Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 21 p. 150-p. 152 para. 5
  • E Ji Imesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Gụọ Akwụkwọ Nsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Ji Imesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Gụọ Akwụkwọ Nsọ
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imesi Echiche Okwu Ike n’Ụzọ Kwesịrị Ekwesị
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • E Ji Akwụkwọ Nsọ Mee Ihe n’Ụzọ Ziri Ezi
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • E Mesiri Echiche Ndị Bụ́ Isi Ike
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • A Gbara Ume Iji Bible Eme Ihe
    Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 21 p. 150-p. 152 para. 5

IHE ỌMỤMỤ NKE 21

E Ji Imesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Gụọ Akwụkwọ Nsọ

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Mesie okwu ndị na-eme ka isi ihe dị n’okwu gị pụta ìhè ike. Jiri mmetụta kwesịrị ekwesị gụọ ya.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

A na-eji imesi okwu ike kwesịrị ekwesị eme ka mmetụta zuru ezu nke akụkụ Akwụkwọ Nsọ a na-agụ nwere pụta ìhè.

MGBE ị na-agwa ndị ọzọ banyere nzube Chineke, mgbe nanị unu nọ ma ọ bụ site n’elu ikpo okwu, okwu gị kwesịrị ihiwe isi n’ihe dị n’Okwu Chineke. Nke a na-agụnyekarị ịgụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ site n’ime Bible, bụ́ nke e kwesịrị ịgụ nke ọma.

Mmesi Okwu Ike Kwesịrị Ekwesị Na-agụnye Mmetụta. E kwesịrị iji mmetụta gụọ Akwụkwọ Nsọ. Tụlee ihe atụ ụfọdụ. Mgbe ị na-agụpụta Abụ Ọma 37:11, ụda olu gị kwesịrị igosi atụmanya na-enye obi ụtọ maka udo e kwere nkwa ya n’ebe ahụ. Mgbe ị na-agụ Mkpughe 21:4 banyere njedebe nke ịta ahụhụ na ọnwụ, ụda olu gị kwesịrị igosipụta ezi obi ekele maka nnwere onwe magburu onwe ya a na-ebu amụma ya. E kwesịrị iji olu nke ịdị ngwa gụọ Mkpughe 18:2, 4, 5, na òkù ọ na-akpọ ka e si na “Babilọn Ukwu ahụ” jupụtara ná mmehie pụta. N’ezie, mmetụta a na-egosipụta kwesịrị isite n’obi ma a gaghị emebiga ya ókè. Ọ bụ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’onwe ya na ụzọ e si jiri ya na-eme ihe na-ekpebi ọ̀tụ̀tụ̀ mmetụta uche kwesịrị ekwesị.

Mesie Okwu Ndị Kwesịrị Ekwesị Ike. Ọ bụrụ na ihe ị ga-ekwu banyere otu amaokwu dabeere nanị n’otu akụkụ ya, i kwesịrị ime ka akụkụ ahụ pụta ìhè mgbe ị na-agụ amaokwu ahụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-agụ Matiu 6:33, i kwesịghị imesi “ezi omume ya” ma ọ bụ “ihe ọzọ ndị a nile” ike karị ma ọ bụrụ na i bu n’obi ịtụle ihe “buru ụzọ na-achọ alaeze ahụ” pụtara.

N’okwu a ga-ekwu ná Nzukọ Ije Ozi, ị pụrụ ime atụmatụ ịgụ Matiu 28:19. Olee okwu ndị i kwesịrị imesi ike? Ọ bụrụ na ị chọrọ ịgba ume ka a dị uchu n’ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi, mesie okwu bụ́ ‘mee ndị na-eso ụzọ’ ike. N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na ị na-eme atụmatụ ịtụle ibu ọrụ Onye Kraịst nwere iso ndị si mba ọzọ kwabata kerịta eziokwu Bible ma ọ bụ na ị chọrọ ịgba ụfọdụ ndị nkwusa ume ije ozi n’ebe mkpa ka ukwuu, ị pụrụ imesi “ndị nke mba nile” ike.

Ọtụtụ mgbe, a na-agụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ iji zaa ajụjụ ma ọ bụ iji kwadoo otu echiche nke ndị ọzọ na-ewere dị ka ihe na-akpata arụmụka. Ọ bụrụ na e mesie echiche nile dị n’amaokwu ahụ ike n’ụzọ ha nhata, ndị na-ege gị ntị nwere ike ha agaghị ahụ otú o si metụta ihe a na-ekwu. Isi ihe dị na ya nwere ike ido gị anya ma o doghị ha anya.

Dị ka ihe atụ mgbe ị na-agụ Abụ Ọma 83:18 na Bible nwere aha Chineke, ọ bụrụ na mmesi okwu ike gị nile abụrụ n’okwu bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu,” onye nwe ụlọ nwere ike ọ gaghị aghọta eziokwu ahụ yiri ihe doro anya nke bụ́ na Chineke nwere aha aka. I kwesịrị imesi aha ahụ bụ́ “Jehova” ike. Otú ọ dị, mgbe i ji otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ na-eme ihe ná mkparịta ụka banyere ọbụbụeze Jehova, i kwesịrị imesi okwu bụ́ “Onye kachasị ihe nile elu” ike karịsịa. N’otu aka ahụ, mgbe i ji Jems 2:24 na-egosi mkpa ọ dị ijikọta okwukwe na ọrụ, imesi “kpọọ mmadụ onye ezi omume” ike karịsịa kama imesi “ọrụ” ike karịsịa pụrụ ime ka ụfọdụ ndị na-ege gị ntị ghara ịghọta isi ihe ị na-ekwu.

A pụrụ ịhụ ihe atụ ọzọ na-enye aka ná Ndị Rom 15:7-13. Nke a bụ akụkụ nke akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara otu ọgbakọ nke ma ndị Jentaịl ma ndị Juu anụ ahụ́ mejupụtara. N’ebe a onyeozi ahụ na-ekwusi ike na ozi Kraịst jere baara ọ bụghị nanị ndị Juu e biri úgwù uru kamakwa ndị mba ọzọ, ka “ndị mba ọzọ wee nye Chineke otuto maka ebere ya.” Pọl hotaziri ihe e kwuru n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ anọ, na-adọrọ uche gaa n’ohere ahụ e nyere ndị mba ọzọ. Olee otú i kwesịrị isi gụọ ihe ndị a e hotara iji mesie isi ihe Pọl bu n’uche ike? Ọ bụrụ na ị na-akanye akara n’okwu ndị ị ga-emesi ike, ị pụrụ ịkanye ihe ná “ndị mba ọzọ” Ro 15 n’amaokwu nke 9, “unu ndị mba ọzọ” Ro 15 n’amaokwu nke 10, “unu ndị mba ọzọ nile” nakwa “ndị nile” Ro 15 n’amaokwu nke 11, na “mba nile” Ro 15 n’amaokwu nke 12. Gbalịa iji imesi okwu ike ahụ gụọ Ndị Rom 15:7-13. Ka ị na-eme otú ahụ, ihe dum Pọl na-ekwu ga-edokwu anya ma dịkwuo mfe ịghọta.

Ụzọ Dị Iche Iche nke Isi Emesi Okwu Ike. A pụrụ iji ọtụtụ ụzọ mesie okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu, ndị ị chọrọ ka ha pụta ìhè, ike. Ụzọ ị ga-esi mee ya kwesịrị ikwekọ n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ nakwa n’ọnọdụ okwu ahụ. A na-atụ aro ole na ole n’ebe a.

Iji ụda olu mesie okwu ike. Nke a na-agụnye mgbanwe ọ bụla nke ụda olu bụ́ nke na-eme ka okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu guzopụ iche n’ahịrịokwu. A pụrụ imesi okwu ike site n’ịgbanwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụda olu—site n’iwelikwu ya elu ma ọ bụ iwetulata ya. N’ọtụtụ asụsụ, ịgbanwe ọdịdị ụda olu na-emesikwu okwu ike. Otú ọ dị, n’asụsụ ụfọdụ, nke ahụ pụrụ ịgbanwe ihe ọ pụtara kpam kpam. Mgbe e ji nwayọọ nwayọọ kwuo okwu ndị bụ́ isi, nke a na-emesikwu ha ike. N’asụsụ ndị na-adịghị eji ụda olu emesi okwu ụfọdụ ike, ọ ga-adị mkpa ime ihe ọ bụla a na-emekarị n’asụsụ ahụ iji mezuo ihe a chọrọ.

Nkwụsịtụ. A pụrụ ime nke a tupu a gụọ ma ọ bụ mgbe a gụsịrị akụkụ bụ́ isi nke otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ—ma ọ bụ ha abụọ. Ịkwụsịtụ kpọmkwem tupu ị gụpụta otu echiche bụ́ isi na-eme ka a tụọ anya ihe; ịkwụsịtụ mgbe ị gụsịrị ya na-eme ka mmetụta ya bamikwuo abami. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a kwụsịbiga ókè, ọ dịghị ihe ga-eguzopụ iche.

Nkwughachi. Ị pụrụ imesi otu isi ihe ike site n’ịkwụsị ma gụghachi okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu ahụ. Otu ụzọ a na-esikarị eme ya bụ ịgụcha amaokwu ahụ, mgbe ahụ gụghachi okwu bụ́ isi.

Mmegharị ahụ́. Ọtụtụ mgbe, imegharị ahụ́ nakwa ọdịdị ihu mmadụ pụrụ ịgbakwụnye mmetụta uche n’otu okwu ma ọ bụ nkebi ahịrịokwu.

Ụda olu. N’asụsụ ụfọdụ, mgbe ụfọdụ, a pụrụ ịgụ okwu n’ụda olu ga-emetụta ihe ha pụtara ma mee ka ha guzopụ iche. N’ebe a kwa, e kwesịrị iji akọ mee ihe, karịsịa mgbe e ji olu ịkwa emo na-eme ihe.

Mgbe Ndị Ọzọ Gụrụ Akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbe onye nwe ụlọ gụrụ otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ, ọ pụrụ imesi okwu ndị na-ezighị ezi ike ma ọ bụ ghara imesi nke ọ bụla ike. Gịnịzi ka ị pụrụ ime? Ọ na-akasịkarị mma ime ka ihe ọ pụtara doo anya site n’otú ị ga-esi kọwaa ya. Mgbe ị kọwasịrị ya, ị pụrụ ilekwasị anya karịsịa n’okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu bụ́ ndị dị n’ime Bible ahụ.

ỤZỌ ISI ZỤLITE IJI IMESI OKWU IKE EME IHE

  • Banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ọ bụla ị na-eme atụmatụ ịgụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Echiche ma ọ bụ mmetụta uche dị aṅaa ka okwu ndị a na-egosipụta? Olee otú m kwesịrị isi wepụta ya?’

  • Tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-eme atụmatụ iji mee ihe. Banyere nke ọ bụla, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe akụkụ Akwụkwọ Nsọ a ga-arụzu? Olee okwu ndị ọ dị mkpa ka e mesie ike iji rụzuo ya?’

IHE OMUME: (1) Tụlee akụkụ Akwụkwọ Nsọ ị na-eme atụmatụ iji mee ihe n’ozi ubi. Mụgharịa iji mmetụta kwesịrị ekwesị gụọ ya. N’iburu n’uche otú ị na-eme atụmatụ isi jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ mee ihe, gụpụta ya agụpụta, na-emesi okwu (ndị) kwesịrị ekwesị ike. (2) N’akwụkwọ a na-amụ ugbu a, họrọ otu paragraf nke nwere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e hotara ehota. Tụlee otú e si jiri akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ mee ihe. Kanye akara n’okwu ndị na-ewepụta echiche dị n’okwu. Gụpụta paragraf ahụ dum n’ụzọ ga-emesi akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ ike n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya