IHE ỌMỤMỤ NKE 5
Nkwụsịtụ Kwesịrị Ekwesị
N’OKWU, nkwụsịtụ ndị e mere n’ebe ndị kwesịrị ekwesị dị mkpa. Nke a bụ eziokwu ma ị̀ na-agwa ìgwè mmadụ ma ọ bụ otu onye okwu. Ọ bụrụ na nkwụsịtụ ndị dị otú ahụ adịghị, ihe a na-ekwu pụrụ ịdị na-ada ka ikwugheri ọnụ kama ịbụ ikwupụta echiche dị n’okwu n’ụzọ doro anya. Nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị na-enye aka eme ka okwu gị doo anya. A pụkwara iji ya mee ihe n’ụzọ ga-eme ka isi ihe ị na-ekwu nwee mmetụta na-adịte aka.
Olee otú ị pụrụ isi mata mgbe i kwesịrị ịkwụsịtụ? Nkwụsịtụ ò kwesịrị ịha aṅaa n’ogologo?
Kwụsịtụ Iji Kebie Okwu. Akara edemede aghọwo akụkụ dị mkpa nke asụsụ a na-ede ede. Ọ pụrụ igosi ebe okwu ma ọ bụ ajụjụ kwụsịrị. N’asụsụ ụfọdụ, a na-eji ya egosi okwu ndị e hotara ehota. Akara edemede ụfọdụ na-egosi njikọ dị n’agbata otu akụkụ nke ahịrịokwu na akụkụ ndị ọzọ. Onye na-agụpụtara onwe ya ihe pụrụ ịhụ akara edemede ndị ahụ. Ma mgbe ọ na-agụpụta ihe maka abamuru nke ndị ọzọ, ụda olu ya aghaghị iwepụta ihe akara edemede ọ bụla dị n’ihe odide ahụ pụtara. (Iji nwetakwuo nkọwa, lee Ihe Ọmụmụ nke 1, “Ịgụzi Ihe Agụzi.”) Akwụsịtụghị mgbe akara edemede chọrọ ka e mee otú ahụ pụrụ ime ka o siere ndị ọzọ ike ịghọta ihe ị na-agụ ma ọ bụ o nwere ike ọbụna ịgbanwe echiche dị n’ihe ị na-agụ.
Tụkwasị n’akara edemede, otú e si wepụta echiche okwu n’ahịrịokwu ga-ekpebi ebe ndị e kwesịrị ịkwụsịtụ. Otu onye a ma ama na-eti egwú kwuru n’otu oge, sị: “Adịghị m akpọta akara ụda egwú karịa ọtụtụ ndị na-akpọ piano. Ma, ị hụla, ịkwụsịtụ n’agbata otu akara ụda egwú na ọzọ, bụ ebe a chọrọ iji nkà eme ihe.” Ọ bụ otú ahụ ka ọ dị n’ikwu okwu. Ịkwụsịtụ n’ebe ndị kwesịrị ekwesị ga-eme ka okwu gị makwuo mma ma mee ka okwu ị kwadebere nke ọma nwekwuo ihe mmụta.
N’ịkwadebe ịgụ ihe n’ihu ọha, ị pụrụ ịchọpụta na ọ na-enye aka ịkanye akara n’ihe odide ị ga-agụpụta. Kanye otu obere akara kwụ ọtọ n’ebe ị ga-akwụsịtụ nke nta, ikekwe n’ebe ị ga-echeretụ nanị nke nta. Kanye akara abụọ chiri anya ndị kwụ ọtọ n’ebe ị ga-akwụsịtụ ruo ogologo oge karị. Ọ bụrụ na ị chọpụta na otú e si hazie okwu ụfọdụ adịghị aga gị were were n’ọnụ nakwa na ị na-akwụsịtụ ugboro ugboro n’ebe na-ekwesịghị ekwesị, jiri pensịl kanye akara na ha iji jikọta okwu nile dị ná nkebi ahịrịokwu ahụ nke siri ike ọgụgụ. Mgbe ahụ gụọ nkebi ahịrịokwu ahụ n’akwụsịtụghị akwụsịtụ site ná mmalite ruo ná njedebe ya. Ọtụtụ ndị ọkà okwu nwere ahụmahụ na-eme nke a.
Ịdị na-akwụsịtụ ná mkparịta ụka a na-enwe kwa ụbọchị adịghị enyekarị nsogbu n’ihi na ị maara echiche ndị ị chọrọ iwepụta. Otú ọ dị, ọ bụrụ na ọ maara gị ahụ́ ịdị na-akwụsịtụ ugboro ugboro n’agbanyeghị ihe echiche okwu chọrọ, okwu gị agaghị na-akpali akpali, ọ gaghịkwa edo anya. A tụrụ aro maka imeziwanye ihe n’Ihe Ọmụmụ nke 4, “Ikwu Okwu n’Ụzọ Na-aga Were Were n’Ọnụ.”
Nkwụsịtụ Maka Mgbanwe Echiche Okwu. Mgbe i si n’otu isi ihe na-agafere n’ọzọ, nkwụsịtụ pụrụ inye ndị na-ege gị ntị ohere iche echiche, ịhazigharị uche ha, ịmata mgbanwe nke echiche okwu, nakwa ịghọta nke ọma karị echiche ọzọ a na-ewepụta. Ọ dị mkpa ka ị kwụsịtụ mgbe i si n’otu echiche na-agafere n’ọzọ dịkwa ka ọ na-adị mkpa ka ị kwụsịlata mgbe i ji ụgbọala chọọ isi n’otu okporo ámá banye n’ọzọ.
Otu ihe mere ndị ọkà okwu ụfọdụ ji esi n’otu echiche amafere n’ọzọ n’akwụsịtụghị bụ na ha na-anwa ikwu ihe buru oké ibu. Nye ụfọdụ ndị, omume ahụ na-egosi otú ha si ekwu okwu kwa ụbọchị. Ikekwe ndị nile nọ ha nso na-ekwu okwu otú ahụ. Ma nke ahụ adịghị eduga n’izi ihe n’ụzọ dị irè. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ikwu, nke kwesịrị ka a nụ ya ma cheta ya, mgbe ahụ wepụta oge zuru ezu iji mee ka echiche ahụ pụta ìhè nke ọma. Ghọta na nkwụsịtụ dị mkpa n’okwu nke a na-ewepụta echiche okwu dị na ya nke ọma.
Ọ bụrụ na ị ga-ekwu okwu nke dabeere n’ihe ndepụta, ị kwesịrị ịhazi ihe ọmụma gị n’ụzọ ga-eme ka ebe ị ga-akwụsịtụ n’agbata otu isi ihe na ọzọ doo anya. Ọ bụrụ na ọ bụ okwu a ga-agụ agụ ka ị gaje ikwu, kanye akara n’ebe ndị e si n’otu isi ihe gbanwee gaa n’ọzọ.
Nkwụsịtụ maka iji gbanwee echiche na-adịkarị ogologo karịa nkwụsịtụ n’ihi akara edemede—otú ọ dị, ọ gaghị adị ogologo nke na ọ ga-eme ka okwu ahụ jụọ oyi. Ọ bụrụ na ha adị oké ogologo, ha ga-eme ka e chee na ị kwadoghị nke ọma nakwa na ị na-anwa ikpebi ihe ọzọ ị ga-ekwu.
Nkwụsịtụ Iji Mesie Okwu Ike. Nkwụsịtụ e ji emesi okwu ike na-adịkarị ịrịba ama, ya bụ, ọ na-ebute ụzọ ma ọ bụkwanụ na-esochi okwu e kwuru ma ọ bụ ajụjụ a jụrụ n’ụzọ kpotụrụ ọkụ. Nkwụsịtụ dị otú ahụ na-enye ndị na-ege ntị ohere ịtụgharị uche n’ihe a ka kwupụrụ, ma ọ bụ ọ na-eme ka a tụọ anya ihe ga-esochi. Ha abụghị otu ihe ahụ. Kpebie ụzọ kwesịrị ekwesị isi mee ya. Ma buru n’obi na e kwesịrị inwe nkwụsịtụ ndị e ji emesi okwu ike nanị maka okwu ndị dị mkpa n’ezie. Ma ọ bụghị otú ahụ, uru okwu ndị ahụ bara ga-efu ọhịa.
Mgbe Jizọs gụpụtara ihe site n’Akwụkwọ Nsọ n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, o ji nkwụsịtụ mee ihe n’ụzọ dị irè. O bu ụzọ gụpụta ihe bụ́ ọrụ ya n’akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaịa onye amụma. Otú ọ dị, tupu ọ kọwaa ya, ọ fụkọtara akwụkwọ mpịakọta ahụ, nyeghachi ya onye na-eje ozi wee nọdụ ala. Mgbe ahụ, ka ndị nile nọ n’ụlọ nzukọ ahụ legidesiri ya anya ike, ọ sịrị: “Taa ka akụkụ Akwụkwọ Nsọ a nke unu ka nụpụrụ mezuru.”—Luk 4:16-21.
Nkwụsịtụ Mgbe Ọnọdụ Chọrọ Ya. Mgbe ụfọdụ mkpọtụ pụkwara ime ka ị kwụsịtụ okwu gị. Mkpọtụ nke ụgbọala na-agafe agafe ma ọ bụ nwatakịrị na-ebe ákwá pụrụ ime ka ọ dị mkpa na ị ga-akwụsịtụ mkparịta ụka gị na onye nwe ụlọ na-enwe, bụ́ onye i zutere n’ozi ubi. Ọ bụrụ na ụzụ e nwere n’ebe a na-enwe mgbakọ agabigaghị ókè, i nwere ike iwelikwu olu gị elu ma gaa n’ihu. Ma ọ bụrụ na ụzụ ahụ na-emesi ike ma dịtee aka, ị ghaghị ịkwụsịtụ. Ndị na-ege gị ntị agadịghị na-aṅa ntị. N’ihi ya, jiri nkwụsịtụ mee ihe n’ụzọ dị irè, iji nyere ndị na-ege gị ntị aka irite uru zuru ezu n’ezi ihe ndị ị chọrọ ịgwa ha.
Kwụsịtụ Iji Nye Ohere Maka Nzaghachi: Ọ bụ ezie na ị pụrụ ịdị na-ekwu okwu nke na-enyeghị ohere ka ndị na-ege ntị na-etinye ọnụ na ya, ọ dị mkpa ka i kwe ka ndị na-ege ntị zaghachi, ọ bụghị ikwupụta ya ekwupụta, kama n’uche ha. Ọ bụrụ na ị jụọ ajụjụ ndị kwesịrị ime ka ndị na-ege gị ntị chee echiche ma ị kwụsịtụghị ruo otú o kwesịrị, ihe dị ukwuu n’abamuru nke ajụjụ ndị ahụ ga-efu ọhịa.
Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịkwụsịtụ, ọ bụghị nanị mgbe a nọ n’ikpo okwu na-ekwu okwu, kamakwa mgbe a na-agbara ndị ọzọ àmà. Ụfọdụ ndị yiri ka ha adịghị akwụsịtụ akwụsịtụ ma ọlị. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ nsogbu gị, mee ezigbo mgbalị iji zụlite nkà okwu a. Ị ga-eme ka nkwurịta okwu gị na ndị ọzọ ka mma, meekwa ka ozi gị n’ubi dịkwuo irè. Nkwụsịtụ bụ mkpirikpi oge nke idere duu, e kwuwokwa n’ụzọ bụ́ eziokwu na idere duu na-ekebi okwu, na-emesi ya ike, na-adọta uche, na-eme ka ntị dịghachi njikere ịnụ ihe.
Mkparịta ụka a na-enwe kwa ụbọchị bụ mmadụ na mmadụ ịgwarịta ibe ha echiche ha. Ndị ọzọ na-enwe mmasị karị ige gị ntị ma ọ bụrụ na i gee ha ntị ma gosi mmasị n’ihe ha na-ekwu. Nke a na-achọ ka ị kwụsịtụ otú kwesịrị ekwesị iji nye ha ohere ikwu obi ha.
N’ozi ubi, àmà anyị na-agba na-akakarị adị irè mgbe a gbara ya n’ụdị mkparịta ụka. Mgbe e kelerịtasịrị ekele, ọtụtụ Ndịàmà na-ahụ na ọ dị mma ikwu isiokwu ha, mgbe ahụzi jụọ otu ajụjụ. Ha na-akwụsịtụ iji nye onye nke ọzọ ohere ịzaghachi, mgbe ahụzi ha ekelee onye nwe ụlọ maka ihe o kwuru. Ná nkwurịta okwu ahụ, ha pụrụ inye onye nwe ụlọ ọtụtụ ohere ikwu okwu. Ha maara na, dị ka ọ na-adịkarị, ha pụrụ inyere mmadụ aka karị ma ọ bụrụ na ha mata ihe bụ́ echiche ya n’ihe ha na-ekwurịta.—Ilu 20:5.
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile ga-aza ajụjụ n’ụzọ dị mma. Ma nke ahụ egbochighị Jizọs ịkwụsịtụ otú kwesịrịnụ iji nye ọbụna ndị na-emegide ya ohere ikwu okwu. (Mak 3:1-5) Inye onye nke ọzọ ohere ikwu okwu ga-agba ya ume iche echiche, n’ihi nke ahụkwa, ọ pụrụ ikpughe ihe dị ya n’obi. N’eziokwu, otu n’ime nzube nke ozi anyị bụ ịkpasu ndị mmadụ iji obi ha zaghachi site n’iche n’ihu ha okwu ndị dị mkpa sitere n’Okwu Chineke bụ́ ndị ha na-aghaghị ime mkpebi na ha.—Hib. 4:12.
Iji nkwụsịtụ kwesịrị ekwesị eme ihe n’ozi anyị bụ nkà n’ezie. Mgbe a na-akwụsịtụ n’ụzọ dị irè, a na-ekwupụta echiche okwu nke ọma karị, ọtụtụ mgbe a na-echetakwa ha ruo ogologo oge karị.