova gbapụtara ndị ohu ya e tere mmanụ ná ndọrọ n’agha, kemgbe ahụkwa, o jiriwo mgbasa na ọganihu ime mmụọ a na-enwetụbeghị ụdị ya gọzie ha. Ndị ya aṅụwo “mmiri ara nke mba dị iche iche,” jiri ihe onwunwe ndị sitere ná mba dị iche iche na-eme ihe maka ọganihu nke ezi ofufe. Dị ka ihe atụ, iji nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ eme ihe n’ụzọ amamihe dị na ya emewo ka o kwe omume ịsụgharị na ibipụta Bible na akwụkwọ ndị e ji amụ Bible n’ọtụtụ narị asụsụ. N’ihi ya, kwa afọ, ọtụtụ narị puku mmadụ na-eso Ndịàmà Jehova amụ Bible, bịakwa mara na Jehova, site n’aka Kraịst, bụ Onye Nzọpụta na Onye Mgbapụta ha.—Ọrụ 5:31; 1 Jọn 4:14.
Ọganihu n’Ime Nhazi
22. Ụdị ọganihu dị aṅaa pụrụ iche ka Jehova na-ekwe nkwa ya?
22 Mmụba nke ọnụ ọgụgụ ndị Jehova na ọganihu n’ime nhazi na-aga ụkwụ na ụkwụ. Jehova na-ekwu, sị: “N’ọnọdụ ọla M ga-eweta ọlaedo, n’ọnọdụ ígwè M ga-eweta ọlaọcha, n’ọnọdụ osisi M ga-eweta ọla, n’ọnọdụ nkume, M ga-eweta ígwè: M ga-emekwa ka ndị nlekọta gị ghọọ udo, M ga-emekwa ka ndị na-achị gị n’ihe ike ghọọ ezi omume.” (Aịsaịa 60:17) Iji ọlaedo dochie ọla bụ imeziwanye ihe, otú ahụ ka ọ dịkwa ihe ndị ọzọ a kpọtụrụ aha n’ebe a. N’ikwekọ na nke a, ndị Jehova anọwo na-enwe ndokwa ndị ka mma n’ime nhazi eri mgbe ikpeazụ a.
23, 24. Ndokwa dịgasị aṅaa ka mma n’ime nhazi ka ndị Jehova nọworo na-enwe kemgbe 1919?
23 Ka ọ na-erule 1919, ọgbakọ dị iche iche nwere ndị okenye na ndị dikọn a họpụtara site ná ntụli aka. Malite n’afọ ahụ, e ji usoro ọchịchị Chineke na-ahọpụta onye nduzi ije ozi ilekọta ọrụ ije ozi ubi n’ọgbakọ, ma e nwere ọnọdụ ụfọdụ ebe ndị okenye ụfọdụ a họpụtara ahọpụta site ná ntụli aka megidere onye nduzi ije ozi. Na 1932, ihe gbanwere. Site na magazin Ụlọ Nche, e nyere ọgbakọ dị iche iche ntụziaka ka ha kwụsị ịhọpụta ndị okenye na ndị dikọn site ná ntụli aka. Kama nke ahụ, ha ga-ahọpụta kọmitii ije ozi site ná ntụli aka bụ́ nke ya na onye nduzi ije ozi ga na-arụkọ ọrụ. Nke ahụ bụ nnukwute mmeziwanye ihe.
24 Na 1938, e webatakwuru “ọlaedo” mgbe e mere ka o doo anya na a ga-eji usoro ọchịchị Chineke na-ahọpụta ndị ohu nile nọ n’ọgbakọ. Nlekọta nke ọgbakọ bịara dịrị n’aka ohu kọmpịnị (ka oge na-aga, ohu ọgbakọ) nakwa ndị ohu dị iche iche na-enyere ya aka, bụ́ ndị a họpụtachara n’okpuru nlekọta nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.”c (Matiu 24:45-47) Otú ọ dị, na 1972, a hụrụ na ụzọ Akwụkwọ Nsọ kwadoro nke isi na-elekọta ọgbakọ bụ site n’aka òtù ndị okenye kama ịbụ site n’aka otu onye. (Ndị Filipaị 1:1) E mere mgbanwe ndị ọzọ ma n’ọgbakọ ma n’Òtù Na-achị Isi. A hụrụ otu ihe atụ nke mgbanwe a e mere n’Òtù Na-achị Isi n’October 7, 2000, bụ́ mgbe a mara ọkwa na ndị so n’Òtù Na-achị Isi, ndị nọ na-eje ozi dị ka ndị nduzi nke Watch Tower Society of Pennsylvania nakwa ụlọ ọrụ ndị ọzọ e jikọtara ha na ya ejiriwo aka ha sepụ aka. N’ụzọ dị otú a, Òtù Na-achị Isi, nke na-anọchite anya ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nwere ike itinyekwu uche n’ịhụ maka nlekọta ime mmụọ nke “nzukọ Chineke” na ndị so ya na-emekọ ihe, bụ́ atụrụ ọzọ ahụ. (Ọrụ 20:28) Ndokwa nile dị otú ahụ bụcha imeziwanye ihe. Ha ewusiwo nzukọ Jehova ike karị ma gọzie ndị na-efe ya ofufe.
25. Ònye meworo ka e nwee ọganihu n’ime nhazi nke ndị Jehova meworo, oleekwa uru ndị e nwetaworo?
25 Ònye meworo ka e nwee mmeziwanye ihe ndị a? Hà bụ n’ihi nkà ime nhazi ma ọ bụ ike nchepụta ihe nke mmadụ ụfọdụ? Ee e, n’ihi na Jehova kwuru, sị: “M ga-eweta ọlaedo.” Ọganihu a nile bụ n’ihi nduzi Chineke. Ka ndị Jehova na-agbaso nduzi ya ma na-eme mgbanwe, ha na-enweta uru dị ukwuu. Udo dị n’etiti ha, ịhụnanya maka ezi omume na-akwalikwa ha ijere ya ozi.
26. Ihe dị aṅaa e ji amata ezi ndị Kraịst ka ọbụna ndị mmegide na-ahụ?
26 Udo nke sitere n’aka Chineke pụrụ ime ka e nwee mgbanwe. Jehova na-ekwe nkwa, sị: “A gaghị anụkwa ihe ike ọzọ n’ala gị, a gaghị anụ mbibi na ntipịa n’ókèala gị nile; ma ị ga-akpọ mgbidi gị nile Nzọpụta, kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị nile Otuto.” (Aịsaịa 60:18) Lee ka o siworo bụrụ eziokwu! Ọbụna ndị mmegide na-ekweta na ịdị n’udo bụ ihe pụrụ iche e ji amata ezi ndị Kraịst. (Maịka 4:3) Udo a nke dị n’etiti ha na Chineke nakwa n’etiti Ndịàmà Jehova n’onwe ha na-eme ka ebe ọ bụla ndị Kraịst na-enwe nzukọ bụrụ ebe mgbaba nke na-enye ume ọhụrụ n’ime ụwa nke na-eme ihe ike. (1 Pita 2:17) Ọ bụ ihe atụ nke udo bara ụba nke ga-adị mgbe ndị nile bi n’ụwa ga-abụ “ndị mmụta Jehova.”—Aịsaịa 11:9; 54:13.
Ìhè Dị Ebube nke Nnwapụta Chineke
27. Ìhè dị aṅaa nke na-enwu mgbe nile na-amụkwasị “nwanyị” Jehova?
27 Jehova kọwara otú ìhè ahụ na-amụkwasị Jerusalem si enwusi ike mgbe o kwuru, sị: “Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè ọzọ n’ehihie; ma n’onwu maramara ọnwa agaghị enye gị ìhè: ma Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi, Chineke gị ga-aghọkwara gị ịma mma gị. Anyanwụ gị agaghị adakwa ọzọ, ọnwa gị agaghị ewepụkwa onwe ya: n’ihi na Jehova ga-aghọrọ gị ìhè ebighị ebi, ụbọchị nile nke iru újú gị ewee zuo ezuo.” (Aịsaịa 60:19, 20) Jehova ga-anọgide na-abụrụ “nwanyị” ya “ìhè ebighị ebi.” Ọ gaghị ‘ada’ ma ọlị dị ka anyanwụ ma ọ bụ ‘wepụ onwe ya’ dị ka ọnwa.d Ìhè nke nnwapụta ya nke na-enwu mgbe nile na-amụkwasị ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị nnọchiteanya bụ́ mmadụ nke “nwanyị” Chineke. Ha na oké ìgwè mmadụ ahụ na-enweta oké ìhè ime mmụọ dị otú ahụ nke na ọ dịghị ọchịchịrị dị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba nke ụwa nke pụrụ ime ka ọ nyụlata. Obi sikwara ha ike banyere ọdịnihu dị mma nke Jehova setịpụwooro ha.—Ndị Rom 2:7; Mkpughe 21:3-5.
28. (a) Gịnị ka e kwere nkwa ya banyere ndị bi na Jerusalem, ndị na-alọtanụ? (b) Gịnị ka ndị Kraịst e tere mmanụ nwetara na 1919? (ch) Ruo ogologo oge hà aṅaa ka ndị ezi omume ga-enweta ala ahụ?
28 Jehova gara n’ihu ikwu banyere ndị bi na Jerusalem, sị: “Ndị gị kwa, ha nile ga-abụ ndị ezi omume, ruo mgbe ebighị ebi ka ha ga-enweta ala; alaka nke ọkụkụ m, ọrụ aka m, ime ka M maa mma.” (Aịsaịa 60:21) Mgbe ndị Israel anụ ahụ si Babilọn lọta, ha ‘nwetara ala ahụ.’ Ma n’oge ahụ, “ruo mgbe ebighị ebi” ghọrọ ruo na narị afọ mbụ O.A. mgbe ndị agha Rom bibiri Jerusalem na mba ndị Juu. Na 1919, ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ si ná ndọrọ n’agha ime mmụọ pụta ma nweta ala ime mmụọ. (Aịsaịa 66:8) Ala a, ma ọ bụ ógbè ịrụ ọrụ, bụ nke ọganihu ime mmụọ yiri nke paradaịs, nke na-agaghị ebelata ebelata kara akara. N’adịghị ka Israel oge ochie, Israel ime mmụọ dị ka otu òtù agaghị abụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi. Ọzọkwa, amụma Aịsaịa ga-enwekwa mmezu nkịtị mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs nkịtị nke “ịba ụba nke udo” ga-aka akara. Mgbe ahụ, ndị ezi omume, bụ́ ndị nwere olileanya elu ala ga-enweta ala ruo mgbe ebighị ebi.—Abụ Ọma 37:11, 29.
29, 30. Olee otú “onye nta” siworo ghọọ “otu puku”?
29 A pụrụ ịhụ otu nkwa dị oké mkpa ná mmechi nke Aịsaịa isi 60, bụ́ nke Jehova ji aha ya mesie ike. Ọ na-ekwu, sị: “Onye nta n’etiti ha ga-aghọ [otu puku], onye dịkarịsịrị nta ga-aghọkwa mba nwere ume: Mụ onwe m, Jehova, ga-eme ka ọ bịa ọsọ ọsọ na mgbe ya.” (Aịsaịa 60:22) Mgbe e weghachiri ndị ahụ e tere mmanụ a chụsasịrị achụsasị n’ọrụ ha na 1919, ha bụ “onye nta” ahụ.e Ma ọnụ ọgụgụ ha mụbara ka a na-ewebata ndị Israel ime mmụọ fọdụrụnụ. Mmụba ahụ ghọkwara nke dị ịrịba ama mgbe a malitere ịchịkọta oké ìgwè mmadụ.
30 N’oge na-adịghị anya, udo na ezi omume nke dị n’etiti ndị Chineke dọtara ọtụtụ ndị nwere obi eziokwu nke na “onye dịkarịsịrị nta” mụbara n’ụzọ nkịtị wee ghọọ “mba nwere ume.” Ugbu a, o nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ buru ibu karịa ọtụtụ mba ndị kwụụrụ onwe ha n’ụwa. N’ụzọ doro anya, Jehova, site n’aka Jisọs Kraịst, eduziwo ọrụ Alaeze ahụ ma mee ka ọ gaa ọsọ ọsọ. Lee ihe obi ụtọ ọ bụ ịhụ mgbasa nke ezi ofufe n’ụwa nile nakwa ikere òkè na ya! Ee, ọ bụ ihe ọṅụ ịmata na mmụba a na-ewetara Jehova otuto, bụ́ onye buru ihe ndị a n’amụma ogologo oge gara aga.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a O yiri ka Tashish ọ̀ dị n’ebe a maara ugbu a dị ka Spain. Otú ọ dị, dị ka akwụkwọ ụfọdụ e ji eme nnyocha si kwuo, okwu bụ́ “ụgbọ nile nke Tashish” na-ezo aka n’ụdị ụgbọ ha bụ—“ụgbọ ndị na-agba n’oké osimiri, ndị osisi ákwà ifufe ha dị elu”—ndị “dị mma ịga Tashish,” n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ụgbọ mmiri ndị e weere na ha dị mma iji na-eme ogologo njem gaa n’ọdụ ụgbọ mmiri ndị dị anya.—1 Ndị Eze 22:48.
b Ọ bụ ezie na e nwere ndị Kraịst na-arụsị ọrụ ike, ndị na-anụ ọkụ n’obi, ndị nwere olileanya elu ala, bụ́ ndị na-esonyere Israel nke Chineke tupu 1930, ọnụ ọgụgụ ha malitere ịmụba n’ụzọ pụtara ìhè n’afọ ndị 1930.
c N’oge ahụ, a na-akpọ ọgbakọ dị iche iche kọmpịnị.
d Jọn onyeozi jiri okwu yiri ya mee ihe n’ịkọwa “Jerusalem ọhụrụ,” bụ́ 144,000 ahụ n’ebube eluigwe ha. (Mkpughe 3:12; 21:10, 22-26) Nke a dabara adaba, n’ihi na “Jerusalem ọhụrụ” na-anọchite anya ndị nile so n’Israel nke Chineke mgbe ha natasịworo ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe, soro Jisọs Kraịst ghọọ akụkụ bụ́ isi nke “nwanyị” Chineke, bụ́ “Jerusalem nke dị n’elu.”—Ndị Galetia 4:26.
e Na 1918, nkezi ọnụ ọgụgụ nke ndị keere òkè n’ikwusa okwu ahụ kwa ọnwa erughị 4,000.
[Foto dị na peeji nke 305]
E nyere “nwanyị” ahụ iwu ka o “bilie”
[Foto dị na peeji nke 312, 313]
“Ụgbọ nile nke Tashish” bu ibu ha nke bụ́ ndị na-efe Jehova ofufe